< 利未記 2 >

1 若有人願意給上主奉獻素祭為祭品,他的祭品應用細麵,倒上油,放上乳香,
“‘Mgbe onye ọbụla wetaara Onyenwe anyị onyinye mkpụrụ ọka, onyinye ya ga-abụ nke ezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma. Ha ga-awụkwasị ya mmanụ oliv, tinyekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ya,
2 拿來交給亞郎的兒子司祭們;司祭取出一把細麵和一些油,同所有的乳香,放在祭壇上焚燒,作為全燔祭,作為中悅上主的馨香火祭,為獲得記念。
ọ ga-ebutere ya ụmụ Erọn ndị nchụaja. Onye nchụaja ga-ekpoju ụtụ ọka na mmanụ ahụ nʼaka, tinyekwara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile ahụ, kpọọ ihe ndị a ọkụ dịka oke ncheta nʼelu ebe ịchụ aja. Ọ ga-abụkwa onyinye nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị.
3 剩下的素祭祭品,應歸亞郎和他的兒子們,因為是獻與上主火祭中的至聖之物。
Ma nke fọdụrụ nʼonyinye ọka ahụ bụ nke Erọn na ụmụ ya. Ọ bụ oke dịkarịsịrị nsọ nke onyinye nsure ọkụ niile echere nʼihu Onyenwe anyị.
4 如果你願意奉獻爐烤的祭品作素祭,應以油調的細麵作成的無酵餅,或抹油的無酵薄餅。
“‘Ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ achịcha eghere nʼite e ji eghe ihe, ọ ga-abụ nke e ji ezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma mee. Ọ ga-abụ ogbe achịcha agwara mmanụ oliv nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, maọbụ achịcha mbadamba e tere mmanụ nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
5 若你的祭品是用烤盤做的素祭,該用油調的無酵細麵作成,
Ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ achịcha e ghere eghe, achịcha ahụ aghaghị ịbụ nke e mere site nʼezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma, nke a gwakọtara mmanụ, nke na-enweghị ihe na-eko achịcha nʼime ya.
6 擘成塊,倒上油:這是素祭。
Nyawasịa ya, wụkwasị ya mmanụ nʼelu, ọ bụkwa onyinye mkpụrụ ọka.
7 若你的祭品是用鍋煎的素祭,該用細麵和油製成。
Ọ bụrụ na onyinye mkpụrụ ọka gị bụ ihe e siri nʼite, ọ ghaghị ịbụ ezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma, e tinyetụrụ mmanụ oliv.
8 當你把品這樣的素祭祭品獻給上主時,應交給司祭帶到祭壇前。
Ị ga-ebute onyinye mkpụrụ ọka ahụ bunye ya onye nchụaja. Ọ ga-eche ya nʼihu Onyenwe anyị nʼebe ịchụ aja.
9 司祭由素素祭祭品中取出一份,放在祭壇上焚燒,作為中悅上主的馨香火祭,為獲得記念。
Onye nchụaja ga-ekporo ụfọdụ nʼaka dịka oke ncheta nʼime onyinye ọka ahụ, kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka aja e surere nʼọkụ, nke isisi ya na-atọ Onyenwe anyị ezi ụtọ.
10 剩下的素祭祭品,應歸亞郎和他的兒子們,因為是獻與上主火祭中的至聖之物。
Ma nke fọdụrụ nʼonyinye ọka ahụ bụ nke Erọn na ụmụ ya. Ọ bụ oke dịkarịsịrị nsọ nke onyinye nsure ọkụ niile echere nʼihu Onyenwe anyị.
11 你們獻給上主的素祭,都應是無酵做的,因凡是有酵有蜜的,都不應焚燒作為獻給上主的火祭;
“‘Unu etinyela ihe na-eko ọka ọbụla nʼonyinye mkpụrụ ọka unu na-enye Onyenwe anyị, nʼihi na unu ekwesighị ịkpọ ihe na-eko achịcha maọbụ mmanụ aṅụ ọkụ nʼonyinye nsure ọkụ unu na-enye Onyenwe anyị.
12 但可當作初熟祭品獻給上主,只是不可獻在祭壇上,當作悅意馨香的祭品。
Unu nwere ike nye Onyenwe anyị achịcha e ji ihe na-eko achịcha na mmanụ aṅụ mee nʼoge onyinye owuwe ihe ubi, ma a gaghị eme otu a nʼoge onyinye ọchụchụ aja nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ.
13 此外,凡你獻的素祭祭品都應加上鹽,總不可讓你的素祭,缺少與你的天主結約的鹽;在你的一切祭品上,都應加上鹽奉獻。
Unu aghaghị itinye nnu nʼime onyinye mkpụrụ ọka ọbụla unu na-enye. Unu ahapụla ọgbụgba ndụ Chineke unu nʼonyinye mkpụrụ ọka unu. Tinyenụ nnu nʼonyinye unu niile.
14 若你給上主奉獻初熟之物作素祭,應奉獻火培的新麥穗,或去殼的新穀粒,當作你初熟之物的素祭,
“‘Ọ bụrụ na onyinye mkpụrụ ọka ị na-ewetara Onyenwe anyị bụ mkpụrụ mbụ nke ubi gị, site nʼọka ọhụrụ gị weta ọka a sụrụ asụ, maọbụ nke a hụrụ nʼọkụ.
15 再倒上油,放上乳香:這是素祭。
Tinye ya mmanụ na ụda na-esi isi ụtọ. Ọ ga-abụ onyinye ọka.
16 司祭取出一些麥粒和油並所有乳香來焚燒,作為獻給上主的火祭,為獲得記念。
Onye nchụaja ga-ewere oke ncheta nʼime ọka ahụ a sụrụ asụ, nke a gwara mmanụ na ụda na-esi isi ụtọ, dịka onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.

< 利未記 2 >