< 利未記 14 >

1 上主訓示梅瑟說:「
Onyenwe anyị gwara Mosis, sị,
2 關於癩病人取潔之日應守的法律如下:應引他去見司祭,
“Ndị a bụ usoro iwu gbasara onye ọrịa ekpenta nʼoge a na-eme mmemme ịdị ọcha ya, mgbe e dutere ya bịakwute onye nchụaja.
3 司祭應到營外查看,如見癩病人的病症痊愈了,
Onye nchụaja ga-apụ gaa nʼazụ ebe obibi nọdụ nʼebe ahụ lee ya ahụ, ịchọpụta ma ọrịa ekpenta ya ọ laala nʼezie. Ọ bụrụ na ọrịa ya alaala,
4 就吩咐人為那取潔者,拿兩隻潔淨的活鳥、香柏木、朱紅線和牛膝草來;
onye nchụaja ga-enye iwu ka e weta nnụnụ abụọ dị ndụ, na ụfọdụ osisi sida, na eriri ogho uhie, na hisọp, maka onye ahụ a ga-emere mmemme ịdị ọcha.
5 然後吩咐人在盛著活水的陶器上,宰殺一隻鳥。
Onye nchụaja ga-enye iwu ka e gbuo otu nʼime nnụnụ abụọ ahụ nʼelu mmiri e si nʼọdọ mmiri na-asọ asọ kute nke dị nʼime ite aja.
6 司祭拿另外一隻活鳥同香柏木、朱紅線和牛膝草,連同活鳥一起浸在殺於活水上的鳥血內,
Ọ ga-ewere nnụnụ nke ọzọ dị ndụ, ya na osisi sida ahụ, na ogho uhie ahụ, na hisọp ahụ, denye ha nʼime ọbara nnụnụ ahụ e gburu nʼelu mmiri ahụ.
7 向那取潔的癩病人灑血七次,使他潔淨;然後放那隻活鳥飛向田野,
Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-efe ọbara ahụ ugboro asaa nʼahụ onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha site nʼọrịa ekpenta. Ọ ga-ekwupụtakwa na a gwọọla onye ahụ. Emesịa, ọ ga-ahapụ nnụnụ ahụ ka o felaa nʼọhịa.
8 那取潔的人洗滌自己的衣服,剃去身上所有的毛,用水洗澡,這樣就算潔淨了。此後,他方可入營內,但仍應在自己的帳幕外居住七天。
“Onye ahụ e mere ka ọ dị ọcha ga-asacha uwe ya, kpụchaa ntutu isi ya, saakwa ahụ ya. Mgbe ahụ, ọ ga-adị ọcha. Emesịa, ọ ga-esoro ndị mmadụ biri nʼobodo. Ma ọ gaghị abanye nʼụlọ nke aka ya tutu ụbọchị asaa agafee.
9 到了第七天,他應剃去身上所有的毛:頭髮、鬍鬚和眉毛;身上所有的毛都應剃去,然後洗滌衣服,用水洗身,就算完全潔淨了。
Nʼụbọchị nke asaa, ọ ga-akpụchapụ ntutu isi ya, na afụọnụ ya, na ikuanya ya, na ajị ndị ọzọ dị ya nʼahụ. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya niile. Mgbe ahụ, a ga-agụ ya nʼonye dị ọcha.
10 到第八天,他應帶兩隻無暇的公羔羊,一隻一歲的無暇母羔羊,作素祭用的十分之三」厄法「油調的細麵,和一「羅格」│。
“Nʼụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewere ebule abụọ na-enweghị ntụpọ, na otu nne atụrụ nke na-enweghị ntụpọ gbara otu afọ, ya na iri iko ọka a kwọrọ nke ọma a gwakọtara mmanụ oliv maka aja mkpụrụ ọka, na otu iko mmanụ.
11 取潔禮的司祭,應叫取潔的人拿著這一切,站在會幕門口,上主面前。
Onye nchụaja ahụ lere ya ahụ sị na ha dị ọcha, ga-ewere aja ndị a, ha na onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha chee nʼihu Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
12 司祭取一隻公羔羊同一」羅格「油,一起現作贖過祭,在上主前行奉獻的搖禮。
“Mgbe ahụ, onye nchụaja ahụ ga-ewere otu nʼime ụmụ ebule ahụ, na otu iko mmanụ chụọ ya dịka onyinye aja ikpe ọmụma. Ọ ga-efufe ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
13 然後在宰殺贖罪祭和全番祭犧牲的聖地方,宰殺這隻公羔羊,因為贖過祭犧牲,如贖罪祭犧牲一樣,應歸司祭:這是至聖之物。
Ọ ga-egbu nwa ebule ahụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, nʼebe a na-anọ egbu anụ aja mmehie na aja nsure ọkụ. Ọ bụ onye nchụaja ga-ewere anụ aja ikpe ọmụma a, dịka o were nke aja mmehie. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
14 司祭取些贖過祭犧牲的血,抹在取潔者的右耳垂,右手拇指和右腳大趾;
Onye nchụaja ahụ ga-ewere ụfọdụ nʼime ọbara aja ikpe ọmụma ahụ, tee nʼọnụ ntị aka nri nke onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha. Ọ ga-etekwa ya nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼelu isi mkpụrụ ụkwụ nke ụkwụ aka nri ya.
15 再由那「羅格」油中,取些油倒在自己的左手掌中,
Emesịa onye nchụaja ga-awụnyetụ mmanụ oliv ahụ nʼọbụaka nke aka ekpe ya,
16 將自己的一個右手指,浸在左手掌的油內,用手指在上主前灑油七次;
ọ ga-arụnye otu mkpịsịaka nri ya nʼime mmanụ dị nʼọbụaka ya, ọ ga-ewere mkpịsịaka ya fesa ụfọdụ nʼime ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị.
17 然後將掌中盛下的油,抹在取潔者的右耳垂,右手拇指和右腳大趾上,即在抹贖過祭犧牲血的地方。
Onye nchụaja ga-ewere mmanụ ahụ fọdụrụ nʼọbụaka ya tee ya onye ahụ nʼọnụ ntị aka nri nke onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya, nʼelu ọbara aja ikpe ọmụma ahụ mee.
18 以後將掌中剩下的油,都抹在取潔者的頭上:如此司祭載上主面前為那人行了贖罪禮。
Ọ ga-ete mmanụ ahụ fọdụrụ nʼaka ya, nʼisi onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha. Onye nchụaja ga-ekpuchikwara ha mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị.
19 此後,司祭應奉獻贖罪祭,為取潔者贖罪除去不潔;最後應宰殺全番祭犧牲,
“Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-achụ aja mmehie, kpuchiere onye ahụ a ga-eme ka ọ dị ọcha site na-adịghị ọcha ha mmehie ya. Emesịa, onye nchụaja ga-egbu aja nsure ọkụ ahụ,
20 在祭壇上奉獻全番祭和素祭。司祭這樣為他行了贖罪禮,他就潔淨了。
were ya na onyinye mkpụrụ ọka chụọrọ onye ahụ aja, maka ikpuchiri ya mmehie ya. Mgbe ahụ, a ga-agụ onye ahụ nʼonye dị ọcha.
21 但是,如果他貧窮,手中財力不足,可拿一隻公羔羊作贖過祭,行搖禮為他贖罪;十分之一「厄法」油調的細麵作素祭,一「羅格」油,
“Ọ bụrụ na ọ bụ ogbenye onye na-enweghị ike iweta ihe ndị a, ha aghaghị iwere otu nwa ebule dịka aja ikpe ọmụma nke a ga-efufe nʼihi aja ikpuchi mmehie ha, Ọ ga-ewetakwa iko ọka a kwọrọ nke ọma asaa maọbụ ihe ọtụtụ efaa a gwara mmanụ oliv dịka aja mkpụrụ ọka, ya na otu iko mmanụ.
22 和財力所能備辦的兩隻斑鳩或兩之雛鴿:一隻做贖罪祭,一隻做全番祭。
Ọ ga-ewetakwa nduru abụọ maọbụ kpalakwukwu abụọ, nke ọbụla o nwere ike iweta. Otu ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ.
23 他應在第八天,將這一切送交司祭,再會幕門口於上主面前為自己取潔。
“Ọ ga-ewere ha nye onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute nʼihu Onyenwe anyị, nʼụbọchị nke asatọ ya, maka ime ka ha dị ọcha.
24 司祭便取那隻作贖過祭的公羔羊和一「羅格」油,在上主面前行奉獻的搖禮;
Onye nchụaja ga-ewerekwa nwa atụrụ aja ikpe ọmụma ahụ, ya na otu iko mmanụ oliv ahụ, fufee ha nʼihu ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị.
25 然後宰殺作贖過祭的公羔羊,取些贖過祭犧牲的血,抹在取潔者的右耳垂,右手拇指和右腳大趾上;
Ọ ga-egbu nwa atụrụ aja ikpe ọmụma ahụ, were ụfọdụ ọbara ya tee nʼọnụ ntị aka nri onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya.
26 然後倒些油在自己的左手掌中,
Onye nchụaja ahụ ga-awụnye ụfọdụ mmanụ oliv ahụ nʼọbụaka nke aka ekpe ya,
27 用一隻右手指蘸些左手掌中的油,在上主面前灑七次;
ọ ga-ewere mkpịsịaka nri ya fesa ụfọdụ mmanụ ahụ nke dị nʼọbụaka ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị.
28 再將掌中盛的油抹在取潔者的右耳垂,右手拇指和右腳大趾上,即在抹贖過祭犧牲血的地方;
Ọ ga-etekwa ụfọdụ mmanụ ahụ dị nʼaka ya nʼebe ndị ahụ o tere ọbara ikpe ọmụma ahụ, nke bụ nʼọnụ ntị onye ahụ nke a na-eme ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya.
29 掌中還有剩下的油,都抹在取潔者的頭上,為他在上主面前行贖罪禮。
Mmanụ nke fọdụrụ nʼaka ya ka onye nchụaja ga-ete nʼisi onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha, ikpuchi mmehie ha nʼihu Onyenwe anyị.
30 取潔的人,按自己的財力,所能備辦的兩隻斑鳩或兩之雛鴿,
Emesịa, ọ ga-eji nduru abụọ ahụ maọbụ kpalakwukwu abụọ ahụ, nke ọbụla o nwere ike iweta, chụọ aja.
31 按他的財力所能獻的,其中一隻獻作贖罪祭,一隻獻作全番祭,同素祭一起獻上。司祭應這樣為取潔的人在上主面前型贖罪禮。
Otu ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ, ha na aja mkpụrụ ọka. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchiri ya mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, bụ onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha.”
32 這是關於身患癩病而財力不足備辦取潔祭品者的法律。
Ndị a bụ usoro iwu dịrị onye ọbụla e sitere nʼọrịa ekpenta mee ka ọ dị ọcha, onye aka ya na-erughị iweta ihe o kwesiri iweta, bụ nke e ji eme ka ọ dị ọcha.
33 上主訓示梅瑟和亞郎說:「
Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
34 當你們進入了我賜給你們作產業的客納罕地,在你們佔有的地方,我令房屋發生癩病現象時,
“Mgbe unu banyere ala Kenan, bụ ala ahụ m na-enye unu, ọ bụrụ na o nwee ụlọ ọbụla m webatara ọrịa na-efe efe,
35 屋主應去告訴司祭說:我看在我房屋內出現了一些相似癩病的斑痕。
onyenwe ụlọ ahụ ga-ejekwuru onye nchụaja sị ya, ‘Ahụla m ihe yiri ọrịa na-efe efe nʼụlọ m.’
36 司祭進去查看斑痕以前,應吩咐人先搬空房屋,免得屋內的一切染上不潔;然後司祭進去查看房屋。
Onye nchụaja ahụ ga-enye iwu ka a kwapụsịa ihe niile dị nʼụlọ ahụ tupu ọ gaa lezie ụlọ ahụ anya, ka ihe niile dị nʼụlọ ahụ ghara ịbụ ihe rụrụ arụ, ma ọ bụrụ na achọpụta ọrịa na-efe efe nʼụlọ ahụ. Mgbe a kwapụtasịrị ihe dị nʼụlọ ahụ, onye nchụaja ga-aga lee ụlọ ahụ.
37 司祭查看斑痕時,如見屋內牆上的斑痕帶些發綠或發紅的小孔,似乎深過牆皮,
Ọ ga-ele ntụpọ dị nʼahụ ụlọ ahụ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ na-acha ahịhịa ndụ ahịhịa ndụ, maọbụ ọbara ọbara, ọ bụrụkwa na ha miri emi karịa aja ụlọ ahụ nʼile anya,
38 就應由屋內出來,到房門口,將房屋封鎖七天。
onye nchụaja ga-esi nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ pụọ, kpọchie ụlọ ahụ ụbọchị asaa.
39 到第七天,司祭再來查看,如見斑痕在屋內牆上蔓延開了,
Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-alọghachi bịa lee ụlọ ahụ ọzọ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbasaala nʼaja ụlọ ahụ,
40 就應命人拔出有斑痕的石頭,丟在城外不潔的地方;
onye nchụaja ga-enye iwu ka e tida akụkụ aja ụlọ ahụ bufuo ya nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.
41 且叫人刮淨屋內四周,將刮下的灰土,倒在城外不潔的地方,
Ọ ga-enyekwa iwu ka a kpụchaa aja ụlọ niile dị nʼime ụlọ ahụ, bufukwaa aja niile a kpụchapụtara nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.
42 再拿別的石頭嵌進拔出的石頭處,拿別的灰土,粉刷房屋。
A ga-ebute nkume ọzọ jiri ha dochie ndị ahụ e bupụsịrị. A ga-ejikwa ụrọ ọhụrụ tee ụlọ ahụ ọzọ.
43 在拔出石頭,刮掃,粉刷房屋以後,如斑痕又在屋內出現,
“Ma ọ bụrụ na ntụpọ ahụ apụta ọzọ, mgbe e bupụsịrị nkume ndị ahụ, ma mgbe a kpuchasịrị aja ụlọ ma techikwaa ya,
44 司祭還應來查看,如見斑痕在屋內蔓延開了,這就是房屋上的腐蝕性癩病;這房屋即是不潔的,
onye nchụaja ga-abịa lee ya. Ọ bụrụ na ọ hụ na ntụpọ ahụ agbasaala ọzọ, ọ ga-agụ ụlọ ahụ dịka ihe rụrụ arụ, nʼihi na ntụpọ ahụ bụ ọrịa na-efe efe.
45 應拆毀這座房屋;房屋的石頭、木材和所有灰土,都應運到城外不潔的地方。
Ọ ga-enye iwu ka a kwatuo ụlọ ahụ bufukwaa ihe niile e jiri rụọ ya, nkume niile, osisi niile na ụrọ niile, nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.
46 整個封鎖日期內,如有人進屋內,直到晚上成為不潔的;
“Onye ọbụla banyere nʼụlọ ahụ nʼoge e mechiri ya, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo nʼoge uhuruchi.
47 如有人在這屋內睡覺,應洗滌自己的衣服;如有人在這屋內吃飯,應洗滌自己的衣服。
Onye ọbụla dinara ala maọbụ rie nri nʼime ya, ga-asacha uwe ya.
48 但是,如果司祭來查看,見房屋刷新以後,斑痕沒有在屋內蔓延,就應聲明房屋是潔淨的因為患處已經好了。
“Ma ọ bụrụ na onye nchụaja abịa hụ na ntụpọ ahụ apụtaghị ọzọ, mgbe e techara ụlọ ahụ ụrọ nke ugboro abụọ, ọ ga-agụ ya nʼụlọ dị ọcha, nʼihi na ọrịa ahụ na-efe efe alaala.
49 司祭應拿兩隻飛鳥、香柏木、朱紅線和牛膝草來為房屋取潔;
Ọ ga-ejikwa nnụnụ abụọ, na osisi sida, na ogho uhie, na osisi hisọp mee mmemme ido ihe ọcha.
50 一隻飛鳥,應在盛有活水的陶器上宰殺,
Ọ ga-egbu otu nʼime nnụnụ ndị ahụ nʼelu mmiri e si nʼiyi na-asọ asọ kute, nke dị nʼime ite aja.
51 然後拿香柏木、牛膝草、朱紅線和那隻活鳥,一同浸在那已殺的鳥血及活水內,向房屋連灑七次。
Ọ ga-edenye osisi sida ahụ, na ogho uhie ahụ, na osisi hisọp ahụ, nʼime ọbara nnụnụ ahụ na mmiri ahụ. Ọ ga-efesa ọbara ahụ nʼụlọ ahụ ugboro asaa.
52 用鳥血、活鳥、香柏木、牛膝草、朱紅線為房屋取潔以後,
Ọ bụ ọbara nnụnụ ahụ, na mmiri ahụ, na nnụnụ nke ọzọ ahụ dị ndụ, na osisi sida ahụ na hisọp ahụ, na ogho uhie ahụ ka ọ ga-eji mee ka ụlọ ahụ dị ọcha.
53 司祭應放那活鳥飛向城外的田野:他這樣為房屋行取潔禮,房屋就潔淨了。
Ọ ga-ahapụ nnụnụ ahụ dị ndụ ka o fepụ felaa nʼọhịa dị nʼazụ obodo. Nke a ga-abụ otu e si kpuchiere ụlọ ahụ mmehie ya. Ọ ga-adịkwa ọcha.”
54 這是有關各種癩病症象、癬疥、
Ndị a bụ usoro iwu metụtara ọrịa ekpenta, na ọkọ,
55 衣癩、`屋癩、
na ọrịa na-efe efe dị nʼuwe maọbụ nʼụlọ,
56 腫瘤、瘡節和斑痕,
maọbụ etuto, maọbụ ntụpọ, maọbụ ọnya.
57 使人知道幾時不潔,幾時潔淨的法律。這是關於癩病所定的法律。」
Iwu ndị a ga-enye aka ịmata ihe rụrụ arụ maọbụ ihe na-adịghị ọcha. Ndị a bụ usoro iwu metụtara ọrịa ekpenta na ọrịa na-efe efe.

< 利未記 14 >