< 耶利米哀歌 4 >

1 怎麼! 黃金竟暗淡無光,純金竟變了色! 聖所的石頭都散亂在街頭!
Lee ka ọlaedo si chuo echu. Lee ka ọlaedo makarịsịrị mma si gbanwee ghọọ ihe na-amakwaghị mma. Nkume niile dị oke ọnụahịa nke ebe nsọ bụ ndị a ghasara nʼisi okporoụzọ niile.
2 熙雍的子女,原比純金尊貴,怎麼現在竟被看作瓦器,被看作陶人的出品!
Lee ka ụmụ ndị ikom Zayọn dị oke ọnụahịa, ndị dị oke ọnụahịa na mbụ dịka ọlaedo a nụchara anụcha, si dịrị ugbu a dịka ite aja nke ọkpụ ite kpụrụ.
3 豺狼尚且露出乳房,哺養自己的幼兒;我的女兒──人民,竟然殘暴不仁,好似曠野中的鴕鳥!
Ọ bụladị ụmụ nkịta ọhịa na-eji ara ha azụ ụmụ ha, ma ndị a aghọọla ndị na-enweghị obi ebere; ha aghọọla enyi nnụnụ nke na-ebi nʼọzara.
4 嬰兒的舌頭,乾渴得緊貼上顎;幼童飢餓求食,卻無人分給他們。
Lee na ire nwa ọhụrụ na-arapara nʼakpo ọnụ ya nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ. Ụmụntakịrị na-arịọkwa ka e nye ha nri, ma o nweghị onye na-enye ha nri ahụ.
5 昔日飽享山珍海味,今日竟餓死街頭;一向衣飾華麗,而今卻滿身糞土。
Ndị ahụ naara eri ihe ụtọ dị iche iche tọgbọrọ nʼefu ugbu a nʼokporoụzọ. Ndị ahụ a zụrụ iyi uwe uhie uhie nọ ugbu a na-edina nʼebe a na-ekpofu ahịhịa.
6 我的女兒──人民的罪罰,比索多瑪的還重,索多瑪頃刻間傾覆了,並非假手於人。
Ahụhụ dịịrị ndị m dị ukwuu karịa ahụhụ nke bịakwasịrị Sọdọm. Nʼihi na ọ bụ nʼotu ntabi anya ka a kwatụrụ ya. Ọ dịkwaghị onye bịara nyere ya aka.
7 昔日,她的少年,比雪還潔白,比乳還皎潔;他們的皮膚,比珊瑚還紅潤,他們的身體好似一片青玉。
Ụmụ ndị eze ha na-egbuke karịa akụmmiri igwe, ha na-acha ọcha chakarịa mmiri ara ehi. Anụ ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ dịka nkume rubi dị oke ọnụahịa; ha makwara mma ile anya dịka nkume safaia, bụ nkume dị oke ọnụahịa.
8 而今,他們的容貌,比炭還黑,在街上已辨認不出,皮包骨頭,枯瘦如柴;
Ma ugbu a, ha na-eji nji karịa unyi. A naghị amatakwa ha ma a hụ ha nʼezi. Anụ ahụ ha araparala nʼọkpụkpụ ha; ọ kpọnwụọla dịka a ga-asị na ọ bụ osisi kpọrọ nkụ.
9 死於刀下的,比死於饑餓的,即因缺乏田產,日漸衰弱而死的,更為幸運。
Ọnọdụ ndị e ji mma agha gbuo ka mma karịa ọnọdụ ndị nwụrụ site nʼụnwụ, ndị agụụ gụgburu, ndị ji nwayọọ nwayọọ nwụọ nʼihi nri nke na-adịghị nʼubi.
10 柔情的婦女竟要親手烹食自己的子女;在我的女兒──人民遭受浩劫時,子女竟成了母親的食物。
Aka ha ka ndị inyom ndị ahụ nwere obi ebere ji gbuo ụmụ ha, sie ha. Ụmụ ha ghọọrọ ha nri nʼoge ahụ a lara ndị m nʼiyi.
11 上主大發震怒,傾洩了他的怒火,火燒熙雍,焚毀了他的基礎。
Onyenwe anyị emeela ka nrubiga oke nke iwe ya pụta ìhè; ọ wụpụla iwe ya dị ọkụ. O sunyela ọkụ na Zayọn, nke rechapụrụ ntọala ya niile.
12 地上的君王和世上的居民,誰也不相信:仇敵能進入耶路撒冷的城門。
Ndị eze nke ụwa ekwetaghị; otu a kwa, ndị ụwa niile ekwetakwaghị na ndị iro nwere ike si nʼọnụ ụzọ ama banye nʼime Jerusalem.
13 這是由於她先知們的罪惡,和她司祭們的過犯:他們在城中心,傾流了義人的血;
Ma ihe ndị a mere nʼihi mmehie ndị amụma ya, na nʼihi ajọ omume nke ndị nchụaja ya, ndị wụsiri ọbara ndị ezi omume nọ nʼetiti ya.
14 他們身染血污,像瞎子一樣,徘徊街頭,叫人不能觸摸他們的衣服。「
Ugbu a, ha na-asọ isi nʼokporoụzọ niile, dịka ndị kpuru ìsì. Ha ejirila ọbara merụọ onwe ha. O nwekwaghị onye na-agbalị ịbịaru ha nso ịmetụ uwe ha aka.
15 不潔! 退避! 」人們喊說:「退避! 不可接近! 」如果他們逃亡,漂流異邦,異邦人又說:「不要讓他們留居此地。」
Ndị mmadụ na-eti mkpu na-asị ha, “Sitenụ nʼebe anyị nọ wezuga onwe unu! Unu rụrụ arụ! Wezuganụ onwe unu, unu emetụkwala anyị aka!” Mgbe ha gbapụrụ ọsọ bido na-awagharị, ndị nọ na mba dị iche iche na-asị ha, “O kwesighị ka ha nọrọkwa nʼebe a.”
16 上主的怒容驅散他們,不再垂顧他們;人也不再尊敬司祭,不再敬重長老。
Onyenwe anyị nʼonwe ya achụsaala ha. Ọ gaghị agụnyekwa ha. Ọ dịkwaghị ndị na-asọpụrụ onye nchụaja, ọ dịkwaghị ndị na-emere ndị okenye amara.
17 我們還在望眼欲穿,幻想著我們的救援;我們仍在瞭望台上,期望著那不能施救的異邦。
Nke ka nke, anya agbaala anyị ọchịchịrị, ebe anyị nọ na-elepụ anya nʼefu maka enyemaka. Ọ bụ site nʼụlọ elu nche ka anyị nọ na-elepụ anya, na-ele anya maka ọbịbịa mba ahụ na-enweghị ike bịa zọpụta anyị.
18 敵人正在追蹤我們的足跡,阻止我們在街上行走;我們的結局已近,我們的日子已滿;的確,我們的終期已到。
Ndị mmadụ na-esogharị anyị ebe niile anyị jere, nʼihi ya anyị enweghị ike jegharịakwa nʼokporoụzọ anyị. Ọgwụgwụ anyị adịla nso, a pụkwara ịgụta ụbọchị ole fọdụụrụ anyị, tupu ọgwụgwụ anyị eruo.
19 追捕我們的人,比凌空的飛鳥還要快速;他們在山上搜索我們,在曠野裏窺伺我們。
Ndị na-achụ anyị ọsọ na-agbasi ọsọ ike karịa ugo na-efe na mbara eluigwe. Ha chụgharịrị anyị nʼelu ugwu niile, nọrọkwa nʼọzara zoo onwe ha na-eche anyị.
20 連我們的氣息──上主的受傅者,也落在他們的陷阱中:我們原希望在他的福蔭下,生活在異邦人中。
Ume ndụ anyị, nke Onyenwe anyị tere mmanụ, ka ha jidere nʼọnya ha. Anyị naara eche na anyị ga-ebi nʼokpuru ndo ya, nʼetiti mba dị iche iche.
21 住在胡茲地的厄東女郎! 你歡欣喜樂罷! 苦爵也要輪到你喝,你將要醉倒,而赤身裸體。
Ṅụrịa ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị ada Edọm, onye nke bi nʼala Uz. Ma a ga-emesịakwa nye gị iko ahụ. Ị ga-esitekwa na ya ṅụọ ihe ọṅụṅụ ṅụjụbiga afọ oke. A ga-agbakwa gị ọtọ.
22 熙雍女郎! 你的罪債已經償還,上主不再使你流徙;厄東女郎! 他必要懲罰你的過犯,揭露你的罪惡。
Gị ada Zayọn, ahụhụ gị agwụsịala; Ọ gaghị emekwa ka i jee biri ogologo oge na mba ọzọ. Kama, ọ ga-ata gị ahụhụ nʼihi mmehie gị, gị, ada Edọm, kpugheekwa ajọ omume gị niile.

< 耶利米哀歌 4 >