< 士師記 11 >

1 基肋阿得人依弗大是一個英勇的壯士,是妓女的兒子;父親名基肋阿得。
Otu ọ dị, Jefta, onye Gilead, bụ dimkpa nʼagha. Nna ya bụ Gilead; nne ya bụ akwụna.
2 基肋阿得的妻子也給他生了幾個兒子,正妻的兒子長大之後,把基肋阿得逐出,他說:「你在我們父家不能承受產業,因為你是外婦的兒子。」
Nwunye Gilead mụtaara ya ọtụtụ ụmụ ndị ikom ọzọ. Mgbe ha tolitere, ha chụpụrụ Jefta site nʼobodo ahụ, sị ya, “Ị gaghị eketa ihe ọbụla nʼezi nna anyị, nʼihi na nwa nwanyị ọzọ ka ị bụ.”
3 依弗大就從他兄弟面前逃走,定居於托布地方;有些流氓聚集在他那裏,同他來往。
Nʼihi nke a, Jefta gbapụrụ site nʼụlọ nna ya, gaa biri nʼobodo Tob. Mgbe na-adịghị anya, ọtụtụ ndị isi na-anụ ọkụ bịara nọnyere ya ma sorokwa ya.
4 過了一些時候,阿孟子民與以色列交戰。
O ruo mgbe ọtụtụ oge gasịrị, ndị Amọn busoro ụmụ Izrel agha.
5 當阿孟子民同以色列交戰的時候,基肋阿得的長老到托布地方去請依弗大回來。
Ndị okenye Gilead jere ịkpọpụta Jefta site nʼala Tob.
6 他們同依弗大說:「請你來作我們的統帥,攻打阿孟子民。」
Ha sịrị ya, “Bịa buru onyeisi agha anyị ka anyị nwee ike ibuso ndị Amọn agha.”
7 依弗大回答基肋阿得的長老說:「你們不是恨我,將我逐出我的父家﹖現在你們遭難,為什麼來找我﹖」
Jefta sịrị ha, “Unu akpọghị m asị, ma chụpụkwa m site nʼụlọ nna m? Gịnị mere unu ji na-achọ m ugbu a unu nọ nʼoke nsogbu?”
8 基肋阿得的長老對依弗大說:「我們現在來找你正是為此。請你和我們一同回去,攻打阿孟子民,作我們,作基肋阿得所有居民的首領。」
Ndị okenye Gilead sịrị ya, “na-agbanyeghị nke a, anyị abịaghachikwutela gị ugbu a, bịa ka anyị na gị lụso ndị Amọn agha. Ị ga-abụkwa onyeisi anyị niile bi na Gilead.”
9 依弗大對基肋阿得的長老說:「你們領我回去,同阿孟子民作戰,如果上主將他們交給我,那麼我就作你們的首領! 」
Jefta zara, “A sịkwarị na m esoro unu gaa lụso ndị Amọn agha, ọ bụrụ na Onyenwe anyị enyefee ha nʼaka m, m ga-abụ onyeisi unu nʼezie?”
10 基肋阿得的長老對依弗大說:「上主在我們中間作證:我們必照你的話實行。」
Ndị okenye Gilead zara, “Onyenwe anyị bụ onye akaebe, na anyị aghaghị ime dịka i kwuru.”
11 依弗大就與基肋阿得的長老一同回去,百姓立他做他們的首領和統帥;依弗大在米茲帕,在上主面前,又把他這一切話陳述了一遍。依弗大與阿孟交涉
Ya mere, Jefta sooro ndị okenye Gilead, ha mekwara ya onyeisi ha na ọchịagha ha. O kwughachikwara okwu ya niile nʼihu Onyenwe anyị nʼobodo Mizpa.
12 依弗大就派使者到阿孟子民王那裏說:「你與我何干﹖竟來我這裏攻打我的土地﹖」
Mgbe ahụ, Jefta zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn jụọ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ ihe i nwere megide anyị i ji ebuso ala anyị agha?”
13 阿孟子民的君王對依弗大的使者說:「因為以色列從埃及上來的時候,侵佔了我的領土,從阿爾農河到雅波克河,直到約但河;現在你應和平交還! 」
Eze ndị Amọn zaghachiri ndị ozi Jefta, “Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta, ha ji aka ike napụ anyị ala anyị, site nʼosimiri Anọn ruo na Jabọk, rukwaa nʼosimiri Jọdan. Ugbu a nyeghachinụ anyị ala ahụ niile nʼudo.”
14 依弗大再打發使者去見阿孟子民的君王,
Jefta zighachiri ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn,
15 對他說:「依弗大這樣說:以色列並沒有侵佔摩阿布的土地和阿孟子民的土地,
na-asị, “Ihe ndị a ka Jefta sịrị: Izrel esiteghị nʼaka ike napụ Moab maọbụ Amọn ala ha.
16 因為以色列從埃及上來的時候,是經過曠野,到了紅海,而來到卡德士。
Kama, mgbe ha si Ijipt rigopụta, Izrel sitere nʼọzara bịaruo Osimiri Uhie, sikwa nʼebe ahụ ruo Kadesh.
17 以色列曾派使者對厄東王說:請讓我們經過你的領土! 但是厄東王不肯答應;又打發使者到摩阿布王那裏,但是他也不肯;於是以色列便逗留在卡德士。
Mgbe ahụ, Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru eze Edọm sị ya, ‘Kwere ka anyị si nʼala gị gafere,’ ma eze Edọm jụrụ ajụ. Ha zipụkwara ozi nye eze Moab, ma o kwenyeghị. Nʼihi ya, Izrel nọgidere na Kadesh.
18 以後他們經過曠野,繞過厄東地和摩阿布地,從摩阿布東面而行,在摩阿農河那邊安營;他們並沒有進入摩阿布的境界,因為阿爾農是摩阿布的邊界。
“Ọzọ, ha sitere nʼọzara gaa gburugburu Edọm na Moab, site nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala Moab, maa ụlọ ikwu ha nʼofe Anọn. Ha abaghị nʼoke ala Moab, nʼihi na Anọn bụ oke ala ya.
19 以色列又派使者到阿摩黎王息紅,即赫市朋王那裏;以色列向他說:請讓我們經過你的領土,到我們的地方去。
“Mgbe ahụ, ụmụ Izrel zigara ndị ozi ka ha jekwuru Saịhọn eze ndị Amọrait, onye bi na Heshbọn, sị ya, ‘Biko, ka anyị site nʼala gị gafee ruo nʼala nke anyị.’
20 然而息紅不信任以色列,不准他們經過他的境界;並且息紅還召集他所有的人民,在雅哈茲安營,同以色列交戰。
Ma eze Saịhọn atụkwasịghị Izrel obi isite nʼoke ala ya gabiga. Nʼihi nke a, ọ chịkọtara usuu ndị agha ya, ma ụlọ ikwu na Jahaz, buso ụmụ Izrel agha.
21 但是上主以色列的天主將息紅及他全體百姓交於以色列手中,擊殺他們;於是以色列便取得住在那地的阿摩黎人所有的土地,
“Mgbe ahụ, Onyenwe anyị, Chineke Izrel nyere Saịhọn na ndị agha ya niile nʼaka Izrel. Ha merikwara ha. Izrel nwetara ala niile nke ndị Amọrait, bụ ndị bi nʼala ahụ.
22 取得阿摩黎人,從阿爾農河到雅波克河,從曠野到約但河所有的土地。
Ha nwetara ala niile ahụ, site nʼAnọn ruo Jabọk, sitekwa nʼọzara ruo Jọdan.
23 現今上主以色列的天主,由自己的百姓以色列面前驅逐了阿摩黎人,難道你還要佔據這地嗎﹖
“Ma ugbu a, Onyenwe anyị, Chineke Izrel achụpụla ndị Amọrait nʼihu ndị ya bụ Izrel. Olee ikike i nwere iwere ala ahụ?
24 你豈不是應佔據你的神革摩士賜你佔領的地,而我們應佔領我們的天主上主,由我們前所驅逐之人的地嗎﹖
Ọ bụghị ihe chi gị, Kemosh, nyere gị ka i ga-enweta? Otu aka ahụ kwa, ihe ọbụla Onyenwe anyị Chineke anyị nyere anyị ka anyị ga-enweta.
25 現在,難道你比摩阿士王漆頗爾的兒子巴拉克還強麼﹖他何曾與以色列爭鬥過,或者與他們交戰過﹖
Ị dị mma karịa Balak nwa Zipoa, eze Moab? O nwere mgbe ọ chọrọ Izrel okwu, maọbụ lụso ha agha?
26 以色列住在赫市朋及其附近村鎮,阿洛厄爾及其附近村鎮,阿爾農河沿岸各城鎮裏,已有三百年之久,為什麼在這期間,你們沒有收回呢﹖
Ọ bụ narị afọ atọ kemgbe ụmụ Izrel malitere ibi na Heshbọn na Aroea, na nʼime obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu ruo nʼiyi Anọn. Ọ bụkwa gịnị mere na ịnapụtaghị ala ndị a nʼoge ndị ahụ?
27 所以我並沒有得罪你,而你竟要加害我,與我交戰;願裁判者上主今天在以色列子民與阿孟子民中間判斷是非! 」
Emegideghị m gị, kama ọ bụ gị na-emejọ m, site nʼibuso m agha. Ka Onyenwe anyị, onye na-ekpe ikpe ziri ezi kpebie ikpe a taa nʼetiti ndị Izrel na ndị Amọn.”
28 但是阿孟子民的君王不肯聽從依弗大向他傳報的這些話。依弗大許願
Ma eze Amọn egeghị ntị nʼozi Jefta ziri ka e zie ya.
29 那時上主的神降於依弗大身上,他就走遍基肋阿得和默納協,來到基肋阿得的米茲帕,又從基肋阿得的米茲帕,到了阿孟子民那裏。
Nʼoge ahụ, mmụọ Onyenwe anyị dakwasịrị Jefta. Site nʼike mmụọ ahụ, o duuru ndị agha Izrel gafee obodo Gilead na Manase, gafeekwa Mizpa, nke dị nʼime Gilead, gaa lụso ndị Amọn agha.
30 依弗大向上主許願說:「若你把阿孟子民交於我手中,
Jefta kwere Onyenwe anyị nkwa sị ya, “Ọ bụrụ na ị ga-enyefe ndị Amọn nʼaka m,
31 當我由阿孟子民那裏平安回來時,不論誰由我家門內出來迎接我,誰就應歸上主,我要把他獻作全燔祭。」
ihe ọbụla sitere nʼọnụ ụzọ ụlọ m pụta izute m mgbe m lọghachiri nʼọnọdụ mmeri megide ndị Amọn, ga-abụ nke Onyenwe anyị. Aga m eji ya chụọ aja nsure ọkụ.”
32 於是依弗大到阿孟子民那裏與他們交戰,上主把他們交在他手中,
Jefta duuru ndị agha ya gaa ibuso Amọn agha. Onyenwe anyị nyekwara ya mmeri dị ukwuu.
33 於是他從阿洛厄爾擊殺他們直到米尼特,直到阿貝耳革辣明,共二十座城,實在是一場大追擊戰;於是阿孟子民在以色列子民前區服了。依弗大還願
O bibiri iri obodo abụọ site nʼAroea ruo nso nso Minit, ruokwa Ebel-Keramim. Otu a ka Izrel si merie ndị Amọn.
34 依弗大回到米茲帕自己家中時,看,他的女兒出來,擊鼓跳舞前來迎接他。她是依弗大的獨生女,除她以外,沒有別的子女。
Mgbe Jefta lọghachiri nʼụlọ ya na Mizpa, ma lee ada ya nwanyị onye ji iti egwu na ite egwu pụta izute ya. Ọ bụ naanị ya ka nna ya mụtara. Ewezuga ya, nna ya amụtaghị nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị ọzọ.
35 當依弗大一見了她,就撕破衣服說:「哎呀! 我的女兒,你真使我苦惱,太叫我作難了! 因為我對上主開過口不能收回。」
Mgbe Jefta hụrụ ya, ọ dọwara uwe ya, tie mkpu sị, “Ewoo, nwa m nwanyị! I wetarala obi m ihe mgbu, nʼihi na ekwela m Onyenwe anyị nkwa, nke m na-aghaghị imezu.”
36 她回來他說:「我的父親,你既然對上主開過口,就照你說出的對待我罷! 因為上主已對你的敵人阿孟子民,為你報了仇。」
Ọ zara, “Nna m, lee, ị ghaghị imezu ihe i kwere Onyenwe anyị na nkwa. Jiri m mee ihe i kwere Onyenwe anyị na nkwa, nʼihi na o nyela gị mmeri dị ukwuu nʼebe ndị Amọn, ndị iro gị nọ.
37 她又向父親說:「請你許我一件事:給我兩個月的期限,讓我與我的伴侶到山上去,哀哭我的童貞。」
Ma ọ dị otu ihe m chọrọ ịrịọ gị, biko kwere ka m soro ụmụ agbọghọ ibe m gaa wagharịa nʼugwu ndị a, ka mụ na ha kwaa akwa ọnwa abụọ, nʼihi na agaghị m alụ di.”
38 他答應說:「你去罷! 」就讓她離去兩個月的時間。她就去了,與她的伴侶在山上哀哭自己的童貞。
Nna ya zara sị ya, “E, nwa m, i nwere ike ịga.” Ọ pụrụ gaa, jegharịa, kwaakwa akwa, ya na ụmụ agbọghọ ndị enyi ya, ruo mgbe ọnwa abụọ ahụ zuru.
39 過了兩個月,她回到父親那裏,父親就在她身上還了所許的願;她還沒有認識男子。於是在以色列成為一種風俗:
Mgbe ọnwa abụọ gasịrị, ọ laghachikwutere nna ya, onye ji ya mezuo nkwa ahụ o kwere. Ọ bụ nwaagbọghọ na-amatabeghị nwoke. Malite nʼoge ahụ ka ọ ghọrọ omenaala ndị Izrel,
40 每年以色列少女要哀弔基肋阿得人依弗大的女兒,一年四天。
na ụmụ agbọghọ na-apụ kwa afọ, gaa, nọọ abalị anọ nʼihi icheta ada Jefta, onye Gilead.

< 士師記 11 >