< 約拿書 2 >

1 約納在魚腹裏,祈求上主,他的天主。
Mgbe ahụ, Jona sitere nʼafọ azụ ahụ kpeere Onyenwe anyị Chineke ekpere.
2 他說:「我在患難中,呼求上主,衪便應允了我,我從陰府的深處呼求,你便俯聽了我的呼聲。 (Sheol h7585)
Ọ sịrị, “Esitere m nʼahụhụ m kpọkuo Onyenwe anyị, ọ zakwara m. Nʼafọ ala mmụọ ka m si tikuo gị, ị nụkwara olu akwa m. (Sheol h7585)
3 你將我拋入海心深處,大水包圍了我;你的波濤和巨浪漫過了我。
Ị tụnyere m nʼime mmiri dị omimi, nʼetiti oke osimiri. Osimiri dịkwa m gburugburu, ebili mmiri gị na mmali mmiri gị gabigakwara m nʼisi.
4 我曾說:我雖從你面前被拋棄,但我仍要瞻仰你的聖殿。
Mgbe ahụ, asịrị m, ‘E sitela nʼihu gị chụpụ m; ma otu ọ dị, aga m elegidekwa anya m ọzọ nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị.’
5 大水圍困我,危及卜性命;深淵包圍我,海草纏住我的頭。
Mmiri gbara m gburugburu, ruo nʼolu m, ogbu mmiri na-erikpu m. Achara mmiri kekụkwara m nʼisi.
6 我下深直到礁底,大地的門閂永為我關閉。上主,卜天主! 你卻從坑裏救出了我的性命。
Arịdaruola m nʼala ugwu ugwu nke osimiri, ala ahụ ihe ntụchi ya niile kpachitara m ruo mgbe ebighị ebi. Ma i meela ka m si nʼolulu pụta na ndụ, Onyenwe anyị, bụ Chineke m.
7 當我奄奄一息時,我記起了上主;我的祈禱達於你前,達於你的聖殿中。
“Mgbe mmụọ m na-ada mba nʼike nʼike, e chetara m gị Onyenwe anyị, ma ekpere m bịakwutere gị, nʼime ụlọnsọ ukwu gị dị nsọ.
8 敬奉虛無偶像的人,實在是捨棄了慈愛的根源。
“Ndị na-arapara nʼarụsị dị iche iche na-enweghị uru ha bara, na-agbakụta ebere Chineke azụ.
9 至於我,我要在頌謝的歌聲中,向你獻祭,償還我許的誓願。救恩屬於上主! 」
Ma ọ bụ olu abụ ekele ka mụ onwe m ga-eji chụọrọ gị aja. Aga m akwụghachi nkwa niile m kwere. Nʼihi na ‘Nzọpụta bụ nke Onyenwe anyị.’”
10 當時,上主命令那魚,那魚便將約納吐在陸地上。
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere azụ ahụ iwu, nke mere ka ọ gbọpụta Jona nʼala akọrọ.

< 約拿書 2 >