< 約伯記 32 >

1 因為約伯自以為義,那三個友人就不再回答他。
Mgbe ahụ, ndị ikom atọ ndị a kwusịrị ịsa Job okwu ọbụla ọzọ nʼihi na ọ hụrụ onwe ya dịka onye ezi omume.
2 那時,有個布次蘭族的人,他是巴辣革耳的兒子厄里烏,為了約伯在天主前自以為義人,便大為憤怒;
Ma oke iwe were Elihu nwa Barakel onye obodo Buz, si nʼikwu Ram megide Job nʼihi na ọ gụrụ onwe ya dịka onye ezi omume karịa Chineke.
3 同時也對約伯的三個友人大為震怒,因為他們找不到適當的答覆,又以天主為不公。
Iwe wekwara ya nʼebe mmadụ atọ ndị enyi Job nọ, nʼihi na ọ dịghị ebe ha hụtara Job dịka onye ụzọ ya na-ezighị ezi, ma ha gara nʼihu ịma ya ikpe.
4 厄里烏先等他們同約伯講完話,因為他們都比他年老。
Ma ruo ugbu a, Elihu agwaghị Job okwu ọbụla nʼihi na ndị ọzọ bụ okenye nʼebe ọ nọ.
5 他一見他們三人無話可說:遂大為憤怒。
Ma mgbe ọ hụrụ na ndị ikom atọ ndị a enweghị okwu ọzọ ha ga-ekwu, nke a kpasuru ya iwe.
6 於是布次人巴辣革耳的兒子厄里烏發言說:我年齡小,你們年紀大,故此我退縮畏懼,不敢在你們前表示我的見解。
Ma Elihu nwa Barakel onye obodo Buz zara sị: “Abụ m nwantakịrị nʼọnụọgụgụ afọ m gbara, ma unu bụ ndị okenye; ọ bụ nke a mere m ji gbaa nkịtị nʼụjọ, hapụ ịgwa unu ihe m maara.
7 我心想:「老人應先發言,年高者應教人智慧。」
Echere m nʼobi m sị, ‘Ọnụọgụgụ afọ ga-ekwu okwu; ọtụtụ afọ ka ọ dịkwara ikuzi amamihe.’
8 但人本來都具有靈性,全能者的氣息賦與人聰明;
Ma ọ bụ mmụọ dị nʼime mmadụ, nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye nghọta.
9 並不是年高者就有智慧,老年人就通曉正義。
Ọ bụghị naanị ndị okenye bụ ndị mara ihe, ọ bụkwaghị naanị ndị gbara ọtụtụ afọ bụ ndị na-aghọta ihe ziri ezi.
10 故此我請你們且聽我說,我也要表示我的見解。
“Ya mere m na-asị, Geenụ m ntị; mụ onwe m ga-agwa unu ihe m ma.
11 直到如今,我等待你們講話,靜聽你們的理論,等待你們尋出適當的言詞;
Echeere m oge niile unu na-ekwu okwu, egere m ntị na ntụgharị uche unu, oge niile unu na-achọpụta okwu unu ga-ekwu.
12 但現今我已明白看出了,你們中沒一個能駁倒約伯,能回答他的話的。
Egere m nnọọ unu ntị, ma ọ dịghị onye nʼime unu nwerela ike gosi Job ụzọ o si jehie; ọ dịghị onye nʼime unu zaghachiri ịrụ ụka ya.
13 你們不要說:「我們尋到了智慧! 只有天主可說服他,人卻不能。」
Unu ekwula sị, ‘Anyị achọtala amamihe; ka Chineke na-abụghị mmadụ gosi ya mmehie ya.’
14 我決不那樣辯論,也決不以你們說的話答覆他。
Ma Job edozighị okwu ya nʼusoro megide m, ya mere agaghị m eji ịrụ ụka unu zaghachi ya.
15 他們已心亂,不能再回答,且已窮於辭令。
“Ha adaala mba na-enweghị ihe ọzọ ha ga-ekwu; ike okwu agwụla ha.
16 他們已不再講話了,他們已停止,不再答話了,我還等什麼﹖
M ga-echere, ugbu a ha deere duu, ugbu a ha guzo ebe ahụ na-enweghị ọsịsa?
17 現在我要開始講我的一段話,表示出我的見解。
Mụ onwe m ga-ekwu uche m; ihe m maara ka mụ onwe m ga-ekwu,
18 因為我覺著充滿了要說的話,內心催迫著我。
nʼihi na okwu juru m ọnụ, ọ bụkwa mmụọ dị nʼime m na-akwagide m.
19 看啊! 我內心像尋覓出口的新酒,要將新酒囊爆裂。
Nʼime m, adị m ka mmanya na-agbọ ụfụfụ a kwuchiri na karama, dịka karama akpụkpọ ọhụrụ dị njikere ịgbawa.
20 我一說出,必覺輕鬆,我定要開口發言。
Aga m ekwurịrị okwu ka m sị nʼụzọ dị otu a chọta izuike; aga m emeghe egbugbere ọnụ m ma zaghachi.
21 我決不顧情面,也決不奉承人。
Agaghị m ekpe mmadụ ọbụla ikpe mmegide maọbụ jaa mmadụ ọbụla mma nʼụzọ na-ezighị ezi.
22 因為我不會奉承,不然,造我者必立即將我消滅。
Nʼihi na ọ bụrụ na m bụ ọka nwere ire ụtọ nʼịja ihe na-ezighị ezi mma, Onye kere m ga-ewepụ m nʼoge na-adịghị anya.

< 約伯記 32 >