< 約伯記 17 >

1 我的氣息已斷,壽命已盡,而且墳墓已為我做好。
Mmụọ m tiwara etiwa, ụbọchị m niile dị mkpụmkpụ, ili na-echere ịnabata m.
2 我豈不是成了笑罵的對象﹖我的眼睛豈不是在酸苦中過夜﹖
Nʼezie ndị na-akwa emo gbara m gburugburu; anya m na-elekwasịkwa mkpasu iwe ha.
3 求你將我的抵押放在你那裏! 誰還敢與我擊掌作保﹖
“Debere m ihe ebe nʼebe gị Chineke nọ. Olee onye ọzọ pụrụ ịnara m nʼakaebe?
4 因為你蒙蔽了他們的心,不叫他們明白,他們纔不敢舉起手來。
I mechiela uche ha ka ha ghara inwe nghọta; ya mere, i gaghị ekwe ka ha nwee mmeri.
5 人請自己的朋友分享所有,但自己的子女卻餓的眼目昏花。
Ọ bụrụ na mmadụ ekwujọọ enyi ya ka o were nweta uru dị nʼime ya, anya ụmụ ya ga-ada mba.
6 我成了人民取笑的資料,人人在我臉上可吐唾沫。
“Chineke emeela ka m bụrụ okwu ilu nye onye ọbụla, meekwa ka m bụrụ onye ha na-agbụsa asọ mmiri nʼihu.
7 我的眼睛因愁悶而昏花,我的肢體消失有如蔭影。
Anya m na-ahụ inyogho inyogho nʼihi iru ụjụ; ahụ m aghọọla onyinyo nke ihe m bụ na mbụ.
8 正直人因此而驚異,無罪者憤起攻擊惡人。
Ndị na-eme ihe ziri ezi na-akụja mgbe ha hụrụ nke a; ndị aka ha dị ọcha na-enwe mkpali megide ndị ajọ omume.
9 義人堅持自己的道,手淨的人倍增勇氣。
Ma otu ọbụla ọ dị, ndị ezi omume ga-aga nʼihu nʼiso ụzọ ha, ndị aka ha dị ọcha ga-aga nʼihu nʼịdị ike.
10 你們眾人,請你們再回來,但在你們中我找不到一個智者。
“Ma bịanụ, unu niile, bidonụ okwu unu ọzọ! Agaghị m achọta onye maara ihe nʼetiti unu.
11 我的時日已過去,我志所謀,我心所愛,都已落空。
Ụbọchị m niile agafeela, atụmatụ m abụrụla ihe lara nʼiyi. Ma ọchịchọ nke obi m
12 他們將黑夜變為白天,使光明靠近黑暗;
na-edo abalị nʼọnọdụ ehihie; nʼihu ọchịchịrị ka ìhè dị nso.
13 若是我還有希望,即以陰府為我的家;在憂暗之處,舖設我的床榻。 (Sheol h7585)
Ọ bụrụ na ebe obibi m na-ele anya ya bụ ili, ọ bụrụ na m agbasaa ihe ndina m nʼelu ọchịchịrị, (Sheol h7585)
14 我對墓穴說:你作我父! 對蛆蟲說:你作我母,我妹!
a sikwa na m asị ire ure, ‘Nna m ka ị bụ,’ maọbụ sị ikpuru ‘Nne m’ maọbụ ‘Nwanne m nwanyị,’
15 我的希望究在何處﹖我的幸福,有誰注意﹖
ebeekwa ka olileanya m dị? Onye pụrụ ịhụ ma m nwere olileanya?
16 這一切只有和我一同降入陰府,一同安息在灰塵中。 (Sheol h7585)
Olileanya m ọ ga-arịda ruo nʼọnụ ụzọ ama nke ọnwụ? Anyị ga-esokọta rịdaruo nʼuzuzu?” (Sheol h7585)

< 約伯記 17 >