< 約伯記 15 >

1 特曼人厄里法次又發言說:
Mgbe ahụ, Elifaz onye Teman zara sị:
2 智者豈能以虛言作答﹖豈能以東風果腹﹖
“Onye maara ihe ọ ga-eji okwu na-abaghị uru zaghachi? Ọ ga-emeju afọ ya nʼifufe na-ekpo ọkụ nke si nʼọwụwa anyanwụ?
3 豈能以無益的廢話,無濟於事的言詞來辯護﹖
Ọ ga-eji okwu na-abaghị uru rụọ ụka, maọbụ kwuo okwu na-enweghị isi?
4 不但如此,而且你還廢除了敬畏天主之情,斷絕了在他面前的默禱。
Ma ị na-eleda ezi omume anya na-egbochikwa ịsọpụrụ Chineke.
5 其實,是你的罪惡教導你說話,叫你的口舌詭辯。
Mmehie gị na-eme ka ọnụ gị kwuo okwu ngwangwa; ọ bụkwa ire ndị aghụghọ ka i nwere.
6 定你罪的,是你的口而不是我,是你的口唇作證控告你。
Ọnụ gị na-ama gị ikpe, ọ bụghị mụ onwe m, egbugbere ọnụ gị na-ekwu okwu megide gị.
7 你豈是第一個出生的人﹖在山嶽未有之前,你豈已誕生﹖
“Ị bụ mmadụ mbụ a mụrụ? A mụọla gị tupu e kee ugwu niile?
8 難道你聽見了天主的秘旨,把持著智慧﹖
Ọ getụla ntị nʼizu nzuzo nke Chineke? Amamihe niile ọ bụ nʼime gị ka ha juru?
9 有什麼事,只有你知,而我們不知;只有你明瞭,而我們不明瞭﹖
Gịnị ka ị maara nke anyị na-amaghị? Ụdị nghọta dị aṅaa ka i nwere nke anyị na-enweghị?
10 我們之中也有白頭老人,年紀比你父親還大。
Ndịisi awọ na ndị kara nka nọ nʼetiti anyị, ndị ikom mere agadi karịa nna mụrụ gị.
11 天主的安慰,和向你說的溫和的話,你以為還太少嗎﹖
Ọ ga-abụ na nkasiobi Chineke bụrụ gị ihe nta, ka ọ bụ okwu dị nro nke ọ gwara gị?
12 你為何讓你的感情控制著你﹖你的眼為何冒火,
Gịnị mere obi gị ji duhie gị, gịnị mekwara anya gị abụọ ji chagharịa,
13 竟向天主發怒,開口說出這樣的話﹖
nke mere iwe gị jiri dị ọkụ megide Chineke, meekwa ka okwu ọjọọ ndị a niile si nʼọnụ gị pụta?
14 人算什麼而敢自稱潔淨,婦女所生的敢自稱正直﹖
“Gịnị ka mmadụ efu bụ, ọ ga-eji dị ọcha nʼobi, gịnị ka mmadụ nwanyị mụrụ bụ, na ha nwere ike ị bụ ndị ezi omume?
15 他連自己的聖者,還不信賴;在他眼中,連蒼天也不純潔,
Ọ bụrụ na Chineke atụkwasịghị ndị nsọ ya obi, ọ bụrụkwa na eluigwe adịghị ọcha nʼanya ya,
16 何況一個墮落可憎,飲惡如水的人。
ọ ga-esi aṅaa tụkwasị mmadụ efu onye rụrụ arụ obi, bụ onye na-aṅụ ajọ omume dịka mmiri.
17 我要告訴你,你且聽我說;我要說明我的經驗,
“Gee m ntị ka m kọwaara gị; kwerekwa ka m gwa gị ihe m hụrụ,
18 即賢哲所傳授,和祖先未曾隱瞞的事:──
bụ ihe ndị amamihe kwuru, ndị na-ezobeghị ihe ha natara nʼaka nna nna ha,
19 這地方原只賜給了他們,尚無一個外方人從他們中間經過。──
bụ ndị e nyefere ala ndị a nʼaka ha mgbe ọ dịghị onye ọbịa gabigara nʼetiti ha.
20 惡人一生飽受苦惱,壽數已給暴君限定;
Ụbọchị ndụ ya niile, onye ajọ omume na-ata ahụhụ mmekpa ahụ, bụ nke e debere ogologo afọ nye nwoke ahụ na-eme ihe ike.
21 恐怖之聲常在他耳中,平靜時匪徒也來侵擾。
Ụzụ na-eweta oke egwu na-eju ya ntị, mgbe ọ dị ka ihe niile na-aga nke ọma, ndị na-apụnara mmadụ ihe na-abịakwasị ya.
22 他不相信還能脫離黑暗,只等待遭受刀劍之害,
O nweghị olileanya ịgbanarị ọchịchịrị; mma agha nọ na-echere ya.
23 注定作為鷹鳥的食物,自知大難業已臨頭。
Ọ na-akpagharị na-achọ ebe nri dịka udele; ọ makwara na ụbọchị ọchịchịrị nọ nso.
24 黑暗的日子使他恐怖,困苦艱難跟隨著他,好像準備廝殺的君王。
Ahụhụ na mkpagbu na-eme ka ọ tụọ oke egwu, nsogbu na-abịakwasị ya dịka eze nke nọ na njikere ibuso ndị iro ya agha.
25 因為他曾伸手反抗過天主,向全能者傲慢逞強過;
Nʼihi na ọ na-atụ Chineke aka nʼihu, dokwaa onwe ya imegide Onye pụrụ ime ihe niile.
26 以伸直的頸項,以堅厚的盾背攻擊過天主。
O ji ikwesi olu ike, dịka ọta siri ike, na-emegide Chineke.
27 他的臉蓋滿了脂油,他的腰積滿了肥肉。
“Ọ bụ ezie na abụba kpuchiri ihu ya, abụba nke dị nʼukwu ya na-eme ka anụ ahụ nupụtakwa,
28 他住在荒涼的城內,住在無人居留,行將化為廢墟的屋中。
ọ ga-ebi nʼobodo e bibiri ebibi, nʼụlọ nke mmadụ na-ekwesighị ibi nʼime ha, ụlọ nke na-adakasị adakasị.
29 他不能富有,所有的財富也不能久存,也決不能向地下生根。
Ma ọ gaghị aga nʼihu ị bụ ọgaranya, akụ ya agaghị adịgidekwa. Ihe o nwere agakwaghị agbasapụ nʼala niile ahụ.
30 他脫離不了黑暗,火燄要灼乾他的嫩芽,暴風要吹去他的花朵。
Ọ gaghị agbanarị ọchịchịrị, ire ọkụ ga-eme ka ome ya kpọnwụọ, iku ume nke ọnụ Chineke ga-ebufu ya.
31 別依恃枝椏已長大,應知這都是空虛;
Ka onye dị otu a hapụ ịghọgbu onwe ya site nʼịtụkwasị uche nʼihe efu, nʼihi na ọ dịghị ụgwọ ọrụ ọbụla ọ ga-enweta.
32 未到時日,已經凋謝,枝葉再不發綠。
Tụpụ oge ya eruo, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya nʼuju, ọzọ, alaka ya ga-akpọnwụ
33 有如葡萄未熟即被打下,橄欖開花即被搖落,
Ọ ga-adị ka osisi vaịnị nke mkpụrụ ya dapụsịrị na-achaghị acha, dịka osisi oliv nke akwụkwọ ya kpọnwụrụ akpọnwụ.
34 因為惡人的家室必要絕嗣,火要燒盡受賄者的帳幕。
Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke ga-adị ka nwanyị aga, ọkụ ga-erepịa ụlọ ikwu niile nke ndị hụrụ iri ngarị nʼanya.
35 他們所懷的是邪惡,所生的是罪孽;心胸懷念的,無非是欺詐。
Ha na-atụrụ ihe ọjọọ dịka ime, ma mụọkwa ajọọ omume; naanị aghụghọ ka akpanwa ha na-arụpụta.”

< 約伯記 15 >