< 耶利米書 6 >

1 本雅明子民,請你們逃出耶路撒冷,在特科亞吹號,在貝特革楞豎立旗幟! 因為有一個災禍,即一個巨大的毀滅,已由北方隱約出現。
“Gbalaganụ unu ụmụ Benjamin! Sitenụ na Jerusalem gbapụ! Gbuonụ opi ike na Tekoa! Bulienụ ihe ngosi elu na Bet-Hakerem! Nʼihi na lee, ihe ọjọọ si nʼakụkụ ugwu na-abịa, e, mbibi dị ukwuu na-abịa.
2 熙雍女郎仿佛美麗的草場,
Aga m ebibi ada Zayọn, onye mara ezi mma, na onye dịkwa pekepeke.
3 牧童領著自己的羊群坰她進發,在她四週張設帳幕,各據一方牧放。
Ndị na-azụ atụrụ ga-eduru igwe atụrụ bịa megide ya. Ha ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ya. Onye ọbụla nʼime ha ga-elekọtazi akụkụ ala nke o ketara anya nke ọma.
4 「請你們備戰,向她進攻;來,讓我們在正午就上前進攻! 我們真不幸! 因為日已偏西,暮影已長!
“Jikerenụ ibu agha megide ya! Bilienụ, ka anyị buso ha agha nʼehihie. Ma lee, anyanwụ ebidola ịda, onyinyo anyasị na-esetipụkwa onwe ya.
5 不妨! 就趁夜上去,破壞她的閭闕。」
Ya mere, bilienụ ka anyị buso ha agha, ọ bụladị nʼabalị! Ka anyị bibie ebe ha niile e wusiri ike!”
6 因為萬軍的上主這樣說:6.「他們該砍伐她的樹木,雀起壁壘,圍攻耶路撒冷,這該受罰的城市,因為在那裏充滿了壓榨。
Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru, “Gbutusienụ osisi niile, wuonụ nkwasa ọgụ gburugburu Jerusalem. A ghaghị ịta obodo a ahụhụ, nʼihi na mmegbu jupụtara nʼime ya.
7 泉源怎樣湧出泉水,她就怎樣湧出邪惡;從那裏只可聽到強暴和迫害,我金看見疾病和瘡痍。
Dịka mmiri si esite nʼolulu mmiri na-asọpụta otu a ka ajọ omume na-esite nʼime ya na-asọpụta. Ihe ike na mbibi ka a na-anụ nʼime ya; ọrịa ya niile na ọnya ya niile ka a na-eche nʼihu m oge niile.
8 耶路撒冷! 你應接受訓戒,免得我的心疏遠你,使你荒涼,成為沒有人居住的地方。」
Nabata ịdọ aka na ntị m, gị Jerusalem, ka m ghara ịgbakụta gị azụ, mee ka ala gị tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla hapụkwa inwe ike ibi nʼime ya.”
9 萬軍的上主這樣說:「你應像收拾葡萄,把以色列的遺民收拾淨盡;又如收割的人 向枝條再伸出你的手來。」
Nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Ka ha tụtụkọtasịa ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel nke ọma, dịka e si atụtụkọta mkpụrụ niile dị nʼosisi vaịnị; werenụ aka chọgharịa nʼalaka niile, dịka onye ọghọ mkpụrụ vaịnị si eme.”
10 我應對誰說,應警告誰,使他們聽信我呢﹖看,他們的耳朵遲鈍不靈,不能留心細聽;看,上主的話對他們已成了笑柄,一點也不感興趣
Ma onye kwanụ ka m nwere ike ịgwa okwu ma dọọ aka na ntị? Onye ga-ege ntị ịnụrụ ihe m na-ekwu? Ntị ha emechiela ruo na ha enweghị ike ịnụ ihe ọbụla. Okwu Onyenwe anyị aghọọla ihe ha na-achọghị ịnụ ọzọ; nke na-adịghị ewetara ha obi ụtọ.
11 為此,我滿懷上主火憤怒,我已無法再控制:「只得將憤怒發洩在街上的孩童和青年的隊伍身上,因為男人和女人,年長和年老的人,都要被擄去;
Ma ọnụma Onyenwe anyị juru m obi, apụghị m ịnagide ya nʼime m. “Wụkwasị ya nʼahụ ụmụntakịrị ndị nọ nʼokporoụzọ; wụkwasịkwa ya ụmụ okorobịa ebe ha zukọrọ. Ọ bụladị di na nwunye ga-anụrụ ụfụ ọnụma ahụ, ndị agadi na ndị ahụ merela nnọọ ezigbo agadi.
12 他們的住它、莊田和妻室,都要歸他人,因為我要向本地的居民伸出我的手──上主的斷語。」
A ga-ewere ụlọ ha nyefee nʼaka ndị ọzọ. A ga-ewerekwa ala ubi ha na ndị nwunye ha nye ndị ọzọ, mgbe m setịpụrụ aka m megide ndị ahụ bi nʼala ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
13 實在,從最小的到最的,都貪財圖利;從先知到司祭,都欺詐行事,
“Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta, ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha. Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụaja na-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ.
14 草率治療我人民的瘡痍說:「好了,好了! 」其實卻沒有好。
Ha na-ekechi ọnya ndị m, dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ. Ha na-asị, ‘Udo dị, udo dị,’ mgbe udo na-adịghị.
15 他們既彿事可憎,就應當知恥;可是,他們不但毫不知恥,反而連羞愧也不知道是什麼;為此,他們要與倒斃者一同倒斃,在我降罰他們時,都要一厥不振──上主說。
O nwere ụzọ omume ha ndị a rụrụ arụ si eme ha ihere? Mba! Ihere adịghị eme ha ma ọlị. Nʼezie, ha amakwaghị ihe a na-akpọ inwe ihere! Nʼihi ya, ha ga-ada nʼetiti ndị dara ada. Ha ga-asọ ngọngọ mgbe m tara ha ahụhụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
16 上主這樣說:「你們應站在交叉路口,觀察探問舊路;那一條是好路,就在那路上走,你們的的心靈必獲安寧。」他們卻答說:「我們偏不走。」
Ihe ndị a kwa bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “Guzonụ nʼebe niile ụzọ gbara abụọ. Lee anya. Jụọnụ ajụjụ banyere okporoụzọ ochie ahụ. Jụpụtanụ ebe ụzọ ọma ahụ dị, jeenụ ije nʼime ya. Unu gbaso ya, unu ga-achọtara mkpụrụobi unu ebe izuike. Ma gịnị ka unu kwuru? Unu sịrị. ‘Anyị agaghị agbaso ụzọ ọma ahụ.’
17 我給你們派駐哨兵,你們連注意號聲! 」他們卻答說:「我們偏不注意。
Ahọpụtara m ndị nche doo ha ichebe unu. Agwakwara m unu okwu sị, ‘Ṅaanụ ntị nʼụda opi ike ha.’ Ma unu kwuru sị, ‘Anyị agaghị ege ntị!’
18 為此,萬民! 你們必需細聽;群眾! 你們應知道他們的遭遇。
Ya mere, nụrụnụ, unu mba niile; lezienụ anya, unu ndị akaebe niile, ka unu hụrụ ihe na-aga ịbịakwasị ha.
19 大地注意:看,我必給這百姓帶來災禍,作他們失節的的苦果,因為他們沒有聽從我的言辭,拋棄了卜法律。
Nụrụ, gị ụwa, lee, ana m aga iwetara ndị a ịla nʼiyi, nke bụ mkpụrụ atụmatụ ọjọọ ha niile, nʼihi na ha jụrụ ige ntị nʼokwu m. Ha jụkwara ịnabatara onwe ha iwu m.
20 那些來自舍巴的乳香,出自遠方的香蒲,於我有何用﹖你們的全燔祭不受悅納,你的犧牲不樂我意。
Gịnị ka m ji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke unu si nʼobodo Sheba bubata, eme? Gịnị ka m ji ụda kalamus ọma unu si mba dị anya bubata eme? Ajụla m ịnabata aja nsure ọkụ unu niile. Aja niile unu na-achụ adịghị atọ m ụtọ.”
21 為此,上主這樣說:「看,我將這人民設下絆腳石,使父子一起絆倒,使鄰居和朋友同趨滅亡。」
Ya mere, ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “Aga m etinye ihe ịsọ ngọngọ nʼụzọ ndị a si agafe. Nna na nwa ya ga-asọ ngọngọ nʼelu ya; otu a kwa, ndị agbataobi na enyi ha ga-ala nʼiyi.”
22 上主這樣說:「看,有一個民族從北方前來,有一個強大的異邦從地極興起,
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, ndị agha si nʼala dị nʼebe ugwu na-abịa; mba dị ukwuu ka a na-akpọlitekwa site na nsọtụ niile nke ụwa.
23 緊握弓戈,殘忍無情,像海嘯一般喧嚷,騎著戰馬,萬眾一心,嚴陣準備向你進攻,熙雍女郎! 」
Ha ji ụta na ùbe, ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-adịghị eme obi ebere. Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri, dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha. Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha, ibuso gị agha, Ada Zayọn.”
24 我們聽到了這消息,束手無策,不勝憂慮,痛苦得有如臨產的婦女。
Anyị anụla akụkọ banyere ude ha, ike agwụla aka anyị abụọ kpamkpam. Oke ihe mgbu na-ejide anyị dị ka nke nwanyị ime na-eme.
25 你們不要到田間去,不要在路上徘徊,因為敵人正在撕殺,四處令人恐怖。
Ka onye ọbụla gharakwa ịga nʼubi, maọbụ ijegharị nʼokporoụzọ, nʼihi na ndị iro ji mma agha na-agagharị, egwu dịkwa nʼebe niile.
26 我的女兒──人民──你該穿上麻衣,輾轉於灰塵,悲哀傷心痛哭,如喪獨子,因為劫奪者要突然來襲擊我們!
Unu ndị m, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe. Tụrụọnụ onwe unu na ntụ, ruonụ uju, ma kwaanụ akwa, dịka nwanyị na-eru ụjụ nʼihi ọnwụ otu nwa nwoke ọ mụtara. Nʼihi na onye mbibi ahụ ga-abịakwasị anyị na mberede.
27 我立了你作我人民的查察員,原是為叫你認識並考察他們的行徑。
“Emeela m gị ka ị bụrụ onye na-anwapụta ọla, ma ọla ahụ bụkwa ndị m. Achọrọ m ka i nyochaa ma nwapụtakwa ụzọ ha niile.
28 他們盡是極頑固的叛徒,往來散播流言,確是壞透了的破銅爛鐵。
Ha bụ ndị nnupu isi, ndị nwere obi nʼazụ, ndị na-ejegharị na-ekwutọ ibe ha. Ha bụ bronz na igwe; ọ bụkwa ndụ rụrụ arụ ka ha na-ebi.
29 風箱猛吹,雖有烈火,但鉛仍不溶化;煉工徒然鍛煉,渣滓總煉不掉。
Ngwa ọrụ ọkpụ uzu na-afụnwu ọkụ ike ike, ime ka ọkụ rechapụ akụkụ igwe ahụ na-enweghị isi, ma nnụcha ahụ na-aga nʼihu abaghị uru, nʼihi na anụchapụghị ndị ajọ omume.
30 人都稱他們為「拋棄的銀渣,」因為上主已將他們拋棄。
Ọlaọcha a jụrụ ajụ ka akpọrọ ha, nʼihi na Onyenwe anyị ajụla ha.”

< 耶利米書 6 >