< 耶利米書 50 >

1 關於巴比倫和加色丁地上主藉耶肋米亞先知所說的話:
Okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere Babilọn na banyere ala ndị Babilọn.
2 你們該在民族間宣布傳揚,該樹起旗幟傳揚,不該隱瞞,說:「巴比倫已陷落了,貝耳遭受了羞辱,默洛達客傾倒了;她的偶像遭受了恥辱,她的神祇傾倒了。」
“Kwusaa ya na mba niile, mee ka a nụrụ ya; bulie ọkọlọtọ mgbe a na-ekwusa ya. Kwupụta ihe niile, ezokwala ihe ọbụla, kama kwusaa ya sị, ‘A ga-adọta Babilọn nʼagha. Ihere ga-emesịa mee Bel; otu a kwa, egwu ga-ejupụta Maduk obi. A ga-eme ka ihere mee oyiyi ya niile a kpụrụ akpụ; oke egwu ga-ejidekwa arụsị ya niile.’
3 因為有一民族從北方上來,向她進攻,使她的國土化為無人居住,人獸絕跡的荒野。
Otu mba, nke si nʼakụkụ ugwu, ga-ebuso ya agha, mee ala ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ya, nʼihi na mmadụ na anụmanụ ga-esi nʼime ya gbalaga.
4 在那些日子裡和在那時期中──上主的斷語──以色列子民要與猶大子民一同歸來,且走且哭,尋覓上主他們的天主,
“Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ndị Izrel na ndị Juda ga-ejikọta onwe ha nʼotu. Ha niile ga-eji anya mmiri pụọ ịchọ Onyenwe anyị Chineke ha.
5 他們必詢問熙雍的所在,面朝往那裏的道路說:來,讓我們以永久不可忘的盟約依附上主! 」
Ha ga-ajụ ajụjụ, banyere ụzọ e si eje Zayọn. Mgbe ahụ, ha ga-eche ihu ha ijeru nʼebe ahụ. Ha niile ga-abịakwa were onwe ha nyefee nʼaka Onyenwe anyị, nʼime ọgbụgba ndụ ebighị ebi, nke a na-agaghị echefu echefu.
6 我的人民是一群迷途的羊群,他們的牧人使他們流浪,在群山間徘徊,翻山越嶺地漫遊,忘掉了自己的羊棧。
“Ndị m akpafuola dịka atụrụ furu efu. Ndị ọzụzụ atụrụ ha eduhiela ha, mee ka ha na-awagharị nʼugwu ukwu niile. Ha na-akpagharị nʼelu ugwu ukwu, ma nʼelu ugwu nta. Ha echefuokwala ebe izuike nke ha.
7 凡遇見他們的,將他們吞噬;他們的仇敵反而說:「我們並沒有過錯,因為是他們得罪了上主,正義的淵源和他們祖先的希望。」
Nʼihi ya, ndị niile chọtara ha na-eripịa ha. Ndị iro ha na-ekwukwa sị, ‘Ikpe amaghị anyị nʼihi na ha emehiela megide Onyenwe anyị, onye bụ ezi ebe ịta nri ha, na onye bụkwa olileanya nke nna nna ha.’
8 你們該逃離巴比倫,走出加色丁地,如同羊群前領頭的公山羊。
“Sinụ na Babilọn gbalaga; sitekwanụ nʼala Babilọn pụọ, dịrịnụ ka mkpi na-edu igwe ewu na atụrụ.
9 因為,看,我必從北方,發動一群強盛的民族前來進攻巴比倫,列陣向她進攻,就地將她攻陷;他們的箭像是善戰的勇士,從不空手而歸。
Nʼihi na aga m akpali ọtụtụ mba dị ike site nʼala dị nʼugwu, ndị ga-ejikọta onwe ha ibuso Babilọn agha. Ha ga-edo onwe ha nʼusoro imegide ya; ọ bụkwa nʼakụkụ ugwu ka ha ga-esi dọta ya nʼagha. Àkụ ha ga-agba ga-adị ka àkụ nke onye bụ dike nʼagha na onye ọka ịgba ụta na-agba. Ha agaghị agba aka lọta.
10 加色丁必遭劫掠,凡劫掠她的,必心滿意足──上主的斷語。
Nʼihi nke a, Babilọn ga-aghọ ihe nkwata nʼagha. Afọ ga-ejukwa ndị niile bụ ndị ga-akwata ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
11 你們搶奪我產業的人,你們儘管喜樂,儘管歡欣:跳躍,好像踏青的小公牛;嘶鳴,有如獲偶的牡馬!
“Nʼihi na ị ṅụrịrị ọṅụ nwee obi ụtọ, gị onye bibiri ihe nketa m, ị wugharịrị dịka nwa ehi nke na-azọcha ọka, bee akwa dịka oke ịnyịnya.
12 你們的母親已遭受極大的恥辱,生養你的,已滿面羞慚。看,她已成為民族中最卑下的,成了曠野、旱地和荒原;
Ihere ga-eme nne unu, e, a ga-eme ka oke ihere mee nne mụrụ unu. Ọ ga-abụkwa mba dịkarịsịrị ala nʼetiti mba niile, bụrụkwa ọzara, ala kpọrọ nkụ na ala uzuzu.
13 在上主的盛怒下,她已無人居住,滿目淒涼:凡經過巴比倫的人,看見的種種慘狀,莫不驚異嗟嘆。
Nʼihi iwe dị ukwuu nke Onyenwe anyị, ọ dịghị onye ga-ebikwa nʼala Babilọn ọzọ, nʼihi na a ga-ebibi ya kpamkpam. Ndị niile si nʼakụkụ ya na-agafe ka ọ ga-eju anya. Ha ga-akparị ya nʼihi ọnya niile dị ya nʼahụ.
14 一切開張弓弩的射手! 你們應列陣圍攻巴比倫,向她射擊,不要吝惜箭羽,因為她得罪了上主。
“Doonụ onwe unu nʼusoro gburugburu obodo Babilọn, unu ndị niile na-agba ụta. Gbaanụ ya ụta. Unu echela banyere àkụ ole unu ga-agbapụ nʼihi na o mehiela megide Onyenwe anyị.
15 你們四周圍繞,向她吶喊! 她必伸手請降,她的城樓必將陷落,她的城牆必要被攻陷,因為這是上主的報復。你們報復她,照她作的還報!
Kpọọnụ mkpu agha megide ya, site nʼakụkụ niile! Ọ chiliela aka ya elu. Lee, ụlọ elu ya e wusiri ike adaala, a kwatuokwala mgbidi ya niile. Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị na-abọrọ onwe ya ọbọ nʼahụ Babilọn, bọọnụ ya ọbọ. Meenụ ya dịka o si mee ndị ọzọ.
16 你們要殲滅巴比倫播種和手持鐮刀收割的人! 面臨無情的刀劍,各人回歸自己的民族,各自逃往自己的故鄉。
Site na Babilọn wezuga onye na-agha mkpụrụ na onye ji mma owuwe ihe ubi na-ewe ihe ubi. Ka onye ọbụla laghachikwuru ndị nke ya, ka onye ọbụla gbalaakwa nʼala nke aka ya, nʼihi mma agha nke onye na-emegbu emegbu.
17 以色列是獅子追捕的亡羊,首先吞噬她的,是亞述君王;最後咬碎她骨骸的,是拿步高巴比倫王。
“Izrel dị ka ewu na atụrụ a chụsasịrị achụsasị, nke ọdụm chụsasịrị. Onye bu ụzọ ripịa ya bụ eze Asịrịa. Onye ikpeazụ gwepịara ọkpụkpụ ya bụ Nebukadneza, eze Babilọn.”
18 為此,萬軍的上主,以色列的天主這樣說:「看,我要懲罰巴比倫王和他的國土,就如我懲罰了亞述君王一樣。
Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Aga m ata eze Babilọn, na ndị ala ya ahụhụ, dịka m si taa eze Asịrịa ahụhụ.
19 我要領以色列回歸自己的牧場,在加爾默耳和巴商牧放,使他們的心靈在厄弗辣因與基肋阿得山上,獲得滿足。
Ma aga m akpọghachitekwa Izrel nʼebe ịta nri nke ha. Ha ga-atakwa nri na Kamel na Bashan. Ọ bụkwa nʼugwu Ifrem na Gilead ka afọ ga-ejukwa ha.
20 那些日子裏和在那時期中──上主的斷語──要想尋求以色列的不義,卻一無所有;要想尋猶大的罪惡,卻一無所見;因為我必寬恕我留下的遺民。
Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “a ga-achọ ajọọ omume nke Izrel, ma ọ dịghị nke a ga-achọta. A ga-achọkwa mmehie niile nke Juda, ma o nweghị nke a ga-achọta, nʼihi na aga m agbaghara ndị ahụ m mere ka ha fọdụ mmehie ha.
21 你們該向默辣塔因地推進,進攻培科得的居民,屠殺,徹底將他們消滅──上主的斷語──全照我吩咐的進行。
“Busonụ ala Merataim agha, busokwanụ ndị bi na Pekod agha. Chụọ ha ọsọ, gbuchapụ ma bibiekwa ha niile kpamkpam.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Mezuonụ ihe niile m nyere unu nʼiwu.
22 地上發生了交戰的吶喊,巨大的毀滅。
A na-anụ ụzụ agha nʼala ahụ, a na-anụ ụzụ oke mbibi.
23 怎麼,威震全地的鎚子也被破碎毀壞了﹖怎麼,巴比倫在萬民中也變得如此悽涼﹖
Lee ka e si gbajie, ma tipịa mkpirisi igwe ahụ na-esupịa ụwa niile. Lee ka Babilọn si tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mba niile nke ụwa.
24 我給你佈下羅網,你竟被捉住;而你,巴比倫,尚不自覺;你被尋獲,且被捉住,因為你竟敢違抗上主! 」
Esiiri m gị ọnya, gị Babilọn; ị makwara nʼọnya ahụ tupu ị mata na ọnya ahụ dị. A chọtala gị, jidekwa gị, nʼihi na i doola onwe gị ibuso Onyenwe anyị agha.
25 上主開了自已的武庫,搬出了自己洩怒的武器,因為吾主萬軍的上主,在加色丁地有事要完成。
Onyenwe anyị emegheela ụlọakụ ngwa agha ya, site nʼime ya wepụta ngwa agha nke ọnụma ya. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nwere ọrụ ọ ga-arụ nʼala Babilọn.
26 你們從四面八方向她湧來,打開她的倉庫,堆積成堆,徹底消滅,不給她留下殘餘;
Sitenụ nʼebe dị anya bịa buso ya agha. Kụkapunụ ọba ya niile, tụkọtanụ ha ọnụ dịka akpa ọka dị ukwuu, nke atụkọtara nʼelu ibe ha. Bibienụ ya kpamkpam, ka ihe ọbụla ghakwara ịfọdụrụ ya.
27 屠殺她的一切公牛,叫他們下入屠場! 卜們的災難臨頭,因為他們的日子到了,到了懲罰他們的時候。
Gbuonụ ụmụ oke ehi ya niile, ka ha niile gaa nʼebe ụlọ igbu anụ Ahụhụ na-adịrị ha, nʼihi na ụbọchị ahụ a kara aka banyere ha abịala, bụ oge a ga-eji taa ha ahụhụ.
28 聽從巴比倫地逃命出走的人,在熙雍報告說:「上主我們的天主在復仇,為自己的殿宇雪恥。
Geenụ ntị nʼihe ndị na-agbalaga na-ekwu, bụ ndị si na Babilọn na-agbapụ ọsọ. Ha na-ekwusa na Zayọn otu Onyenwe anyị Chineke anyị si bọọ ọbọ, otu o si abọ ọbọ nʼihi ụlọnsọ ukwu ya.
29 你們召集弓手,一切挽弓的人,來向巴比倫進攻,在她周圍紮營,不要讓她有人逃脫,該按照她的作為而報復她,照她所作的對待她,因為她傲慢反對上主,反對以色列的聖者。
“Kpọkọtanụ ndị na-agba ụta maka imegide Babilọn, bụ ndị niile na-agba ụta. Maanụ ụlọ ikwu, gbaa ya gburugburu; unu ekwela ka onye ọbụla si nʼime ya gbapụ. Kwụghachi ya ụgwọ dịka ọrụ ya si dị, dịka ihe niile ahụ o mere si dị meenụ ya otu ahụ. Nʼihi na o buliela onwe ya elu megide Onyenwe anyị, bụ Onye nsọ nke Izrel.
30 為此,她的青年人要倒斃在她的廣場,她所有的戰士都要在那一天內滅亡──上主的斷語──
Nʼihi ya, ụmụ okorobịa ya ga-ada nʼokporoụzọ ama niile. A ga-emekwa ka ndị agha ya niile dere duu nʼụbọchị ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
31 你這驕橫的人! 看,我來對付你──我主萬軍上主的斷語──因為你的日子到了,到了懲罰你的時候。
“Lee, edoola m onwe m imegide gị, gị onye nganga.” Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya. “Nʼihi na ụbọchị gị abịala, bụ oge ahụ a ga-ata gị ahụhụ.
32 驕橫的必要傾覆顛仆,再沒有人來使她復興;我必放火燒毀她的城市,火要吞滅她四周的一切。」
Onye nganga ahụ ga-asọ ngọngọ daa, ma o nweghị onye ga-enyere ya aka ka o bilitekwa. Aga m esunye obodo ya niile ọkụ, nke ga-erechapụ ndị niile gbara ya gburugburu.”
33 萬軍的上主這樣說:「以色列子民與猶大子民一同遭受了壓迫;凡俘擄他們的,都扣留他們,不肯釋放。」
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: “A na-emegbu nnọọ ndị Izrel, nʼotu aka ahụkwa, ndị Juda. Ndị dọtara ha nʼagha jidesiri ha aka ike. Ha adịghị ahapụ ha ka ha laa.
34 但是他們的救贖者,名叫萬軍的上主,剛強有力,必要辯護他們的案件,使大地安寧,使巴比倫的居民惶亂。
Ma Onye mgbapụta ha dị ike. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụkwa aha ya. Ọ ga-eji ike ya niile kpepụta ọnụ ha, ime ka ala ha nweekwa izuike, ma meekwa ka ndị bi na Babilọn ghara inwe izuike.
35 刀劍加於加色丁人──上主的斷語──加於巴比倫的居民,她的公卿和她的謀臣;
“Mma agha ga-ebili megide ndị Babilọn niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “na ndị ahụ niile bi na Babilọn ma megidekwa ndịisi ọchịchị niile na ndị ahụ niile maara ihe.
36 刀劍加於她的巫士,使他們瘋狂;刀劍加於她的勇士,叫他們驚慌;
Mma agha ga-ebili megide ndị amụma ụgha ha niile. Ha ga-aghọ ndị nzuzu. Mma agha ga-ebili megide ndị bụ dike nʼagha. Obi ha ga-ejupụtakwa nʼoke egwu.
37 刀劍加於她的戰馬戰車,加於她境內所有的雜族,使他們柔弱如婦女;刀劍加於她的府庫,使人任意搶奪;
Mma agha ga-ebili megide ịnyịnya ha, na ụgbọ agha ha, na ndị mba ọzọ niile nọ nʼetiti ha. Ha ga-aghọkwa ndị inyom. Mma agha ga-ebilikwa megide akụ ha niile. A ga-alụta ha niile nʼagha.
38 刀劍加於她的水源,叫水源涸竭,因為她偶像遍地,人們癡戀這些怪物;
Okpomọkụ ga-abịakwasị mmiri ha niile mee ka ha taa. Nʼihi na ala ha bụ ala arụsị: arụsị ha niile ga-ayịkwa ara nʼihi oke egwu nke ga-abịakwasị ha.
39 為此,她必成為野貓和野狗的巢穴,駝鳥的棲身地,永遠不會有人居住,世世代代不會有居民;
“Nʼihi ya, ọ bụ ụmụ anụmanụ nke ọzara, na nkịta ọhịa ga-ebi nʼebe ahụ. Ikwighịkwighị ga-ebikwa nʼebe ahụ. Mmadụ ọbụla agaghị ebikwa nʼime ya ọzọ. O nweghị onye ga-ebikwa nʼime ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
40 恰如天主滅亡了的索多瑪、哈摩辣及附近的城市一樣──上主的斷語──再沒有人居住,再沒有人留宿。
Dịka m si kwatuo Sọdọm na Gọmọra, ya na obodo niile gbara ya gburugburu,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ; nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.”
41 看,有一個民族,從北方來,有一個強盛的異邦和許多君王從地極興起,
“Lee, ndị agha si nʼala dị nʼebe ugwu na-abịa; mba dị ukwuu na ọtụtụ ndị eze ka a na-akpọlitekwa site na nsọtụ niile nke ụwa.
42 緊握弓矛,殘忍無情,像海嘯般喧嚷,騎著戰馬,萬眾一心,嚴陣準備向你進攻,巴比倫女郎!
Ha ji ọtụtụ ụta na ùbe; ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-enweghị obi ebere. Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri, dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha. Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha, ibuso gị agha, Ada Babilọn.
43 巴比倫王聽到了他們前來的消息,束手無策,不勝憂慮,痛苦得有如臨盆的產婦。
Eze Babilọn nụrụ akụkọ banyere ude ha, akụkọ mere ka ike gwụrụ aka ya abụọ kpamkpam. Oke ihe mgbu ejidela ya, ihe mgbu dịka nke nwanyị ime na-eme.
44 看哪,好像一隻雄獅,從約但的叢林上來,走向常綠的牧場;同樣,我也要轉瞬間將他們趕走,派我選定的人來統治。誠然,誰是我的對手﹖誰敢向我提出質問﹖誰能對抗我的牧人﹖
Lee, dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ, nʼotu ntabi anya ka m ga-esi nʼala ya chụpụ Babilọn. Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka? Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu? Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?”
45 為此,請你們聽上主對巴比倫設下的計謀,對加色丁地策劃的策略:連最弱小的羊也一定要被人牽去,他們的牧場也必對他們戰慄。
Nʼihi ya, nụrụ ihe Onyenwe anyị kwadobere megide Babilọn, nụrụkwa ihe o zubere megide ala ndị Babilọn. A ga-adọkpụrụ ndị dị nta nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ. Ebe ịta nri ha ga-anọ nʼọnọdụ mgbagwoju anya nʼihi nke a.
46 巴比倫轟然陷落,大地為之震動;哀號之聲,直達萬邦。
Ụwa ga-ama jijiji mgbe ha nụrụ mkpọtụ ọdịda Babilọn, iti mkpu akwa ya ga-adakwa ụda nʼetiti mba niile dị iche iche.

< 耶利米書 50 >