< 耶利米書 37 >

1 雅的兒子漆德克雅繼約雅金的兒子耶苛尼雅為王,巴比倫王拿步高立他為王統治猶大地。
Emesịa, Nebukadneza eze Babilọn mere Zedekaya nwa Josaya eze Juda, nʼọnọdụ Konaya nwa Jehoiakim.
2 他和他的臣僕及本地人民,都沒有聽從上主藉耶肋米亞先知所說的話。
Ma Zedekaya na ndị ozi ya, na ndị Juda niile egeghị ntị nʼokwu Onyenwe anyị nke o si nʼọnụ Jeremaya onye amụma gwa ha.
3 漆德克雅王派舍肋米亞的兒子猶加耳,和司祭瑪阿雅的兒子責法尼雅到耶肋米亞先知那裏說:「請你為我們轉求上主,我們的天主! 」
Zedekaya bụ eze, ziri Jehukal nwa Shelemaya, na Zefanaya onye nchụaja, bụ nwa Maaseia ozi sị ha, jekwuru Jeremaya onye amụma gwa ya okwu sị, “Biko, kpeere anyị ekpere, rịọrọ anyị Onyenwe anyị Chineke anyị arịrịọ.”
4 那時,耶肋米亞尚出入於民間,人還沒有將他放在監獄裏。
Nʼoge a, Jeremaya nweere onwe ya ijegharị nʼetiti ndị Izrel, nʼihi na ha etinyebeghị ya nʼụlọ mkpọrọ.
5 法郎軍隊忽由埃及出發,圍攻耶路撒冷的加色丁人一聽見他們出動的消息,就由耶路撒冷撤退了。
Nʼihi na mgbe ndị agha Babilọn gbara Jerusalem gburugburu na-ebuso ya agha, ndị agha Fero sitere Ijipt na-apụkwute ha ibuso ha agha. Mgbe ndị agha Babilọn nụrụ na ndị agha Ijipt na-abịa, ha mere ngwangwa si nʼibuso Jerusalem agha wezuga onwe ha.
6 此時上主有話傳給耶肋米亞先知說:
Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya onye amụma ntị sị ya,
7 「上主,以色列的天主這樣說:你們應這樣回答派你們前來求間我的猶大君王說:看,出發前來援助你們的法郎軍隊,仍要回到自己的本地埃及去。
“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel kwuru, Ihe ndị a ka ị ga-agwa eze Juda onye zitere ozi sị gị rịọọ m arịrịọ, ‘Ndị agha Fero ahụ si nʼIjipt pụta bịa inyere unu aka ga-emesịa laghachi nʼala ha bụ Ijipt.
8 至於加色丁人仍要捲土重來,進攻這座城市;且要攻下,放火燒城。
Mgbe ahụ, ndị agha Babilọn ga-alọghachikwa ibuso obodo a agha. Ha ga-emeri ya, dọta ya nʼagha, kpọọkwa ya ọkụ.’
9 上主這樣說:你們不要自欺說:加色丁人已離我們遠去! 真實,他們並沒有遠去。
“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Unu arafula onwe unu site nʼiche echiche sị, ‘Ndị Babilọn agaghị abịakwa ibuso anyị agha.’ E, ha agaghị abịakwa ọzọ.
10 縱使你們能擊敗與你們交戰的加色丁人所有的軍隊,使他們中只剩下一些受傷的人,他們仍要由帳中奮起,放火燒盡這座城市。
A sịkwa na ndị agha unu enwee ike merie ndị agha Babilọn ahụ ga-abịa ibuso unu agha, a sịkwa na ọ bụ naanị ndị e merụrụ ahụ bụ ndị fọdụrụ nʼetiti ha, ndị a ga-esi nʼogige ndị agha Babilọn pụta bịa kpọọ obodo a ọkụ.”
11 加色丁人的軍隊受法郎軍隊的威脅,由耶路撒冷撤退時,
Mgbe ndị agha Babilọn si na gburugburu Jerusalem wezuga onwe ha nʼihi ọbịbịa ndị agha Fero na-abịa,
12 耶肋米亞離開耶路撒冷,到本篤地去,要在那裏由自己的親族間分得一份產業。
Jeremaya sitekwara na Jerusalem pụọ malite ịgawa nʼala ndị Benjamin, nʼihi iketa oke ruuru ya site nʼaka ndị bi nʼebe ahụ.
13 當他到了本雅明門時,那裏有一個站崗的人,名叫依黎雅,是舍肋米亞的兒子,哈納尼雅的孫子,捉住耶肋米亞先知說:「你想去投降加色丁人! 」
Ma mgbe o ruru nʼọnụ ụzọ ama Benjamin, onyeisi ndị agha aha ya bụ Irija nwa Shelemaya, nwa Hananaya jidere ya, boo ya ebubo sị ya, “Ọ bụ ọsọ ka ị na-agba! Ị na-achọ ịgbakwuru ndị Babilọn!”
14 耶肋米亞答說:「冤枉! 我不是去投降加色人丁」。依黎雅不聽他說,就捉住耶肋米亞,帶他去見首長。
Ma Jeremaya zara sị ya, “Ọ bụ okwu ụgha ka ị na-ekwu. Anaghị m agba ọsọ ịgbakwuru ndị Babilọn.” Ma Irija egeghị ya ntị, kama o jidere Jeremaya kpụta ya nʼihu ndịisi ọchịchị.
15 首長們遂發怒,將耶肋米亞鞭打了,幽禁在書記家的監牢裏,因為他們早已把他的家改成了監獄。
Ha were iwe megide Jeremaya, nye iwu ka e tie ya ihe, kpọchiekwa ya nʼụlọ Jonatan, ode akwụkwọ. Nʼihi na ha ji ụlọ ahụ mere ụlọ mkpọrọ nʼoge a.
16 於是耶肋米亞走一穹形的地窖內,在那裏住了多日。
E tinyere Jeremaya nʼime ụlọ mkpọrọ olulu, ebe ọ nọrọ ogologo oge.
17 此後,漆德克雅王派人提他出來,在自己的宮殿私下問他說:「上主有什麼話沒有﹖」耶肋米亞答說:「有」。接著說:「你必被交在巴比倫王手中」。
Emesịa, Zedekaya bụ eze nyere iwu ka a kpọta ya nʼụlọeze. Mgbe a kpọtara ya, Zedekaya jụrụ ya ajụjụ na nzuzo sị ya, “I nwere okwu site nʼaka Onyenwe anyị?” Jeremaya zara sị ya, “E, lee, a ga-arara gị nyefee gị nʼaka eze Babilọn.”
18 此外,耶肋米亞還問漆德克雅王說:「我在什麼事上得罪了你和你的臣僕,以及這些人民,你們竟將我放在監裏﹖
Mgbe ahụ, Jeremaya gwara Zedekaya, bụ eze okwu ọzọ sị ya, “Ihe ọjọọ dị aṅaa ka m mere megide gị, maọbụ megide ndị ọrụ gị, maọbụ megide ndị a, unu ji tinye m nʼụlọ mkpọrọ?
19 你們那些曾向你們預言說:巴比倫王不會來攻打你們和這地方的先知,現在在哪裏!
Ebee ka ndị amụma unu nọ, bụ ndị ahụ na-eburu unu amụma na-asị unu, ‘Eze Babilọn agaghị ebuso unu agha, ọ gaghị ebusokwa ala a agha?’
20 如今,我主君王,請聽!願你開恩允許我的祈求,不要叫我再回到書記約納堂家裡去,免得我死在那裡!」
Ugbu a, biko, onyenwe m eze, biko gee m ntị. Biko, nụrụ arịrịọ m: Ezighachila m nʼụlọ Jonatan, ode akwụkwọ, nʼihi na ọ bụrụ na i mee otu a, aga m anwụ nʼebe ahụ.”
21 於是漆德克雅王下令,將耶肋米亞囚禁在監獄的庭院裏,每日由麵包房取一份食物給他,直到城中糧食用盡。從此耶肋米亞o主在拘留所內的庭院裏。
Zedekaya bụ eze, nyere iwu ka e debe Jeremaya nʼogige ndị nche. O nyekwara iwu ka a na-enye ya achịcha e si nʼụlọ ndị na-eme achịcha na-ewebata ụbọchị niile, tutu ruo mgbe achịcha e nwere nʼobodo ahụ gwụsịrị. Ya mere, o mere ka Jeremaya nọgide nʼogige ndị nche.

< 耶利米書 37 >