< 耶利米書 36 >

1 猶大王史約雅內的兒子約雅金第四年,上主有話傳給耶肋米亞說
Nʼafọ anọ nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya bụ eze Juda, okwu Onyenwe anyị ndị a ruru Jeremaya ntị,
2 :「你拿卷冊來,寫上自我由約史雅時日,對你說話那一天以來,直到今日,關於耶路撒冷和猶大及列邦對你所說的一切話,
“Were akwụkwọ detuo okwu ahụ niile m gwarala gị banyere Izrel, na Juda, na banyere ndị mba ọzọ dị iche iche, bụ okwu ndị ahụ m bidoro ịgwa gị site nʼoge ọchịchị Josaya ruo ugbu a.
3 也許猶大家聽了我有意對他們施行的一切災禍,會各自離棄自己的邳道,叫我好寬恕他們的過犯和罪惡」。
Ma eleghị anya mgbe ndị Juda nụrụ ka e kwupụtara ihe banyere ihe ọjọọ ndị ahụ m zubere, nke na-aga ịbịakwasị ha, onye ọbụla nʼime ha nʼotu nʼotu ga-esite nʼụzọ ọjọọ ya tụgharịa. Mgbe ahụ, aga m agbaghara ha ajọ omume ha na mmehie ha.”
4 於是耶肋米亞叫了乃雅黎的兒子巴路克來;路克來依照耶肋米亞的口授,在卷冊上寫上了上主對先知說的一切話。
Ya mere, Jeremaya kpọrọ Baruk nwa Neraya ka ọ bịakwute ya. Mgbe Jeremaya nọ na-akpọpụta okwu ahụ niile Onyenwe anyị gwara ya, Baruk nọkwa na-edepụta ha nʼakwụkwọ.
5 耶肋米亞吩咐巴路克說:「我被阻止,不能到上主的殿宇去,
Emesịa, Jeremaya gwara Baruk okwu sị ya, “Ọnọdụ nke m nọ nʼime ya ugbu a agaghị ekwe ka m site nʼebe a pụọ jeruo nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
6 所以你去,在一個禁食的日子上,誦讀卷冊上依我口授寫的上主的話,給在上主殿裏的全體人民聽,也讀給來自各城的全體猶大人聽,
Nʼihi ya, gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼụbọchị ibu ọnụ, nọdụ nʼebe ahụ gụpụtara ndị mmadụ okwu Onyenwe anyị ndị a ị dere nʼakwụkwọ dịka m kpọpụtara ha. Gụpụtara ya ndị Juda si obodo niile bịa nʼụlọnsọ ahụ.
7 也許他們會向上主哀求,各自會離棄自己的邳道,因為上主對這人民用以恐嚇的憤恨和憤怒,真正厲害! 」
Ma eleghị anya, ha ga-arịọ Onyenwe anyị arịrịọ. Ma eleghị anya onye ọbụla nʼime ha ga-esite nʼụzọ ọjọọ ya tụgharịa, ka iwe na ọnụma dị ukwuu nke Onyenwe anyị ga-ekpughe megide ndị a ghara ịbịakwasị ha.”
8 乃黎雅的兒子巴路克全按耶肋米亞先知吩咐的做了:在上主殿宇裏,宣讀了卷冊上主的話。
Baruk nwa Neraya mere dịka Jeremaya onye amụma si gwa ya. Ọ gụpụtara okwu Onyenwe anyị, nke dị nʼakwụkwọ ahụ, nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
9 猶大王約史雅的兒子約雅金第五年九月,耶路撒冷全體人民以及從猶大城市來到耶路撒冷的全體人民,集合在上主面前宣佈禁食。
Nʼọnwa itoolu nke afọ ise nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda, e doro oge dị iche nye maka ibu ọnụ nʼihu Onyenwe anyị. E kwusara ibu ọnụ a nye ndị niile nọ na Jerusalem, na ndị si nʼobodo Juda niile bịa na Jerusalem.
10 巴路克就乘機在上主殿宇內,沙番的兒子革馬黎雅書記的房子那裏,即上院靠近上主殿宇新門的進口處,宣讀卷冊上耶肋米亞的話,給全體人民聽。
Baruk nọ nʼọnụụlọ Gemaraya nwa Shefan, bụ ode akwụkwọ, gụpụtara ndị niile nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị okwu Jeremaya, nke dị nʼakwụkwọ a dị nsọ nʼọnụ ụzọ ama ọhụrụ nke ụlọnsọ ahụ.
11 沙番的兒子革馬黎雅的兒子米加雅,聽了卷冊上所有的上主的話,
Mgbe Mikaya nwa Gemaraya nwa Shefan nụrụ okwu Onyenwe anyị nke e si nʼakwụkwọ ahụ gụpụta,
12 就下到王宮書記的事務所內,看,眾首長都正坐在那裏,有書記厄里沙瑪,舍瑪雅的兒子德拉雅,阿革波爾的兒子厄耳納堂,沙番的兒子革馬黎雅,哈紇尼雅的兒子漆德克雅和其餘的首長。
o si nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼụlọ ode akwụkwọ dị nʼụlọeze, ebe ndịisi niile zukọrọ. Ndị a bụ ndị zukọrọ nʼebe ahụ; Elishama, ode akwụkwọ, na Delaya nwa Shemaya, na Elnatan nwa Akboa, na Gemaraya nwa Shefan, na Zedekaya nwa Hananaya, na ndịisi ọchịchị ndị ọzọ.
13 米加雅就把自己在巴路克給人民宣讀卷冊時所聽到的所有話,告訴了他們。
Mgbe Mikaya gwara ha ihe ọ nụrụ Baruk si nʼakwụkwọ ahụ gụpụtara ndị mmadụ,
14 眾首長便派乃塔尼雅的兒子猶狄和雇史的兒子舍肋米亞到巴路克那裏說:「請你來,並請你隨手帶上你讀給人民的那軸卷冊」。乃肋米亞的兒子巴路克立即手內拿上那軸卷冊,到他們那裏去了。
ndịisi ahụ niile zipụrụ Jehudi nwa Netanaya, nwa Shelemaya, nwa Kushi, ka o jekwuru Baruk sị ya “Were akwụkwọ ahụ ị si na ya gụpụtara ndị mmadụ ihe, bịa.” Ya mere, Baruk, nwa Neraya, ji akwụkwọ a nʼaka ya jekwuru ha.
15 你們對他說:「請坐,讀給我們聽! 」巴路克讀給他們聽了。
Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ha gwara ya sị ya, “Biko, nọdụ ala gụọra anyị ihe dị nʼakwụkwọ a.” Ya mere, Baruk gụpụtara ha ihe dị nʼakwụkwọ ahụ.
16 他們聽了這一切話,彼此不勝驚慌說:「我們必須將這一切話稟告君王! 」
Mgbe ha nụchasịrị okwu dị nʼakwụkwọ ahụ, ha lerịtara onwe ha anya nʼegwu, gwa Baruk okwu sị ya, “Anyị aghaghị ime ka okwu ndị a ruo eze ntị.”
17 然後問巴路克說:「請你告訴我們:你怎樣由耶肋米亞的口授寫了這一切話﹖」
Ha jụrụ Baruk sị ya, “Gwa anyị i si aṅaa detuo ihe ndị a niile? Ọ bụ Jeremaya kpọpụtaara gị ihe i dere?”
18 巴路克答覆他們說:「這一切話都是他口授給我的,我只不過用筆記錄在這卷冊上」。
Baruk zara sị ha, “E, ọ bụ ya kpọpụtara m okwu ndị a niile m deturu. E ji m inki dee ha nʼakwụkwọ.”
19 於是首長對巴路克說:「你快去和耶肋米亞藏起來,不要讓人知道你們藏在哪裏」。
Mgbe ahụ, ndịisi ahụ gwara Baruk okwu sị ya, “Ọsọ, gaa ka gị na Jeremaya zoo onwe unu. Unu ekwekwala ka onye ọbụla mata ebe unu zoro onwe unu.”
20 然後他們一同到內殿去拜見君王,那卷冊卻留在書記厄里沙瑪室內,只將這一切話稟告了君王。
Mgbe ha zochasịrị akwụkwọ ahụ nʼọnụụlọ Elishama onye ode akwụkwọ, ha jekwuuru eze nʼogige ụlọ ya kọọrọ ya ihe niile.
21 君王於是打發猶狄去取那軸卷冊;猶狄由書記厄里沙瑪室內取了來,讀給君王和環立在君王旁的眾朝臣聽。
Eze ziri Jehudi ka ọ gaa weta akwụkwọ ahụ. Mgbe Jehudi wetara ya site nʼọnụụlọ Elishama, ode akwụkwọ, ọ gụrụ ya nʼihu eze, na nʼihu ndịisi ọchịchị ahụ niile guzo nʼakụkụ eze.
22 那時正是九月,君王住在冬宮裏,面前正燒著一盆火,
Nʼọnwa nke itoolu ahụ, mgbe eze nọ nʼụlọ oyi ya, ọkụ na-enwukwa nʼime ite ọkụ dị nʼihu ya.
23 猶狄只讀了三四行,君王就用書記的刀把它割下,拋在火盆裏,直到那卷冊在火盆內被燒盡。
Mgbe ọbụla Jehudi gụsịrị ibe akwụkwọ atọ maọbụ anọ, eze na-anara ya akwụkwọ ndị ahụ were agụba ode akwụkwọ chakasịa ha, wụnye ha nʼọkụ. O megidere otu a tutu ruo mgbe ọ wụnyechara akwụkwọ ndị ahụ niile nʼọkụ.
24 君王與眾臣僕言這一切話,毫不害怕,也不撕裂自己的衣服,
Eze na ndị so ya nọdụ nʼoge a na-agụpụta akwụkwọ a atụghị egwu ọbụla; ha adọwakwaghị uwe ha igosi obi ọjọọ.
25 雖然厄耳納堂和德拉雅及革瑪黎雅曾苦苦哀求君王不要燒毀那軸卷冊,
Ọ bụ ezie na Elnatan na Delaya na Gemaraya rịọrọ eze sị ya adọkasịla akwụkwọ ndị ahụ, ma o geghị ha ntị.
26 反命王子耶辣默耳,阿次黎耳的兒子色辣雅和哈德耳的兒子舍肋米雅,去逮捕書記巴路克和先知耶肋米亞;但是上主卻將他們藏起來了。
Kama eze nyere Jerameel otu nʼime ụmụ eze, na Seraya nwa Azriel, na Shelemaya nwa Abdeel iwu ijide Baruk ode akwụkwọ, na Jeremaya onye amụma, ma Onyenwe anyị zoro ha.
27 君王焚燒了那軸載有巴路克由耶肋米亞口授記錄的話的卷冊以後,有上主的話傳給耶肋米亞說:
Mgbe eze suresịrị akwụkwọ ahụ na okwu niile nke Baruk dere nʼime ya ọkụ, bụ okwu nke Jeremaya kpọpụtara site nʼọnụ ya, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya:
28 「你拿另一卷冊來,寫上猶大王約雅金所燒毀的前一軸卷冊上的一切話。
“Werekwa akwụkwọ ọzọ dee okwu ndị ahụ niile e dere nʼakwụkwọ nke mbụ ahụ, nke Jehoiakim eze Juda kpọrọ ọkụ.
29 關於猶大王約雅金你應說:上主這樣說:你燒毀了這軸卷冊說:為什麼你在上面寫道:巴比倫王必來破壞這地方,消滅這地方 的人民和獸﹖
Ọzọkwa, gwa Jehoiakim eze Juda sị ya, ‘otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Ị kpọrọ akwụkwọ ndị ahụ ọkụ, kwuo sị, “Gịnị mere i ji dee nʼime ya na eze Babilọn aghaghị ịbịa bibie ala a, gbuchapụ ndị niile nọ nʼime ya, ma mmadụ ma anụmanụ?”
30 為此上主關於猶大王約雅金這樣說:他必沒有人繼坐達味的寶座,死後必棄屍原野,遭受日晒夜露。
Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Jehoiakim eze Juda; Ọ gaghị amụta onye ga-anọ nʼocheeze Devid. Ọzọ, a ga-atụfu ozu ya nʼebe igirigi nke abalị ga-adakwasị ya, ebe okpomọkụ nke ehihie ga-erute ya.
31 對他和他的後裔及臣僕,我要懲罰他們的罪惡,給他們和耶路撒冷居民及猶大人,召來我向他們預告,他們卻不理會的一切災禍」。
Aga m ata ya na ụmụ ya, na ndị ozi ya ahụhụ nʼihi ajọ omume ha. Aga m eme ka ihe ọjọọ ahụ m kwuru ihe banyere ya bịakwasị ha na ndị niile bi na Jerusalem, na ndị Juda niile, nʼihi na ha jụrụ ige m ntị.’”
32 耶肋米亞就拿來另一軸卷冊,交給書記乃黎雅的兒子巴路克。巴路克依照耶肋米亞的口授,在上面筆錄了猶大王約雅金,在火中燒毀了的那卷冊上所有的話;並且還加添了許多相類似的話。
Ya mere, Jeremaya weere akwụkwọ ọzọ nye Baruk ode akwụkwọ, bụ nwa Neraya, dịka Jeremaya na-akpọpụta okwu, Baruk depụtakwara nʼakwụkwọ okwu ndị ahụ niile, nke Jehoiakim eze Juda surere nʼọkụ. A tụkwasịkwara nʼelu ha ọtụtụ okwu ndị ọzọ nke dịka ha.

< 耶利米書 36 >