< 耶利米書 35 >

1 猶大王約史雅的兒子約雅金為王時,上主有話傳給耶肋米亞說:
Ndị a bụ okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya ntị nʼoge ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda sị ya,
2 「你到勒加布人家裏去,與他們會談,引他們走進上主殿宇的一間房裏,給他們酒喝」。
“Jee nʼụlọ ụmụ Rekab kpọọ ha oku ka ha bịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼotu nʼime ọnụụlọ ya, nọdụ nʼebe ahụ nye ha mmanya ka ha ṅụọ.”
3 於是我帶了哈巴漆尼的孫子,依爾米雅的兒子雅匝尼雅,和他的兄弟與他所有的兒子,以及勒加布全家,
Ya mere, ejekwuuru m Jaazanaya nwa Jeremaya, nwa Habazinaya na ụmụnne ya, na ụmụ ya ndị ikom, ya bụ, ndị ezinaụlọ Rekab niile.
4 到了上主的殿宇,進了天主的人依革達里雅的兒子南的兒子們的房間集合集合這間房靠近長官室,正是在看守殿門的沙隆的兒子瑪阿色雅的住房上面,
Akpọbatara m ha nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼime ọnụụlọ ụmụ Hanan nwa Igdalaya, onye nke Chineke. Ọnụụlọ a dị nso nʼọnụụlọ ndịisi ụlọnsọ, nke dị nʼelu ọnụụlọ Maaseia nwa Shalum, onye nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ.
5 將滿杯滿爵的酒,擺在勒加布的子孫面前,向他們請說:「請喝酒吧! 」
Mgbe ahụ, e doziri m ọkwa ụfọdụ jupụtara na mmanya na iko ụfọdụ nʼihu ụmụ Rekab, sị ha, “Ngwanụ, ṅụanụ mmanya.”
6 他們答說:「我們不喝,因為我們的祖先勒加布的兒子約納達有布曾吩咐我們說:你們和你們的兒子永不可喝酒;
Ma ha zara sị, “Anyị adịghị aṅụ mmanya, nʼihi na nna nna anyị Jehonadab nwa Rekab nyere anyị iwu sị anyị, ‘Unu aṅụkwala mmanya, unu na ụmụ ụmụ unu.
7 也不可建造房屋,不可播種,不可栽植或佔有葡萄園,卻要終身住在帳幕裏,好使你們能長久在你們作客的地方。
Ọzọkwa, unu ewurula onwe unu ụlọ, unu akụla mkpụrụ ubi, maọbụ kụọ ubi vaịnị. Unu adọtarala onwe unu ihe ndị a niile, kama na-ebinụ nʼụlọ ikwuu. Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka unu ga-esi bie ogologo ndụ nʼala ahụ unu bụ ndị ọbịa nʼime ya.’
8 在我們的祖先勒加布的兒子約納遠吩咐我們的一切事上,我們全聽從了他的話,我們、妻子和兒女,終身不喝酒,
Anyị erubela isi nʼihe niile nna nna anyị Jehonadab nwa Rekab gwara anyị. Anyị na ndị nwunye anyị na ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom adịghị aṅụ mmanya,
9 也不建造房屋居住,也沒有葡萄或田地和播種的事,
maọbụ wuo ụlọ, maọbụ nwee ubi vaịnị, ala ubi maọbụ mkpụrụ ọkụkụ.
10 只住在帳幕裏,全聽從並履行我們的祖先約納達w的事。
Ọ bụkwa nʼụlọ ikwuu ka anyị na-ebi dị ka nna nna anyị Jehonadab nyere anyị nʼiwu.
11 只在巴比倫王拿步高上來進攻這城時,我們才說:走吧! 到耶路撒冷去,躲避加色弓人和阿蘭軍隊;從此我們才住在耶路撒冷」。
Ma mgbe Nebukadneza eze Babilọn busoro ala anyị agha, anyị kpebiri sị, ‘Bịanụ ka anyị gbaba Jerusalem si otu a gbanarị ndị agha Babilọn, na ndị agha ndị Aram.’ Ọ bụ nke a mere anyị ji biri na Jerusalem.”
12 於是有上主的話傳給耶肋米亞說:
Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya
13 「萬軍的上主,以色列的天主這樣說:你去對猶大人和耶路撒冷的居民說:你們不接受教訓,聽從我的話嗎﹖──上主的斷語──
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Gaa gwa ndị Juda na ndị bi na Jerusalem, ‘Ọ bụ na unu agaghị esite nʼịdọ aka na ntị mụta irubere okwu m isi?’ ka Onyenwe anyị kwupụtara.
14 勒加布的兒子約納達布的話居然有人遵守:他命子孫們不喝酒,他們直到今日就不喝酒,全聽從了他們祖先的命令;我不斷懇切教訓你們,你們卻沒有聽從;
‘Jehonadab nwa Rekab nyere ụmụ ụmụ ya iwu sị ha aṅụla mmanya, ha na-edebe iwu ahụ. Ruo taa, ha adịghị aṅụ mmanya, nʼihi na ha na-edebe iwu nna nna ha nyere ha. Ma mụ onwe m agwala unu okwu mgbe na mgbe, ma unu jụrụ irubere m isi.
15 我給你們派遺──且不斷派遺,我所有的僕人們,來勸你們各自離開自己的邪道,改自己的行為,不再追隨外方的神祗,好能住在我賜給你們和你們祖先的地方;你們仍不側耳聽從我。
Mgbe mgbe ka m ziteere unu ụmụ ohu m bụ ndị amụma, ndị bịara gwa unu okwu sị, “Dozienụ ụzọ unu, sitekwanụ nʼajọ omume unu tụgharịa. Unu niile nʼotu nʼotu, unu agbasola chi ndị ọzọ ife ha. Ọ bụrụ na unu emee otu a, unu ga-ebi nʼala a m nyere unu na nna nna unu ha.” Ma unu jụrụ ịṅa ntị, jụkwa ige m ntị.
16 實在,加勒布的兒子約納達達布的子孫,遵守了他們祖先吩咐的命令;至於這民族,卻不聽從我。
Ụmụ ụmụ Jehonadab, nwa Rekab, emeela ihe nna nna ha nyere ha nʼiwu, ma ndị a jụrụ irubere m isi.’
17 為此,上主萬軍的天主,以色列的天主這樣說:看,我必給猶大和耶路撒冷 a的居民,招來我對他們所預告的一切災禍,因為我訓諭他們,他們不答應」。
“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke Izrel kwuru: ‘Geenụ ntị! Lee, ana m aga ime ka ihe ọjọọ bịakwasị Juda na ndị niile bi na Jerusalem, dịka m kwuru na ọ ga-adị. Nʼihi na agwala m ha okwu, ma ha jụrụ ige m ntị. Akpọrọ m ha oku, ma ha jụrụ ịza.’”
18 於是耶肋米亞對勒加布人家族說:「萬軍的上主,以色列的天主這樣說:因為你們聽從了祖先約納布的命令,遵守了他的一切規律,完全依照他所吩咐的做了;
Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndị ezinaụlọ Rekab, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Unu erubeela isi mee ihe niile nna nna unu bụ Jehonadab nyere unu nʼiwu.’
19 為此,萬軍的上主,以色列的天主這樣說:勒加布的兒子約納達布從此永不會缺乏侍立在我面前的人」。
Nʼihi ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru sị, ‘O nweghị mgbe ọbụla nwoke ga-ejere m ozi ga-akọ nʼezinaụlọ Jehonadab nwa Rekab.’”

< 耶利米書 35 >