< 耶利米書 18 >

1 上主有話傳給耶肋米亞說:
Nke a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya.
2 「起來,下到陶工家裏去,在那裏我要讓你聽到我的話」。
“Bilie, jee nʼụlọ ọkpụ ite, ebe ahụ ka m ga-anọ zie gị ozi.”
3 我便下到陶工家裏,見他正在輪盤上工作。
Ya mere, ebiliri m jee nʼụlọ ọkpụ ite, bịakwute ya mgbe ọ nọ na-arụ ọrụ na nkume ịkpụ ihe.
4 陶工用泥做的器皿,若在他手中壞了,他便再做,或做成另一個器皿,全隨陶工的意思去做。
Ma ite ahụ ọ chọrọ ịkpụ apụtaghị dịka ọkpụ ite si chọọ ya, nʼihi ya, ọ kpụkọtara ụrọ ahụ ọzọ, malitekwa ịkpụgharị ya.
5 於是上主的話傳給我說:
Mgbe ahụ okwu Onyenwe anyị ruru m ntị,
6 「以色列家,我豈不能像這陶工一樣對待你們﹖──上主的斷語──以色列家! 看,你們在我手中,就像泥土在陶工手中一樣。
Ọ sịrị, “Ọ bụ na m apụghị ime unu dịka ọkpụ ite a mere, unu ụmụ Izrel?” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Dịka ụrọ si dị nʼaka ọkpụ ite ahụ, otu a ka unu onwe unu si dịrị nʼaka m, gị Izrel.
7 我一時可對一個民族,或如同國家,決意要拔除,要毀壞,要消滅;
Mgbe ọbụla m kpọsara na a ga-akwada maọbụ bibie, maọbụ si nʼọnọdụ ya hopu mba maọbụ alaeze ọbụla,
8 但是我要打擊的民族,若離棄自己的邪惡,我也反悔,不再給他降原定的災禍。
ọ bụrụ na mba ahụ m dọrọ aka na ntị esite na mmehie ha chegharịa, a gaghị ebibi ya dịka m si zube.
9 或者,我一時想對一個民族或一個國家,決意要建設,要栽培,
Ọzọ, ọ bụrụ na m akpọsaa na a ga-ewuli mba ọbụla maọbụ alaeze ọbụla elu, kụọkwa ya,
10 但若她行我不喜歡的事,不聽從我的聲音,我也要反悔,不再給她許過的恩惠。
ọ bụrụ na o mee ihe jọrọ njọ nʼanya m, jụ irubere m isi, agaghị m emere ya ihe ọma ahụ m zubere imere ya.
11 現在你可告訴猶大人和耶路撒冷的居民說:上主這樣說:看,我已給你們安排了災禍,定了懲罰你們的計劃,希望你們每人離棄自己的邪道,改善自己的途徑和作為」。
“Ugbu a, gwa ndị Juda na ndị ahụ bi na Jerusalem, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Lee, ana m akwado mbibi nke ga-abịakwasị unu; ana m echekwa echiche ọjọọ megide unu. Ya mere, ka onye ọbụla nʼime unu site nʼụzọ ọjọọ ya chegharịa, ya meekwa ka ụzọ ya na omume ya zie ezi.’
12 他們反倒答說:「已沒有希望弓! 因為我們願隨從自己的計謀,各按自己頑固的惡意行事」。
Ma ha ga-aza sị, ‘O nweghị isi! Anyị ga-anọgide na-eme ihe ọbụla anyị chepụtara nʼechiche anyị, na-emekwa atụmatụ isiike nke obi ọjọọ anyị tụpụtara.’”
13 為此上主這樣說:「你們可到各民族去詢問:有誰聽到了像這樣的事﹖以色列處女做出了極可憎的事。
Nʼihi ya ka Onyenwe anyị ji kwuo sị, “Jụtanụ ajụjụ nʼetiti mba niile, onye nụrụla ihe dị otu a? Ndị m, Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke emeela ihe jọgburu onwe ya.
14 黎巴嫩山巔的巖石豈能缺少積雪﹖叢山間湧流的冰泉,豈能涸竭﹖
O nweela mgbe mmiri oyi m mere ka ọ kpụkọtaa kọrọ nʼelu ugwu Lebanọn? O nweela mgbe mmiri ya jụrụ oyi, nke si nʼebe dị anya na-asọdata ji akwụsị ịsọ asọ?
15 但我的人民卻忘掉了我,向「虛無」獻香,滑出了自己的正道,離開舊日的行徑,而走上了小道,不平坦的路,
Ma ndị m echezọọla m. Ha na-achụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị na-enweghị isi, bụ arụsị ndị ahụ mere ka ha sọọ ngọngọ nʼụzọ ha niile. Ha sụrụ ngọngọ hapụ ịgbasokwa ụzọ ọma ahụ dị site na mgbe ochie. Kama ha na-eje ije nʼụzọ ọhịa, nke na-enweghị ụkpụrụ, nke a na-ewuzighị ewuzi.
16 使自己的地域變為驚愕的原因,取笑的目標;凡經過這 中2 的人,莫不驚異搖首。
Ala ha ga-atọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-aghọ ihe iju anya ruo ebighị ebi. Ndị si nʼakụkụ ya na-agafe ga-efufe isi ha, nʼihi na ihe ha ga-ahụ ga-eju ha anya.
17 我必像一陳東風在敵人面前將他們吹散;在他們滅亡之日,我必使你們只見我背,不見我面」。
Aga m achụsa ha nʼihu ndị iro ha dịka ifufe na-efe site nʼọwụwa anyanwụ. Aga m agbakụta ha azụ. Ha agaghị ahụkwa ihu m anya nʼụbọchị ahụ mbibi ga-abịakwasị ha.”
18 他們說:「來,我們合謀陷害耶肋米亞! 因為沒有司祭,法律不會因此廢止;沒有智者,計謀不會因此缺乏;沒有先知,神諭不會因此斷絕。來,我們用舌頭評擊他,不注意他的一切 勸告」。
Ha sịrị, “Bịanụ ka anyị gbaa izu megide Jeremaya, nʼihi na izi iwu agaghị esite nʼebe ndị nchụaja nọ kwụsị, maọbụ ndụmọdụ nʼebe ndị maara ihe, ma ọ bụkwanụ okwu site nʼebe ndị amụma nọ. Ya mere, bịanụ ka anyị were ire anyị buso ya agha, gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ọbụla nke ọ na-ekwu.”
19 上主,願你俯聽我,請聽我敵人的聲明。
Gee m ntị, Onyenwe anyị. Nụrụ ihe ndị na-ebo m ebubo na-ekwu megide m.
20 難道該以怨報德嗎﹖他們竟掘下陷阱來陷害我的生命! 望你記憶:我曾在你面前為他們求情,替他們挽回你的盛怒。
O kwesiri iji ajọ omume kwụghachi ihe ọma? Ma lee na ha egwuolara m olulu. Chetakwa na m guzooro nʼihu gị ma rịọ gị arịrịọ nʼihi ha. Arịrịọ m bụ ka ị hapụ iweso ha oke iwe.
21 為此,你應使他們的子女遭受饑荒,任人屠殺;使他們的婦女喪予居寡,使他們的男人死於瘟疫,使他們的青年在戰埸上死於刀下。
Ya mere, were ụmụ ha nyefee nʼaka ụnwụ. Werekwa ha onwe ha nyefee nʼaka mma agha. Mee ka ndị nwunye ha ghọọ ndị gba aka ụmụ na di. Meekwa ka e gbuo ndị ikom ha, ka mma agha gbukwaa ụmụ okorobịa nʼọgbọ agha.
22 當你引匪隊突擊他們時,願從他們的屋裏可聽到哭聲,因為他們掘了陷阱捕捉我,在我腳下設下羅網。
Mee ka e site nʼụlọ ha nụ mkpu akwa, mgbe i mere ka ndị iro ha buso ha agha na mberede. Nʼihi na ha egwuola olulu ijide m, ha esiekwarala m ọnya nzuzo ijide m nʼụkwụ.
23 如同你,上主,你知道他們對我的一切計劃是要殺害我;請你不要寬恕他們的過惡,不要由你面前抹去他們的過惡,務使他們倒仆在你面前;在你發怒時,求你報復他們。
Ma gị onwe gị, Onyenwe anyị, maara nzube ọjọọ ha niile igbu m. Agbagharala ha ajọ omume ha; maọbụ hichapụ mmehie ha site nʼihu gị. Mee ka ụkwụ ha gbuchapụ ka ha daa nʼihu gị; mesie ha ike mgbe ị na-ewe iwe.

< 耶利米書 18 >