< 以賽亞書 7 >

1 當烏齊雅的孫子,約堂的兒子阿哈次為猶大王時,阿蘭王勒斤和以色列王勒瑪里雅的兒子培卡黑,上來攻打耶路撒冷,但是不能攻陷。
Mgbe Ehaz, nwa Jotam, nwa nwa Ụzaya bụ eze na Juda, Rezin eze Aram, na Peka eze Izrel, nwa Remalaya, busoro Jerusalem agha. Ma ha emerighị ya; obodo ahụ guzosiri ike.
2 有人報告達味家說:「阿蘭已經駐紮在厄弗辣因!」君王與人民都膽戰心驚,有如風中搖動的樹木。
Ma mgbe e mesịrị, ozi ruru ụlọ Devid ntị sị, “Ndị Aram na Ifrem ejikọọla onwe ha ọnụ”; nke a mere ka ụlọeze, na obi ndị ọ na-achị maa jijiji, dịka osisi dị nʼọhịa si ama jijiji mgbe oke ifufe na-efe.
3 上主對依撒意亞說:「你和你的兒子舍阿爾雅叔布出去,到上池的水溝盡頭,即漂工田間的大道上,去會見阿哈次;
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Aịzaya okwu sị ya, “Jekwuru Ehaz bụ eze. Mgbe ị na-aga, kpọrọ Shịa-Jashub nwa gị nwoke. Unu ga-ahụ Ehaz nʼakụkụ Elu elu olulu ọdọ mmiri nke dị nʼụzọ ahụ gawara nʼAla ọsụ akwa.
4 對他說:你必須審慎,保持鎮定,不必畏懼,不要因那兩個冒煙的火把頭-即勒斤、阿蘭和勒瑪里雅之子-的怒火而膽怯。
Gwa ya ka ọ ghara inye ndụ ya nsogbu, ka ọ gharakwa ịtụ egwu. Sị ya, ‘Lezie anya, nọ jụụ, echegbula onwe ya banyere icheku ọkụ abụọ ahụ na-anyụ anyụ. Atụla egwu nʼihi iwe Rezin nwa Aram, na iwe Peka nwa Remalaya.
5 雖然阿蘭、厄弗辣因和勒瑪里雅的兒子同謀,迫害你說:
E, Aram, na Ifrem, na nwa nwoke Remalaya, agbaala izu ibuso gị agha ịla gị nʼiyi. Ha ekwuola sị,
6 我們上猶大去,擾亂她,把她佔領過來歸於我們,並在那裏立塔貝耳的兒子為王;
“Ka anyị wakpo Juda, ka anyị dọwaa ya ma kee ya nʼetiti onwe anyị, mee nwa Tabeel ka ọ bụrụ eze ya.”
7 但是吾主上主卻這樣說:這事決不能成立,亦不能發生!
Ma otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “‘Ọ gaghị adị ire! Ọ gaghị emezukwa.
8 因為阿蘭的首都是大馬士革,大馬士革的首領是勒斤;
Nʼihi isi obodo Aram bụ Damaskọs. Onyeisi Damaskọs bụ naanị Rezin. Ma tupu afọ iri isii na ise agafee a ga-etikpọkwa Ifrem.
9 厄弗辣因的首都是撒瑪黎雅,撒瑪黎雅的首領是勒瑪里雅的兒子。【六年或五年以後,阿蘭將被消滅,厄弗辣因將要衰敗。】假使你們不肯相信,你們必然不能存立。」
Isi obodo Ifrem bụ Sameria. Onyeisi Sameria bụ naanị nwa Remalaya. Ọ bụrụ na unu eguzosighị ike nʼokwukwe unu, unu agaghị eguzo ma ọlị.’”
10 上主又對阿哈次說:「
Ọ dịghị anya, Onyenwe anyị ziri Ehaz ozi ndị a sị,
11 你向上主你的天主要求一個徵兆罷 !或求諸陰府深處,或求諸上天高處。」 (Sheol h7585)
“Jụọ m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, ka m meere gị ihe ịrịbama nke ga-egosi gị na m ga-ebibi ndị iro gị niile dịka m kwuru. Rịọọ m ihe masịrị gị, nʼebe dị elu nʼeluigwe maọbụ nʼebe kachasị omimi nʼụwa.” (Sheol h7585)
12 阿哈次回答說:「我不要求,我不願試探上主。」
Ma Ehaz zara sị, “Mba, agaghị arịọ, agaghị m anwakwa Onyenwe anyị m otu a.”
13 依撒意亞說:「達味的家族,你們聽著罷 !你們使人厭惡還不夠,還要使我的天主厭惡嗎﹖
Ma Aịzaya sịrị, “Ṅaanụ ntị unu ụlọ Devid. Ọ bụ na o zurughị unu ime ka ike gwụ mmadụ? Unu ga-emekwa ka ike gwụ Chineke nʼonwe ya?
14 因此,吾主要親自給你們一個徵兆:看,有位貞女要懷孕生子,給他起名叫厄瑪奴耳。
Ya mere, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-enye gị ihe ịrịbama! Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ ga-akpọ aha ya Ịmanụel, nke pụtara, Chineke nọnyeere anyị.
15 到他知道棄惡揚善的時候,要吃乳酪和蜂蜜;
Mmiri ara ehi rahụrụ arahụ na mmanụ aṅụ ka nwantakịrị ahụ ga-eri mgbe ọ matara ịjụ ihe ọjọọ na ịhọrọ ezi ihe.
16 因為在這孩子尚未知道棄惡擇善以前,你在那兩個君王面前所擔心的國土,必將荒廢。
Tupu a zụlite nwantakịrị ahụ ịmata ịhọrọ ezi ihe na ịjụ ajọ ihe, ndị eze abụọ ndị ị na-atụ egwu ha, ga-anwụcha.
17 上主必使患難的日子臨於你、你的百姓和你的父家身上;這是從厄弗辣因叛離猶大那一天所未有過的,【即亞述王加禍的日子。】
Onyenwe anyị ga-eme ka ọbụbụ ọnụ dị ukwuu bịakwasị gị na obodo gị, na ezinaụlọ gị. Ihe egwu ga-adịkwa, ụdị nke a na-ahụbeghị mbụ, site nʼoge e kewapụrụ Ifrem site na Juda. Eze Asịrịa ga-edu ndị agha ya bịa.”
18 那一日,上主要喚來埃及大河盡頭的蠅和亞述境內的蜂,
Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-akpọku ijiji site na nsọtụ Naịl dị nʼIjipt nakwa aṅụ sitere nʼala Asịrịa.
19 牠們將要前來,一起落在荒谷、巖穴,以及一切荊棘叢中和一切水溝上。
Ha ga-abịa nʼigwe, bichie ndagwurugwu ala gị niile, na nʼọgba nkume niile, na nʼọhịa ogwu ogwu niile, na nʼọzara niile, na nʼezi ala niile.
20 那一日,吾主要用由大河那邊借來的剃刀【即亞述王】剃去你的頭髮和恥毛,連鬍鬚也要刮掉。
Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eji agụba e gotara nʼofe osimiri, nke bụ eze Asịrịa, kpụchapụ unu agịrị isi na ajị ụkwụ, kpụchapụkwa afụọnụ unu niile.
21 到那一日,人僅能餵養一隻牛犢和兩隻母山羊,
Nʼụbọchị ahụ, otu onye ga-edebe otu nwa ehi na ewu abụọ ndụ.
22 因為出奶很多,人將以乳酪為食,因而境內所有的遺民,都將以乳酪和蜂蜜為食。
Onye ọbụla kwa nʼala ahụ ga-eri mmiri ara ehi rahụrụ arahụ, ya na mmanụ aṅụ, nʼihi na mmiri ara ehi ga-aba ụba nke ukwuu nʼala ahụ.
23 到那一日,先前所有種植一千棵葡萄,值一千塊銀子的地方,必將叢生荊棘和蒺藜。
Nʼụbọchị ahụ, ala ọbụla nke nwere otu puku osisi vaịnị nke ọnụahịa ya ruru otu puku shekel ọlaọcha ga-abụ naanị ogwu na uke.
24 人往那裏去,必須攜帶弓箭,因為遍地都是荊棘和蒺藜。
Ndị dinta ga-achịrị àkụ na ùta gaa nʼebe ahụ, nʼihi na uke na ogwu ga-ekpuchi ala ahụ.
25 先前用鋤頭開墾的山地,沒有人敢到那裏,因為害怕荊棘蒺藜。那裏將成為放牛和羊群踐踏的地區。
Ma banyere ugwu eji ọgụ kọọ na mbụ, ị gaghị abakwa nʼebe ahụ ọzọ nʼihi egwu uke na ogwu; ha ga-abụ ebe a na-atọpụ ehi na ebe atụrụ na-agbagharị.

< 以賽亞書 7 >