< 以賽亞書 49 >

1 諸島嶼,請聽我!遠方的人民,請靜聽!上主由母腹中就召叫了我,自母胎中就給我起了名字。
Geenụ m ntị, unu niile ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu, nụrụkwanụ nke a, unu ndị nọ na mba dị anya. Onyenwe anyị kpọrọ m tupu amụọ m. Ọ kpọrọ m aha m mgbe m ka nọ nʼime afọ nne m.
2 他使我的口好似利劍,將我掩護在他的手蔭下,使我像一支磨光的箭,將我隱藏在他的箭囊中。
O mere ka okwu sị m nʼọnụ dịrị nkọ dịka mma agha. O zobere m nʼaka ya kpuchie m. O mere m ka m dịrị ka àkụ dị nkọ nke o zoro nʼime akpa àkụ ya.
3 他對我說:你是我的僕人,是我驕矜的「以色列。」
Ọ sịrị m, “Ị bụ ohu m, Izrel. Ọ bụkwa site na gị ka m ga-eji gosi ịma mma na ike m.”
4 但是我說:「我白白勤勞了,我枉費了氣力而毫無益處;但是我的權利是在上主那裏,我的報酬在我的天主面前。」
Ma mụ onwe m sịrị, “Ọ bụ nʼefu ka m dọgburu onwe m nʼọrụ. Etufuola m ike m niile nʼihi ihe na-abụghị ihe. Ma ihe ruru m dị nʼaka Onyenwe anyị, ụgwọ ọrụ m dịkwa nʼaka Chineke m.”
5 我在上主眼中是光榮的,天主是我的力量。那由母胎形成我作他的僕人,將雅各伯領回到他前,並把以色列聚在他前的上主,如今說:「
Ma ugbu a Onyenwe anyị na-asị, Onye ahụ kpụrụ m nʼafọ nne m ka m bụrụ onye na-ejere ya ozi; ka ọ kpọghachite Jekọb nye ya ka achịkọtakwa ndị Izrel nyekwa ya onwe ya, nʼihi na-abụ m onye nsọpụrụ dịrị nʼanya Onyenwe anyị, Chineke m aghọkwaarala m ike m.
6 你作我的僕人,復興雅各伯支派,領回以色列遺留下的人,還是小事,我更要使你作萬民的光明,使我的救恩達於地極。」
Ọ sịrị, “Ọ bụ ihe dị nta karịa, gị ị bụrụ m ohu, ịkpọghachita ebo niile nke Jekọb na ịkpọghachita ndị Izrel ndị m chebere. Aga m emekwa ka ị bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ, ka nzọpụta m site nʼaka gị ruo ndị bi na nsọtụ ụwa niile.”
7 上主,以色列的救主和聖者,向那極受輕慢,為列國所憎惡,且作統治者奴役的人這樣說:「列王必要見而起立,諸侯必要見而下拜:這是因為上主忠實可靠,以色列的聖者揀選了你的緣故。」
Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Onye mgbapụta na Onye nsọ Izrel na-agwa onye ahụ a na-elelị anya, onye ahụ mba kpọrọ ihe arụ, e, onye ahụ ndị na-achị achị mere ka ọ ghọọ ohu ha, “Ndị eze ga-eguzo ọtọ mgbe ị na-agafe. Ndịisi na-achị achị ga-akpọ isiala nye gị, nʼihi na Onyenwe anyị, Onye kwesiri ntụkwasị obi, Onye nsọ Izrel, ahọpụtala gị.”
8 上主這樣說:在悅納的時候,我俯允了你;在救恩的日期,我幫助了你;我必保護你,使你作為人民的盟約,復興國家,分得荒蕪的產業,
Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: “Nʼoge amara m, aga m aza unu, nʼụbọchị nzọpụta aga m enyere unu aka. Aga m echebe unu, mee ka unu bụrụ ọgbụgba ndụ nye ndị mmadụ, iweghachite ala ahụ na ikegharịkwa ihe nketa ya nke tọgbọrọ nʼefu;
9 好向俘虜說:「你們出來罷!」向在黑暗中的人說:「你們出現罷!」他們將在各路上被牧放,他們的牧場是在一切荒嶺上。
na-asị ndị mkpọrọ, ‘Pụtanụ,’ na-asịkwa ndị nọ nʼọchịchịrị, ‘Pụtanụ nʼihe.’ “Ha ga-adịkwa ka atụrụ m, nọọ nʼakụkụ ụzọ, ndị na-ata ahịhịa nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ, nʼakụkụ ugwu nta niile.
10 他們不餓也不渴,熱風和列日也不損傷他們,因為那憐憫他們的率領著他們,引領他們到水泉傍。
Agụ agaghị agụ ha, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ. Oke anwụ otiti nke ọzara agaghị acha ha ọzọ. Nʼihi na Onyenwe anyị ga-esite nʼobi ebere ya duo ha nʼakụkụ isi iyi jupụtara na mmiri.
11 我要使我的一切山嶺變為大路,並把我的街道修高。
Aga m emekwa ka ugwu ukwu niile ghọọ okporoụzọ, meekwa ka okporoụzọ niile guzozie.
12 看啊!有的由遠方而來,有的由北方和西方而來,還有些由息寧而來。
Lee, ndị m ga-alọghachi, ha ga-esitekwa nʼebe dị anya, ụfọdụ ga-esite nʼugwu, ụfọdụ nʼọdịda anyanwụ, ndị ọzọ ga-esite na mpaghara Aswan.”
13 諸天要歡樂,大地要踴躍,山嶺要歡呼高唱,因為上主安慰了他的百姓,憐恤了他受苦的人們。
Tienụ mkpu ọṅụ, eluigwe niile; ka ụwa ṅụrịa ọṅụ. Ugwu ukwu niile, bụọnụ abụ, nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi. Ọ ga-enwekwa obi ebere nʼihi iru ụjụ ha.
14 熙雍曾說過:「上主離棄了我,吾主忘掉了我。」
Ma Zayọn sịrị, “Onyenwe anyị agbakụtala m azụ; Onyenwe m echefuola m.”
15 婦女豈能忘掉自己的乳嬰﹖出為人母的,豈能忘掉親生的兒子﹖縱然她們能忘掉,我也不能忘掉你啊﹖
“Nwanyị ọ pụrụ ichezọ nwa ya na-aṅụ ara, hapụ inwe obi ebere nʼahụ nwa si nʼafọ ya? Eleghị anya ọ pụrụ ichezọ, ma agaghị m echezọ unu.
16 看哪!我已把你刻在我的手掌上,你的城牆時常在我的眼前。
Lee, edeela m aha gị nʼọbụaka m, nʼihu m kwa ka m debere foto mgbidi gị nke ga-adịgide.
17 建築你的工人急速動工,那毀滅你和破壞你的,要離你遠去。
Ụmụ gị emeela ngwangwa lọghachite, ndị ahụ mere ka ị tọgbọrọ nʼefu ga-esi nʼime gị pụọ.
18 你舉目四望罷!他們都已集合到你這裏來;我永遠生活--上主的斷語--他們必如裝飾品穿戴在你身上,把你裝扮得有如新娘。
Welie anya gị abụọ lee gburugburu, legharịa anya, ụmụ gị niile na-ezukọta na-alọghachikwute gị. Dịka m na-adị ndụ,” ka Onyenwe anyị kwubiri. “Ị ga-eyi ha niile dịka ọla ịchọ mma, ị ga-ekekwa ha dịka nwanyị a na-alụ ọhụrụ si eme.
19 至於你的廢址,你那荒蕪和遭蹂躪之地,如今為你的居民都太狹小了,因為吞噬你的人已遠離他去。
“Ọ bụ ezie na e bibiri gị, mee ka ị tọgbọrọ nʼefu, ala gị abụrụ nkpọnkpọ ebe, ma ugbu a, ị gaghị ezuru ndị gị, otu a kwa, ndị ahụ ripịara gị ga-anọ gị nʼebe dị anya.
20 連你在不孕期中所生的子女也要說給你聽:「這地方為我太狹小了,請給我一個住處罷!」
Ụmụ niile a mụrụ nʼoge ọnwụ gbabara gị aka, ga-asịkwa na ntị gị, ‘Ebe a dịrị anyị oke ntakịrị, nye anyị ebe sara mbara karịa nke anyị ga-ebi nʼime ya.’
21 那時你心裏會問:「誰給我生育了這些人呢﹖我原是不妊不孕的,【且是流放被逐的,】這些人是誰給我養大的﹖看!我本是孤苦零丁的,他們卻是從那裏來的﹖」
Mgbe ahụ, ị ga-eche nʼime onwe gị sị, ‘Onye mụtaara m ọtụtụ ụmụ ndị a niile? A dịrị m ka nwanyị na-amụghị nwa maọbụ onye ụmụ ya nwụchara. Onye ajụrụ ajụ na nke e mere ka ọ gaa biri nʼala ọzọ. Mụ onwe m fọdụrụ, naanị m. Onye kwa mụụrụ m ụmụ ndị a? Onye zụlitere ha?’”
22 吾主上主這樣說:「看!我要向列邦高舉我的手,向萬民樹起我的旗幟;他們必要把你的兒子抱在懷中帶來,把你的女兒放在肩上背來。
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “Lee, aga m akpọku ndị mba ọzọ, weliere ha ọkọlọtọ m, ha ga-ekulatara gị ụmụ gị ndị ikom nʼaka ha. Ụmụ ndị inyom ka ha ga-ekukwasị nʼubu ha kulatakwa ha.
23 列王要作你的養父,皇后要當你的保姆。他們要在你面前俯伏在地,並要舔去你腳上的塵土;那時你將知道:我是上主;凡仰賴我的,決不會蒙羞。」
Ndị eze ga-abụkwa ndị nna na-azụ ụmụ gị, ndị eze nwanyị ha ga-abụkwa ndị inyom na-enye ụmụ gị ara. Ha ga-akpọ isiala nye gị, rachakwaa aja dị nʼụkwụ gị abụọ. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, matakwa na ihere agaghị eme ndị niile na-ele anya inyeaka m.”
24 獵物豈能由勇士手中奪回﹖俘虜豈能由強者手中救出﹖
A ga-anara dike nʼagha ihe ọ lụtara nʼagha, maọbụ zọpụta ndị a dọọrọ nʼagha site nʼaka onye afọ tara mmiri?
25 但是,上主這樣說:「俘虜必要由勇士手中奪回,獵物必要由強者手中救出。我必與同你爭奪的人爭奪,我必拯救你的子孫。
Ma otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼezie, a ga-esi nʼaka ndị bụ dike nʼagha pụnara ha ndị ha dọtara nʼagha. A ga-esitekwa nʼaka onye na-akpa ike napụta ya ihe ọ dọtara nʼagha. Nʼihi na aga m ebuso ha agha bụ ndị niile na-ebuso gị agha. Aga m anapụtakwa ụmụ gị.
26 我要使壓迫你的人吃自己的肉,喝自己的血如喝新酒。如此,凡有血肉的人都知道我是上主,是你的拯救者,是你的救主,是雅各伯的大能者。」
Aga m eme ka ndị na-akpagbu gị rie anụ ahụ onwe ha; ha ga-aṅụ ọbara onwe ha ṅụbiga ya oke, dịka mmanya. Mgbe ahụ, ihe niile bụ mmadụ nʼụwa ga-amata, na mụ onwe m Onyenwe anyị, bụ Onye na-azọpụta gị, Onye mgbapụta gị, na Onye dị ike nke Jekọb.”

< 以賽亞書 49 >