< 以賽亞書 45 >

1 上主這樣對他的受傅者居魯士說:--我牽著他的右手,使他蹂躪他面前的列國,解除列王的腰帶;我在他前開啟城門,使門戶不再關閉--「
“Nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu nye ohu ya nke o tere mmanụ, bụ Sairọs, onye m ga-eji aka nri ya megide mba niile, mee ka ha nọrọ nʼokpuru ya, napụkwa ndị eze ngwa agha ha niile, megheere ya ọnụ ụzọ niile nke na ọ dịkwaghị ọnụ ụzọ ama a ga-emechibido ya.
2 我要走在你前面,把岐嶇的路修平;我要把銅門打破,將鐵閂擊碎,
Mụ onwe m ga-ebu ụzọ gaa nʼihu gị kwazee ugwu ukwu niile, tiwasịa ibo ọnụ ụzọ bronz niile gbuwakwaa mkpọrọ igwe dị iche iche.
3 把隱藏的錢財和秘密的寶物賜給你,為叫你知道:是我上主,以色列的天主,提著你的名召叫了你。
Aga m enye gị akụ niile e zoro nʼebe ọchịchịrị gbara, akụnụba niile e zoro nʼebe nzuzo dị iche iche. Ka ị mata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, onye ahụ kpọrọ gị aha, na-eme ihe ndị a niile.
4 為了我的僕人雅各伯和我揀選的以色列的緣故,我提著你的名召叫了你,給你起了這個稱號,縱然你還不認識我。
Nʼihi Jekọb bụ ohu m, nʼihi Izrel onye m họpụtara nye onwe m, ka m ji kpọọ gị aha gị nyekwa gị aha nke nsọpụrụ, maọbụ ezie na ị maghị onye m bụ.
5 我是上主,再沒有另一位;除我以外,沒有別的神;雖然你還不認識我,我卻武裝了你,
Ọ bụ m bụ Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị; ewezuga m, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị. Ọ bụ ezie na ị maghị m, ma aga m eme ka ị dịrị ike.
6 為叫從日出到日落之地的人都知道:除我之外,再沒有另一位。我是上主,再沒有另一位;
Mgbe ahụ, ụwa niile, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, ga-amata nʼezie na Chineke ọzọ adịghị, karịa m. Abụ m Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị.
7 是我造了光明,造了黑暗;造了幸福,降了災禍:是我上主造成了這一切。」
Ọ bụ m kpụrụ ìhè, keekwa ọchịchịrị. Ọ bụ m na-ezite ọganihu, na-ekekwa ịla nʼiyi. Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, na-eme ihe ndị a niile.
8 諸天,請由上滴下甘露,望雲彩降下仁義,願大地裂開生出救恩,願正義一同出生!我上主創造了這事。
“Gị, eluigwe, zodata ezi omume m ka mbara eluigwe na-ezodakwa ya dịka mmiri. Ka ala meghee onwe ya, ka nzọpụta pupụta, ka ezi omume soro ya puokwa dịka ahịhịa. Ọ bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị kere ha niile.
9 禍哉,那與自己的製造者爭辯的!瓦器豈能與摶泥者爭辯﹖陶器豈能對陶工說:「你做的是什麼啊!」或說:「你手製的不精美!」
“Ahụhụ na-adịrị mmadụ ahụ nke na-alụso onye kere ya ọgụ, mmadụ ahụ bụ otu mpekele ejuju nʼetiti mpekele ejuju niile dị nʼala. Ụrọ ọ na-ajụ onye ji ya akpụ ihe ajụjụ sị, ‘Gịnị ka i ji m akpụ?’ Ka ọrụ gị ọ ga-asị, ‘Lee, ọ dịghị aka abụọ o nwere’?
10 禍哉!那向父親說:「你為什麼生子﹖」或向母親說:「你為什麼生育」的人!
Ahụhụ na-adịrị nwantakịrị ahụ gwara nna ya okwu sị, ‘Gịnị ka ị mụtara na nwa?’ maọbụ sịkwa nne ya, ‘Gịnị bụ ihe ị mụpụtara?’
11 以色列的聖者、安排將來的上主這樣說:「關於我子女的事,你們要質問我嗎﹖或者對我手中的工作,你們有所吩咐嗎!
“Otu a ka Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel, Onye kere Izrel na-ajụ ajụjụ sị; banyere ihe ndị gaje ime ị na-ajụ m ajụjụ banyere ụmụ m, maọbụ nye m iwu banyere ọrụ aka m?
12 是我造了大地,又造了地上的人;是我親手展開了諸天,佈置了天上的星辰;
Ọ bụ mụ onwe m kere ụwa, keekwa mmadụ ka o biri nʼime ya. Aka m abụọ ka m ji gbasaa mbara igwe, nyekwa kpakpando niile iwu.
13 是我由於仁義喚起了他;我要修平他的道路,他要修建我的城池,遣回我的俘虜,而不索取贖金,也不要求報酬。」這是萬軍上主說的。
M ga-akpọlite Sairọs nʼezi omume m: M ga-eme ka ụzọ ya niile zie ezi. Ọ ga-ewughachi obodo m, mee ka ndị m a dọtara nʼagha nwere onwe ha, ma ọ bụghị nʼihi ọnụahịa maọbụ ihe nrite, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.”
14 上主這樣說:「埃及的工人,雇士的商人,以及色巴的巨人,都要過來,歸屬於你;他們都要帶著鎖鍊追隨你後;並俯伏在你面前,懇求你說:惟獨你這裏有天主,以外沒有別的神明。」
Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Ihe ndị Ijipt rụpụtara na ngwa ahịa ndị Kush na ndị Saba ahụ toro ogologo, ha ga-abịakwute gị, ha ga-abụ nke gị; ha ga-esokwa gị nʼazụ dịka ndị mkpọrọ e kere agbụ. Ha ga-akpọ isiala nʼihu gị rịọ gị arịrịọ, na-asị, ‘Nʼezie, ọ bụ naanị otu Chineke dị, onye nọnyere gị, ọ dịkwaghị chi ọzọ dị.’”
15 以色列的天主,救主!你真是隱密的天主。
Nʼezie, gị onwe gị bụ Chineke, Onye nzọpụta Izrel. Ị bụkwa Chineke, onye na-ezonarị mmadụ onwe ya.
16 製造偶像的人必蒙羞受辱,一同歸於羞慚。
A ga-eme ndị niile na-akpụ arụsị ihe ihere, e, ihere ga-eme ha nʼihi na a ga-etinye ha nʼọnọdụ oke ihere.
17 但以色列必因上主而得救,獲享永遠的救恩:你們不會蒙羞受辱,直到永遠。
Ma Onyenwe anyị ga-eji nzọpụta nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi zọpụta Izrel. Ihere agaghị eme ha. A gaghị etinyekwa ha nʼọnọdụ ihe ihere ruo mgbe ebighị ebi.
18 因為那創造諸天的上主--只有他是天主,是他創造、形成和奠定了大地:他並非創造了一團混沌,而是為使人居住纔造了它--他這樣說:「我是上主,沒有另一位。
Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe sịrị, ọ bụ ya dobekwara ihe niile nʼọnọdụ ha. Ọ bụ ya, bụ Chineke, onye zubere ma kee ụwa, tọkwaa ntọala ya. O keghị ụwa ka ọ tọgbọrọ nʼefu, kama ọ bụ ka e biri nʼime ya ka o ji kee ya. Ọ sịrị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị; ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị.
19 我沒有在隱秘處或黑暗之地說過話,我沒有給雅各伯的子孫說過:你們徒然尋求了我!我上主,只說真實,惟講公理。
Ọ bụghị na nzuzo ka m kwuru okwu, site nʼotu ebe nʼala nke ọchịchịrị. Agwaghị m mkpụrụ Jekọb ‘Chọọnụ m nʼefu.’ Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị na-ekwu eziokwu, Ana m ekwupụta ihe ziri ezi.
20 列國的餘民!你們一起集合起來,一同前來罷!凡抬過偶像,敬拜過不能施救的神祇的,真是無知!
“Chịkọtaanụ onwe unu, gbakọtanụ, bịanụ nso, unu ndị si na mba niile gbapụta ọsọ ndụ. Ha amaghị ihe bụ ndị a na-ebugharị chi osisi e ji aka mee, ndị na-ekpekwara chi ndị ahụ na-enweghị ike ịzọpụta ekpere.
21 請你們陳述,請你們證明,也讓你們一同商量商量:是誰從古時就叫人聽到這事呢﹖是誰早已宣佈了呢﹖不是我,上主嗎!的確,除我以外,沒有別的神!除我以外,再沒有一個仁義的神和救主。
Kwupụtanụ ihe kwesiri ịdị, gosinụ ya, ka ha gbaakọkwa izu. Onye buru ụzọ kwuo ihe ndị a nʼoge gara aga, onye kwupụtara ya site na mgbe ochie? Ọ bụghị mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị? Ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị mụ onwe m, Chineke onye ezi omume na Onye nzọpụta; ọ dịghị onye ọzọ dị ma ewezuga m.
22 大地四極的人!你們歸依我,必能得救,因為只有我是天主,再沒有另一個。
“Laghachikwutenụ m, ka m zọpụta unu. Laghachikwutenụ m, unu ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa. Nʼihi na ọ bụ naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị chi ọzọ dị.
23 我指著我自己起誓:真理一出我口,那話決不返回;人人都將向我屈膝,眾舌都要指著我起誓。
Ejirila m onwe m ṅụọ iyi, ọnụ m ekwupụla okwu nʼezi omume, bụ okwu nke na-enweghị mgbanwe: Nʼihu m ka ikpere niile ọbụla ga-egbu nʼala; mụ ka ire niile ọbụla ga-aṅụrụ iyi.
24 人都要說:唯有在上主前有仁義和力量。凡向他發怒的,必要含羞地歸依他。
E, ha ga-ekwupụta sị, ‘Ọ bụ nʼime Onyenwe anyị naanị ka ezi omume na ike dị.’” Ndị niile na-akpọ ya asị ga-abịakwute ya. Ihere ga-emekwa ha.
25 以色列所有的後裔,必要因上主獲勝誇耀。」
Ma agbụrụ niile nke Izrel ga-achọta nnapụta ha nʼime Onyenwe anyị, ọ bụkwa na ya ka ha ga-anya isi.

< 以賽亞書 45 >