< 以賽亞書 41 >

1 群島啊!請肅靜聽我!讓萬民前來!讓他們前來開口說話;讓我們一起互相辯論!
Nọrọnụ jụụ nʼihu m, unu mba niile mmiri gbara gburugburu! Ka mba niile gbanwee ike ha. Ka ha pụta kwuo okwu. Ka anyị zukọtaa nʼebe ikpe ikpe.
2 是誰由東方喚醒了那人,使他步步遇到勝利﹖是誰將眾民交付給他,又使列王臣服於他呢﹖他的刀劍使他們化為灰塵,他的弓箭分散他們有如草芥。
“Onye kpọtere onye a sitere nʼọwụwa anyanwụ na-abịa, onye e sitere nʼezi omume kpọọ ya ije ozi? O weere mba niile nyefee ya nʼaka, meriekwa ndị eze nʼihu ya. O ji mma agha ya tie ha mee ka ha ghọọ uzuzu, jiri ụta ya mee ka ha ghọọkwa igbugbo ọka nke ifufe na-ebugharị.
3 他追擊他們時,平安地經過;他的腳好像沒有踏著道路一樣。
Ọ na-achụ ha ọsọ, ma na-agakwa nʼihu na-enweghị mmerụ ahụ ọbụla. E, ọ na-agbasokwa ụzọ nke ọ na-agabeghị mbụ.
4 是誰從原始安排了歷代的事而予以實行成就呢﹖我,上主,是元始,與最末者同在的也是我。
Ọ bụ onye rụrụ ọrụ dị otu a mezukwa ya, na-akpọ ọgbọ niile site na mmalite? Ọ bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, onye dị siterị na mbido ihe niile, onye ga-adịgidekwa ruo ọgwụgwụ ihe niile. Ọ bụ mụ onwe m bụ onye ahụ.”
5 群島一見即害怕起來,地極為之震動,遂都聚集前來;
Mba niile bi nʼala mmiri gbara gburugburu ahụla ọrụ m rụrụ. Ha hụrụ ya tụọ egwu; ndị niile bi na nsọtụ ụwa na-amakwa jijiji. Ha zukọtara bịa nso.
6 彼此相助,並對自己的同伴說:「勇敢些!」
Onye ọbụla nʼime ha na-agba ibe ya ume na-asị, “Nwee obi ike.”
7 工匠鼓勵金匠,掄大鎚的鼓勵使小錘的,誇讚鉛工說:「鉛的好!」遂用釘子釘住,使偶像不致動搖。
Onye ọkpụ ụzụ ọla na-agba onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ume. Onye ji mkpirisi igwe eme ka ihe dị mụrụmụrụ, na-agba onye na-akụ osiama ume. Otu onye na-ekwu banyere nkpukọta ya, na-asị, “A kpụziri ya akpụzi.” Onye nke ọzọ, na-eji ǹtu kpọgidesie ihe ahụ apịrị apị ike ka ọ ghara ịda.
8 但是你,我的僕人以色列,我所揀選的雅各伯,我的好友亞巴郎的苗裔,
“Ma gị onwe gị, Izrel, ohu m, Jekọb, onye m họpụtara, gị mkpụrụ Ebraham, bụ enyi m.
9 你是我由地極領來的,是我從遠方召來的,我曾向你說過:「你是我的僕人,我揀選了你,我決不放棄你。」
Esitere m na nsọtụ niile nke ụwa kpọghachi unu, gwa unu na ohu m ka unu bụ, nʼihi na ahọpụtala m unu, agakwaghị m ahapụ unu.
10 你不要害怕,因為我與你在一起;你不要驚惶,因為我是你的天主;我必堅固你,協助你,用我勝利的右手扶持你。
Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu. Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka; aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu.
11 凡向你洩怒的,必蒙羞受辱;凡同你爭辯的,必要滅亡,化為烏有。
“Lee! A ga-etinye ndị niile iwe ha dị ọkụ megide unu nʼọnọdụ ihe ihere, ihere ga-emekwa ha. Ndị niile na-eguzogide unu ga-aghọ ihe efu, bụrụ ndị lara nʼiyi.
12 凡與你爭吵的人,你找他們,也找不到。凡與你交戰的人,必化為烏有,歸於虛無,
Unu ga-ele anya ha, chọọ ha, ma ọ dịghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ. Ndị a na-ebuso unu agha ga-abụ naanị ihe efu.
13 因為是我,上主,你的天主,提攜著你的右手,向你說過:「不要害怕,有我協助你。」
Nʼihi na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, onye na-ejidesi aka nri gị ike bụ onye na-asị gị, ‘Atụla egwu; aga m enyere gị aka.’
14 雅各伯蟲豸啊!以色列蛆蟲啊!不要害怕,我必協助你--上主的斷語--你的救主是以色列的聖者。
Atụla egwu, gị idide, bụ Jekọb, unu Izrel dị nta, atụla egwu, nʼihi na mụ onwe m ga-enyere gị aka,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, Onye mgbapụta gị, bụ Onye nsọ nke Izrel.
15 看啊,我使你成為一架鋒利多齒的新打禾機,叫你壓搾高山,壓得粉碎,使丘陵變為碎末。
“Lee, aga m eme ka unu ghọọ igwe ọhụrụ eji azọcha mkpụrụ ọka nke dị nkọ, nwekwa ọtụtụ eze. Unu ga-azọcha ugwu niile zọpịa ha, meekwa ka ugwu nta niile dịka igbugbo ọka.
16 你要簸揚它們,風必將它們捲去,暴風必吹散它們;然而你要因上主而喜樂,因以色列的聖者而誇耀。
Unu ga-ayọgharị, fụchaa ha; ikuku ga-eburu ha bufuo, oke ikuku ga-ekposasị ha. Ma unu ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, nyaakwa isi nʼime Onye dị nsọ nke Izrel.
17 貧困和窮苦的人,若找水而無所獲,他們的舌頭渴得焦燥,我上主必俯允他們,我,以色列的天主必不棄捨他們。
“Mgbe mmiri ọṅụṅụ kọrọ ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa, mgbe ha na-enweghị ike ịchọta mmiri ọṅụṅụ mgbe akpịrị na-akpọ ha nkụ nʼihi agụụ mmiri, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-aza ha. Mụ onwe m, bụ Chineke nke Izrel, agaghị agbakụta ha azụ.
18 我要在禿山上開闢河流,在空谷中噴出泉源;我要使沙漠變為池沼,使乾地化為噴泉。
Aga m eme ka mmiri site nʼala kpọrọ nkụ nke ugwu niile na-erudatara ha. Aga m eme ka isi iyi na-asọpụta na ndagwurugwu niile. Aga m eme ka mmiri jupụta nʼọzara, meekwa ka isi iyi mmiri site nʼala kpọrọ nkụ na-asọpụta.
19 我要在沙漠中種植香柏木、皂莢、桃金娘和橄欖樹;在荒野中要把柏樹、榆樹和雲杉樹一起栽植起來;
Aga m akụ nʼọzara, osisi sida, na osisi akashia, na osisi mietul, na osisi oliv. M ga-eji osisi junipa, na osisi saipres na osisi fịa, kụkọta ha ọnụ nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu,
20 為使人們看見,知道,同時因深思而瞭解:這是上主的手所做的,是以色列的聖者所創造的。
ka ndị mmadụ hụ, matakwa, tuleekwa uche ma ghọta, na ọ bụ aka Onyenwe anyị mere nke a, na ọ bụ Onye nsọ nke Izrel kere ya.
21 拿出你的理由來,上主說:呈上你的證據來,雅各伯的君王說。
“Wepụtanụ mkpesa unu,” ka Onyenwe anyị sịrị, “Doo okwu unu nʼusoro,” ka Eze nke Jekọb na-asịkwa.
22 讓他們前來,告訴我們將要發生什麼事;讓他們告訴我們,那以往的事有什麼意義,好叫我們記在心中;或者讓我們聽聽那要來的事罷,好叫我們知道那事的結果。
“Ka ha bubata arụsị ndị a, ma gwa anyị, ihe gaje ime. Ka ha gwa anyị ihe mere nʼoge gara aga, ihe ha pụtara, ka anyị nwee ike tulee ha matakwa ihe ga-abụ ikpeazụ ha. Maọbụ kwupụtara anyị ihe ndị ahụ na-abịa,
23 請你們說說那以後要來的事,好叫我們知道你們是神;無論好壞請你們做一下,好叫我們都驚奇害怕。
gwa anyị ihe ọdịnihu ji, ka anyị mara na unu bụ chi. Meenụ ezi ihe, maọbụ ihe ọjọọ, nke ga-eme ka anya gbagwojuo anyị, ka anyị jupụtakwa nʼegwu.
24 看哪!你們竟是烏有,你們的工作也是虛無;那選擇你們的實在可憎。
Ma unu dị nta karịa ihe efu. Ọrụ unu niile bụkwa ihe na-abaghị uru. Onye họọrọ unu emeela onwe ya ihe arụ.
25 我由北方喚起了一個人,他就來了;我由日出之地呼喚了他的名字,他將蹂躪王侯有如泥濘,又如陶工踐踏黏土。
“Akpọliela m otu onye site nʼakụkụ ugwu, ọ na-abịakwa. Otu onye na-asọpụrụ aha m sikwa nʼọwụwa anyanwụ. Ọ na-azọpịa ndị ọchịchị niile dịka ha bụ ụrọ, ọ ga-azọpịa ha dịka onye na-akpụ ite si azọpịa aja ụrọ.
26 誰首先說過這事,好叫我們知道,在事前說過,而叫我們說「對啦﹖」實在沒有一個預言過,沒有一個講過,也沒有一個聽見過你們說話。
O kwuru maka nke a site na mmalite, ka anyị nwee ike mara, maọbụ mgbe na o mebeghị, ka anyị nwee ike sị, ‘Ihe o kwuru ziri ezi’? O nweghị onye kwuru ihe banyere nke a, o nweghịkwa onye mere ka amata ya, o nwekwaghị onye si nʼọnụ gị nụ okwu ọbụla.
27 只有我是第一位給熙雍報告過這事,給耶路撒冷遣發了一位報告喜訊的。
Abụ m onye mbụ gwara Zayọn, ‘Lee, nʼebe a ka ha dị!’ Ọ bụ m ziteere Jerusalem onyeozi oziọma.
28 我環視四周,了無一人;他們中沒有一個可做謀士,向他詢問,可回答一句的。
Elegharịrị m anya ma o nweghị onye m hụrụ. O nweghị onye nọ nʼetiti chi ha nke nwere ike inye ndụmọdụ; o nweghị onye inye ọsịsa ajụjụ mgbe m jụrụ ha.
29 看哪,他們都是烏有,他們的工作是虛無,他們的鑄像是空氣,是空氣。
Lee, ha niile bụ ụgha! Ọrụ ha niile pụtara ihe efu, arụsị ha niile awuru awu bụ naanị ifufe na ọgbaaghara.

< 以賽亞書 41 >