< 以賽亞書 30 >

1 禍哉,悖逆的子民--上主的斷語!他們自作主張,不請示於我;自訂盟約,不依照我的精神,致使罪上加罪。
“Ahụhụ ga-adịrị ụmụ ndị nnupu isi,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “bụ ndị na-agbaso nzube nke na-esiteghị nʼaka m, ndị ha na ndị ọzọ na-agba ndụ nke Mmụọ m na-anabataghị, si otu a na-eme ka mmehie na-aba ụba nʼelu mmehie.
2 他們沒有請求我的許可,便起程南下埃及,想託庇於法郎的保障之下,想隱匿於埃及的蔭庇之下。
Ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka ma ha ajụtaghị ase site nʼaka m. Ndị were obi ha tụkwasị na Fero maka nchebe, chọsiekwa ike ime Ijipt ebe mgbaba.
3 但是法郎的保障將是你們的羞恥,隱匿於埃及的蔭庇之下,將是一種污辱。
Ma nchekwa Fero ga-aghọrọ unu ihe ihere, ndo ndị Ijipt ga-etinye unu nʼọnọdụ mweda nʼala.
4 雖然他的首領已在左罕,他的使者已到達哈乃斯;
Ọ bụ ezie na ha nwere ndị ozi na Zoan ndị nnọchi anya ha erutekwala Hans,
5 但是他們都要因這於他們毫無裨益的民族而受到羞慚,因為這民族為他們不但毫無幫助,毫無益處,反而是一種羞恥和污辱。
ihere ga-eme onye ọbụla nʼihi ndị na-abaghị uru nye ha, ndị na-abụghị ihe inyeaka maọbụ ihe iba uru, kama naanị ihe ihere na ịta ụta.”
6 他們以牲畜帶著貴物經過南方--殘酷苦痛的地域,即壯獅和牝獅咆哮,蝮蛇和火蛇飛行的地域--驢背上駝著他們的財富,駱駝背上駝著他們的寶物,到一個於他們毫無裨益的民族那裏去。
Amụma banyere ụmụ anụmanụ bi na Negev. Nʼala ahụhụ na mkpagbu, nke ọdụm na nne ọdụm, nke ajụala na agwọ ọjọọ na-efe ka ọkụ, ndị nnọchite anya obodo na-ebu akụ ha niile nʼelu ịnyịnya ibu, na-ebukwa akụnụba ha dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya kamel, na-agakwuru mba ahụ na-abaghị uru,
7 埃及人的援助是無用的,是空虛的,因此我稱呼她是「靜坐的辣哈布。」
bụ Ijipt, ndị inyeaka ha na-enye enweghị isi. Nʼihi nke a, ana m agụ ya Rehab, onye na-enweghị ihe ọ na-arụ.
8 你現在去,當他們面前,寫在版上,記在書中,為後世作證據:「
Gaa ugbu a, dekwasịrị ha ya nʼelu mbadamba nkume, detuokwa ha nʼime akwụkwọ, ka ọ dịrị maka ụbọchị na-abịa dịka ihe akaebe ruo mgbe ebighị ebi.
9 這是一個反叛的民族,不忠實的子女,拒絕聽從上主法律的子民。」
Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enupu isi, ụmụ aghụghọ ndị kpachaara anya jụ ịnabata ozizi Onyenwe anyị na-ezi.
10 他們曾對先見者說:「你們不要再看異象。」對先知說:「你們不要給我們說什麼預言,給我們說些好聽的話,預示些幻想故事罷!
Ha na-agwa ndị ọhụ ụzọ, “Unu ahụkwala ọhụ, o zuola,” ma sịkwa ndị amụma, “Mechienụ ọnụ! Unu ahụtakwarala anyị ihe ziri ezi nʼọhụ unu. Gwanụ anyị ihe na-atọ ụtọ na ntị, buonu amụma nduhie.
11 離開你們的正道罷!轉移你們的路線罷!在我們面前不要再提以色列的聖者!」
Unu na-anọchiri anyị ụzọ, nyenụ anyị ohere. Anyị achọkwaghị ịnụ ihe ọbụla banyere onye ahụ unu na-akpọ Onye dị nsọ nke Izrel.”
12 因此,以色列的聖者這樣說:「因為你們藐視了這話,而依賴邪說謬論,且傾心信賴;
Ya mere, ihe a ka Onye dị nsọ nke Izrel na-ekwu, “Nʼihi na unu kpọrọ okwu m na-agwa unu asị, ma dabere na mmegbu na-atụkwasịkwa obi unu nʼaghụghọ,
13 所以這罪惡,為你們將如一堵高牆上突起而將倒下的缺口,頃刻之間就會突然坍塌,
mmehie a ga-aghọrọ unu ihe dịka mgbidi dị elu, nke gbawara agbawa, nke ga-ada na mberede, nʼotu ntabi anya.
14 坍塌得有如毫不痛惜地被摔碎的陶器,碎得找不到一塊碎片,能用以從爐中取火,從井裏取水。」
Ọ ga-etipịasị dịka ite aja, nke etipịara na-enweghị obi ebere, nke a na-enweghị ike ịchọta mpekele ejuju ọbụla nʼetiti ya, iji gụta ọkụ site na-ekwu, maọbụ kupụta mmiri site nʼite.”
15 因為吾主上主,以色列的聖者這樣說過:「你們的得救是在於歸依和安靜,你們的力量是在於寧靜和信賴。」然而你們不願意;
Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nsọ nke Izrel sịrị, “Ọ bụ na nchegharị na izuike ka a ga-azọpụta unu, na ịnọ juu na ntụkwasị obi ka ịdị ike unu ga-adị, ma unu ekweghị na nke ọbụla.
16 你們反說:「不!我們要騎馬逃去!」的確,你們必要逃去。「我們要乘駿馬疾馳。」的確,追擊你們的必然疾馳。
Kama unu na-asị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼelu ịnyịnya gbapụ.’ E, unu ga-agba ọsọ nʼezie. Unu sịrị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼịnyịnya ndị na-efe ọsọ.’ Ya mere, ndị ga-achụ unu ga-adị ngwa.
17 千人要逃避一人的叱咋,萬人要逃避五人的叱咋,直到你們所剩餘的,有如山頂上的木杆,或山嶺上的旗幟。
Otu onye nʼime ndị iro unu ga-achụ puku mmadụ nʼime unu ọsọ. Mmadụ ise si nʼime ha ezuola ịchusasị unu, ruo mgbe unu ga-adị ka osisi a manyere ọkọlọtọ debe nʼelu ugwu, e, ka ọkọlọtọ a hapụrụ nʼelu ugwu nta.”
18 然而上主仍舊等著向你們施惠,仍高興向你們表示憐愛,因為上主是正義的天主,凡仰賴他的人是有福的。
Ma Onyenwe anyị nọkwa na-echere ka unu bịakwute ya, ka o gosi unu ịhụnanya ya. O jikeere imere unu ebere, nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi. Ngọzị na-adịkwara ndị niile na-ele anya inyeaka ya.
19 熙雍的百姓,耶路撒冷的居民啊 !你不會再慟哭,他必垂憐你呼求的聲音,他一聽見必要應允你。
Unu ndị Zayọn ndị bi na Jerusalem, ndị nke m, unu agaghị ebekwa akwa ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye obi ebere. Ọ ga-enyere unu aka mgbe ọbụla unu kpọkuru ya.
20 吾主縱然給你們困苦的食物和酸辛的水,但你的教師再不躲藏,你的眼睛必能常見到你的教師。
Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị na-enye unu achịcha nke nhụju anya na mmiri nke ahụhụ, ndị ozizi unu agaghị abụkwa ndị zoro onwe ha ọzọ, kama unu ga-eji anya unu hụ ha.
21 當你偏左或偏右時,你必會親耳聽到你後面有聲音說:「這是正路,你們要在這上面行!」
Ma unu tụgharịrị nʼaka nri ma ọ bụkwanụ nʼaka ekpe, ntị unu ga-anụ otu olu nʼazụ unu, nke na-asị, “Nke a bụ ụzọ, Jeenụ ije nʼime ya.”
22 你必以那包銀的木偶和包金的神像為不潔之物,將它們拋棄,有如拋棄月經布一樣,並對它說:「去罷!」
Mgbe ahụ kwa, unu ga-emebi arụsị unu niile, nke e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ. Unu ga-atụfukwa ha dịka ihe ruru unyi, nke na-asọ oyi. Unu ga-asị ha, “Pụọnụ nʼebe a!”
23 你把種子種在地裏,上主必使雨降在其上,並使你地裏出產的食糧豐盛富饒;那一日你的群畜必將在廣闊的草場上牧放。
Ọ ga-ezitekwa mmiri ozuzo maka mkpụrụ unu kụrụ nʼala ubi unu, ihe omume nke ga-esite nʼala ahụ pụta ga-ama abụba baakwa ụba. Nʼụbọchị ahụ anụ ụlọ unu ga-ata nri nʼebe ịta nri sara mbara.
24 耕田的牛和驢駒必吃用木杴或簸箕揚淨而拌上鹽的芻料。
Ehi na ịnyịnya ibu ndị na-arụ ọrụ ubi ga-ata nri a gwara nke ọma nke nnu dị, nke eji ngwa ọrụ ịfụcha ọka na shọvel kpasaa nke ọma.
25 大行慘殺之日,當保樓倒塌之時,所有的高山峻嶺必有溪水涓涓細流。
Nʼelu ugwu ọbụla dị elu na nʼelu ugwu nta ọbụla dị elu, ka iyi na mmiri niile ga-eru, nʼụbọchị oke ogbugbu, mgbe ụlọ elu niile ga-ada.
26 當上主包紮他百姓的創口,治療他們傷痕的那日,月亮的光華將似太陽的光華,而太陽的光華必增加七倍,有如積累了七天的光華。
Ọnwa ga-amụke dịka anwụ, ìhè anyanwụ ga-adịkwa okpukpu asaa dịka ìhè ụbọchị asaa e mere ka ọ mụọ nʼotu ụbọchị! Ihe ndị a ga-emezu nʼụbọchị ahụ Onyenwe anyị malitere ikechi na ịgwọ ọnya o mere ka o rute ndị ya aka.
27 看哪!上主的名由遠方而來,他怒火如焚,濃煙衝天;他的口唇滿了敵愾,他的舌頭有如吞噬的火燄;
Lee, Aha Onyenwe anyị ka o si nʼebe dị anya na-abịa! Ọ na-abịa nʼoke iwe, anwụrụ ọkụ gbakwara ya gburugburu. Iwe jupụtara nʼegbugbere ọnụ ya, okwu ya na-erechapụ dịka ọkụ.
28 他的氣息如氾濫的河川,漲到人的頸項;他要用盪滅的篩子篩淨列國,用引入歧途的馬勒拑住萬民的下顎。
Iku ume ya dịkwa ka iyi rubigara oke, nke na-achị ọkụ, nke na-etoru onye nọ nʼime ya nʼolu. Ọ na-ayọcha mba niile nʼime nyọ ịla nʼiyi, ọ na-etinye nʼagba ndị mmadụ eriri igwe nke na-edufu ha.
29 你們必要謳歌,有如歡祝慶節之夜;內心愉快,有如在笛聲之下登上主的山,到以色列的磐石那裏去一樣。
Ma unu ga-abụ abụ dịka unu na-abụ nʼabalị mmemme dị nsọ, obi unu ga-aṅụrị ọṅụ dịka mgbe ndị na-egbu opi na-arịgo elu na-aga nʼugwu nsọ Onyenwe anyị, na-agakwuru Oke Nkume Izrel.
30 上主必使人聽見他尊嚴的聲音,見到他降臨的手臂,在狂怒之中,在吞噬的火燄中,在狂風、暴雨、冰雹之中。
Onyenwe anyị ga-eme ka ndị mmadụ nụ olu ya dị ebube, ọ ga-emekwa ka ha hụ aka ya na-arịdata ala jiri ọnụma nke iwe ya na ọkụ na-erepịa erepịa, jirikwa oke mmiri ozuzo, na egbe eluigwe, na akụmmiri igwe.
31 亞述必因上主的聲音而戰慄,上主必用刑杖擊打亞述。
Olu Onyenwe anyị ga-emenye ndị Asịrịa egwu; ọ ga-eji mkpara igwe ya kụdaa ha nʼala.
32 當上主懲戒的刑杖加於他們身上時,每次擊撻都是在敲鼓和彈琴的聲中執行的。他將以激烈的戰爭擊敗他們。
Ihe otiti ọbụla nke Onyenwe anyị na-eji mkpọ ya, tie ha nʼahụ ga-adị ka egwu ụbọ akwara na une dị iche iche na-enye, mgbe ọ na-eweli aka ya na-eti ha oke ihe otiti dịka ọ na-alụso ha ọgụ.
33 因為托斐特已準備好多時,還是為君王而設的,又深又廣,堆滿了許多柴火;上主的氣 息有如一條硫磺河流,把它點燃起來。
Edoolarị ihe niile nʼusoro site nʼoge gara aga. A kwadoola ebe a ga-akwanye ọkụ nke ga-erechapụ eze ahụ. Ọ bụ ebe sara mbara, nke dị omimi, na nke a kwajuru nkụ. Ọ bụ iku ume Onyenwe anyị nke dịka mwụpụta nke nkume na-enwu ọkụ ka a ga-eji mụnye ya ọkụ.

< 以賽亞書 30 >