< 何西阿書 4 >

1 [後編:以色列的罪惡和懲罰]四:以色列子民,請聽上主的話! 因為上主譴責此地的居民:因為此地沒有誠實,沒有仁愛,沒有人認識天主;
Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Izrel, nʼihi na Onyenwe anyị nwere ebubo megide unu ndị bi nʼala a. “Nʼihi na ọ dịghị ikwesi ntụkwasị obi, ọ dịghị ịhụnanya, ọ dịghịkwa ihe ọmụma banyere Chineke nʼala a niile.
2 只有詛咒、謊言、殺戳、偷竊、姦淫、強暴和纍纍的血案。
Ọ bụ naanị ịbụ ọnụ, ịgha ụgha na igbu mmadụ, izu ohi na ịkwa iko. Ọgbaaghara dị nʼebe niile, ya na ogbugbu mmadụ na-esepụghị aka.
3 因此,此地必要荒廢;凡住在這地上的,甚至田間的野獸和天空的飛鳥都要絕跡,連海中的魚類也要消滅。
Nke a mere ala jiri nọrọ nʼiru ụjụ, ndị niile nọ na ya na-atakwa ahụ, ma anụ ọhịa, ma nnụnụ nke igwe, ọ bụladị azụ dị nʼosimiri ka a na-ekpochapụ.
4 但是沒有人爭辯,也沒有人譴責! 司祭啊,我要與你爭辯!
“Ma otu ọ dị, ka onye ọbụla ghara ise okwu, ka onye ọbụla ghara ibo ibe ya ebubo. Nʼihi na ndị gị dịka ndị na-eseso onye nchụaja okwu.
5 你白天黑夜跌倒,先知也同你一齊跌倒,你竟然使你的人民喪亡。
Ị na-asọ ngọngọ ehihie na abalị, ndị amụma na-esokwa gị sụọ ngọngọ. Nʼihi ya aga m ala nne gị nʼiyi
6 我的百姓因缺乏知識而滅亡;因為你拋棄了知識,我也要拋棄你,不讓你充當我的司祭;你既然忘卻了你的天主的法律,我也要忘記你的子孫。
ndị m ka a na-ala nʼiyi nʼihi na ha amaghị ihe. “Ebe ọ bụ na ị jụrụ ihe ọmụma, aga m ajụkwa gị dị ka onye nchụaja m; ebe ọ bụ na ị gbakụtara iwu Chineke gị azụ mụ onwe m ga-agbakụtakwa ụmụ gị azụ.
7 司祭越增多,也越得罪我,竟以羞辱作為他們的光榮。
Ka ha na-abawanye nʼọnụọgụgụ, otu a ka ha si na-aga nʼihu na-emehie megide m, ha gbanwere Chineke ha dị ebube nʼihi ihe na-eweta ihere.
8 他們賴我百姓的罪惡自肥,一心渴望他們的過犯。
Ha na-eriju afọ site na mmehie ndị m. Ha ji anya ukwu na-achọ ka ha na-emehie na-aga nʼihu.
9 由此百姓和司祭,一律看待:我將按他的行徑懲治他,對他的行為予以報復,
Ọ ga-abụkwa ka ndị nchụaja dị, otu a ka ndị obodo dịkwa. Nʼihi ya, aga m enye ha ntaramahụhụ ma kwụghachi ha ụgwọ nʼihi omume ha niile.
10 好使他們吃,卻吃不飽,行淫而不能繁殖;因為他們捨棄了上主,縱慾,
“Ha ga na-eri ihe ma afọ agaghị eju ha. Ha ga-ebi ndụ akwụna ma ha agaghị amụba, nʼihi na ha ajụla Onyenwe anyị, were onwe ha nyefee
11 行淫:老酒新酒叫人失去良知。
nʼaka ịgba akwụna, na mmanya ochie na mmanya ọhụrụ, nke na-ewepụ mmụọ nghọta.
12 我的人民求教於木偶,讓木杖啟示他;因為淫心迷往了他們,使他們行淫,遠開了他們的天主。
Ndị nke m na-ajụ osisi apịrị apị ase ihe ha ga-eme, na-anata ọsịsa site na mkpara osisi onye ọ na-ajụ ase. Mmụọ nke ịgba akwụna na-eme ka ha kpafuo; ha gbara akwụna ma hapụ Chineke ha.
13 在山頂上獻祭,在丘陵上、在橡樹、楊樹和篤耨香下焚香,在濃蔭下多麼愉快;因此你們的女兒行淫,你的兒媳犯姦。
Ha na-achụ aja nʼelu ugwu niile, na-esure onyinye nsure ọkụ nʼelu ugwu nta niile, na nʼokpuru osisi ook, osisi pọpla na osisi terebint, ebe ndo ya dị ezi mma. Nʼihi nke a ka ụmụ unu ndị inyom na-agba akwụna, ndị nwunye ụmụ unu na-akwa iko.
14 但我卻不因你們的女兒行了淫,而懲罰她們,也不因你們的兒息媳犯了姦,而處罰她們;因為她們同蕩婦走往偏僻之處,又同廟妓一同獻祭:但無知的百姓卻因此而墮落!
“Agaghị m ata ụmụ unu ndị inyom ahụhụ, mgbe ha na-agba akwụna, maọbụ taa ndị nwunye ụmụ nwoke unu ahụhụ mgbe ha na-akwa iko, nʼihi na ndị ikom unu nʼonwe ha na-ejekwuru ndị akwụna, ha na ndị akwụna ụlọ arụsị na-achụkọkwa aja, ma ndị a na-enweghị nghọta ga-ala nʼiyi.
15 以色列,如果你行了淫,但願猶大不要陷於罪惡! 你們不要到基耳加耳去,不要上貝特阿文,也不要起誓願 2上主永在! 」
“Ọ bụ ezie na unu bụ ndị na-akwa iko unu bụ Izrel, ma ka ikpe gharakwa ịma Juda. “Unu agakwala Gilgal, unu agakwala ruo Bet-Aven, unu aṅụkwala iyi sị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ.’
16 的確,以色列倔強,有如一頭倔強的母牛,那麼上主那能牧放他們,有如在廣闊的草場牧放羔羊﹖
Ndị Izrel dị isiike dịka nwaagbọghọ ehi dị isiike. Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa zụọ ha dịka ụmụ atụrụ nʼebe ịta nri sara mbara?
17 厄弗辣因與偶像結了不解之緣:任憑他們吧!
Ifrem na arụsị agbaala ndụ hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya.
18 他們與醉客為伍,任意荒淫,喜愛羞恥勝於上主的光榮。
Ọ bụladị mgbe mmanya ha gwụrụ, ha na-aga nʼihu na-agba akwụna; ha hụrụ ihere nʼanya nke ukwuu karịa otuto ha.
19 暴風要伸展羽翼將他們捲去,他們必因自己的祭壇蒙受恥辱。
Ifufe ga-ebupụ ha, aja ha na-achụ ga-ewetara ha ihere.

< 何西阿書 4 >