< 何西阿書 12 >

1 厄弗辣因愛好颶風,整日追逐東風,說許多謊話,行許多暴行,既與亞述結盟,又給埃及送油。
Akaọrụ Ifrem bụ naanị ịchụso ikuku, ọ na-achụso ikuku si nʼọwụwa anyanwụ bido nʼụtụtụ ruo nʼabalị. Otu a ka ha si eme ka ịgha ụgha, na ime ihe ike na-abawanye ụba. Ha na Asịrịa na-agbakwa ndụ, ha na-ebugakwa mmanụ nʼIjipt.
2 上主要與以色列爭辯,要按他們的行徑懲罰雅各伯,依照他的行為報復他:
Onyenwe anyị na-akpọ Juda ikpe. Ọ ga-ata Jekọb ahụhụ dịka ụzọ ya si dị, kwụghachikwa ya dịka omume ya si dị.
3 他在母胎中就欺騙了他的弟兄,及至壯年又曾與天神搏鬥;
Mgbe ọ nọ nʼafọ nne ya ka o jidere nwanne ya nwoke nʼikiri ụkwụ. Mgbe ọ ghọrọ dimkpa, ya na Chineke gbara mgba.
4 他與天神博鬥,並且獲得了勝利;他哭了,曾懇求他開恩;在貝特耳再遇見了他,在那裏天主對他說:──
E, ya na mmụọ ozi gbara mgba. Nʼoge ahụ, o jidesiri ya aka ike, kwaa akwa, rịọọ ngọzị site nʼaka ya. Ọ hụrụ ya na Betel, gwaakwa ya okwu,
5 上主,萬軍的天主,雅威是他的名號x──
Onyenwe anyị Chineke onye pụrụ ime ihe niile, Onyenwe anyị bụ aha ya.
6 「至於你,你應當歸向你的天主,遵守仁愛和正義,時刻仰望你的天主。」
Ịghaghị ịlọghachikwute Chineke gị, guzosie ike nʼịhụnanya na ikpe ziri ezi, na-elekwa anya Chineke gị mgbe niile.
7 厄弗辣因有如客納罕人,手裏拿著欺詐的天秤,喜行欺騙。
Onye ahịa na-eji ihe ọtụtụ aghụghọ na-erenye ndị mmadụ ahịa, ọ hụrụ imegbu emegbu nʼanya.
8 厄弗辣因說:「我現在實在成了富翁,發了大財。」然而他所獲得的一切,為補贖他所犯的罪孽,仍嫌不夠。
Ifrem kwuru, “Abaala m ọgaranya! Abụrụla m onye nwere akụnụba dị ukwuu! Ọ bụ ezie na m bụ onye nwere akụ dị ukwuu, ma agaghị achọta njehie maọbụ mmehie ọbụla nʼime m.”
9 自從在埃及地時,我就是上主,你的天主:我必再使你住在帳幕中,如在盛會的節日一樣。
“Abụ m Onyenwe anyị na Chineke gị, onye si nʼIjipt kpọpụta unu. Aga m emekwa ka ị biri nʼụlọ ikwu ọzọ, dịka ọ dị nʼoge mmemme ndị ahụ niile a kara aka.
10 是我向先知們說了話,是我增多了異象,我也必藉先知們消滅他們。
A gwara m ndị amụma, ọ bụ m mere ka ha hụ ọhụ dị iche iche, sitekwa nʼọnụ ndị amụma tụọ ilu dị iche iche.”
11 在基肋阿得只有罪惡,的確,他們只是虛無;在基耳加耳 他們向牛犢獻了祭,因此他們的祭壇必將成為田畦中的石堆。
Gilead ọ na-eme ajọ ihe? Ndị ya bụ ndị efulefu. Ha na-achụ aja oke ehi dị iche iche na Gilgal? Ebe ịchụ aja ha niile ga a dịka ebe a chịkọtara ukwu nkume, nke dị nʼubi a kọrọ akọ.
12 雅各伯曾逃到阿蘭平原,以色列曾為娶妻而服役,曾為娶妻而放羊。
Jekọb gbalagara nʼala Aram; Izrel fere ofufe nʼihi inweta nwunye, nʼihi ịkwụ ụgwọ ya, o lekọtara atụrụ.
13 上主曾藉一位先知領以色列出離埃及,也藉一位先知保護了他們。
Ọ bụkwa onye amụma ka Onyenwe anyị ji site nʼIjipt kpọpụta Izrel, o sitekwara nʼaka onye amụma lekọtazie ya anya.
14 但厄弗辣因大大激怒了上主,他的血債必要歸到他身上,他的主必要在他身上報復自己受的凌辱。
Ma Ifrem akpasuola iwe ilu nke ukwuu. Onyenwe ya ga-awụkwasịkwa ya ikpe ọmụma. Ọ ga-akwụghachi ya dịka nlelị ya si dị.

< 何西阿書 12 >