< 創世記 42 >
1 雅各伯見埃及有糧食出售,便對自己的兒子們說:「你們為什麼彼此觀望﹖」
Ugbu a, Jekọb nụrụ na ọka dị nʼIjipt. Ọ sịrị ụmụ ya, “Kedụ ihe anyị jiri nọrọ na-elerịta onwe anyị anya”
2 繼而說:「我聽說在埃及有糧食出售,你們下到那裏,給我們購買些糧食,叫我們好活下去,不致餓死。」
Ọ sịrị, “Lee anụrụ m na ọka dị nʼIjipt. Gbadatanụ nʼebe ahụ zụtara anyị ọka ka anyị dị ndụ ghara ịnwụ.”
Ụmụnne Josef iri ndị ahụ gbadara Ijipt ịzụta ọka.
4 至於若瑟的弟弟本雅明,雅各伯沒有叫他與哥哥們同去,因為他想:怕他遇害。
Ma Jekọb ekweghị ka Benjamin nwanne nta Josef soro ha gaa, nʼihi na ọ tụrụ egwu na ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị ya.
5 這樣以色列的兒子們也夾在前來購糧的人中,前來購糧,因為客納罕地也發生了飢荒。
Otu a, ụmụ Izrel so nʼọtụtụ ndị ọzọ ndị jekwara ịzụrụ nri nʼIjipt, nʼihi na ụnwụ ahụ dị njọ nʼala Kenan.
6 當時在地方上執政的人是若瑟,給地方上所有人民配售糧食的也是他。若瑟的哥哥們來了,就俯首至地,向他下拜。
Nʼoge a, Josef na-achị ala Ijipt, bụrụkwa onye iresi ndị obodo ọka dị nʼaka. Ya mere, mgbe ụmụnne Josef rutere, ha bịara hulata kpọọ isiala nye Josef.
7 若瑟一見他的哥哥們,就認出他們來,卻裝做生人,向他們說了一切嚴厲的話,問他們說:「你們是從那裏來的﹖」他們答說:「我們是從客納罕地來購買糧食的。」
Mgbe Josef hụrụ ụmụnne ya, ọ matara ndị ha bụ. Ma ọ kpara agwa dịka onye na-amaghị ha, gwa ha okwu nʼolu ike, sị ha, “Ebee ka unu si bịa?” Ha zara, “Anyị si ala Kenan bịa. Anyị bịara ịzụrụ nri.”
Josef matara ụmụnne ya, ma ha onwe ha amataghị onye ọ bụ.
9 於是若瑟想起了他昔日關於他們所作的夢,便對他們說:「你們是探子,前來刺探本地的虛實。」
Josef chetakwara nrọ ndị ahụ ọ rọrọ banyere ha. Ọ gwara ha okwu sị ha, “Unu bụ ndị nnyocha. Ịchọpụta adịghị ike ala anyị mere unu ji bịa.”
10 他們回答說:「我主! 絕對不是:你的僕人們是來購買糧食的。
Ha zara sị, “Nna anyị ukwu, anyị bụ ndị ohu gị bịara ịzụrụ nri.
11 我們全是一個人的兒子,我們是誠實人;你的僕人們從未做過探子。」
Anyị niile bụ ụmụ otu nna. Ndị ohu gị bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi. Anyị abụghị ndị nnyopụta.”
12 若瑟對他們說:「不,你們前來必是為刺探此地的虛實。」
Ma Josef gwara ha sị, “Mba! Unu bịara ịchọpụta akụkụ obodo anyị nke a na-echezighị nke ọma.”
13 他們答說:「你的僕人們原是兄弟十二人,同是客納罕地一個人的兒子;最小的現今在父親那裏,另一個已不在了。」
Ha zara sị ya, “Ndị ohu gị dị ụmụnne iri na abụọ. Ọ bụkwa otu nna mụrụ anyị niile. Nna anyị na nwanne anyị nta, onye ikpeazụ ọ mụrụ nọ na Kenan ugbu a. Ma otu onye nʼime anyị anwụọla.”
14 若瑟對他們說:「我才說你們是探子;這話實在不錯。
Josef sịrị, “Ihe unu na-akọ na-egosi na unu bụ ndị nnyopụta, dịka m gwara unu.
15 為此我要考驗你們:我指著法郎的生命起誓:如果你們最小的弟弟不到這裏來,你們莫想離開此地。
Nke a ka a ga-eji anwale unu. Nʼaha Fero dị ndụ, unu agaghị esi nʼebe a laa tutu nwanne unu nke nta ahụ abịa nʼebe a.
16 你們可由你們中派一個人回去,帶你們的弟弟來,其他的人暫且拘留,以待證明你們的話是否誠實;如果不是真的,我只著法郎的生命起誓:你們必是探子。」
Zipụnụ otu onye nʼime unu ka ọ gaa kpọta nwanne unu nwoke. Ma aga m etinye ndị fọdụrụ nʼụlọ mkpọrọ, tutu m chọpụta ma ihe unu kwuru ọ bụ eziokwu maọbụ ụgha. Ọ bụrụ ụgha nʼezie, dịka Fero na-adị ndụ, unu bụ ndị nnyopụta.”
O tinyere ha niile nʼụlọ mkpọrọ, hapụ ha nʼebe ahụ abalị atọ.
18 第三天,若瑟對他們說:「我原是個敬畏天主的人,你們願意保全性命,應這樣做:
Josef gwara ha, nʼụbọchị nke atọ, “Nke a bụ ihe unu ga-eme ma dị ndụ, nʼihi na abụ m onye na-atụ egwu Chineke.
19 如果你們是誠實人,叫你們兄弟中一個人留在拘留所內,其餘的人可帶糧食回去,解救家中的飢荒。
Ọ bụrụ na unu bụ ndị ezi mmadụ, ka otu onye nʼime unu nọdụ nʼebe a, nʼụlọ mkpọrọ, ka ndị fọdụrụ buru ọka bulaara ndị ezinaụlọ unu nọ nʼagụụ.
20 然後給我帶你們的小弟弟來,好證實你們的話,你們也不致於死。」他們就這樣作了。
Ma kpọtaranụ m nwanne unu nke nta nʼebe a, nke a ga-egosi na okwu unu bụ eziokwu, na unu agaghịkwa anwụ.” Ha mere otu a.
21 他們彼此說:「我們實在該賠補加害我們兄弟的罪,因為他向我們哀求時,我們見了他心靈痛苦,竟不肯聽;為此這場苦難才落到我們身上! 」
Ha gwarịtara onwe ha okwu sị, “Nʼezie, ọ bụ nʼihi nwanne anyị nwoke ka ahụhụ ndị a ji abịakwasị anyị. Anyị hụrụ obi mgbawa ya, mgbe ọ na-arịọ ka anyị chebe ndụ ya, ma anyị egeghị ya ntị. Ọ bụ nke a mere mmekpa ahụ ndị a ji bịakwasị anyị ugbu a.”
22 勒烏本就對他們說:「我豈不是對你們說過:不要傷害那孩子嗎﹖你們卻不肯聽;看,現在要追討他的血了。」
Ruben zara sị ha, “Ọ bụ na mụ agwaghị unu sị unu hapụ imejọ nwantakịrị ahụ, ma unu egeghị ntị? Ugbu a, anyị na-asa ajụjụ banyere ọbara ya.”
23 他們原不知道若瑟都聽得懂,因為在他們中有一翻譯員。
Ha amataghị na Josef na-anụ ihe ha na-ekwu, nʼihi na onye nsụgharị okwu nọ nʼetiti ha.
24 若瑟就由他們前退出去哭了。然後又回來與他們交談,由他們中提出西默盎在他們眼前將他捆綁起來。
O sitere nʼebe ha nọ tụgharịa gaa kwaa akwa. Ọ lọghachikwutere ha ọzọ gwakwa ha okwu. O si nʼetiti ha kpọpụta Simiọn kee ya agbụ ka ha na-ele ya anya.
25 若瑟遂吩咐人將他們的布袋裝滿了糧食,將各人的銀錢仍放在各人的布袋內,並且還給了他們途中所需要的食物;人就對他們這樣做了。
Josef nyere iwu ka e kpojuo ọka nʼakpa ha, tinyekwara onye ọbụla ego ọ kwụrụ nʼakpa ya. Ọ nyere iwu ka e nye ha ihe ha ga-eri nʼụzọ. Mgbe e mesịrị ihe ndị a,
26 他們將購得的糧食馱在驢上,就從那裏起身走了。
ha bokwasịrị ịnyịnya ibu akpa ọka ha nʼotu nʼotu. Ha hapụrụ Ijipt lawa.
27 到了客棧,他們中一人打開了布袋拿料餵驢,看見自己的銀錢仍在布袋口,
Mgbe ha ruru ebe ha nọrọ ọnọdụ abalị, otu nʼime ha meghere akpa ya ka o nye ịnyịnya ibu ya ọka, ọ hụrụ ego ya nʼọnụ akpa ya.
28 遂對兄弟們說:「我的銀錢退回來了;看,仍在我的袋裏。」他們心驚起來,彼此戰慄地說:「天主對我們所作的,是怎麼一回事。」
Ọ gwara ụmụnne ya sị, “Lee, e tighachiri ego m kwụrụ. Lee ya nʼakpa ọka m.” Ike gwụrụ onye ọbụla nʼime ha. Site nʼahụ ịma jijiji ha lerịtara onwe ha anya sị, “Gịnị bụ ihe a Chineke mere anyị?”
29 他們回到客納罕地,他們的父親雅各伯那裏,將所遇見的事全告訴他說:「
Mgbe ha lakwutere nna ha Jekọb nʼala Kenan, ha kọọrọ ya ihe niile dakwasịrị ha. Ha gwara ya sị,
30 那地方的主人對我們說了一些嚴厲的話,將我們視作刺探那地方的人。
“Nwoke na-achị ala ahụ gwara anyị okwu nʼolu ike. O mesoro anyị mmeso dịka anyị bụ ndị bịara inyochapụta obodo ha.
Ma anyị gwara ya sị, ‘Anyị bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi, ndị na-abụghị ndị nnyopụta obodo.
32 我們原是兄弟十二人,同一父親的兒子,一個已不在了,最小的現在同我們的父親在客納罕地。
Anyị dị ụmụnne iri na abụọ ndị nwere otu nna. Otu nʼime anyị anọkwaghị, ma nke ntakịrị na nna anyị nọ na nʼala Kenan taa.’
33 那地方的主人對我們說:為叫我知道你們是誠實人,你們兄弟中一人留在我這裏,其餘的人帶糧食回去解救家中的飢荒;
“Mgbe ahụ, nwoke a, onye na-achị ala ahụ, sịrị anyị, ‘Nke a ka m ga-eji mata ma unu bụ ndị ezi mmadụ. Hapụrụnụ m otu nwanne unu. Burunu ọka, bulaara ndị ezinaụlọ unu agụụ na-agụgbu.
34 然後將你們的弟弟給我帶來,那時我才能知道你們不是探子,確是誠實人,我將你們的兄弟還給你們,你們可在這地方自由行動。」
Ma kpọtara m nwanne unu nke nta. Mgbe ahụ ka m ga-ama ihe unu bụ. Ma unu bụ ndị nnyopụta maọbụ ndị ezi mmadụ. Mgbe ahụ, aga m ahapụrụ unu nwanne unu. Unu ga na-azụkwa ahịa nʼala a.’”
35 當他們倒自己的糧袋時,不料各人的錢囊仍在各人的袋內。他們和他們的父親,一見錢囊,都害怕起來。
Mgbe ha bidoro ịwụpụtasị ọka dị nʼakpa ha, lee, nʼime akpa ọka onye ọbụla, a chọtara ego ọ kwụrụ nʼakpa ya. Mgbe ha na nna ha hụrụ ego ndị a, ha tụrụ egwu.
36 他們的父親雅各伯對他們說:「你們總是使我喪失兒子:若瑟不在了,西默盎不在了,你們還要帶走本雅明! 這一切都落在我身上! 」
Ya mere, nna ha Jekọb gwara ha sị, “Unu agbawala m aka ụmụ. Josef anọghị, Simiọn anọkwaghị. Ma unu na-achọ iwezuga Benjamin. Naanị m ka ihe niile ndị a na-emegide!”
37 勒烏本對他父親說:「如果我不將他給你帶回來,你可殺死我的兩個兒子;只管將他交在我手裏,我必再還給你。」
Mgbe ahụ, Ruben gwara nna ya sị, “I nwere ike gbuo ụmụ m ndị ikom abụọ ma ọ bụrụ na m akpọghachighị Benjamin. Tifee ya nʼaka m, aga m akpọghachikwara gị ya.”
38 雅各伯答說:「我兒子不能和你們一同下去,因為他哥哥死了,只剩下了他獨自一個;如果他在你們行的路上遇到什麼不幸,那你們就要使我這白髮老人在憂苦中降入陰府了。」 (Sheol )
Ma Jekọb sịrị, “Nwa m agaghị eso unu gaa. Nʼihi na nwanne ya anwụọla, ọ bụkwa naanị ya ka ọ fọdụrụ. Ọ bụrụ na nsogbu ezute ya nʼụzọ nʼije a, unu ga-eme ka m jiri isi awọ m laa nʼili nʼọnọdụ mwute.” (Sheol )