< 創世記 35 >

1 天主對雅各伯說:「起來,上貝特耳去,住在那裏,為你昔日逃避你哥哥厄撒烏在那裏顯現給你的天主,築一祭壇。」
Chineke sịrị Jekọb, “Bilie, gaa Betel, birikwa nʼebe ahụ. Wuo ebe ịchụ aja nye Chineke, onye mere ka ị hụ ya mgbe ị na-agbanarị Ịsọ nwanne gị nwoke.”
2 雅各伯便對家人和跟隨他的人說:「你們應除去你們中間所有外邦的神像,並取潔,更換衣服,
Ya mere, Jekọb gwara ndị ezinaụlọ ya na ndị niile so ya sị, “Wezuganụ chi ndị ala ọzọ dị nʼetiti unu. Doonụ onwe unu ọcha, gbanweekwanụ uwe unu.
3 因為我門要起身上貝特耳去;在那裏我要給在我困苦的時日俯聽了我,在我所走的路上伴隨了我的天主,築一祭壇。」
Bilienụ, ka anyị gaa Betel, ebe m ga-ewu ebe ịchụ aja nye Chineke, onye zara m oku nʼụbọchị nsogbu m, ma nọnyekwara m na njem nke m gara.”
4 眾人便將自己手中所有外邦的神像,所有的耳環,都交給了雅各伯;雅各伯就都埋在那靠近舍根的橡樹底下。
Ya mere, ha nyere Jekọb chi ndị ala ọzọ niile ha ji nʼaka, na ọla niile dị ha na ntị. Jekọb chịịrị ha niile lie ha nʼokpuru osisi ook dị na Shekem.
5 當他們起程出發時,天主叫周圍的城邑都非常恐怖,為此誰也不敢追趕雅各伯的兒子。
Ha biliri ije. Egwu Chineke dakwasịrị obodo niile gbara ha gburugburu. Ọ dịghị ndị chụsoro ha.
6 這樣,雅各伯和與他在一起的人,來到客納罕地的路次,即貝特耳;
Jekọb na ndị niile so ya rutere Luz, nke a na-akpọkwa Betel nke dị na Kenan.
7 他在那裏築了一座祭壇。稱呼那地方為貝特耳,因為他逃避他哥哥時,天主曾在那裏顯現給他。
Jekọb wuru ebe ịchụ aja nʼebe a, kpọọ aha ebe ahụ El Betel, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Chineke gosiri ya onwe ya mgbe ọ na-agbanarị Ịsọ nwanne ya nwoke.
8 其時黎貝加的乳母德波辣死了,就埋在貝加的下面的一株橡樹底下;為此給這橡樹起名叫「悲泣的橡樹。」
Mgbe nke a gasịrị, Debọra, nwanyị lekọtara Ribeka mgbe ọ bụ nwantakịrị, nwụrụ. E liri ya nʼokpuru osisi ook dị na Betel. A kpọkwara ebe ahụ, “Osisi ook ebe ịkwa akwa.”
9 雅各伯由帕丹阿蘭回來後,天主又顯現給他,再祝福。
Chineke gosiri Jekọb onwe ya ọzọ, mgbe o sitere na Padan Aram pụta, gọziekwa ya.
10 他天主對他說:「你原叫雅各伯,但以後不再叫作雅各伯,卻要叫作以色列。」遂給他改名以色列。
Chineke sịrị ya, “Aha gị bụ Jekọb ma a gaghị akpọkwa gị Jekọb ọzọ, kama aha gị ga-abụ Izrel.” Ya mere ọ kpọrọ ya Izrel.
11 天主又對他說:「我是全能的天主,你要生育繁殖;不但一個民族,而是一些民族要由你而生,許多君王要由你而生。
Chineke sịrị ya, “Abụ m Chineke onye pụrụ ime ihe niile. Mụọ ọmụmụ, baakwa ụba nʼọnụọgụgụ. Otu mba na igwe mba ga-esi na gị pụta. Ndị eze ga-esitekwa gị nʼahụ pụta.
12 我將賜給了亞巴郎和依撒格的土地賜給你;我也將這土地賜給你未來的後裔。」
Ala ahụ m nyere Ebraham na Aịzik ka m na-enyekwa gị. Aga m enyekwa ya ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị.”
13 然後天主就在與他談話的地方,離開他,上升去了。
Emesịa, Chineke si nʼebe ahụ ha nọ kparịtaa ụka pụọ.
14 雅各伯在天主與他談話地方,豎立了一根柱子,一根石柱;在上面行了奠祭,倒上油。
Jekọb wuru ogidi nkume nʼebe ahụ Chineke nọ gwa ya okwu. Ọ wụsara onyinye ihe ọṅụṅụ wụkwasịkwa mmanụ nʼelu ogidi nkume ahụ.
15 雅各伯給天主與他談話的地方起名叫貝特耳。
Jekọb kpọrọ ebe ahụ ya na Chineke nọ kparịtaa ụka Betel.
16 他們由貝特耳起程出發,離厄弗辣大還有一段路程時,辣黑耳要生產,感覺難產。
Ha biliri ije, site na Betel. Ma mgbe ha ka nọ ebe dị anya site nʼobodo Efrat, Rechel mụrụ nwa, ma o nwere ihe mgbu ka ọ na-amụ nwa.
17 正當難產之際,收生婆對她說:「不要怕,你這次還是生個男孩。」
Mgbe o sitere nʼoke ihe mgbu na-amụpụta nwa ahụ, nwanyị na-aghọ nwa gwara ya, “Atụla egwu, nʼihi na ọ bụ nwa nwoke ọzọ ka ị mụtara.”
18 辣黑耳將要斷氣快死的時候,給他起名叫本敖尼;但他的父親卻叫他本雅明。
Ma tupu Rechel ekuo ume ikpeazụ, nʼihi na ọ na-anwụ, ọ kpọrọ aha nwa ọhụrụ ahụ Ben-Oni, ma nna ya kpọrọ ya Benjamin.
19 辣黑耳死了,葬在去厄弗辣大,即白冷的路旁。
Rechel nwụrụ, e lie ya nʼakụkụ ụzọ gara Efrat, nke a na-akpọkwa Betlehem.
20 雅各伯在她墳上立了一塊碑;這塊辣黑耳墳上的碑,至今尚存。
Jekọb wuru ogidi nʼelu ili ya, nke na-eguzokwa ruo taa, igosi ebe e liri Rechel.
21 以色列又起程前行,在米革達耳厄德爾的那一面支搭了帳幕。
Izrel malitere ije ya, tutu ruo ebe o wuru ebe izuike ya nʼala dị nʼofe ọzọ nke Migdal Eda.
22 以色列住在那地時,勒烏本竟去與他父親的妾彼耳哈同睡;以色列後來聞知了此事。雅各伯的兒子共計十二人。
Mgbe Izrel bi nʼala ahụ, Ruben gara dinakwuru Bilha, iko nwanyị nna ya. E mekwara ka Izrel nụ ihe a Ruben mere. Ụmụ ndị ikom Jekọb dị iri na abụọ.
23 肋阿的兒子:雅各伯的長子勒烏本、西默盎、肋未、猶大、依撒加爾和則步隆。
Ụmụ Lịa bụ, Ruben, ọkpara Jekọb. Simiọn, Livayị, Juda, Isaka na Zebụlọn.
24 辣黑耳的兒子:若瑟和本雅明。
Ụmụ Rechel bụ, Josef na Benjamin.
25 辣黑耳的婢女彼耳哈的兒子:丹和納斐塔里。
Ụmụ Bilha, odibo nwanyị Rechel bụ, Dan na Naftalị.
26 肋阿的婢女齊耳帕的兒子:加得和阿協爾:這些都是雅各伯在帕丹阿蘭生的兒子。
Ụmụ Zilpa, odibo nwanyị Lịa bụ, Gad na Asha. Ụmụ ndị ikom ndị a ka a mụụrụ Jekọb na Padan Aram.
27 雅各伯來到了克黎雅特阿爾巴,即赫貝龍的瑪默勒他父親依撒格那裏,即亞巴郎和依撒格曾寄居過的地方。
Nʼikpeazụ, Jekọb bịakwutere nna ya Aịzik na Mamre nke dị nso na Kiriat Arba (ebe a na-akpọ Hebrọn). Ebe ahụ ka Ebraham na Aịzik biri na mbụ.
28 依撒格享壽一百八十歲。
Nʼoge ahụ Aịzik gbara narị afọ na iri afọ asatọ.
29 他年高老邁,已享天年,遂斷氣而死,歸到他親族那裏去了;他的兒子厄撒烏和雅各伯將他埋葬了。
Ọ dịkwaghị anya site nʼoge a, Aịzik nwụrụ, mgbe o mere nnọọ agadi. Ụmụ ya ndị ikom abụọ, Ịsọ na Jekọb, liri ya.

< 創世記 35 >