< 創世記 24 >
Ugbu a, Ebraham aghọọla agadi nʼahụ ya ma nʼọnụọgụgụ afọ ya. Onyenwe anyị agọziela ya nʼụzọ niile
2 亞巴郎對管理他所有家產的老僕人說:「請你將手放在我的胯下,
Ọ gwara onyeisi ndị ozi nʼụlọ ya, onye nke na-elekọta ihe niile o nwere sị ya, “Tinye aka gị nʼokpuru apata m.
3 要你指著上主、天地的天主起誓:你決不要為我的兒子,由我現住的客納罕人中,娶一個女子為妻;
Achọrọ m ka i jiri aha Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe na ụwa, ṅụọra m iyi, na ị gaghị achọtara nwa m nwoke nwunye site nʼetiti ndị Kenan, ndị m bi nʼetiti ha.
4 卻要到我的故鄉,我的親族中去,為我的兒子依撒格娶妻。」
Kama na ị ga-aga nʼala nke m na ụmụnna m lụtara nwa m, bụ Aịzik, nwunye nʼetiti ụmụnna m.”
5 僕人對他說:「假使那女子不願跟我到此地來,我能否帶你的兒子回到你的本鄉﹖」
Ohu ahụ jụrụ ya, “Ọ bụrụkwanụ na nwaagbọghọ ahụ achọghị isoro m lọghachi nʼebe a, m ga-akpọrọ nwa gị nwoke laghachi nʼobodo i si bịa?”
6 亞巴郎答覆他說:「你切不可帶我的兒子回到那裏去。
Ebraham sịrị ya, “Lezie anya hụ na ị kpọghachighị nwa m nwoke nʼebe ahụ.
7 那引我出離父家和我生身地,同我談過話,對我起誓說「我必將這地賜給你後裔」的上主,上天的天主,必派遣自己的使者作你的前導,領你由那裏給我兒子娶個妻子。
Onyenwe anyị, Chineke nke eluigwe, bụ onye kpọpụtara m site nʼụlọ nna m nakwa obodo nke aka m, onye ahụ gwara m okwu ma kwem nkwa site nʼịṅụ iyi nye sị, ‘Aga m enye ụmụ ụmụ gị ala a.’ Ọ ga-ezipụ mmụọ ozi ya ka ọ gaa nʼihu gị ka i nwee ike inwetara nwa m nwoke nwunye site nʼebe ahụ.
8 假若那女子不願跟你來,你對我起的誓,就與你無涉;無論如何,你不能帶我的兒子回到那裏去。」
Ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ achọghị isoro gị lọghachi, mgbe ahụ, ị ga-abụ onye nwere onwe ya pụọ nʼiyi a ị ṅụrụ. Naanị na ị gaghị eme ka nwa m nwoke laghachi nʼebe ahụ.”
9 僕人遂將手放在主人亞巴郎的胯下,為這事向他起了誓。
Ya mere, ohu ahụ tinyere aka ya nʼokpuru apata nna ya ukwu Ebraham, ṅụọ iyi banyere okwu ndị a.
10 僕人由他主人的駱駝中,牽了十匹駱駝,帶著主人的各樣寶物,起身往美索不達米亞的納曷爾城去了。
Emesịa, ohu a duuru ịnyịnya kamel iri nʼime ndị nna ya ukwu nwere pụọ. O sitekwara nʼaka nna ya ukwu were ihe ọma dị iche iche maka njem a, gawa Aram Naharaim, rute nʼobodo Nahọ.
11 傍晚,女人們出來打水的時候,他叫駱駝臥在城外的水井旁,
O mere ka ịnyịnya kamel ndị ahụ makpuru ala nʼakụkụ olulu mmiri dị nʼazụ obodo ahụ. Ọ bụ nʼoge anyasị, oge ụmụ nwanyị ji apụta iseta mmiri nʼebe ahụ.
12 然後說:「上主、我主人亞巴郎的天主! 求你對我主人亞巴郎施行仁慈,今日使我幸運。
Mgbe ahụ, o kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị, Chineke nke nna m ukwu Ebraham, mee ka ihe gaara m nke ọma taa. Gosi nna m ukwu Ebraham obi ebere gị.
Lee, ana m eguzo nʼakụkụ isi iyi mmiri a, ụmụ nwanyị ndị obodo a na-abịa iseta mmiri.
14 我對那個少女說:請你放下水罐,讓我喝點水。如果她答說:請喝! 並且我還要打水給你的駱駝喝,她即是你為你的僕人依撒格預定的少女;由此我知道,你對我主人施行了仁慈。」
Kwere ka o si otu a dịrị na nwaagbọghọ nke m ga-asị, ‘Biko, zie ite gị ka m ṅụrụ mmiri.’ Ọ bụrụ na onye ahụ asị m, ‘Ṅụọ, aga m ekutekwa mmiri nke ịnyịnya kamel gị ga-aṅụ,’ ka onye ahụ bụrụ onye ị họpụtara ohu gị Aịzik. Nʼụzọ dị otu a ka m ga-esi mata na i gosila nna m ukwu obi ebere.”
15 話還沒有說完,黎貝加就肩著水罐出來了。她是亞巴郎的兄弟納曷爾的妻子米耳加的兒子貝突耳的女兒。
Tupu o kpechaa ekpere a, lekwa Ribeka ada Betuel, nwa nwoke Milka, onye bụ nwunye Nahọ, nwanne Ebraham. Ọ na-apụta bukwasị ite nʼubu ya.
16 這少女容貌很美,是個還沒有人認識的處女。她下到水泉,灌滿了水罐,就上來了。
Ọ bụ nwaagbọghọ mara mma nke ukwuu, onye na-amatabeghị nwoke, nke nwoke ọbụla na-edinabeghị. Ọ gara nʼolulu mmiri kujuo ite ya si nʼebe ahụ na-arịgopụta.
17 僕人就跑上前去迎著她說:「請讓我喝點你水罐裏的水,好嗎! 」
Ohu ahụ mere ngwangwa jekwuru ya sị ya, “Biko nyetụ m mmiri si nʼite mmiri gị.”
18 她回答說:「先生! 請喝! 」她急忙將水罐放低,托在手上讓他喝。
Ọ mere ngwangwa budata ite ahụ nʼaka ya, hulata ya si ya, “Ṅụọ, onyenwe m.”
19 他喝足了以後,少女說:「我再為你的駱駝打水,叫牠們也喝足。」
Mgbe o nyechara ya mmiri, ọ sịrị, “Aga m ekutekwa mmiri nye ịnyịnya kamel gị ndị a ruo mgbe ha ṅụjuru afọ.”
20 遂急忙將罐裏的水倒在槽裏,再跑到那井裏去打水,打給他的駱駝喝。
Ngwangwa, ọ wụpụrụ mmiri dị nʼite ya nʼime ihe anụ ụlọ ji aṅụ mmiri, gbara ọsọ gaa kute mmiri ọzọ na-agbanye nʼime ihe ahụ. O kugidere mmiri tutu ruo mgbe ịnyịnya kamel ndị ahụ ṅụjuchara afọ.
21 僕人在旁靜靜地注視她,急願知道,是否上主已使他此行成功。
Mgbe ihe ndị a na-eme, ohu ahụ gbara nkịtị na-ele ya anya ịchọpụta ma Onyenwe anyị emeela ka ije ya bụrụ ihe gara nke ọma.
22 駱駝喝完了水以後,老人就拿出一個半「協刻耳」重的金鼻環,和一對重十「協刻耳」的金手鐲,給她戴上,
Mgbe ịnyịnya kamel ndị ahụ ṅụsịrị mmiri, nwoke ahụ wepụtara mgbanimi ọlaedo nke ọtụtụ ya bụ otu beka, na mgbaaka ọlaedo abụọ nke ọtụtụ ha bụ shekel iri.
23 然後說:「請你告訴我你是誰的女兒﹖你父親家裏,有沒有地方可讓我們過宿﹖」
Ọ jụrụ ya sị, “Nwa onye ka ị bụ? Ohere ọ dị nʼụlọ nna gị ebe mụ na ịnyịnya kamel ndị a ga-anọ nʼabalị a?”
24 她回答說:「我是米耳加給納曷爾所生之子貝突耳的女兒。」
Ọ zara sị ya, “Abụ m nwa Betuel, nwa Milka nwunye Nahọ.”
25 她又繼續說:「我們家裏有很多草料和飼糧,而且還有地方可供過宿。」
Ọ sịkwara, “Anyị nwere nri anụ ụlọ, nweekwa ebe ị ga-edina nʼabalị a.”
Nwoke ahụ hulatara ala kpọọ isiala nye Onyenwe anyị.
27 上主,我主人亞巴郎的天主應受讚美! 因為他不斷以仁慈和忠信善待了我的主人。上主也一路引我來到了我主人的老家。」
Kwuo sị, “Ngọzị dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nna m ukwu Ebraham, onye na-esitebeghị nʼebe nna m ukwu nọ wezuga ebere ya na ikwesi ntụkwasị obi ya. Ma banyere mụ onwe m, Onyenwe anyị e duola m nʼije a, kpọrọ m rute nʼụlọ ndị ikwu nna m ukwu.”
28 那少女跑回去,將這一切事告訴了她母親家中的人。
Nwaagbọghọ ahụ gbalara gaa kọọrọ ndị ezinaụlọ nne ya ihe ndị a.
29 黎貝加有個哥哥名叫拉班,他一看見他妹妹鼻上的金環,和手腕上的金鐲,聽見他妹妹黎貝加說:「那人如此如此對我說。」
Ribeka nwere otu nwanne nwoke aha ya bụ Leban. Leban gbara ọsọ gbakwuje nwoke ahụ nʼisi iyi mmiri ahụ.
30 拉班就跑去見那在郊外水泉旁的人,迨他來到那人那裏,見他仍站在靠近水泉的駱駝旁,
Mgbe ọ hụrụ mgbanimi, na mgbaaka ndị ahụ nwanne ya nwanyị yi nʼaka ya, ma nụkwa ihe Ribeka kwuru banyere ihe nwoke ahụ gwara ya, o jekwuru nwoke ahụ, hụ ya ka ya na ịnyịnya kamel ya guzo nʼakụkụ olulu mmiri.
31 就對他說:「你這受上主祝福的人,請來我已預備好了房屋和餵駱駝的地方;你為什麼還站在郊外﹖」
Ọ sịrị ya, “Bịa, gị onye Onyenwe anyị gọziri. Gịnị mere i ji guzo nʼebe a. Edozielara m gị ụlọ ebe ị ga-edina na ebe ịnyịnya kamel ndị a ga-anọ.”
32 拉班便將那人領進家去,卸了駱駝,餵上草料和飼糧;又拿水給他和與他同來的人洗腳,
Ya mere, nwoke ahụ gara nʼụlọ, ebe Leban nyere aka butukwaara ya ibu nke ịnyịnya kamel ndị ahụ bu. E wetara nri nye ịnyịnya kamel ndị ahụ, wetara ya mmiri nke ya na ndị ikom so ya ji saa ụkwụ ha.
33 然後在他面前擺上飯,但僕人卻說:「在我未說明我的來意之前,我不吃飯。」拉班說:「你說罷! 」
E doziri ya ihe oriri, ma ọ zara sị, “Agaghị m eri ihe ọbụla tutu ruo mgbe m kwuru ihe m ji bịa.” Leban sịrị, “Ngwa, kwuonụ.”
Ya mere, ọ sịrị, “Abụ m ohu Ebraham.
35 上主厚厚地祝福了我的主人,使他十分富有,賜了他羊群、牛群、金銀、僕婢、駱駝和驢子。
Onyenwe anyị agọziela nna m ukwu, mee ya ka ọ bụrụ ọgaranya. O nyela ya igwe atụrụ, na igwe ehi, na ọlaọcha na ọlaedo, na ọtụtụ ndị ohu nwoke na nwanyị, na ịnyịnya kamel, na ịnyịnya ibu.
36 我主人的妻子撒辣,在老年給我主人生了一個兒子,主人遂將所有的財產都給了他。
Sera nwunye nna m ukwu mụtaara ya otu nwa nwoke mgbe o merela agadi. Ihe niile nna m ukwu nwere ka o nyefere nwa ahụ nʼaka.
37 我主人叫我起誓說:你決不要給我的兒子,由我現居地的客納罕人中,娶一個女子為妻。
Nna m ukwu mere ka m ṅụọra ya iyi sị, ‘Ị gaghị esite nʼetiti ụmụ ndị inyom Kenan ndị anyị bi nʼala ha lụtara nwa m nwoke nwunye.
Kama ị ga-aga nʼezinaụlọ nna m, na nke ndị ikwu m chọtara nwa m nwoke nwunye.’
“Mgbe ahụ, ajụrụ m nna m ukwu, ‘Ọ bụrụkwanụ na nwanyị ahụ ekweghị iso m lọghachi?’
40 他回答我說:我一向在上主面前行走,他必派遣自己的使者與你同行,使你此行必成功,能由我的同族,我的父家,為我兒子娶妻。
“Ọ sịrị, ‘Onyenwe anyị, onye m na-ejegharị nʼihu ya, ga-eziga mmụọ ozi ya ka o soro gị gaa ime ka ije gị nwee isi, ka i nwee ike chọtara nwa m nwoke nwanyị site nʼetiti ndị ikwu m na ezinaụlọ nna m.
41 只要你去了我同族那裏,你就履行了對我起的誓;若是他們不給你,你對我起的誓,就與你無涉。
Ị ga-abụ onye nwere onwe gị site nʼiyi ị ṅụrụ ma ọ bụrụ na mgbe i gakwuru ndị ikwu m, ha jụrụ ịkpọnye gị nwanyị ahụ. Ị ga-abụ onye nwere onwe gị site nʼiyi ị ṅụrụ m.’
42 今天我到了水泉那裏就說:上主,我主人亞巴郎的天主! 惟願你使我此行成功。
“Mgbe m rutere nʼisi iyi mmiri taa, ekwuru m sị, ‘Onyenwe anyị Chineke nna m ukwu Ebraham, ọ bụrụ na ọ masị gị, biko mee ka ije a m bịara bụrụ nke ga-aga nke ọma.
43 看我現在站在泉旁,我對那個出來打水的少女說:請你讓我喝點你水罐裏的水罷!
Lee, ka m na-eguzo nʼakụkụ isi iyi mmiri a, ka nwaagbọghọ ahụ bịara ikuru mmiri nke m ga-asị, “Biko kwere ka m si nʼite gị ṅụrụtụ ntakịrị mmiri,”
44 如果她對我說:請喝,並且我還要打水給你的駱駝喝,她即是上主為我主人的兒子預定的妻子。
ma ọ bụrụ na ọ sị m, “Ṅụọ, aga m ekutekwa mmiri nye ịnyịnya kamel gị ndị a,” ka onye dị otu a bụrụ nwanyị ahụ Onyenwe anyị chọtaara Aịzik nwa nna m ukwu.’
45 我心裏尚未說完這話,看,黎貝加肩著水罐來了,下到水泉那裏打水,我就對她說:請給我一點水喝!
“Tupu m kpesịa ekpere a nʼobi m, lekwa Ribeka ka o bụ ite mmiri ya nʼubu ya na-abịa. Ọ gbadara nʼisi iyi mmiri ahụ kute mmiri. Asịrị m ya, ‘Biko nye m mmiri ka m ṅụọ.’
46 她急忙從肩上放下水罐說:你喝,並且我還要打水給你的駱駝喝。我喝了,同時她也給了駱駝水喝。
“Ngwangwa, o sitere nʼubu ya budata ite, sị m, ‘Ṅụọ, aga m ekutekwa mmiri nke ịnyịnya kamel ndị a ga-aṅụ.’ Ya mere, aṅụrụ m, o nyekwara ịnyịnya kamel m ndị ahụ mmiri ha ṅụrụ.
47 我於是問她說:你是誰的女兒﹖她答說:我是米耳加給納曷爾生的兒子貝突耳的女兒。我就將鼻環戴在她鼻上,將手鐲帶在她手腕上。
“Mgbe ahụ, ajụrụ m ya, ‘Nwa onye ka ị bụ?’ “Ọ sịrị m, ‘Abụ m nwa Betuel onye bụ nwa Nahọ nke Milka mụtaara ya.’ “Mgbe ahụ etinyere m ya mgbanimi ahụ nʼimi ya, tinyekwa ọlaaka ahụ nʼaka ya abụọ.
48 然後我俯身朝拜了上主,讚頌了上主、我主人亞巴郎的天主,因為他引我走了正路,為我主人的兒子娶了我主人兄弟的孫女。
Ehulatara m ala kpọọ isiala nye Onyenwe anyị. Etoro m Onyenwe anyị, Chineke nke nna m ukwu Ebraham, onye duru m nʼezi ụzọ inweta nwa nwanne nna m ukwu dịka nwunye nwa ya nwoke.
49 現在,如果你們願意以仁慈和忠信善待我主人,請告訴我;如果不肯,也請告訴我;我好決定行事。」
Ugbu a, ọ bụrụ na unu ga-egosi nna m ukwu obiọma na ikwesi ntụkwasị obi gwanụ m. Ọ bụrụkwanụ na ọ gaghị esi otu a dịrị, gwanụ m ka m mata ụzọ m ga-agbaso.”
50 拉班和貝突耳答說:「這件事既是出於上主,我們不能對你說好說壞。
Leban na Betuel zara sị ya, “Ihe niile si nʼaka Onyenwe anyị. Anyị enweghị ike ịgwa gị okwu ọjọọ maọbụ nke ọma.
51 看黎貝加在你面前,你可帶她去做你主人兒子的妻子,如上主所說的。」
Lee Ribeka, kpọrọ ya laa, ka ọ bụrụ nwunye nwa nna gị ukwu, dịka Onyenwe anyị kwuru.”
52 亞巴郎的僕人一聽見他們說出這話,就俯伏在地朝拜了上主;
Mgbe ohu Ebraham nụrụ ihe ha kwuru, ọ dara nʼala kpọọ isiala nye Onyenwe anyị.
53 然後拿出金銀的珍飾和衣服來,送給了黎貝加,又送給了她的哥哥和她的母親一些寶貴禮品。
Mgbe ahụ kwa, ohu ahụ wepụtara ihe ịchọ mma ọlaedo, na ọlaọcha dị iche iche na uwe nye ha Ribeka. Ọ wepụtakwara onyinye ndị ọzọ dị oke ọnụahịa nye nwanne ya nwoke na nne ya.
54 這以後,他和同他前來的人才吃喝,並住了一宿。清早起來,他就說:「請讓我回到我主人那裏去! 」
Emesịa, mgbe ihe ndị a gasịrị, ya na ndị ikom so ya riri, ṅụọ, dinaakwa nʼabalị ahụ. Mgbe ha si nʼụra teta, o kwuru sị, “Zilaga m ka m lakwuru nna m ukwu.”
55 黎貝加的哥哥和母親說:「讓少女同我們再住上幾天或十天,然後走罷! 」
Ma Leban na nne ya zara sị ya, “Ka nwantakịrị nwanyị a nọnyere anyị ihe dịka ụbọchị iri tupu o soro gị laa.”
56 他回答他們說:「你們不要挽留我,上主既使我此行成功,請你們讓我走,回到我主人那裏去。」
Ma ọ zara ha sị, “Unu egbochila anyị. Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị emeela ka ije m bụrụ ihe gara nke ọma, zilaga m ka m laghachikwuru nna m ukwu.”
Ha zara sị ya, “Ka anyị kpọọ nwantakịrị nwanyị ahụ jụọ ya ihe bụ uche ya.”
58 他們就將黎貝加叫來問她說:「你願意跟這人去嗎﹖」她答說:「願意。」
Ya mere ha kpọrọ Ribeka jụọ ya sị, “Ị ga-eso nwoke a gaa?” Ọ zara sị, “E, aga m aga.”
59 於是他們打發自己的姊妹黎貝加和她的乳母,同亞巴郎的僕人和與他同來的人一起走了。
Ya mere, ha zipụrụ nwanne ha nwanyị Ribeka, tinyere nwanyị lekọtara ya anya mgbe ọ dị na nwantakịrị, na ohu Ebraham na ndị ikom so ya.
60 他們祝福黎貝加說:「我們的姊妹,願你子孫無數! 願你的後裔,佔領仇敵的城門! 」
Ha gọziri Ribeka sị ya, “Nwanne anyị nwanyị mụọ ọmụmụ, mụruo puku kwụrụ puku, ka mkpụrụ afọ gị nwetara onwe ha, ọnụ ụzọ ama ndị iro ha.”
61 黎貝加便和自己的婢女們起來,上了駱駝,跟那人去了。僕人便帶著黎貝加起了程。
Ribeka biliri, ya na ndị inyom na-ejere ya ozi, ha rigoro nʼelu ịnyịnya kamel ndị ahụ, soro nwoke ahụ. Ya mere, ohu ahụ duuru Ribeka laa.
62 那時依撒格剛來到拉海洛依井旁附近,他原住在乃革布地方。
Nʼoge a, Aịzik bịara nʼebe mbata obodo Bịa-Lahai-Rọị nʼihi na o bi na Negev.
63 傍晚時,依撒格出來在田間來回沉思,舉目一望,看見了一隊駱駝。
Aịzik pụtara ịtụgharị uche nʼọhịa nʼoge uhuruchi. Ọ lepụrụ anya hụ ọtụtụ ịnyịnya kamel na-abịanụ.
Ribeka nʼonwe ya lepụkwara anya hụ Aịzik. O sitere nʼelu ịnyịnya kamel rịdata,
65 問僕人說:「田間前來迎接我們的那人是誰﹖」僕人答說:「是我的主人。」黎貝加遂拿面紗蒙在臉上。
jụọ ohu ahụ sị, “Onye bụ nwoke a si nʼọhịa na-abịa izute anyị?” Ohu ahụ zara sị ya, “Ọ bụ nna m ukwu” Nʼihi nke a, Ribeka weere akwa mkpudo ya kpuchie ihu ya.
Ohu ahụ kọọrọ Aịzik akụkọ otu ije ya niile si gaa.
67 依撒格便領黎貝加進入自己母親撒辣的帳幕,娶了她為妻,很是愛她。依撒格自從母親死後,這才有了安慰。
Aịzik kpọbatara Ribeka nʼụlọ ikwu Sera, nne ya. Ọ lụrụ Ribeka, onye ghọrọ nwunye ya. Aịzik hụrụ ya nʼanya, ma nweta nkasiobi nʼihi ọnwụ nne ya.