< 以西結書 5 >

1 「人子,你拿一把快刀,當理髮的剃刀用,剃去你的頭髮和鬍鬚,然後拿一個天平,分開那些鬚髮。
“Ma gị, nwa nke mmadụ, were mma agha dị nkọ dịka agụba onye ọkpụisi, kpụchaa isi gị na afụọnụ gị; werekwa ihe e ji atụ ihe ọtụtụ tụọ agịrị isi gị, ka ụzọ ọbụla hara nʼotu.
2 等被困的日子一滿,把三分之一在城內用火燒掉;再拿三分之一在城四周用劍擊砍;其他三分之一,要揚在風中,我要拔出劍來追趕他們。
Ị ga-ewere otu ụzọ nʼụzọ atọ, kpọọ ya ọkụ nʼetiti obodo ahụ mgbe ụbọchị nke nnọchigide ahụ zuru; ị ga-ewere otu ụzọ, jiri mma agha chabichaa ya gburugburu obodo ahụ, otu ụzọ nke ọzọ ka ị ga-efesacha nʼikuku. Nʼihi na aga m eji mma agha chụsachaa ha.
3 但你要從鬍鬚中取出幾根來,繫在你的衣服邊上,
Ma ị ga-esite nʼime ya wepụta agịrị isi dị ole na ole, kedo ha nʼọnụ ọnụ uwe gị.
4 再從其中取出幾根投入火中,讓火燒掉;然後你向以色列全家說:
Ọzọkwa, site na ndị a, ị ga-ewere ụfọdụ tụnye ha nʼime ọkụ ka ha ree ọkụ, site na ha ka ọkụ ga-esi banye nʼụlọ Izrel niile.
5 吾主上主這樣說:這就是耶路撒冷! 我將她安置在萬民之中,使萬國環繞著她;
“Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Nke a bụ Jerusalem, obodo m mere ka ọ dịrị nʼetiti mba dị nʼụwa, nke mba dị iche iche gbara gburugburu.
6 但是她違背了我的法令,作惡甚於異民,違背我的法律甚於環繞她的列國,因為她們輕視了我的法令,沒有照我的法律行事。
Ma o sitela nʼajọ omume ya, nupu isi nʼiwu na ụkpụrụ m nyere, karịa mba na obodo ndị ọzọ ahụ niile gbara ya gburugburu. Ọ jụkwara idebe iwu m, jụkwa ịgbaso ụkpụrụ m.
7 為此,吾主上主這樣說:因為你們比環繞你們的異民更為叛逆,沒有照我的法律行事;沒有遵行我的法令,也沒有按照環繞你們異民的法律行事;
“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ị bụrụla onye nnupu isi karịa mba niile ndị gbara gị gburugburu. Ị jụkwara idebe iwu m na ịgbaso ụkpụrụ m, ọ bụghịkwa dịka iwu na atụmatụ nke mba dị iche iche nọ gị gburugburu ka ị mere.
8 因此吾主上主這樣說:看,我要親自對付你;在你中間,在異民眼前實行懲罰。
“Ya mere, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m, ga-emegide gị bụ Jerusalem, kpee gị ikpe nʼihu mba niile.
9 為了你的一切醜惡,我要對你實習未曾實行過的,將來也不會實行的事;
Nʼihi ihe arụ gị niile, aga m eme gị ihe m na-emebeghị mbụ, nke m agaghị emekwa ọzọ.
10 在你境內,為父的要吃自己的兒子,為子的要吃自己的父親。我必如此在你境內實行懲罰,且把遺民分散到四方。
Nʼihi nke a, ndị bụ nna ga-eri ụmụ ha nʼetiti gị, ụmụ ga-erikwa ndị nna ha. Aga m ekpe gị ikpe mee ka ndị fọdụrụ ndụ gbasasịa nʼụwa niile.
11 為此我指著我的生命起誓說:──吾主上主的斷語──因為你用你的一切可憎和可惡之物玷污了我的聖所,我必將你剷除,我的眼決不憐視,一點也不憐惜。
Ya mere, dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, ebe ọ bụ na i jirila oyiyi ihe arụ na omume rụrụ arụ merụọ ụlọ m, aga m esite nʼebe ị nọ wezuga ịhụnanya m. Agaghị m emekwara gị ebere maọbụ hapụ ịta gị ahụhụ.
12 你三分之一的人民要在你境內死於瘟疫,亡於饑荒;另三分之一,在你四周各地喪身刀下;其他三分之一,我要分散到各地。我且拔出劍來追趕他們。
Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ndị bi nʼime gị ga-anwụ site nʼagụụ maọbụ na ọrịa; otu ụzọ ga-anwụ site na mma agha nke ndị iro nọ nʼazụ mgbidi gị, otu ụzọ fọdụrụ ka a ga-achụsa nʼifufe, a ga-eji mma agha ndị iro chụsasịa ha.
13 這樣,我的忿怒纔可以發洩,我的怒火在他們身上纔會平息,得到了報復;當我的憤怒在他們身上發洩時,他們要承認我,上主,在妒火中講了話。
“Mgbe ahụ, iwe m ga-akwụsị, ọnụma m megide ha ga-adajụkwa, na nke a ka a ga-abọrọ m ọbọ. Ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼekworo mgbe m mezuru ọnụma m nʼahụ ha.
14 我要使你成為荒野,使你在環繞你的異民前,和所有的過客前,成為辱罵的對象。
“Nʼihi ya, aga m eme ka ị bụrụ ihe e bibiri ebibi, na ihe e ji eme ihe ọchị nye mba niile gbara gị gburugburu, na nʼihu ndị na-agafe nʼụzọ ahụ.
15 當我大發憤怒,以嚴厲的懲罰在你身上施行裁判時,你就成為環繞你的異民凌辱、恥笑、警戒和警駭的對象:這是我上主說的。
Ị ga-abụ ihe e ji eme ihe ọchị na ihe nkọcha nye mba dị iche iche gbara gị gburugburu, mgbe m ga-eji iwe na obi ọkụ na ntaramahụhụ dị egwu kpee gị ikpe, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.
16 當我向你們射出饑荒的毒箭──射出毀滅的箭,毀滅你們時──我必使饑荒在你們境內更加嚴重,斷絕你們的糧源。
Mgbe m gbara gị àkụ ọjọọ ahụ na-eweta ọnwụ na ịla nʼiyi, bụ àkụ nke oke ụnwụ, aga m agba gị ya, gbajaa gị. Aga m anọgide na-ezite ụnwụ tutu ruo mgbe e mere ka ihe oriri kọọ gị.
17 我必使饑荒和猛獸危害你們,掠去你們的子女,並使瘟疫和血案在你境內盛行,還有刀兵來打擊你:這是我上主說的。」
Aga m ezitere gị oke ụnwụ na ajọ anụ ọhịa, ha ga-agbawa gị aka nwa, ọrịa ọjọọ na ọbara ga-esi nʼetiti gị gafee; aga m eji mma agha megide gị. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.”

< 以西結書 5 >