< 以西結書 28 >
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2 人子,你要向提洛的王子說:吾主上主這樣說:因為你心高氣傲地說:『我是神,我在海心坐在神位上。』其實,你只是人,而不是神,你心中卻自以為是神。
“Nwa nke mmadụ, gwa eze Taịa, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: “‘Nʼihi nganga nke juru gị obi, ị na-ekwu sị, “Mụ onwe m bụ chi, mụ onwe m na-anọkwasị nʼocheeze nke otu chi, nke dị nʼetiti oke osimiri niile.” Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi, ọ bụ ezie na ị na-eche na ị mara ihe dịka chi.
3 看,至於明智,你勝過達尼爾,任何秘密都不能隱瞞你。
Ị maara ihe karịa Daniel? Ọ bụ na o nweghị ihe e zoro ezo nʼebe ị nọ?
I werela amamihe gị na nghọta gị nwetara onwe gị akụ, tụkọba ọlaedo na ọlaọcha, nʼime ụlọakụ gị dị iche iche.
5 你在貿易上憑你的豐富智慧,不斷增加你的財富;因你的財富,你便心高氣傲,
E, mmụta nʼịzụ ahịa gị emeela ka ị ghọọ ọgaranya, nʼihi akụnụba inwere ị bụrụla onye na-akpa nganga.
“‘Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu; “‘ebe ọ bụ na ị gụrụ onwe gị dịka onye maara ihe onye maara ihe dịka chi,
7 為此,看我要率領外方人,即列國最蠻橫的人來攻打你,他們要拔出劍來攻擊你以智慧所得的美麗,玷污你的光華,
ana m aga ịkpọbata ndị mba ọzọ megide gị, bụ mba kachasị mba niile dị iche iche njọ na-enweghị obi ebere. Ha ga-amịpụta mma agha ha megide ịma mma gị na amamihe gị, ha ga-adụwakwa ebube nke mma gị.
Ha ga-eme ka ị rịdaruo nʼolulu nke ala mmụọ. Ị ga-anwụ ọnwụ ike nʼetiti oke osimiri niile.
9 在殺戮你的面前,你還敢說『我是神』嗎﹖在擊殺你的人手中,你只是人,而不是神。
Mgbe nke a mere, ị ga-asị, “Mụ onwe m bụ chi,” nʼihu ndị ahụ na-egbu gị? Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi, nʼaka ndị ahụ na-egbu gị.
10 你必在外方人手中死去,像未受割損的人死去一樣:這是我,上主說的──吾主上主的斷語。」
Ị ga-anwụ ọnwụ dịka ndị a na-ebighị ugwu, site nʼaka ndị ọbịa. Mụ onwe m ekwuola, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’”
Okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị,
12 人子,你要為提洛的王子唱哀歌,哀悼他說:吾主上主這樣說:你原是一個完美的的模型,滿備智慧,十分美觀。
“Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere eze Taịa ma gwa ya, ‘Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “‘Gị onwe gị bụ akara izuoke, ị jupụtara na amamihe na ịma mma.
13 你曾住在「伊甸」──天主的樂園內,有各種寶石作你的服飾,如赤玉、青玉、金鋼石、橄欖玉、紅瑪瑙、水蒼玉、藍玉、紫寶石、翡翠;衣邊和繡花是用金做的,在你受造的那天,都已準備好了。
Ị nọ nʼIden, nʼubi Chineke a gbara ogige. Nʼebe ahụ ka e ji nkume dị oke ọnụahịa ndị a chọọ gị mma, rubi, na topaazi, na emeralụdụ, na krisolaịt, na ọniks, na jaspa, na safaia, na tọkwọisi, na beril. A rụnyere nkume ndị a niile nʼime ọlaedo. Ọ bụkwa nʼụbọchị ahụ e kere gị ka e doziri ha.
14 我曾立你為革魯賓,作光耀的守衛,在天主的聖山上,在烈火的石中往來。
Ahọpụtara m gị mee gị ka ị bụrụ cherub, ọrụ ahụ e doro gị iche ịrụ. Ọ bụ nʼugwu nsọ Chineke ka ị na-anọ, na-ejegharịkwa nʼetiti nkume ndị ahụ na-acha ọkụ.
15 從你受造之日起,你的行為原是齊全的,直到你犯了罪之時。
Ị bụ onye na-enweghị ịta ụta nʼụzọ gị niile site nʼụbọchị e kere gị, tutu ruo mgbe a hụrụ ajọ omume nʼime gị.
16 因你生意興隆,你就充滿了欺壓,犯了重罪,因此我從天主的山上將你趕走,從烈火石中將你這作守衛的革魯賓剷除。
Site nʼịba ụba nke ọzụzụ ahịa gị ị ghọrọ onye na-eme ihe ike, si otu a mehiekwa. Nʼihi ya, esi m nʼugwu Chineke chụpụ gị, nʼihi adịghị nsọ gị. Esitekwara m nʼetiti nkume ọkụ ndị ahụ chụpụ gị, gị cherub na-ekpuchi ekpuchi.
17 你因美麗而心高氣傲,為了你的光耀,你失去了智慧,所以我要把你拋在地上,叫你在列王面前出醜。
Obi gị jupụtara na nganga nʼihi ịma mma gị, i mere ka amamihe gị bụrụ ihe rụrụ arụ nʼihi ebube nke ịma mma gị. Nʼihi ya, achụdara m gị, tụọ gị nʼala, mee ka ị bụrụ ihe nlere anya nye ndị eze niile.
18 因你罪過眾多,因你經商不公,褻瀆了你的聖所,所以我要使火由你中間冒出,將你燒毀,在眾目昭彰之下,使你成為地上的塵埃。
Nʼihi ọtụtụ mmehie gị, na ịzụ ahịa aghụghọ gị, i meela ka ụlọnsọ gị niile ghọọ ihe rụrụ arụ. Nʼihi ya, emere m ka ọkụ si nʼetiti gị pụta, repịa gị. Ka ị ghọọ ntụ nʼelu ala, nʼihu ndị ahụ niile na-ele gị anya.
19 萬民中凡認識你的,都因你而驚駭。你將成為恐怖的對象,且永遠不復存在。」
Ndị niile maara gị ka ihe ndị a juru anya, nʼihi na ị ghọọla ihe oke egwu. Ị laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’”
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
“Nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe Saịdọn dị buo amụma megide ya,
22 對她說:吾主上主這樣說:漆冬,看,我要攻擊你,在你中間受光榮;當我對她施行懲罰,對她顯示我的聖善時,他們必承認我是上主。
ma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “‘Mụ onwe m na-emegide gị, gị Saịdọn, nʼetiti unu ka m ga-egosipụta otuto m. Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị mgbe m mere ka ahụhụ dakwasị unu, nʼime unu, a ga-anwapụta na m bụ onye dị nsọ.
23 我要在她境內散發瘟疫,使血傾流在街市上,刀劍由四周向她襲擊,傷亡的人橫臥在她中間:這樣,他們必承認我是上主。
Aga m ezite ajọ ọrịa na-efe efe, nke ga-emegide ya, meekwa ka ọbara jupụta nʼokporoụzọ ya niile. Ndị e gburu egbu ga-ada nʼime ya, site na mma agha nke ga-abịakwasị ya nʼakụkụ niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
24 以色列的四鄰中,為以色列家族再沒有刺人的荊棘和惱人的蒺藜,敢於輕視他們:這樣,他們必承認我是上主。」
“‘Ụlọ Izrel agaghị enwekwa mba kpọrọ ha asị gbara ha gburugburu ndị dịka uke, nke na-adụ adụ, na ogwu nke na-egbu mgbu. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
25 吾主上主這樣說:「當我把分散在各民族中的以色列家族聚集起來時,我要在異民前,在他們身上顯示為聖:他們要住在我所賜予我僕人雅各伯的地域內。
“‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ndị Izrel ga-alọghachi biri nʼala nke aka ha ọzọ, ala nke m nyere nna ha Jekọb ohu m. Nʼihi na aga m esite na mba niile ha gbasasịrị chịkọtaa ha, si otu a gosi mba niile nke ụwa ịdị nsọ m.
26 他們要安全地住在那裏,建造房屋,栽植葡萄園;當我向一般輕視過他們的四鄰施行懲罰時,他們必平安地住在那裏。那麼他們必承認我,上主,是他們的天主。」
Ha ga-ebi nʼala a na ntụkwasị obi. Ha ga-ewu ụlọ, kụọ ubi vaịnị, birikwa na-atụghị egwu ọbụla. Mgbe m pịachara mba niile dị ha gburugburu ụtarị, bụ mba ndị ahụ mekpara ha ahụ, mgbe ahụ, ha ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha.’”