< 出埃及記 6 >

1 上主回答梅瑟說:「現在你就要看見我對法朗所要作的;在強硬的手臂下,他必放走他們;在強硬的手腕下,他必將他們逐出自己的國境。」
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ugbu a, ị ga-ahụ ihe m ga-eme Fero. Nʼihi ike aka m, ọ ga-ezipụ ha. Nʼihi ike aka, ọ ga-achụpụ ha site nʼala ya.”
2 天主訓示梅瑟說:「我是雅威。
Chineke gara nʼihu gwa Mosis sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
3 我曾顯現給亞巴郎、依撒格和雅各伯為「全能的天主,」但沒有以「雅威」的名字將我啟示給他們。
Egosiri m Ebraham na Aịzik na Jekọb onwe m dịka Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Ma ọ dịghị mgbe m mere ka ha mata aha m dịka Onyenwe anyị.
4 我也與他們立了約,許下將他們寄居而作客的客納罕地賜給他們。
Emere m ka ọgbụgba ndụ m guzosie ike nʼetiti mụ na ha, ọgbụgba ndụ nke inye ha ala Kenan ebe ha biri dịka ndị ọbịa.
5 如今我聽見了以色列子民因埃及人的奴役而發的唉號,想起了我的約。
Ugbu a, anụla m ịsụ ude ụmụ Izrel, bụ ndị ahụ ndị Ijipt mere ka ha bụrụ ndị ohu. Echetakwala m ọgbụgba ndụ m.
6 為此你應該對以色列子民說:我是上主,我要使你們擺脫埃及人的虐待,拯救你們脫離他們的奴役,用伸開的手臂,藉嚴厲的懲罰救贖你們。
“Ya mere, gwa ụmụ Izrel, ‘Abụ m Onyenwe anyị. Aga m akpọpụta unu site nʼọnọdụ ịbụ ohu ndị Ijipt. Aga m eme ka unu nwere onwe unu site nʼọnọdụ ịbụ ndị ohu nye ha. Aga m eji aka ike m nke m ga-esetipụ, ya na ihe ngosipụta dị ukwuu nke ikpe ikpe m, gbapụta unu.
7 我要以你們作我的百姓,我作你們的天主。你們將承認我是天主,你們的天主,使你們擺脫埃及人的虐待。
Mgbe ahụ, aga m ewere unu ka unu bụrụ ndị m. Aga m abụ Chineke unu. Unu ga-amata na m bụ Onyenwe anyị, onye kpọpụtara unu site nʼaka ịbụ ohu nʼala Ijipt.
8 我領你們要去的地方,就是我舉手誓許給亞巴郎、依撒格和雅各伯的地方;我要把那地方賜給你們作產業。─我是上主。」
Aga m akpọbata unu nʼala ahụ m weliri aka m elu, ṅụọ nʼiyi, nye Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, ime ka ọ bụrụ ihe nketa unu. Abụ m Onyenwe anyị.’”
9 梅瑟將這些話告訴了以色列子民,但他們由於苦工喪氣,不肯聽梅瑟的話。
Mosis gwara ụmụ Izrel ihe ndị a, ma ha egeghị ntị nʼihi ịda mba nke obi ha na ahụhụ sitere na ndọgbu nʼọrụ ha.
10 上主訓示梅瑟說:「
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ọzọ sị,
11 你去告訴埃及王法朗說:」叫他將以色列子民由他國中放走。」
“Gaa gwa Fero eze Ijipt, ka ọ hapụ ụmụ Izrel ka ha pụọ nʼala ya.”
12 梅瑟當面回答上主說:「以色列子民既不肯聽我,法朗又怎肯聽我﹖況且我又是笨口結舌的人。」
Mosis kwuru nʼihu Onyenwe anyị sị, “Mgbe ụmụ Izrel na-aṅaghị m ntị, olee otu Fero ga-esi ṅaa m ntị? Nke ka nke, enweghị m ike ikwu okwu nke ọma.”
13 上主訓示梅瑟和亞郎,命令他們去見以色列子民和埃及王法朗,好領以色列子民出離埃及國。梅瑟和亞郎的族譜
Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu banyere ụmụ Izrel na banyere Fero eze Ijipt. O nyere ha iwu sị ha site nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel.
14 以下是他們家族的族長:以色列的長子勒烏本的兒子:有哈諾客、帕路、赫茲龍和加爾米:以上是勒烏本的家族。
Ndị a bụ aha ndịisi ebo Izrel niile. Ụmụ ndị ikom Ruben, ọkpara Izrel bụ, Hanok na Palu, Hezrọn na Kami. Ndị a bụ agbụrụ Ruben.
15 西默盎的兒子:有耶慕耳、雅明、敖哈得、雅津、祚哈爾和客納罕女子生的兒子沙烏耳:以上是西默盎的家族。
Ụmụ ndị ikom Simiọn bụ, Jemuel, Jamin, Ohad, Jakin, Zoha na Shaul (onye nne ya bụ onye Kenan). Ndị a bụ agbụrụ Simiọn.
16 以下是肋末的兒子和他們後代的名字:格爾雄、刻哈特和默辣黎。肋末享年一百三十七歲。
Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Livayị nʼusoro e si mụọ ha: Geshọn, Kohat na Merari. Livayị nʼonwe ya gbara narị afọ na iri afọ atọ na asaa mgbe ọ nwụrụ.
17 革爾雄的兒子有:里貝尼和史米以及他們的家族。
Ụmụ ndị ikom Geshọn, nʼagbụrụ ha, bụ Libni na Shimei, nʼusoro ezinaụlọ ha.
18 哈特的兒子:有阿默蘭、依茲哈爾、赫貝龍、烏齊耳。刻哈特享年一百三十三歲。
Ụmụ ndị ikom Kohat bụ, Amram, Izha, Hebrọn na Uziel. Kohat gbara narị afọ na iri afọ atọ na atọ mgbe ọ nwụrụ.
19 默辣黎的兒子有:瑪赫里和慕史:以上是勒末各家族和他們的後代。
Ụmụ ndị ikom Merari bụ Mahali na Mushi. Ndị a niile si nʼagbụrụ Livayị, dịka ihe e dere banyere ha si dị.
20 阿默蘭娶了自己的姑母約革貝得為妻,她給他生了亞郎和梅瑟。阿默蘭享年一百三十七歲。
Amram lụrụ Jokebed, nwanne nna ya. Erọn na Mosis bụ ụmụ ha ndị ikom. Ma Amram gbara narị afọ na iri afọ atọ na asaa mgbe ọ nwụrụ.
21 依茲哈爾的兒子有:科辣黑、乃裴格和齊革黎。
Ụmụ ndị ikom Izha bụ Kora, Nefeg na Zikri.
22 齊耳的兒子:有米沙耳、厄里匝番和息特黎。
Ụmụ ndị ikom Uziel bụ, Mishael, Elzafan na Sitri.
23 亞郎娶了阿米納達布的女兒,納赫雄的姐妹厄里舍巴為妻,她給亞郎生了納達布、阿彼胡、厄肋阿匝爾和依塔瑪爾。
Erọn lụrụ Elisheba, nwa Aminadab, na nwanne nwanyị Nashọn. Ụmụ ha bụ, Nadab, na Abihu, Elieza na Itama.
24 科辣黑的兒子:有阿息爾、厄耳卡納和阿彼雅撒夫:以上是科辣黑的家族。
Ụmụ ndị ikom Kora bụ, Asịa, Elkena na Abiasaf. Ndị a bụ ndị ikwu Kora.
25 亞郎的兒子厄肋阿匝爾娶了普提耳的一個女兒為妻,她給他生了丕乃哈斯:以上是肋末人各支屬的族長。
Elieza, nwa Erọn lụrụ otu nʼime ụmụ Putiel, onye mụtaara ya Finehaz. Ndị a bụ aha ndịisi ezinaụlọ Livayị dịka ikwu ha si dị.
26 天主曾向亞郎和? 國。」
Ọ bụkwa Mosis na Erọn ka Onyenwe anyị gwara okwu sị, “Sitenụ nʼala Ijipt dupụta ụmụ Izrel dịka ọnụọgụgụ ha si dị.”
27 這個梅瑟和亞郎曾向埃及王紡朗說過:要將以色列子民從埃及領出來。
Ha bụ ndị gwara Fero, eze Ijipt okwu banyere ime ka ụmụ Izrel site nʼala Ijipt pụọ. Ọ bụkwa otu Mosis na Erọn ahụ.
28 當上主在埃及國對梅瑟說話的那一天,
Otu ụbọchị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼIjipt,
29 上主曾對梅瑟說:「我是上主。你應該把我對你所說的一切話告訴埃及王法朗。」
ọ sịrị ya, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, gaa gwa Fero eze Ijipt ihe niile m gwara gị.”
30 梅瑟當面回答上主說:「看,我是個笨口結舌的人,法朗怎肯聽我﹖」
Mosis kwuru nʼihu Onyenwe anyị sị, “Lee, abụ m onye na-adịghị ekwuzi okwu nke ọma, gịnị mere Fero ga-eji gee ntị nʼihe m ga-agwa ya?”

< 出埃及記 6 >