< 出埃及記 37 >

1 貝匝肋耳用皂莢木做了一個櫃,長二肘半,寬一肘半,高一肘半,
Bezalel ji osisi akashia wuo igbe ọgbụgba ndụ nke ịdị ogologo ya bụ otu mita na sentimita iri. Obosara ya ga-abụ sentimita iri isii na asatọ. Ịla elu ya ga-abụkwa sentimita iri isii na asatọ.
2 裏外包上了純金,周圍做了金花邊。
O ji ọlaedo a nụchara anụcha machie nʼime na azụ ya, jirikwa ọlaedo kpụọ ihe gburugburu akụkụ ya niile.
3 鑄了四個金環,安在四個腳上:這邊兩個,那邊兩個。
Ọ kpụrụ mgbaaka ọlaedo anọ maka ya, kwụnyekwa ha nʼụkwụ anọ ya, ya bụ mgbaaka abụọ nʼotu akụkụ, mgbaaka abụọ nʼakụkụ nke ọzọ ya.
4 又用皂莢木做了杠桿,包上了金。
O jikwa osisi akashia ahụ mee okporo osisi, machiekwa ha ọlaedo.
5 將杠桿穿入約櫃邊的環內,作抬櫃之用。
O tinyekwara mkpara ndị ahụ nʼime mgbaaka ahụ dị nʼakụkụ igbe ahụ; ka ọ bụrụ ihe iji na-ebu ya.
6 又用純金做了贖罪蓋,長二肘半,寬一肘半。
Emesịa, o ji ọlaedo a nụchara anụcha mee ihe e ji ekwuchi igbe ahụ. Aha a na-akpọ okwuchi igbe a bụ Oche Ebere. Ịdị ogologo ya dị otu mita na sentimita iri, obosara ya dị iri sentimita asaa.
7 又做了一對金革魯賓,由贖罪蓋兩端用鎚工做成;
Mgbe ahụ, o ji ọlaedo a nụchara anụcha, nke e tipịara etipịa, kpụọ cherubim abụọ na nsọtụ abụọ nke ebe mkpuchi ahụ.
8 在這端做了一個革魯賓,在那端做了一個革魯賓;贖罪蓋兩端的革魯賓與贖罪蓋連在一起;
A rụnyere otu cherub nʼotu nsọtụ, otu cherub na nsọtụ nke ọzọ; nʼisi nsọtụ abụọ ahụ, ka o jikọtara ha ọnụ ka ha na okwuchi igbe ahụ bụrụ otu.
9 革魯賓的翅膀,伸展其上,翅膀遮著贖罪蓋;他們的臉彼此相對,面朝贖罪蓋。製作供桌
Cherubim ndị a gbasara nku ha laa elu, were ha na-ekpuchi okwuchi ahụ. Cherubim ndị ahụ cherịtara onwe ha ihu, na-ele anya nʼebe okwuchi ahụ dị.
10 又用皂莢木做了供桌,長二肘,寬一肘,高一肘半,
Emesịa, o mere tebul nke ịdị ogologo ya bụ iri sentimita itoolu. Obosara ya bụ iri sentimita ise, ịla elu ya bụ iri sentimita asaa. Ọ bụ osisi akashia ka o ji mee ya.
11 包上了純金,周圍做了金花邊,
Ọ bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka e ji machie ya. A kpụnyekwara ihe ọkpụkpụ ọlaedo gburugburu ọnụ ọnụ ya.
12 周圍做了一掌寬的框子,框子周圍,也做了金花邊。
A rụnyere ihe nʼọnụ ọnụ tebul ahụ nke ịla elu ya ga-eru sentimita asatọ. Ihe a dị gburugburu ọnụ ọnụ tebul ahụ, ọ bụkwa ọlaedo a kpụrụ akpụ ka e ji rụọ ya.
13 又鑄了四個金環,將金環安在桌四腳的角上。
Ha kpụrụ mgbaaka ọlaedo anọ maka tebul ahụ; kwụnyekwa ha nʼakụkụ anọ ahụ nʼebe ụkwụ anọ ya dị.
14 環子靠近框子,為穿抬供桌的杠桿.。
E tinyere mgbaaka ndị ahụ nso nso ihe njikọ ahụ ka ha jide mkpara ndị ahụ, e ji ebu tebul ahụ.
15 又用皂莢木做了杠桿,包上金,為抬供桌之用。
O jikwa osisi akashia mee okporo osisi ahụ e ji ebu tebul ahụ. Jirikwa ọlaedo machie ya.
16 又用純金做了供桌上的器物:盤、碟、杯和為奠祭用的爵。燈台
O mekwara ihe niile na-adị nʼelu tebul ahụ: efere, ngaji, ọkwa na iko, nke e ji awụpụ aja ihe ọṅụṅụ. Ọ bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka o ji kpụọ ha.
17 又用純金做了燈台:燈台同燈座以及登幹,全用鎚工做成;花朵,即花托和花瓣,都由燈台發出。
Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna. Ha kpụrụ ụkwụ ala ala ya, na alaka ya, mekwaa ka iko ya niile yiri okoko osisi, nʼisi ya niile, na ifuru ya niile bụrụ otu ya na ahụ ya.
18 燈台兩面發出了六叉:這面三叉,那面三叉。
Alaka isii sitere nʼakụkụ abụọ nke ihe ịdọkwasị oriọna ahụ wapụta, alaka atọ nʼotu akụkụ ya, alaka atọ nʼakụkụ nke ọzọ.
19 在一叉上,有像杏花的三朵花,都有花托和花瓣;在另一叉上也有像杏花的三朵花,都有花托和花瓣;由燈台發出的六叉都是一樣。
Iko atọ e mere dịka okoko osisi alụmọnd ya na ifuru, ya na okoko ya niile dịkwa nʼotu alaka; iko atọ nʼalaka nke ọzọ, otu a ka ọ ga-adị nʼalaka isii niile ahụ na-awapụta site nʼihe ịdọkwasị oriọna ahụ.
20 在燈台的直幹上,有像杏花的四個花朵,都有花托和花瓣。
Nʼelu ihe ịdọba oriọna ahụ, enwere iko anọ dịka ifuru osisi alụmọnd, ya na ebe o si awapụta na okoko ya.
21 由燈幹發出的每兩叉之下,各有一個花朵;從燈幹發出的六個叉都是如此。
Otu isi dị nʼokpuru alaka abụọ si nʼetiti ihe ịdọba oriọna ahụ pụta, isi nke abụọ ga-adị nʼokpuru alaka abụọ nke ọzọ, isi nke atọ ga-adị nʼokpuru alaka nke atọ, ya bụ ha niile alaka isii.
22 這些花朵和燈叉,都從燈台發出,全是用整塊純金鎚成。
Isi nwapụta ya na alaka ya niile dịkọtara ọnụ, ha na ihe ịdọkwasị oriọna ahụ, nke e ji ọlaedo a nụchara anụcha rụọ.
23 又做了燈台上的七盞燈,以及純金的燈剪和碟子。
Ha mekwara oriọna asaa ya, ma mkpa ya na ihe ịkpakepụ ọkụ ya niile. Ha bụ ọlaedo a nụchara anụcha.
24 為做燈台和一切用具,用了一塔冷通純金。香壇
Ha sitere na iri kilogram atọ na anọ nke ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna ahụ na ngwongwo ya niile.
25 以後用皂莢木做了香壇,長一肘,寬一肘,方形,高二肘,四角從壇上突出。
Ha ji osisi akashia wuo ebe ịchụ aja a na-anọ esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Akụkụ anọ ya ha nʼotu. Ogologo ya na obosara ya bụ iri sentimita anọ na ise. Ịdị elu ya bụ iri sentimita itoolu. Mpi ya niile si na ya pụta.
26 又用純金包了壇、壇的上面、四壁、周圍和四角;壇周圍做了金花邊。
Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha machie elu ya; akụkụ ya niile nakwa mpi ya niile. Ha jikwa ọlaedo kpụlite ọnụ ọnụ ya gburugburu.
27 壇兩側花邊下,做了兩個金環,兩面都有,為穿杠桿抬壇之用。
Ha kpụnyere mgbaaka ọlaedo abụọ nʼokpuru ihe ahụ akpụlitere akpụlite, abụọ na ncherita ihu akụkụ ọ bụla, ebe a ga na-ejide mkpara e ji ebu ya.
28 又用皂莢木做了杠桿,包上了金。
Ha ji osisi akashia mee mkpara ndị ahụ. Jirikwa ọlaedo machie ha.
29 以後又以配製香料的方法,做了為傅禮用的聖油,和為焚香用的純香料。
Ha mekwara mmanụ otite dị nsọ, na ezigbo ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke a na-agwaghị ihe; bụ ọrụ nke onye na-eme mmanụ isi ụtọ.

< 出埃及記 37 >