< 以斯帖記 3 >

1 此後,薛西斯王擢陞阿加格人哈默大達的兒子哈曼,使他進級,位居所有同僚公卿之上。
Mgbe ihe ndị a gasịrị, eze bụ Ahasuerọs mere Heman nwa Hamedata onye Agag ka ọ bụrụ onye ukwu, o nyere ya ugwu site nʼinye ya oche dị elu karịa nke ndị ọzọ niile a na-asọpụrụ.
2 君王下命,凡在御門供職的臣僕,都應向哈曼俯首下拜,只有摩爾德開不肯向他低頭,也不下拜。
Ndịisi ọchịchị eze niile na-egbu ikpere nʼala nye Heman nsọpụrụ mgbe ọbụla o si nʼọnụ ụzọ ama ụlọeze na-agafe, nʼihi na ọ bụ otu a ka eze nyere nʼiwu. Ma Mọdekai ekweghị egbu ikpere nye ya, ọ kwekwaghị enye ya nsọpụrụ.
3 於是御門供職的臣僕問摩爾德開說:「為什麼你違犯王命﹖」
Mgbe ahụ, ndị ozi eze ndị nọ nʼọnụ ụzọ ama eze jụrụ Mọdekai ajụjụ si ya, “Gịnị mere i ji na-enupu isi nʼiwu eze nyere?”
4 他們天天這樣問他,他也不聽;他們便告訴了哈曼,說摩爾德開背版王命,想觀察摩爾德開的態度是否堅持到底,因為他曾給他們說自己是猶太人。
Ha na-agwa ya okwu kwa ụbọchị kwa ụbọchị, ma o geghị ha ntị. Nʼihi nke a, ha gwara Heman ihe banyere ya, ịhụ ma ọ ga-anabata omume Mọdekai, ebe ọ gwara ha na ya bụ onye Juu.
5 哈曼見摩爾德開不向他低頭下拜,就非常忿怒,
Ihe a were Heman iwe nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na Mọdekai jụrụ igbu ikpere nʼihu ya, maọbụ ịsọpụrụ ya.
6 心想只殺害摩爾德開一人,不足洩恨,因為人向他告訴了摩爾德開的身世;於是哈曼打算把薛西斯王整個帝國內的一切猶太人,和摩爾德開一起殺盡滅絕。
Mgbe ọ matara ndị Mọdekai ha bụ, ọ dị ya ka ihe ileda anya ma o gbuo naanị Mọdekai. Kama Heman chọrọ ụzọ ọ ga-esi laa ndị Mọdekai niile, bụ ndị Juu nọ nʼalaeze niile nke Sekses nʼiyi.
7 在薛西斯為王第十二年正月,即「尼散」月,有人在哈曼前抽「普爾,」就是抽籤,為定一個日子和月份,好在那一天滅絕摩爾德開的種族。結果,抽出了十二月,即「阿達爾」月十三日。
Nʼọnwa mbụ, nke bụ ọnwa Nisan, nʼafọ nke iri na abụọ nke ọchịchị eze Ahasuerọs. Ha fere nza (nke bụ Pua) nʼihu Heman iji họpụta ụbọchị na ọnwa. Ma nza ahụ danyere nʼụbọchị nke iri na atọ nʼọnwa nke iri na abụọ, nke bụ ọnwa Aada.
8 於是哈曼對薛西斯王說:「在你全國各省內,有一個民族,散居在各民族之間,他們的法律和各民族的都不同,又不遵守王法;容留他們,於君王實在不利。
Mgbe ahụ Heman sịrị eze Sekses, “O nwere otu ndị gbasara ebe niile, nʼetiti ndị bi nʼobodo dị iche iche niile nke alaeze gị, ha kepụrụ onwe ha iche. Iwu ha dị iche site nʼiwu nke ndị mba ọzọ. Ha adịghị edebekwa iwu eze, ọ gaghị abara eze uru i hapụ ha ka ha nọdụrụ onwe ha.
9 若君王贊同,可諭令把他們滅絕,我願捐一萬「塔冷通」銀子,交與管理國庫的人,歸入王庫。」
Ọ bụrụ na ọ masịrị eze, ya nye iwu ka a laa ha nʼiyi, aga m akwụnye puku talenti ọlaọcha iri nʼaka ndị nlekọta nʼihi ụlọakụ eze.”
10 於是君王由自己的手上,取下指璽,交與那迫害猶太人的阿加格人哈默大達的兒子哈曼。
Ya mere, eze gbapụtara ọlaaka ikike ya nye ya Heman nwa Hamedata onye Agag, onye iro ndị Juu
11 接著對哈曼說:「錢仍還給你,至於這個民族,你可任意處置。」
Eze gwara Heman, “Enyela m gị ọlaọcha ahụ, ya na ndị a. Mee ha dịka o si dị gị mma.”
12 即在正月十三日召集了眾御史,根據哈曼的旨意,用各省習用的文字,和各民族的方言,擬定了一道文書,頒發給各省御史大臣,各民族族長;文書用薛西斯王的名義措辭,並蓋上君王的指璽;
Nʼabalị iri na atọ nke ọnwa mbụ, a kpọkọrọ ndị ode akwụkwọ eze niile. Ha depụtara nʼakwụkwọ isi obodo dị iche iche, nakwa nʼasụsụ ndị ọbụla, ihe niile Heman nyere nʼiwu nye ndị nnọchị anya eze niile, ndị ọchịchị nke ala niile ha na-achị, na ndịisi nke ndị ọbụla nọ nʼime alaeze a. E ji aha Ahasuerọs dee akwụkwọ ndị ahụ, werekwa mgbaaka eze nʼonwe ya kaa ya akara.
13 然後由眾驛使傳遞至帝國各省,限令在一天內,即十二月,「阿達爾」月十三日,把全國所有的猶太人,不論老幼婦孺,一律加以殲滅、屠殺、剷除,財產一律沒收。
E zipụrụ ndị ọgba ọsọ ozi eze ka ha gaa nʼisi obodo ọbụla nʼalaeze ahụ, na-enye iwu a edere nʼakwụkwọ ka a laa nʼiyi, gbuo, ma kpochapụkwa ndị Juu niile, ma nwantakịrị ma okenye, ma nwanyị, ma ụmụntakịrị, nʼotu ụbọchị, nʼabalị iri na atọ nke ọnwa iri na abụọ, nke bụ ọnwa Aada, nakwa ịpụnara ha akụnụba ha nʼike.
14 諭文應在各省公佈,通知天下人民,準備應付這一天。
Ihe ndepụta nke otu akwụkwọ ahụ bụ nke a ga-enye dịka iwu nʼobodo niile ọbụla site na nkwupụta, mee ka ndị mba niile mara maka ya, nọọkwa na njikere nʼihi ụbọchị ahụ.
15 驛使因迫於君令,就迅速出發;在穌撒禁城裏立即公佈了這道上諭。此時君王與哈曼同席共飲;但是穌撒全城卻陷於混亂。
Ọ bụ ndị ozi eze na-agba ọsọ nke ọma ka e nyere ozi ahụ, ka ha jiri ya jee nʼobodo niile. E mekwara ka iwu ahụ baa mmadụ niile bi na Susa ntị. Emesịa, eze na Heman nọdụrụ ala ịṅụ ihe ọṅụṅụ nʼoge ndị niile bi na Susa nọ nʼegwu nʼihi okwu ibibi ndị Juu ahụ.

< 以斯帖記 3 >