< 申命記 9 >

1 以色列,請聽! 你今天就要過約但河,去征服比你強大的民族,廣大的城邑和高可摩天的要塞。
Nụrụ, Izrel! Taa ka ị na-aga ịgafe osimiri Jọdan ịbanye ka inweta ala mba ndị dị ukwuu na ndị dị ike karịa gị, inweta obodo ndị dị ukwuu nke nwere mgbidi ha dị elu ruo nʼeluigwe.
2 那高大的民族,即阿納克的子孫,是你所知道的,論到他們,你曾聽說過:「誰能抵抗阿納克的子孫﹖」
Ndị bi nʼime ha bụ ndị Anak, ndị gbara dimkpa, too ogologo nke ukwuu. Ị maara banyere ha. Ị nụkwaala ka e kwuru sị, “Onye pụrụ iguzo onwe ya nʼihu ụmụ Anak?”
3 但你今天應該知道,上主你的天主要如吞滅的火,親自走在你前面,是他要消滅他們,是他要他們在你面前屈服;這樣你纔能將他們驅逐,使他們迅速毀滅,一如上主對你所說的。
Ma mata taa na Onyenwe anyị Chineke gị bụ onye na-aga nʼihu gị dịka ọkụ na-erepịa erepịa. Ọ ga-ala ha nʼiyi. Ọ bụkwa ya ga-eme ka unu lụgbuo ha, chụpụ ha, bibiekwa ha ngwangwa dịka Onyenwe anyị kwere gị na nkwa.
4 當上主你的天主將他們由你面前驅逐以後,你心中不要想:上主領我來佔領這地方,是因了我的義德。其實是因這些民族的罪惡,上主才將他們由你面前趕走。
Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị sitere nʼihu gị chụpụ ha, asịla onwe gị, “Onyenwe anyị akpọbatala m nʼebe a, ka m nweta ala a nʼihi ezi omume m.” Mba, ọ bụ naanị nʼihi ajọ omume nke mba ndị a bi nʼala ahụ ka Onyenwe anyị ji esite nʼihu gị chụpụ ha.
5 你能去佔領他們的土地,並不是因了你的義德,也不是因了你心地正直,而實是因這些民族的罪惡,上主你的天主纔將他們由你面前趕走;同時也是為實踐上主向你祖先亞巴郎、依撒格和雅各伯起誓所許的諾言。
Ọ bụghị nʼihi ezi omume gị, maọbụ izi ezi nke obi gị ka ị ga-eji nweta ala ahụ, kama ọ bụ nʼihi ajọ omume nke mba ndị a bi nʼime ya ka Onyenwe anyị Chineke gị ga-eji achụpụ ha site nʼihu gị. Ọ na-emekwa ya nʼihi imezu nkwa ahụ o kwere nna nna gị ha bụ Ebraham, Aịzik, na Jekọb.
6 由此可知,上主你的天主,把這肥美的土地賜給你作產業,並不是因了你的義德,因為你原是一個執拗的民族。
Ya mere, ghọta ya nke ọma na Onyenwe anyị Chineke gị anaghị enye gị ezi ala a ka inweta ya nʼihi ezi omume gị, nʼihi na unu bụ ndị isiike.
7 你當記念不忘:你在曠野裏怎樣激怒了上主你的天主。自從你由埃及地出來的那天起,直到你們來到這地方,你們常是反抗上主。
Chetakwa nke a ma echefukwala otu i si kpasuo Onyenwe anyị Chineke gị iwe, mgbe mgbe, nʼime ọzara. Site nʼụbọchị ị hapụrụ Ijipt tutu ruo taa, ka ị na-enupu isi nʼebe Onyenwe anyị nọ.
8 你們在曷勒布激怒了上主,致使上主對你們發怒,幾乎將你們消滅。
Unu kpasuru Onyenwe anyị iwe nʼugwu Horeb, ya mere o jiri were iwe laa unu nʼiyi.
9 那時我上了山,要接受石版,就是上主與你們結約的石版,我在山上住了四十天四十夜,不吃不喝;
Mgbe m rigooro nʼelu ugwu ahụ ịnata mbadamba nkume ndị ahụ bụ mbadamba nkume ọgbụgba ndụ dị nʼetiti Onyenwe anyị na unu, anọrọ m nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, ọ dịghị nri m riri, ọ dịghịkwa mmiri m ṅụrụ.
10 上主交給了我兩塊天主用手指寫上字的石版。上面所寫的,是上主於集會之日,在山上由火中對你們所說的一切話。
Onyenwe anyị nyere m mbadamba nkume abụọ ndị ahụ, nke eji mkpịsịaka Chineke dee. Edekwasịrị nʼelu ha iwu niile nke Onyenwe anyị gwara unu nʼugwu ahụ site nʼetiti ọkụ, nʼụbọchị mkpọkọta ahụ.
11 過了四十天四十夜,天主交給了我那兩塊石版、即約版,
Mgbe iri abalị anọ gwụrụ Onyenwe anyị nyere m mbadamba nkume abụọ ndị ahụ, bụ mbadamba nkume ọgbụgba ndụ.
12 然後對我說:「起來,趕快下去,因為你由埃及領出來的人民已敗壞了,他們很快就離棄了我給他們指定的道路,為自己鑄造了偶像。」
Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị gwara m sị m, “Rịdata ọsịịsọ, nʼihi na ndị gị, ndị i si nʼIjipt dupụta, emerụọla onwe ha, ha emeela ngwangwa iwezuga onwe ha site nʼiwu m nyere ha. Ha emeerela onwe ha nwa ehi a kpụrụ akpụ, ka ọ bụrụ chi ha.”
13 上主又對我說:「我看這民族,確是一個執拗的民族。
Onyenwe anyị gwara m sị, “Ahụla m na ndị a bụ ndị isiike nʼezie.
14 你且由著我罷! 我要消滅他們,由天下抹去他們的名字;我要使你成為一個比他們更大更多的民族。」
Hapụ m, ka m kpochapụ ma hichapụkwa aha ha site nʼokpuru eluigwe. Aga m emekwa gị ka ị ghọọ mba dị ike karịa, dịkwa ọtụtụ nʼọnụọgụgụ karịa ha.”
15 我於是轉身從冒火的山上下來,手中拿著兩塊約版。
Ya mere, atụgharịrị m malite isi nʼugwu ahụ na-enwu ọkụ rịdata, ejikwa m mbadamba nkume abụọ nke ọgbụgba ndụ ahụ nʼaka m.
16 我一看見你們鑄造了牛犢,犯罪背叛了上主你們的天主,迅速離棄了上主給你們指定的道路,
Mgbe m lepụrụ anya, ahụrụ m na unu emeela mmehie megide Onyenwe anyị Chineke unu. Unu akpụọlara onwe unu arụsị nʼụdị nwa ehi. Unu esitela nʼịgbaso iwu Onyenwe anyị wezuga onwe unu ọsịịsọ.
17 我就把那兩塊石版,由我手中扔下去,在你們眼前摔得粉碎。
Mgbe ahụ, ewere m mbadamba nkume abụọ ahụ, tụpụ ha site nʼaka m abụọ, kụrie ha nʼihu unu.
18 為了你們所犯的一切罪過,作了上主眼中視為惡的事,使他惱怒,我就像上次一樣俯伏在上主面前,四十天四十夜不吃不喝。
Mgbe ahụ, adara m nʼala ọzọ nʼihu Onyenwe anyị. Iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, erighị m nri maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ ọbụla, nʼihi mmehie niile unu mere. Unu mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị si otu a kpasuo ya iwe nke ukwuu.
19 因為上主對你們大發忿怒,要消滅你們,我實在恐懼不安;但上主這次又俯聽了我。
Atụrụ m egwu iwe na ọnụma nke Onyenwe anyị, nʼihi na iwe ya dị ukwuu megide unu ruo na ikpochapụ unu. Ma nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gere ntị nʼarịrịọ m.
20 同樣,上主對亞郎也大發忿怒,要消滅他;那時我也為亞郎祈求過。
Nʼoge ahụ, Erọn nʼonwe ya, nọrọ nʼoke nsogbu, nʼihi na Onyenwe anyị were iwe megide ya, chọọ ibibi ya, ma arịọrọ m Onyenwe anyị arịrịọ nʼihi ya.
21 我把你們犯罪所鑄造的牛犢,放在火裏燒了;然後搗碎,磨成細末,將細末拋在由山上流下來的溪水內。
Mgbe ahụ, eweere m ngwa ọrụ mmehie unu, ya bụ nwa ehi ahụ unu kpụrụ, kpọọ ya ọkụ, tipịa ya, gwerie ya nke ọma dịka ntụ, wụnye ntụ ya nʼime mmiri nke si nʼugwu na-asọpụta.
22 以後,你們在塔貝辣、瑪撒、克貝洛特阿塔瓦又激怒了上主。
Ọzọkwa, unu kpasuru Onyenwe anyị iwe na Tabera, na Masa, ọ bụladị na Kibrọt Hataava.
23 當上主命你們由卡德士巴爾乃亞起程,說:「你們上去佔領我賜給你們的地方。」你們又違背了上主你們天主的命令,沒有信賴他,也沒有聽他的命。
Mgbe Onyenwe anyị si na Kadesh Banea zipụ unu ọ sị unu, “Gaanụ nweta ala ahụ m nyere unu.” Ma unu nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu. Unu ekwenyeghị maọbụ rubere ya isi.
24 自從我認識你們那天起,你們常是背叛上主。
Site nʼụbọchị m maara ndị unu bụ, ọ dịbeghị mgbe unu na-enupughị isi nʼebe Onyenwe anyị nọ.
25 因為上主決意要消滅你們,我就四十天四十夜俯伏在上主面前,
Ọ bụ ya mere m jiri daa nʼala nʼihu Onyenwe anyị iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, nʼihi na Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-ala unu nʼiyi.
26 哀求上主說:吾主上主! 不要消滅你的百姓,你的產業,因為是你以大能救出來的,是你以強力的手由埃及領出來的,
Ekpere m ekpere nʼoge ahụ nye Onyenwe anyị sị ya, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị biko, alala ndị gị nʼiyi, nʼihi na ha bụ ihe nketa gị, bụrụkwa ndị i ji ike aka gị na ebube gị gbapụta site nʼIjipt.
27 求你記念你的僕人亞巴郎、依撒格和雅各伯,別看這民族的頑固、邪惡和罪過,
Elekwasịla nnupu isi ha na isiike ha anya, kama, cheta nkwa gị, nke i kwere ndị ohu gị, Ebraham, Aịzik, na Jekọb. Biko, agụnyela ndụ ọjọọ ha, na mmehie ha megide ha.
28 免得你領我們出來的那地方的人說:這是由於上主不能領他們進入所許給他們的地方,又由於恨他們纔領他們出來,叫他們死在曠野。
Ma ọ bụghị otu a, ndị obodo ahụ nke i si na ya kpọpụta anyị ga-asị, ‘Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị apụghị inye ha ala o kwere ha na nkwa ka o ji laa ha nʼiyi. Nʼihi na ọ kpọrọ ha asị, ka o ji kpọbata ha nʼime ọzara mee ka ha nwụọ nʼebe ahụ.’
29 他們畢竟是你的百姓,是你的產業,是你以大能和伸開的手臂領出來的。
Ma ha bụ ndị gị, ha bụkwa ihe nketa gị. Ha bụ ndị i sitere nʼike gị dị egwu na ike nke aka gị kpọpụta site nʼIjipt.”

< 申命記 9 >