< 申命記 4 >

1 以色列! 現在你要聽我教訓你們的法令和規律,盡力遵行:這樣你們纔能生活,纔能進入佔領,上主你們祖先的天主賜給你們的地方。
Ugbu a, O Izrel, gee ntị nʼụkpụrụ na iwu niile m na-aga ikuziri unu ka unu na-eme ma ọ bụrụ na unu chọrọ ịdị ndụ banye, ma nwetakwa ala ahụ Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha na-enye unu.
2 我吩咐你們的話,你們不可增刪,而應全守我向你們所訓示的,上主你們天主的誡命。
Unu atụkwasịla iwu ọzọ nʼelu iwu ndị a, ma ọ bụkwanụ site na ha wepụ iwu ọbụla. Kama, meenụ ihe iwu ndị a na-ekwu, nʼihi na ha si nʼaka Onyenwe anyị Chineke unu.
3 你們親眼見了上主在巴耳培敖爾所做的事:凡隨從巴耳培敖爾的人,上主你們的天主都由你們中間消滅了;
Unu ji anya unu hụ ihe Onyenwe anyị mere na Baal-Peoa. Onyenwe anyị Chineke unu sitere nʼetiti unu bibie ndị niile gbasoro Baal nke Peoa.
4 你們依附上主你們的天主的人,今日都還活著。
Ma unu niile nọgidesịrị ike soro Onyenwe anyị Chineke unu bụ ndị dị ndụ taa.
5 看,我授與你們法令和規律,都是上主我的天主吩咐與我的,好叫你們在你們要去佔領的土地內,依照遵行。
Lee, ezila m unu ụkpụrụ na iwu niile Onyenwe anyị Chineke m sị m zi unu, iwu unu na-aghaghị idebe nʼala ahụ unu na-aga inweta.
6 你們要謹守遵行,因為這樣,在萬民眼中,纔能顯出你們的智慧和見識;他們一聽到這一切法令說:「這實在是一個有智慧,有見識的大民族! 」
Lezienụ anya hụ na unu debere ha, nʼihi na nke a ga-egosi mba gbara unu gburugburu na unu bụ ndị nwere nghọta na amamihe. Nʼihi na mgbe ha nụrụ banyere ụkpụrụ ndị a, ha ga-ekwu okwu sị, “Nʼezie, ndị jupụtara na mba ukwu a bụ ndị nwere nghọta na amamihe.”
7 有那個大民族的神這樣接近他們,如同上主我們的天主,在我們每次呼求他時,這樣親近我們呢﹖
Olee mba ọzọ dị ukwuu, nke e mere ka chi ha nọọ ha nso dịka Onyenwe anyị Chineke anyị si na-anọ anyị nso mgbe ọbụla anyị kpọkuru ya nʼekpere?
8 又有那個大民族,有這樣公正的法令和規律,如同我今天在你們面前,所頒佈的這一切法律呢﹖
Olee mba ukwu ọzọ dịkwa nke nwere ụkpụrụ na iwu ziri ezi dịka iwu ndị a m na-enye unu taa?
9 你應謹慎,加意留心,不要忘了你親眼所見的奇事,終生日日不要讓這些事遠離你的心,並要將這一切傳於你的子子孫孫。
Naanị kpachapụnụ anya unu, ma cheenụ onwe unu nche mgbe niile, ka unu ghara ichefu ihe ndị a niile unu ji anya unu hụ, ka ha gharakwa isi nʼobi unu pụọ ụbọchị niile nke ndụ unu. Kama kuziere ha ụmụ unu, na ụmụ ụmụ ndị ga-esote ha.
10 當你在曷勒布,站在上主你的天主面前的那一天,上主曾對我說:「你給我召集民眾,我要叫他們聽清我的話,使他們在世有生之日,學習敬畏我,以此教訓自己的子女。」
Cheta ụbọchị ahụ unu bịara guzo nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu nʼugwu Horeb, nʼụbọchị ahụ ọ gwara m okwu sị m, “Kpọkọtaa ụmụ Izrel ka ha bịa nʼihu m, nụrụ okwu m, ka ha nwee ike mụta ịtụ m egwu ụbọchị niile nke ha ga-ebi nʼala ahụ, ka ha nweekwa ike ikuziri ụmụ ha.”
11 你們遂走上前來,站在山腳下,其時山上火燄沖天,且為黑暗和烏雲籠罩著。
Ọ bụ nʼala ugwu ahụ ka unu bịara nso, guzo, mgbe ọkụ si nʼugwu ahụ na-ere, na-alali elu iru eluigwe, ya na igwe ojii nakwa oke ọchịchịrị.
12 上主由火中對你們說話,你們聽到說話的聲音,卻見不到什麼形狀,只有聲音。
Mgbe ahụ Onyenwe anyị sitere nʼọkụ ahụ gwa unu okwu. Unu nụrụ ụda olu ya, ma unu ahụghị oyiyi ọbụla anya, naanị ụda olu.
13 他將他的盟約,即那十條誡命,給你們宣布出來,吩咐你們遵守,又將這誡命寫在兩塊石版上;
O nyere unu ọgbụgba ndụ ya, nke unu na-aghaghị idebe. Ha dị iwu iri. O dere ha na mbadamba nkume abụọ.
14 同時上主也吩咐我將法令和規律教訓你們.叫你們在要去佔領的土地內遵行。
E, ọ bụ nʼoge ahụ ka Onyenwe anyị nyere m iwu sị m nye unu ụkpụrụ na iwu unu ga-agbaso mgbe unu banyere nʼala ahụ dị nʼofe Jọdan, nke unu na-aga inweta.
15 你們應極其謹慎:因為上主你們的天主,在曷勒布由火中對你們說話的那天,你們既然沒有見到什麼形狀,
Unu maara na unu ahụghị ụdịdị Onyenwe anyị anya nʼụbọchị ahụ o sitere nʼọkụ gwa unu okwu nʼugwu Horeb. Ya mere kpachapụrụnụ onwe unu anya
16 那麼,你們切不要墮落,為自己製造任何形狀的神像,無論是男或者是女的形狀,
ka unu ghara imerụ onwe unu site nʼịkpụ oyiyi ọbụla dịka arụsị, ụdị oyiyi ihe ọbụla, maọbụ nʼụdị nwoke maọbụ nʼụdị nwanyị,
17 或地上各種走獸的形狀,或空中各類飛鳥的形狀,
maọbụ nʼụdị anụmanụ, maọbụ nʼụdị nnụnụ na-efe efe,
18 或地上任何爬蟲的形狀,或地下水裏各種魚類的形狀。
maọbụ nʼụdị anụ na-akpụ akpụ, ma ọ bụkwanụ nʼụdị azụ bi na mmiri.
19 當你舉目望天,觀看日月星辰,和天上的眾星宿時,切不要為之勾引,而去敬拜事奉。那原是上主,你的天主分賜給普天下萬民享用的;
Mgbe unu lere anya na mbara eluigwe hụ anyanwụ, ọnwa, na kpakpando, dịka ha si basaa na mbara eluigwe, unu ekwela ka unu bụrụ ndị a na-arafu ịkpọ isiala nye ha na ife ha ofufe bụ ihe ndị a Onyenwe anyị Chineke unu kere nye mba niile bi nʼokpuru eluigwe.
20 至於你們,上主揀選了你們,將你們由鐵爐中──埃及──領出來,作他特有的子民,就如今日一樣。
Ma banyere unu, Onyenwe anyị kpọọrọ unu, kpọpụta unu site nʼime ọkụ na-agbaze igwe, site nʼIjipt pụta, ka unu bụrụ ihe nketa ya, dịka unu dị ugbu a.
21 可是,上主為了你們的緣故,對我發怒起誓,不讓我過約但河,不許我進入,上主你的天主賜給你作產業的那肥美的土地;
Onyenwe anyị wesoro m iwe nʼihi unu, ọ ṅụrụ iyi na m agaghị agafe osimiri Jọdan ịbanye nʼala ọma ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa gị.
22 我只有死在這地方,不得過約但河;你們都要過去,佔領那肥美的土地為產業,
Aghaghị m ịnwụ nʼala a. Agaghị m agafe Jọdan. Ma unu ga-agafe gaa nweta ala ọma ahụ.
23 那麼你們應謹慎,不要忘記上主你們的天主與你們所訂立的盟約,不要製造任何形狀的神像,有如上主你的天主所禁止的,
Lezienụ anya ka unu ghara ichefu ọgbụgba ndụ unu na Onyenwe anyị Chineke unu nwekọrọ, unu emerela onwe unu arụsị yiri ụdịdị ihe ọbụla, ndị ahụ iwu Onyenwe anyị Chineke unu nyere megidere.
24 因為上主你的天主是吞噬的烈火,忌邪的天主。
Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ ọkụ na-erepịa erepịa. Ọ bụ Chineke ekworo.
25 當你們生養了子孫,在那地住得久了,如果你們墮落下去,製造任何形狀的偶像,行了上主你的天主眼中視為邪惡的事,惹他發怒,
Mgbe ị ga-amụ ụmụ, nwekwa ụmụ ụmụ, mgbe unu birila ọtụtụ oge nʼala ahụ, ọ bụrụ na unu emerụọ onwe unu site nʼimere onwe unu ụdị arụsị ọbụla, si otu a mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị Chineke unu, ma kpasuo ya iwe
26 我今天就指著上天下地對你們作證,你們必在過約但河後所佔領的土地上迅速滅亡,決不會在那地長久生存,必全被消滅。
ana m akpọku eluigwe na ụwa ka ha bụrụ ndị akaebe mụ na unu taa, na a ga-ala unu nʼiyi ngwangwa nʼala ahụ bụ nke unu na-agafe Jọdan inweta. Unu agaghị ebi ogologo oge nʼebe ahụ, nʼihi na a ga-ekpochapụ unu.
27 上主要將你們分散到萬民之中,在上主領你們所到的外邦中,你們剩下的人,必為數不多。
Onyenwe anyị ga-eme ka unu gbasasịa nʼetiti mba ndị ọzọ. Ọ bụkwa naanị mmadụ ole na ole ga-afọdụ ndụ nʼetiti mba ndị ahụ Onyenwe anyị ga-achụga unu.
28 在那裏你們要事奉人手所製造的神,即各種看不見,聽不見,不會吃,不能聞的木石神像。
Nʼebe ahụ, unu ga-efe chi ndị bụ ọrụ aka mmadụ nke e ji osisi tụọ na nke e ji nkume pịa, nke na-adịghị ahụ ụzọ, nke na-adịghị anụ ihe, nke na-apụghị iri nri ma ọ bụkwanụ ịnụ isisi.
29 你在那裏必要尋求上主你的天主,只要你全心全靈尋求,你就可尋到他。
Ma ọ bụrụ na unu anọrọ nʼebe ahụ chọọ Onyenwe anyị Chineke unu, unu ga-achọtakwa ya, mgbe unu ji obi unu niile na mkpụrụobi unu niile chọọ ya.
30 日後,當這些事都臨於你,使你困惱時,你必回心歸向上主你的天主,聽從他的聲音;
Mgbe mkpagbu bịara, mgbe ihe ilu ndị a bịakwasịrị unu nʼoge dị nʼihu, unu ga-emesịa lọghachikwute Onyenwe anyị Chineke unu, unu ga-egekwa ntị nʼihe ọ ga-agwa unu.
31 因為上主你的天主原是仁慈的天主,他不會捨棄你,不會毀滅你,也不會忘卻他起誓與你祖先所立的盟約。
Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ Chineke na-eme ebere. Ọ gaghị agọnarị unu maọbụ laa unu nʼiyi, maọbụ chefuo ọgbụgba ndụ ya na nna nna unu ha gbara, nke o ji iyi ọ ṅụrụ mesie ike.
32 你且考察在你以前過去的世代,從天主在地上造了人以來,由天這邊到天那邊,是否有過像這樣的大事,是否聽過像這樣的事﹖
Nyochaanụ ihe mere nʼoge gara aga, tupu a mụọ unu, na tupu Chineke ekee mmadụ nʼụwa. Jụọnụ ajụjụ nʼụwa niile, jụta ma ihe ukwu dị otu a o metụla mgbe ọbụla.
33 是否有一民族,如同你一樣,聽到了天主由火中說話的聲音,還仍然活著﹖
O nweela ndị mmadụ nụrụ olu Chineke mgbe o si nʼọkụ gwa ha okwu dịka unu mere, ma ha anwụghị?
34 或者,是否有過一個神,以災難、神蹟、奇事、戰爭、強力的手、伸展的臂和可怕的威能,企圖將某一民族由另一民族中領出來,如上主你們的天主在埃及於你們眼前,對你們所做的一切一樣﹖
O nweela chi ọzọ nwara ka o site na mba ọzọ nwetara onwe ya otu mba, site nʼihe nwalee, site nʼihe ịrịbama na ihe ebube dị iche iche, site nʼagha, nʼaka dị ike, na ogwe aka esetipụrụ esetipụ, maọbụ nʼihe dị oke egwu dị iche iche, dịka ihe niile nke Onyenwe anyị Chineke unu mere nʼala Ijipt nʼihu anya unu abụọ?
35 這一切只顯示給你,是要你知道,只有上主是天主,除他以外再沒有別的神。
O gosiri unu ihe ndị a ka unu mara na Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie, na ọ dịkwaghị onye ọzọ ma ọ bụghị ya.
36 他由天上使你聽到他的聲音,是為教訓你;在地上使你見到他的烈火,叫你聽到他由火中發出的言語。
O sitere nʼeluigwe mee ka unu nụ olu ya maka ịdọ unu aka na ntị. Nʼụwa, o mere ka unu hụ oke ogidi ọkụ ahụ o wuru, unu nụkwara olu ya nʼetiti ọkụ ahụ.
37 他由於愛你的祖先,纔揀選了他們的後裔,親自以強力把你由埃及領出來,
Nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe nna nna unu nọ na nʼihi nhọpụta ọ họpụtara ụmụ ụmụ ha, ka o ji si nʼIjipt dupụta unu nʼihu ya. Ọ bụkwa ike aka ya ka o ji mezuo nke a.
38 由你面前趕走比你更大的民族,領你進入他們的國土,賜給你作為產業,就如今日一樣。
Ka o site nʼihu unu chụpụ mba dị ukwuu na ndị dị ike, ma kpọbata unu nʼala ha, inye unu ala ahụ dịka ihe nketa unu, dị ka o si dị taa.
39 所以今日你該知道,且要牢記在心:天上地下,只有上主是天主,再沒有別的神。
Matanụ nke ọma, ma nabata okwu a nʼobi unu na Onyenwe anyị bụ Chineke nʼeluigwe na nʼụwa. O nwekwaghị chi ọzọ dị ma ọ bụghị ya.
40 你應遵守他的法令和誡命,就是我今日所訓示與你的,好使你和你的後代子孫得享幸福,在上主你的天主永久賜給你的土地內,能以久住。」
Debenụ ụkpụrụ ya na iwu ndị a niile m na-enye unu taa, ka ihe niile gaara unu na ụmụ unu nke ọma, ka unu biekwa nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye unu ruo mgbe niile.
41 那時梅瑟在約但河東,向日出之地,劃定了三座城,
Mgbe ahụ, Mosis họpụtara obodo atọ nʼofe ọwụwa anyanwụ nke osimiri Jọdan,
42 使那素無仇恨而又無心殺死同胞的人,可逃到那裏去避難;凡逃入其中的一座,就可獲救。
ebe onye ọbụla gburu mmadụ ga-agbaba ọsọ ndụ, ma ọ bụrụ na ha gburu onye agbataobi ha na-amaghị ama, na-akpọghị ya asị na mgbe gara aga. Ọ ga-agbaba nʼotu ime obodo ndị a ichebe ndụ ya.
43 為勒烏本人指定了位於曠野高原的貝責爾;為加得人指地了基肋阿得的辣摩特;為默納協人指定了巴商的哥藍。
Obodo ndị ahụ bụ, Beza, nke dị nʼugwu elu ya dị larịị nʼime ọzara. A họpụtara ya maka ebo Ruben. Ramọt, nke dị na Gilead, maka ebo Gad, na Golan, nke dị na Bashan, maka ebo Manase.
44 這是梅瑟在以色列子民面前宣布的法律,
Nke a bụ iwu Mosis chere nʼihu ụmụ Izrel.
45 就是梅瑟在以色列子民出埃及後,對他們所發表的勸告、法令和規則。
Ndị a bụ ihe ama, na ụkpụrụ, na iwu Mosis nyere ụmụ Izrel nke ha aghaghị idebe mgbe ha si nʼIjipt pụta
46 地點是在約但河東,貝特培敖爾對面的山谷中,即在位於赫市朋的阿摩黎王息紅的國土內。息紅已為梅瑟和以色列子民由埃及出來後所殺,
na ndagwurugwu Bet-Peoa nke dị nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, nʼala Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye na-achị na Heshbọn, bụ onye Mosis na ndị Izrel meriri nʼagha mgbe ha si nʼIjipt pụta.
47 他的土地為他們所佔領,並且也佔了巴商王敖格的土地。──這兩個阿摩黎人王,住在約但河東,向日出之地,
Ndị Izrel nwetaara onwe ha ala ya na ala Ọg, eze Bashan. Eze abụọ ndị a bụ eze ndị Amọrait ndị ala ha dị nʼọwụwa anyanwụ nke osimiri Jọdan.
48 從阿爾農河岸的阿洛厄爾,直到息爾翁山,即赫爾孟山,
Ala a sitere nʼAroea, nʼọnụ mmiri Anọn ruo nʼugwu Siriọn (ya bụ ugwu Hemon),
49 連約但河東的全阿辣巴荒野在內,直到位於丕斯加山坡下的阿辣巴海。
ruo nʼala Araba niile, nke dị nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, ruokwa nʼOsimiri Nnu, nʼala ala ugwu Pisga.

< 申命記 4 >