< 申命記 33 >

1 這是天主的人,梅瑟死前賜予以四色列子民的祝福。
Nke a bụ ngọzị Mosis, onye nke Chineke, jiri gọzie ụmụ Izrel, tupu ọ nwụọ.
2 他說:「上主由西乃而來,從色依爾光照他的百姓,由帕蘭山射出光輝,從卡德士的默黎巴前進,由他的右邊有烈火發出。
Ọ sịrị, “Onyenwe anyị si nʼugwu Saịnaị bịa, ọ waliteere ha site nʼugwu Sia, o nwupụtara site nʼugwu Paran Ya na igwe ndị nsọ so bịa site nʼakụkụ ndịda, site nʼala ala ugwu ahụ.
3 你實在愛你的人民,眾聖者都在你手中;他們俯伏在你腳前,領受你的教導。
Nʼezie, ọ bụ gị na-ahụ ndị mmadụ ahụ nʼanya, ndị nsọ ahụ niile dị gị nʼaka. Nʼụkwụ gị ka ha na-ada kpọọ isiala, gị na-akụziri ha ihe,
4 梅瑟給我們立定法律,作為雅各伯會眾的產業時,
iwu ahụ Mosis nyere anyị, ihe onwunwe nke ọgbakọ Jekọb.
5 人民的首領與以色列支派會合時,上主在耶叔戎中作了王。
Ọ bụ ya bụ eze na Jeshurun, mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọ ha na ebo niile nke Izrel.
6 願勒烏本生存,不至滅亡! 願他的人數不再減少! 」
“Ka ebo Ruben dịrị ndụ ghara ịnwụ, ma ka ọnụọgụgụ ndị ikom ya dịrị ole na ole.”
7 他論及猶大這樣說:「上主! 願你俯聽猶大的聲音,領他重歸自己的民族;以你的手為他交戰,協助他抵抗他的仇敵! 」
Ihe a ka o kwuru banyere Juda, “Nụrụ, Onyenwe anyị, akwa Juda, kpọlata ya nʼebe ndị ya nọ. Aka ya ka o ji alụrụ onwe ya ọgụ ichebe ihe o bu nʼuche. Bụụrụ ya onye inyeaka megide ndị iro ya.”
8 論及肋未說:「願你將你的「突明」賜給肋未,將你的「烏陵」,賜給對你虔誠的人,就是你在瑪撒曾試探過,在默黎巴水旁曾考驗過的人,
Banyere Livayị o kwuru sị, “Urim na Tumim gị dịịrị ohu gị ahụ kwesiri ntụkwasị obi. Ị nwara ya ọnwụnwa na Masa, gị na ya sekwara okwu na mmiri Meriba.
9 也就是那些論及自己的父母說:我沒有顧及他們,對自己的兄弟不加重視,對自己的子女也漠不關心的人! 他們只遵守你的話,持守你的盟約。
Onye ahụ lere nne na nna ya anya sị, ‘Ejighị m ha kpọrọ ihe.’ Ọ gụnyeghịkwa ụmụnne ya dịka ndị ọ maara, ọ nabatakwaghị ụmụ nke aka ya. Ma o debere okwu gị, cheziekwa ọgbụgba ndụ gị.
10 他們要將你的誡命教給雅各伯,將你的法律授給以色列;在你面前獻上馨香,在祭壇上獻上全燔祭。
Ọ na-akụziri Jekọb ikpe gị, na-akụzikwara Izrel iwu gị. Ọ na-achụkwa aja ụda na-esi isi ụtọ nʼihu gị, na-achụkwa aja nsure ọkụ nʼebe ịchụ aja gị.
11 上主! 願你祝福他的勇力,悅納他手中的作為;對反抗他的人,願你打斷他們的腰,使惱恨他的人,再也不得起立! 」
Gọzie akụnụba ya Onyenwe anyị, ka ọrụ aka ya bụrụkwa ihe na-atọ gị ụtọ. Tijie ụkwụ ndị niile na-ebili imegide ya, tigbuo ndị iro ya ka ha ghara inwe ike ibili ọzọ.”
12 論及本雅明說:「上主所鍾愛的,他必安居樂業;至高者日日庇護他,住在他兩肩之間。」
Mosis kwuru banyere ebo Benjamin sị, “Ka onye ahụ Onyenwe anyị hụrụ nʼanya zuru ike na-atụghị ụjọ nʼime ya. Nʼihi na ọ ga-ekpuchi ya ogologo ụbọchị niile. Ọ bụkwa nʼetiti ubu ya abụọ ka onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya na-anọ.”
13 論及若瑟說:「願他的地蒙受上主的祝福! 願天上甘露,地下深藏的淵泉,
Banyere Josef o kwuru sị, “Ka Onyenwe anyị gọzie ala ya, ya jiri igirigi dị oke ọnụahịa nke eluigwe dị nʼelu, na ogbu mmiri dị nʼokpuru ala,
14 因太陽而出產的美果,靠月亮而出產的寶物,
na ihe ọma niile anyanwụ na-eweta, na ihe ọma niile ọnwa na-ewepụta,
15 太古山岳的珍品,永恒丘陵的美物,
na onyinye ọma niile si nʼugwu ukwu ochie, na ịba ụba ugwu ebighị ebi ndị ahụ,
16 地上的寶物及其富藏,以及住在荊棘叢中者的恩惠,都臨到若瑟頭上,降在兄弟中為首者的頭頂上!
na onyinye ọma niile si nʼala na uju ya niile, na ihuọma onye ahụ na-ebi nʼọhịa nta ahụ na-enwu ọkụ. Ka ihe ndị a niile dịrị nʼisi Josef, nʼiku anya onye bụ nwa eze, nʼetiti ụmụnna ya.
17 他的健壯有如頭胎的公牛,他的雙角像是野牛的雙角,用以抵觸萬民,直到地極。這是厄弗辣因的萬軍,即是默納協的勁旅。」
Nʼịma mma, ọ dị ka nwa oke ehi e bụ ụzọ mụọ, mpi ya dị ka mpi ehi ọhịa. Ya ka ọ ga-eji sọda mba niile ọ bụladị mba ndị ahụ dị na nsọtụ ụwa. Otu a ka iri puku kwụrụ puku ndị Ifrem dị otu a ka imerime puku ndị Manase dị.”
18 論及則步隆說:「則步隆! 你要在旅途中喜樂;至於你、依撒加爾! 你要在帳幕內歡樂。
Banyere Zebụlọn, o kwuru sị, “Ṅụrịa, gị Zebụlọn, nʼọpụpụ gị, ma gị Isaka, ṅụrịa nʼebe obibi gị.
19 他們要邀請人民上山,在那裏奉獻應獻的祭祀,因為他們要吸收海洋的富饒,沙中潛藏的珠寶。」
Ha ga-akpọ ndị mmadụ oku nʼelu ugwu ukwuu, nọ nʼebe ahụ chụọ aja ezi omume, ha ga-eri site nʼịba ụba nke ihe dị nʼosimiri, site nʼakụ nzuzo dị nʼaja.”
20 論及加得說:「那使加得擴張的,應受讚美! 他臥下彷彿一隻母獅,撕裂了人的手臂和頭顱。
Banyere Gad, o kwuru sị, “Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-eme ka ebe obibi Gad saa mbara. Gad na-ebi dịka ọdụm, na-adọkapụ aka maọbụ isi.
21 他為自己選取了為首的一分,因為那原是為首領保留的一分。他走在人民之前,執行了上主的法令,和他對以色列的旨意。」
Ọ họọrọ ala nke kachasị mma nye onwe ya; oke ruuru onyendu ka e wepụrụ dobere ya. Mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọ, o mezuru ezi ihe dị Onyenwe anyị nʼobi, na ikpe ya niile banyere Izrel.”
22 論及丹說:「丹好似由巴商跳出的幼獅。」
Banyere Dan, o kwuru sị, “Dan bụ nwa ọdụm, onye na-esi na Bashan mapụta.”
23 論及納斐塔里說:「納斐塔里,飽受恩愛,充滿上主的祝福,海和南部將是他的產業。」
Banyere Naftalị, o kwuru sị, “Naftalị bụ onye njupụta nke ihuọma Onyenwe anyị dịrị, o jupụtakwara na ngọzị ya, ọ ga-eketa akụkụ ndịda nke iyi ukwu.”
24 論及阿協爾說:「眾子中最受祝福的是阿協爾;願他獲得兄弟的恩待,在油中洗腳!
Banyere Asha, o kwuru sị, “Onye a gọziri karịchasịa nʼụmụ ndị ikom ka Asha bụ, ka ihe banyere ya tọọ ụmụnna ya ụtọ, ka o jirikwa mmanụ saa ụkwụ ya.
25 願你有銅鐵的門閂;願你一生獲享安寧! 」
Ihe mkpọchi nke ọnụ ụzọ ama gị ga-abụ bronz na igwe, dịka ụbọchị ndụ gị niile si dị, otu a ka ịdị ike gị ga-adị.
26 沒有一個像耶叔戎的天主,他騰空駕雲,在威嚴中來援助你。
“O nweghị onye dịka Chineke Jeshurun, onye na-agba eluigwe dịka ịnyịnya ịbịa inyere gị aka, onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya nʼịdị ukwuu ya.
27 亙古的天主是你的避難所,他永遠的手臂是你的支柱;他由你面前驅走了敵人,是他向你下命說:毀滅罷!
Chineke ebighị ebi bụ ebe mgbaba gị. Nʼokpuru gị ka aka ebighị ebi ya dị. Ọ ga-esite nʼihu gị chụpụ ndị iro gị, kwuokwa sị, ‘Bibie ha!’
28 因此,以色列能以安居樂業,雅各伯的後裔定居在產糧出酒之地,天也從上降下甘露。
Ya mere Izrel ga-ebi naanị ya nʼudo, isi iyi mmiri Jekọb dị chịm, nʼala ahụ jupụtara na mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ ebe igirigi nke eluigwe na-ada.
29 以色列,你真是有福的;為上主所拯救的人民,有誰相似你﹖他是你護身的盾牌,是使你勝利的刀劍。你的仇敵必將奉承你,而你卻要踐踏他們的背脊。
Onye a gọziri agọzi ka ị bụ, gị Izrel, onye dị ka gị ndị Onyenwe anyị zọpụtara? Ọ bụ ọta gị na onye inyeaka gị, na mma agha gị dị ebube. Ndị iro gị ga-eji egwu daa nʼihu gị, ị ga-azọdakwa ebe ha niile dị elu.”

< 申命記 33 >