< 但以理書 6 >

1 他認為更好在國內設立一百二十個總督,分治全國;
Ọ dị Daraiọs mma ịhọpụta ndịisi dị otu narị na iri abụọ, ndị ga-anọ nʼalaeze ahụ niile dịka ndị nnọchite anya eze.
2 在這些總督之上另設三位監察史-達尼爾便是其中之一-各總督應向他們述職,這樣可免君王煩勞。
O họpụtakwara ndịisi atọ ọzọ dịka ndịisi ha, nke otu onye nʼime ha bụ Daniel. Ndị a bụ ndị ga na-agụkọrọ ha otu ihe si aga, ka ihe ọbụla ghara ifunarị eze.
3 這位達尼爾,由於他具有超凡的精神,辦事勝過其他監察史和總督,所以君王有意立他治理全國。
Ọ dịghị anya, ọ pụtara ihe nye eze na Daniel kwesiri ntụkwasị obi karịa ndịisi na ndị nlekọta ahụ niile. Nʼihi na amamihe ya, na ike ọrụ ya dị ukwuu. Nke a mere ka eze chee echiche kpebie ime ya onyeisi nʼalaeze niile.
4 因此監察史和總督,竭力在達尼爾處理國事上,尋找機會陷害他,卻總不能找到任何可控告他的事實和過失,因為達尼爾忠信可靠,所以在他身上總找不到任何疏忽和過錯。
Nʼihi nke a, ndịisi ọkwa ha dị elu na ndịisi ndị ọzọ bidoro chọwa mkpesa ha ga-enye iji megide Daniel nʼihe gbasara ọchịchị. Ma ọ dịghị ihe ebubo ọbụla maọbụ omume ọjọọ ọbụla ha chọpụtara, nʼihi na ọ kwesiri ntụkwasị obi. Ọ dịghịkwa omume ọjọọ maọbụ nke aghụghọ ọbụla a chọpụtara nʼọrụ ya.
5 於是這些人說道:「我們若不在他的神的法律上尋找,就找不到陷害達尼爾的任何事。」
Nʼikpeazụ, ndị ikom a sịrị, “O nweghị otu anyị ga-esi chọta ihe a ga-eji boo nwoke a bụ Daniel ebubo, karịakwa nʼihe metụtara iwu ofufe Chineke ya.”
6 這些監察史和總督,便群集到君王前,對君王說:「達理阿大王,萬歲!
Ya mere, ndịisi ndị a na ndị ozi ndị ahụ kpebiri jekwuru eze ahụ sị ya, “Eze Daraiọs, dịrịkwa ndụ ruo mgbe niile!
7 國內的眾監察史、知縣、總督、大臣和省長,都計議請下一道詔書,立一禁令:三十天內,凡不向你大王,而向任何神祇或任何人祈求的,應將他投入獅子圈內。
Ndịisi alaeze gị niile, ndị ukwu na ndị nta, ndị na-anọchi anya eze na ndị ndụmọdụ na ndị ị tinyere ka ha na-achị zukọtara kpebie na eze kwesiri inye iwu nke ga-ekwu na a chọghị ka onye ọbụla rịọọ ihe ọbụla nʼaka chi maọbụ nʼaka mmadụ ọbụla karịa gị eze, site nʼoge i nyere iwu a tutu iri ụbọchị atọ agafee. Onye ọbụla nupuru isi nʼiwu a ka a ga-atụba nʼolulu ọdụm.
8 大王! 請你現在就立刻下這道禁令,簽署這項文告,人就不能再更改,因為按瑪待人和波斯人的法律,那是不可更改的。」
Anyị chọkwara ka gị bụ eze kwagide iwu a ma jirikwa aka gị dee aha gị nʼakwụkwọ iwu ahụ. Nʼihi na anyị chọrọ ka ọ bụrụ iwu nke na-agaghị enwe mgbanwe, nke a na-apụghị ịkagbukwa akagbu, dịka iwu ndị Midia na Peshịa si dị.”
9 達理阿遂簽署了這文告禁令。
Ya mere, Daraiọs jiri aka ya dee aha ya nʼakwụkwọ iwu ahụ.
10 達尼爾一知道君王簽署了這項文告,便回了家。他樓房的窗戶是向著耶路撒冷開的-他每天仍照常三次屈膝跪拜,祈求稱謝自己的天主,如往日所行的一樣。
Ma mgbe Daniel maara na iwu a adịla ire, ọ banyere nʼụlọ ya, nʼelu ụlọ elu nke ebe obibi ya, o meghere oghereikuku ya chere ihu na Jerusalem. Nʼebe ahụ ka ọ na-anọ ekpe ekpere na ekele Chineke ya, ugboro atọ nʼụbọchị dịka ọ na-eme na mbụ.
11 那些人群集前來,看見達尼爾正在自己的天主前祈求哀禱,
Ndị iro ya gbakọtara hụ na Daniel na-ekpe ekpere na-arịọkwa Chineke arịrịọ.
12 他們遂去見君王,向他提及禁令說:「陛下不是簽署了這樣的一道禁令:三十天內,凡不向大王,而向任何神祇或任何人祈求的,應將他投入獅子圈內嗎﹖」君王回答說:「確有此事! 照瑪待人和波斯人的法律是不可更改的。」
Ha jekwuru eze sị ya, “I chetakwara iwu ahụ i nyere, nke sị na onye ọbụla ekwesighị ịrịọ chi ọzọ maọbụ mmadụ arịrịọ ọbụla karịa gị, tutu iri ụbọchị atọ agafee, na onye ọbụla nupuru isi nʼiwu a ka a ga-atụba nʼolulu ọdụm?” Eze sịrị, “Ya bụ iwu ka dịkwa, dịka iwu ndị Midia na Peshịa nke e nweghị ike ịkagbu akagbu.”
13 他們便對君王說道:「大王! 猶大俘虜中的那個達尼爾,竟然不介意陛下和陛下所簽署的禁令,仍照常一日三次自作祈禱。」
Mgbe ahụ, ha gwara eze, “Daniel, onye bụ otu nʼime ndị si Juda a dọtara nʼagha adịghị aṅa gị ntị, gị onye a na-asọpụrụ, maọbụ nye iwu ahụ i nyere bụ nke e dere nʼakwụkwọ. Ọ nọkwa na-ekpe ekpere ya ugbo atọ nʼụbọchị.”
14 君王聽了這些話,十分難過,有心要救達尼爾,君王直到日落要設法解救他。
Obi jọrọ eze njọ nke ukwuu mgbe ọ nụrụ ihe ndị a. O kpebiri nʼobi ya ime ihe niile ịhụ na Daniel ataghị ahụhụ. Ya mere, ụbọchị ahụ niile, site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, ọ nọ na-eche otu ọ ga-esi mee nke a.
15 但是那些人又群集到君王前,對君王說:「大王! 陛下要知道瑪待人和波斯人的法律:凡君王所立的禁令和法令,是不可更改的。」
Mgbe ahụ, ndị ikom ndị a bịakwutere eze sị ya, “Chetakwa, gị eze, na dịka iwu ndị Midia na Peshịa si dị, ọ dịghị iwu ọbụla eze nyere maọbụ ụkpụrụ nke e mere ka o guzosie ike ga-agbanwe.”
16 君王於是下令,將達尼爾逮捕投入獅子圈內。君王對達尼爾說:「願你恒心恭敬的天主拯救救你! 」
Nʼikpeazụ, eze nyere iwu, ha kpụpụtara Daniel tụba ya nʼolulu ọdụm. Eze gwara Daniel, “Ka Chineke gị, onye ahụ ị na-efe mgbe niile, zọpụta gị.”
17 遂即移了一塊大石,封住圈口,君王蓋上自己的御璽,大臣們蓋上自己的印章,免得達尼爾的案件發生意外的變化。
E wetara nkume dị ukwuu jiri mechie ọnụ olulu ọdụm ahụ. Eze jikwa mgbaaka akara ya na mgbaaka ndịisi ọzọ kaa akara e ji nyachie ọnụ olulu ahụ. E mere nke a ka ọnọdụ Daniel hapụ ịgbanwe.
18 然後君王回了王宮,整夜絕食,斷絕娛樂,並徹夜失眠未睡。
Mgbe eze lọbatara nʼụlọeze ya, o dinara nʼihe ndina ya buo ọnụ, onweghịkwa nri ebutere ya. Nʼabalị ahụ, o nweghị ike rahụ ụra.
19 清晨,天一亮,君王便起來,急速往獅子圈去了,
Nʼìhè mbụ nke ụtụtụ, mgbe chị na-abọ, eze biliri mee ngwangwa, gaa nʼolulu ọdụm ahụ.
20 一來到獅子圈旁,就哀聲呼喊,向達尼爾說道:「永生天主的僕人達尼爾! 你恒心恭敬的天主真能由獅子口裏拯救你嗎﹖」
Mgbe ọ bịaruru nso olulu ahụ, ọ kpọrọ Daniel oku nʼolu obi ntiwa sị, “Daniel, ohu Chineke dị ndụ, Chineke gị ahụ ị na-efe mgbe niile, o nwekwara ike ịzọpụta gị nʼaka ọdụm?”
21 達尼爾遂對君王說:「大王萬歲!
Ya mere, Daniel sịrị eze, “Eze, dịrị ndụ ruo mgbe niile!
22 我的天主曾打發他的天使閉住獅子的口,一點沒有傷害我,因為我在他面前是無罪的;大王! 我即在陛下面前,也從沒有做過什麼傷害人的事。」
Chineke m zitere mmụọ ozi ka o mechie ọnụ ọdụm ndị a, ka ha si otu a hapụ inwe ike ịmetụ m aka, nʼihi na Chineke maara na aka m dị ọcha. Ọ makwaara na o nweghị ihe ọbụla m mere mejọọ gị.”
23 君王非常高興,遂下令將達尼爾從獅子圈裏提出來。達尼爾便從獅子圈裏被提出來,他身上絲毫沒有受到損傷,因為他信賴了自己的天主。
Ọṅụ juru eze ahụ obi! O nyere iwu ka e si nʼime olulu ahụ dọpụta Daniel. Mgbe a kpọpụtara Daniel, o nweghị ihe ọbụla a hụrụ mere ya nʼahụ, nʼihi na ọ tụkwasịrị Chineke ya obi.
24 君王遂下令逮捕那些控告達尼爾的人,將他們和他們的兒子、妻子,都投入獅子圈裏,他們還沒有到獅子圈底,獅子就向他們撲來,捉住他們,將他們的骨頭全咬碎了。
Mgbe ahụ, eze nyere iwu ka e jide ndị ahụ boro Daniel ebubo. O nyere iwu ka a tụnye ha nʼolulu ọdụm ahụ, ha na ndị nwunye ha na ụmụ ha. Ọdụm ndị ahụ dị nʼime olulu ahụ jidere ndị ahụ dọrie ma ọkpụkpụ ha tupu ha adaruo ala.
25 達理阿於是詔告居民於普世的各民族,各邦國及各異語人民說:「願平安常與你們同在!
Emesịa, eze Daraiọs depụtara ozi a nʼakwụkwọ nye iwu ka a gụọra ya mmadụ niile, mba niile na asụsụ niile dị iche iche nʼelu ụwa. “Ka ọ dịrị unu na mma.
26 我今頒發詔書,諭令我所統轄的全國人民,都應在達尼爾的天主前起敬起畏,因為他是生活永在的天主,他的國永不滅亡,他的王權永遠常存。
“Ana m enye iwu na mmadụ niile nọ nʼalaeze m kwesiri ịtụ egwu na ịma jijiji nʼihu Chineke nke Daniel.
27 他拯救施援,在天上地下實行神蹟奇事;是他拯救達尼爾脫免獅子的爪牙。」
Ọ na-agbapụta ndị ya, na-azọpụtakwa.
28 這位達尼爾就這樣在達理阿和波斯人居魯士為王時,事事亨通。
Ya mere, ihe gaara Daniel nke ọma nʼoge niile Daraiọs bụ eze, na nʼoge Sairọs onye Peshịa chịkwara dịka eze.

< 但以理書 6 >