< 但以理書 3 >

1 拿步高王製造了一尊高六十肘,寬六肘的金像,立在巴比倫省的杜辣平原上。
Eze Nebukadneza kpụrụ oyiyi ọlaedo nke ịdị elu ya ga-adị iri mita atọ, obosara ya ga-adị ka mita atọ. Emesịa, o debe ya nʼobosara ala Dura, nke dị nʼotu mpaghara Babilọn.
2 拿步高王就派人召集總督、省長、知縣、參謀、司庫、法官、警官和各省官長,前來參與拿步高立像的開光典禮。
Eze Nebukadneza ziri ozi ka e zie ndị nnọchite anya eze niile, ndịisi, ndị na-achị achị, ndị ndụmọdụ ya niile, ndị na-elekọta ụlọakụ ya niile, ndị ọkaikpe, ndị maji na-edozi okwu na ọtụtụ ndị ọzọ nọkwa nʼisi ọchịchị akụkụ niile nke ala ahụ, ka ha bịa nʼụbọchị a ga-edo oyiyi ahụ nsọ bụ nke eze Nebukadneza guzobere.
3 於是總督、省長、知縣、參謀、司庫、法官、警官和各省官長都聚集前來,參與拿步高王立像的開光典禮,都站在拿步高立的像前。
Ya mere, ndị nnọchite anya eze niile, ndịisi, ndị na-achị achị, ndị ndụmọdụ ya niile na ndị na-elekọta ụlọakụ ya niile, ndị ọkaikpe, ndị maji na-edozi okwu na ọtụtụ ndị ọzọ nọkwa nʼisi ọchịchị akụkụ niile nke ala ahụ, zukọtara maka ido oyiyi ahụ nke eze, bụ Nebukadneza guzobere nsọ. Ha niile guzooro ọtọ nʼihu oyiyi ahụ bụ nke eze Nebukadneza guzobere.
4 傳令官高聲呼喊說:「各民族、各邦國、各異語人民! 這是給你們下的令:
Onye nkwusa kwuru okwu nʼolu ike, “Mmadụ niile si na mba niile na asụsụ niile dị iche iche bịa, ka a na-enye iwu nke a,
5 你們幾時聽到角、笙、琴、瑟、箏、簫及各種樂器齊奏,就當俯伏朝拜拿步高王立的金像。
mgbe ọbụla unu nụrụ ụda ọja, une, ụbọ akwara, maọbụ ụda ihe egwu ọbụla, unu ga-ada nʼala kpọọ isiala nye ihe a Nebukadneza eze ji ọlaedo kpụọ.
6 凡不俯伏朝拜的,應當立刻投在烈火窯中。」
Onye ọbụla juru ịkpọ isiala ka a ga-atụba ngwangwa nʼime ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu.”
7 因此,當在場的人聽見角、笙、琴、瑟、箏、簫及各種樂器齊奏時,各民族、各邦國、各異語人民都俯伏朝拜了拿步高王所立的金像。
Ya mere, ngwangwa ha nụrụ ụda opi ike, nke ọja, une ụbọ akwara, nke une na nke egwu dị iche iche, ndị niile si mba dị iche iche, ndị na-asụ asụsụ dị iche iche, dara nʼala kpọọ isiala nye oyiyi ọlaedo ahụ, nke eze bụ Nebukadneza guzobere.
8 當時,有幾個加色丁人前來控告猶太人,
Nʼoge a, ụfọdụ nʼime ndị Kaldịa pụtara nʼihu boo ndị Juu ebubo.
9 對拿步高王啟奏說:「大王萬歲!
Ha gwara eze, bụ Nebukadneza, “Ka eze dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
10 大王! 你發出了諭令,要所有聽見角、笙、琴、瑟、箏、簫及各種樂器齊奏的人,都應立刻俯伏朝拜金像,
Gị, onwe gị nyere iwu, na onye ọbụla nụrụ ụda opi ike, ọja, une, ụbọ akwara maọbụ ihe egwu ọzọ ga-akpọ isiala sekpuoro ihe ahụ e ji ọlaedo kpụọ,
11 誰不俯伏朝拜,就應立即把他投入烈火窯中。
na onye ọbụla jụrụ ịkpọ isiala ka a ga-atụba nʼime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu.
12 然而有幾個你所委任管理巴比倫省政務的猶太人,即沙得辣客、默沙客和阿貝得乃哥,大王! 他們不尊重你的諭令,不恭敬你的神,也不朝拜你所立的金像。」
Ugbu a, e nwere ụfọdụ ndị Juu, ndị aha ha bụ Shedrak, na Mishak na Abednego, ndị i mere ka ha bụrụ ndị na-elekọta ihe niile a na-eme eme nʼala Babilọn; ha aṅaghị ntị nʼiwu eze nyere, jụkwa ịkpọ isiala nye oyiyi a i ji ọlaedo kpụọ.”
13 拿步高勃然大怒,遂下令傳沙得辣客、默沙客和阿貝得乃哥來;這幾個人就被帶到君王前,
Nebukadneza nʼọnọdụ oke iwe nyere iwu ka a kpọta Shedrak, na Mishak, na Abednego. Ya mere, a kpọbatara ndị ikom a nʼihu eze,
14 拿步高便對他們說:「沙得辣客、默沙客、阿貝得乃哥! 你們是真存心不恭敬我的神,不朝拜我立的金像嗎﹖
Nebukadneza sịrị ha, “Ọ bụ eziokwu, Shedrak, na Mishak, na Abednego, na unu adịghị efe chi m maọbụ kpọọ isiala nye oyiyi ọlaedo ahụ m guzobere?
15 現在你們準備好,一聽見角、笙、琴、瑟、箏、簫及各種樂器齊奏,就俯伏朝拜我製造的像;若是你們不朝拜,你們就立刻被投入烈火窯中,看有什麼神能由我手中將你們救出﹖」
Mgbe unu nụrụ ụda opi, ọja, une na ụbọ akwara maọbụ ihe egwu ọzọ, ọ bụrụ na unu adaa nʼala kpọọ isiala nye oyiyi ahụ a kpụrụ akpụ, ihe niile ga-adị mma. Kama ọ bụrụ na unu ajụ ịkpọ isiala, a ga-atụnye unu ngwangwa nʼime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu. Kedụ chi ahụ nke pụrụ ịnapụta unu site nʼaka m?”
16 沙得辣客 、默沙客和阿貝得乃哥回答拿步高王說:「關於這事,我們無須回答;
Shedrak, na Mishak, na Abednego, gwara eze, “O Nebukadneza, ọ dịghị mkpa na anyị ga-azara ọnụ anyị nʼihu gị banyere okwu a.
17 如果我們所恭敬的天主肯救我們,大王! 他必會救我們脫離火窯和脫離你的手;
Ọ bụrụ Chineke anyị na-efe nwere ike ịzọpụta anyị site nʼọkụ na-enwusi ike nʼaka gị, ya zọpụta anyị.
18 如果他不肯,大王! 你應當知道,我們仍然不願意恭敬你的神,也不朝拜你所立的金像。」
Ma ọ bụrụkwa na ọ zọpụtaghị anyị, mata nke ọma, o eze, na anyị agaghị efe chi gị ndị a maọbụ kpọọ isiala nye oyiyi a ị kpụrụ akpụ nke ị guzobere.”
19 拿步高一聽這話,怒火填胸,立刻對沙得辣客、默沙客和阿貝得乃哥變了臉,下令要人將火窯燒得比往常更熱七倍,
Mgbe ahụ, Nebukadneza jupụtara nʼoke iwe megide Shedrak, na Mishak, na Abednego, nke bụ nʼihu ya gbarụrụ nʼebe ha nọ. O nyere iwu sị ka e mee ụlọ ọkụ ahụ ka ọ dị ọkụ ugboro asaa karịa ka o kwesiri.
20 又命軍中的幾個壯士將沙得辣客、默沙客和阿貝得乃哥捆起來,投入烈火窯中。
Ọ nyere ụfọdụ ndị kacha sie ike nʼetiti ndị agha ya iwu ka e kee Shedrak, na Mishak, na Abednego eriri nʼụkwụ na aka, tụbakwa ha nʼọkụ ahụ na-enwu enwu.
21 這三個人穿著外氅、長袍、頭巾和其他的衣服,被捆起來,投入烈火窯中。
Ya mere, ha kere ndị ikom ahụ agbụ ebe ha ka yi uwe ụkwụ ha, na akwa nkụkụ isi ha, na uwe mwụda ha, na uwe ha niile, tụba ha nʼetiti ọkụ ahụ na-enwu ajọ onwunwu.
22 由於君王的命令急迫,火窯又燒得猛烈,火燄反將投擲沙得辣客、默沙客和阿貝得乃哥的那些人燒死了。
Ebe ọ bụ nʼokwu eze dị ọkụ ọkụ, tinyere na ọkụ ahụ na-enwusi ike, o mere ka ire ọkụ regbuo ndị agha ahụ tụbara Shedrak, na Mishak, na Abednego.
23 至於沙得辣客、默沙客和阿貝得乃哥三個人,被捆著落入烈火窯中。
Ya mere, Shedrak, na Mishak, na Abednego ndị e kesịrị agbụ ike, dabara nʼime ọkụ ahụ na-enwusi ike.
24 那時拿步高王十分驚慌,急忙站起,問他的臣僕說:「我們不是把他們三個人全捆起來拋入烈火窯中了嗎﹖」僕人回答君王說:「大王,實在是! 」
Nʼọnọdụ iju anya, Eze Nebukadneza wuliri nʼụkwụ ya, jụọ ndị ndụmọdụ sị, “Ọ bụghị ndị ikom atọ anyị kere agbụ ka anyị tụbara nʼime ọkụ?” Ha zara eze, “Ọ bụ ezie, eze.”
25 君王又問說:「怎麼我看見有四個人無拘無束地在火中行走,絲毫沒有受傷,而且那第四個人的外貌,彷彿是神的兒子。」
Ọ sịrị, “Ma ana m ahụ mmadụ anọ ndị a na-ekeghị agbụ, ka ha na-agagharị nʼime ọkụ ahụ. Leekwa na ọkụ ahụ anaghị ere ha. Onye ahụ mere ha mmadụ anọ yiri nwa nke ndị bụ chi.”
26 於是拿步高走近烈火窯口,說道:「至高天主的僕人沙得辣客、默沙客、和阿貝得乃哥,你們出來罷! 」沙得辣客、默沙客和阿貝得乃哥即從火中出來。
Mgbe ahụ Nebukadneza, bịara nso nʼọnụ ụzọ oke ọkụ ahụ sị, “Shedrak, Mishak na Abednego, ndị ohu Chineke Onye kachasị ihe niile elu, pụtanụ! Bịanụ nʼebe a!” Ya mere, Shedrak, Mishak na Abednego, sitere nʼoke ọkụ ahụ pụta.
27 省長、太守、總督和君王的臣僕一齊前來,查看這幾個人,見烈火在他們身上一點不發生作用,連他們頭上的一根頭髮都沒有燒掉,他們的外氅也沒有變色,他們身上也沒有一點火的氣味。
Ụmụ ndị eze niile, ndịisi niile, ndị ahụ niile na-achị achị na ndị ndụmọdụ eze niile, zukọtara gburugburu ndị ikom atọ ahụ, ha hụkwara na ọkụ emerụghị ha ahụ, na o rechapụghịkwa agịrị isi dị ha nʼisi, uwe ha ereghịkwa ọkụ, isisi anwụrụ ọkụ adịghịkwa nʼahụ ha.
28 於是拿步高說道:「沙得辣客、默沙客和阿貝得乃哥的天主,是可讚美的! 他打發了自己的天使來,救護那些信賴自己的僕人,他們敢違背王命,寧願捐軀,除自己的天主以外,不願事奉叩拜其他任何神祇。
Mgbe ahụ, Nebukadneza sịrị, “Otuto dịrị Chineke nke Shedrak, Mishak na Abednego nʼihi na o zitere mmụọ ozi ya ịzọpụta ndị ohu ya tụkwasịrị ya obi, mgbe ha jụrụ ime ihe eze nyere nʼiwu, kama ha jiri aka ha họrọ ịnwụ, kama ife chi ọzọ nke na-abụghị Chineke nke ha.
29 為此我今頒發詔書,無論那一個民族,那一邦國,那一個異語人民,凡對沙得辣客、默沙客和阿貝得乃哥的天主敢出言不恭的,必被萬剮凌遲,他們的住宅必成為廢墟,因為沒有其他的神能像他這樣施行拯救。」
Ya mere, ana m enye iwu a taa, na-asị na onye ọbụla, maọbụ mba ọbụla, maọbụ asụsụ ọbụla, onye kwuru okwu ọjọọ megide Chineke Shedrak, Mishak na Abednego, a ga-etikpọkwa ụlọ onye ahụ, mee ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe. Nʼihi na o nweghị chi ọzọ nke pụrụ ịzọpụta nʼụzọ dị otu a.”
30 然後君王在巴比倫省擢陞了沙得辣客、默沙客和阿貝得乃哥。
Mgbe ahụ, eze nyere Shedrak, Mishak na Abednego ọkwa ọzọ dị elu karịa nke ha nwere na mbụ nʼala Babilọn.

< 但以理書 3 >