< 使徒行傳 4 >

1 正當他們向百姓講話的時候,司祭、聖殿警官和撒杜塞人來到他們那裏,
Mgbe ha nọ na-agwa ndị mmadụ ahụ okwu, ndị nchụaja na onyeisi ndị agha na-eche ụlọnsọ ukwu ahụ na ndị Sadusii bịakwutere ha.
2 大為惱怒,因為他們教訓百姓,並宣講耶穌從死者中復活,
Ha were oke iwe nʼihi na ha na-ezi ndị mmadụ ihe, na-ekwusakwa na nʼime Jisọs ka mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ dị.
3 遂下手拿住他們,押在拘留所裏,直到第二天,因為天已晚了。
Ha jidere ha tinye ha nʼụlọ mkpọrọ, ruo nʼechi ya. Nʼihi na oge e jidere ha bụ nʼoge uhuruchi.
4 但聽道的人中,有許多人信從了,男人的數目,大約有五千。
Ma ọtụtụ ndị nụrụ okwu ahụ kwenyere. Ọnụọgụgụ ha ruru ihe dị ka puku mmadụ ise.
5 到了第二天,猶太人的首領、長老和經師都聚集在耶路撒冷,
Nʼechi ya, ndị na-achị achị, na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ na Jerusalem.
6 還有大司祭亞納斯和蓋法、若望、亞歷山大以及大司祭家族的人。
Onyeisi nchụaja bụ Anas nọ nʼebe ahụ, na Kaịfas na Jọn na Alegzanda, na ndị ọzọ bụ ndị ikwu onyeisi nchụaja.
7 他們就令宗徒們站在中間,仔細考問說:「你們憑什麼能力,或以誰的名義行這事﹖」
Mgbe ha kpọpụtara ha nʼetiti ha, ha jụrụ ha, “Ọ bụ site nʼike onye, na site nʼaha onye, ka unu ji mee ihe a?”
8 那時,伯多祿充滿聖神,向他們說:「各位百姓首領和長老!
Nʼoge ahụ, Pita jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ gwara ha, “Unu ndị na-achị ala anyị, na ndị okenye.
9 如果你們今天詢問我們有關向一個病人行善的事,並且他怎樣痊癒了,
Ọ bụrụ na unu kpọpụtara anyị ịchọpụta otu nwoke ngwụrọ a si bụrụ onye ahụ dị mma maọbụ otu e si gwọọ ya,
10 我很高興告訴你們和全以色列百姓:是憑納匝肋人耶穌基督的名字即是你們所釘死,天主從死者中所復活的;就是憑著這人,這個站在你們面前的人好了。
ya mere maranụ nke a, unu na ndị Izrel niile, a gwọrọ nwoke a guzo nʼetiti unu site nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret, onye unu kpọgidere nʼobe, ma Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ.
11 這耶穌就是為你們『匠人所棄而不用的石頭,反而成了屋角基石。』
Jisọs a bụ “‘nkume ahụ unu ndị na-ewu ụlọ jụrụ, nke ghọrọ nkume isi ntọala ụlọ.’
12 除他以外,無論憑誰,決無救援,因為在天下人間,沒有賜下別的名字,使我們賴以得救的。」
Nzọpụta adịghị nʼime onye ọbụla ọzọ, nʼihi na o nweghị aha ọzọ e nyere nʼetiti mmadụ nʼokpuru eluigwe nke e nwere ike isite na ya zọpụta anyị.”
13 他們看到伯多祿和若望的膽量,並曉得他們是沒有讀過書的平常人,就十分驚訝;他們既認出他們是同耶穌在一起的,
Mgbe ha hụrụ nkwuwa okwu Pita na Jọn, na-atụghị ụjọ, ma chọpụtakwa na ha bụ ndị mmadụ nkịtị, na ndị a na-azụghị nʼụlọ akwụkwọ, o juru ha anya. Ma ha ghọtara na ha bụ ndị ha na Jisọs nọkọrọ.
14 又看見那治好了的人,同他們一起站著,都無言可對。
Ma mgbe ha hụrụ nwoke ahụ a gwọrọ, ka o guzo nʼakụkụ ha, ha enweghị okwu ọbụla ha nwere ikwu megide nke a.
15 遂命他們暫且離開公議會,彼此商議,
Ha nyere iwu ka ha si nʼụlọikpe ahụ pụọ, ma bido ịgba izu nʼetiti onwe ha banyere nke a.
16 說:「對這些人我們可以作什麼呢﹖因為他們確實顯了一個明顯的奇蹟,凡耶路撒冷的居民都知道了,我們也不能否認。
Ha na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme ndị a? Anyị apụghị ịgọ agọ na ha rụrụ ọrụ ịrịbama pụrụ iche. Ndị niile bi na Jerusalem maara ihe banyere nke a.
17 但是,為叫這事不再在民間傳播,我們當恐嚇他們,叫他們不可再因這名字向任何人發言。」
Ma iji mee ka akụkọ ọrụ ebube a hapụ ịgbasa ruo ọtụtụ mmadụ ntị, ka anyị dọọ ha aka na ntị ka ha ghara ịgwa onye ọbụla okwu banyere aha nwoke a.”
18 遂叫了他們來,嚴令他們絕對不可再因耶穌的名發言施教。
Ha kpọrọ ha nye ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu maọbụ izi ihe nʼaha Jisọs.
19 伯多祿和若望卻回答說:「聽從你們而不聽從天主,在天主前是否合理,你們評斷罷!
Ma Pita na Jọn zara sị ha, “Kpeenụ ikpe a nʼonwe unu, maọbụ ihe ziri ezi nʼanya Chineke ige unu ntị karịa ige Chineke ntị?
20 因為我們不得不說我們所見所聞的事。」
Nʼihi na ọ bụ ihe rara ahụ na anyị ga-akwụsị ikwu okwu banyere ihe ahụ anyị hụrụ na nke anyị nụrụ.”
21 議員們為了百姓的原故,找不到藉口來處罰他們,就把他們恐嚇一番,予以釋放了,因為眾人都為所發生的事光榮天主。
Mgbe ha batụchara ha mba, ha hapụrụ ha ka ha laa. O nweghị ụzọ ọbụla ha ga-esi taa ha ahụhụ nʼihi na mmadụ niile nọ na-eto Chineke nʼihi ihe a mere.
22 原來那因奇蹟治好了的人,已有四十多歲了。
Nʼihi na nwoke a gwọrọ nʼụzọ dị ebube agafeela iri afọ anọ.
23 他們被釋放之後,來到自己的人那裏,報告了大司祭和長老向他們所說的一切;
Mgbe ha hapụrụ ha, ha lara kọọrọ ndị ibe ha ihe ndịisi nchụaja na ndị okenye gwara ha.
24 大家一聽,都同心合意地高聲向天主說:「上主!『是你創造了天地海洋,和其中的一切。』
Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile ji otu obi welie olu ha kpọkuo Chineke, sị, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gị onwe gị kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri, na ihe niile dị nʼime ha.
25 你曾以聖神藉我們的祖先,你的僕人達味的口說過:『異民為何叛亂﹖萬民為何策劃妄事﹖
Ọ bụ gị sitere nʼaka Mmụọ Nsọ site nʼọnụ nna anyị Devid, onye na-ejere gị ozi, sị: “‘Gịnị mere mba niile ji eme oke mkpọtụ? Gịnị mere ndị mmadụ ji na-apịa ọpịpịa nke na-abaghị uru?
26 世上的君王起來,首領聚集在一起,反對上主和他的受傅者。』
Ndị eze nke ụwa na-eguzokwa onwe ha, ndị na-achị achị na-agbakọtakwa, imegide Onyenwe anyị na imegide Onye ya e tere mmanụ.’
27 實在,黑落德和般雀比拉多與異民和以色列人聚集在這座城內,反對你的聖僕人耶穌,反對你的受傅者,
Nʼezie nʼobodo a, Herọd na Pọntiọs Pailet, na ndị mba ọzọ, nakwa ndị Izrel ezukọtala imegide onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi, bụ Jisọs, onye i tere mmanụ,
28 實行了你的手和計劃所預定要成就的事。
ha mere ihe i jiri ike gị na uche gị kwuo na ha aghaghị imezu.
29 現今,上主 !請注意他們的恐嚇,賜你的僕人以絕大的膽量,宣講你的真道,
Ugbu a, Onyenwe anyị, lee ịba mba ha ma nye ndị ohu gị ike iji gbasaa ozi gị na-atụghị egwu ọbụla.
30 同時伸出你的手,藉你的聖僕人耶穌的名字治病,顯徵兆,行奇蹟。」
Setịpụ aka gị gwọọ ndị ọrịa ma rụọ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama site nʼaha onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi bụ Jisọs.”
31 他們祈禱後,他們聚集的地方震動起來,眾人都充滿了聖神,大膽地宣講天主的真道。
Mgbe ha kpesịrị ekpere, ụlọ ahụ ha zukọrọ nʼime ya mara jijiji. Ha jupụtara na Mmụọ Nsọ, ma jiri nkwuwa okwu kwusaakwa okwu Chineke.
32 眾信徒都是一心一意,凡各人所有的,沒有人說是自己的,都歸公用。
Ndị niile kwere ekwe nwere otu obi nʼotu mkpụrụobi. O nweghị onye ọbụla gụrụ ihe ọbụla o nwere dịka nke aka ya, kama ha mere ka onye ọbụla nʼime ha keta oke nʼihe ibe ya nwere.
33 宗徒們以大德能,作證主耶穌的復活,在眾人前大受愛戴。
Ndị ozi sitere nʼike gaa nʼihu na-agba ama banyere mbilite nʼọnwụ Onyenwe anyị Jisọs, oke amara bakwaara ha niile ụba.
34 在他們中,沒有一個貧乏的人,因為凡有田地和房屋的,賣了以後,都把賣得的價錢帶來,
O nweghị onye mkpa kpara nʼime ha, nʼihi na site nʼoge ruo nʼoge, ndị nwere ala maọbụ ụlọ na-ere ha, ma wetakwa ego ha retara na ha,
35 放在宗徒們腳前,照每人所需要的分配。
nye ndị ozi, a na-ekekwa ya nye onye ọbụla dị ka mkpa ya si dị.
36 有位若瑟,宗徒稱之為巴爾納伯,解說「安慰之子,」是肋未人,生於塞浦路斯島,
Josef onye ikwu Livayị, onye sitere na Saiprọs, onye ndị ozi na-akpọ Banabas (nke pụtara “nwa nke nkasiobi”).
37 他有田地,賣了以後,也把銀錢帶來,放在宗徒腳前。
O rere ala o nwere, weta ego ya, ma tọgbọ ya nʼụkwụ ndị ozi.

< 使徒行傳 4 >