< 提摩太後書 4 >

1 我在天主和那要審判生死者的基督耶穌前,指著衪的顯現和衪的國,懇求你
Ya mere, ana m adụsi gị ọdụ ike nʼihu Chineke na nʼihu Kraịst Jisọs, onye ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe. Ejikwa m ọbịbịa ya na alaeze ya na-asị gị,
2 務要宣講真道,不論順境逆境,總要堅持不變;以百般的忍耐和各樣的教訓去反駁,去責斥,去勸勉。
kwusaa okwu ahụ mgbe niile; dịkwa njikere, mgbe o kwesiri ekwesi na mgbe ọ na-ekwesighị, jiri ya nye ntụziaka, jiri ya baa mba, jirikwa ya gbaa ndị mmadụ ume, site na ntachiobi na ilezi anya inye ezi ndụmọdụ.
3 因為時刻將到,那時人不接受健全的道理,反而耳朵發癢,順從自己的情慾,為自己攏聚許多師傅;
Nʼihi na oge na-abịa mgbe ụfọdụ mmadụ na-agaghị anagidekwa eziokwu ahụ, kama ha ga-agagharị ịchọ ndị ozizi ha ga-eji gbaa onwe ha gburugburu, ndị ga-ezi ha ihe ha chọrọ ịnụ.
4 且掩耳不聽真理,偏去聽那無稽的傳說。
Ha agaghị ege ntị nʼeziokwu ahụ, kama ha ga-ege ntị nʼakụkọ na-enweghị isi.
5 至於你,在一切事上務要慬慎,忍受堅苦,作傳揚福音的工作,完成你的職務。
Ma guzosie ike, nọọ na nche mgbe niile, na-edi ahụhụ, na-arụkwa ọrụ gị dịka onye oziọma. Rụzukwaa ihe ị kwesiri ịrụ nʼọrụ gị.
6 因為我已被奠祭,我離世的時期已經近了。
Nʼihi na ugbu a, abụrụla m rịị onye a na-awụpụ dị ka aja ihe ọṅụṅụ, oge ụla m eruokwala.
7 這場好仗,我已打完;這場賽跑,我已跑到終點,這信仰,我已保持了。
Alụsịala m ọgụ ọma ahụ, agbasịala m ọsọ ahụ, edebezuokwala m okwukwe ahụ.
8 從今以後,正義的冠冕已為我預備下了,就是主,正義的審判者,到那一日必要賞給我,不但賞給我,也賞給一切愛慕衪顯現的人。
Ugbu a, e deberela m okpueze nke ezi omume, nke Onyenwe anyị, onye ikpe ezi omume ahụ, ga-enye m nʼụbọchị ahụ. Ma ọ bụghị naanị m ka ọ ga-enye ya, kama ọ ga-enyekwa ya ndị ahụ niile ọ na-agụsị agụ ike ịhụ ya anya.
9 你要趕快到我這裏來,
Gbalịsie ike ịbịakwute m ọsịịsọ,
10 德瑪斯因愛現世,已離棄我到得撒洛尼去了;克勒斯刻去了迦拉達,弟鐸去了達耳瑪提雅, (aiōn g165)
nʼihi na Dimas onye hụrụ ihe ndụ a nʼanya ahapụla m gaa Tesalonaịka. Kresens agaala Galeshịa, Taịtọs agakwaala Dalmetia. (aiōn g165)
11 只有路加同我在一起。你要帶著馬爾谷脰你一起來,因為他在職務為我是有用的。
Ọ bụ naanị Luk nọnyere m. Mgbe ị na-abịa, kpọta Mak nʼihi na ọ ga-enyere m aka nʼije ozi m.
12 至於提希苛,我派他到厄弗所去了。
Ezipụla m Taịkikọs ka ọ gaa Efesọs.
13 我留在特洛阿卡爾頗家中的那件外衣,你來時務必帶上,還有那幾卷書,尤其那幾些羊皮卷。
Mgbe ị na-abịa, wetara m uwe m ji achụ oyi, bụ nke m hapụrụ nʼaka Kapọs na Troas, wetakwara m akwụkwọ m niile ahụ dị nʼebe ahụ, ọkachasị akwụkwọ akpụkpọ anụ niile ahụ.
14 銅匠亞歷山大使我受許多苦,主將照他所行的報應他。
Alegzanda onye na-akpụ ọla emeela m ọtụtụ ihe ọjọọ. Onyenwe anyị ga-akwụghachi ya dị ka ihe o mere m si dị.
15 這人你也要加意提防,因為他極力反抗我們的道理。
Kpachara anya nʼebe ọ nọ, nʼihi na o guzosiri ike megide ihe niile anyị kwuru.
16 在我初次堂時,沒有人在我身邊旁,眾人都都離棄了我,我願天主不歸罪於他們!
Na mbụ, mgbe m pụtara ikpere ọnụ m, ọ dịghị onye kwụnyeere m. Ha niile gbahapụrụ m. Ka a hapụ ịgụnyere ha omume a dị ka mmehie.
17 但是主卻在我左右,堅固了我,使福音的宣講藉著我而完成,使一切外邦人都能聽見;我也從獅子口中疲救了出來。
Ma Onyenwe anyị nọnyeere m, nyekwa m ike ikwusa oziọma ka ndị mba ọzọ niile nụrụ ya. Ọ zọpụtara m, site nʼọnụ ọdụm.
18 主要救我脫各種凶惡的事,也要我安全地進入衪天上的國。願光榮歸於衪,於無窮世之世,阿們。 (aiōn g165)
Onyenwe anyị ga-azọpụtakwa m site nʼihe ọjọọ niile ọbụla, kpọbata m nʼudo baa nʼalaeze eluigwe ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
19 請問候普黎斯加、阿桂拉和敖乃息佛洛一家。
Keleere m Prisila na Akwila na ndị niile bi nʼụlọ Onisiferọs.
20 厄辣斯托仍留在格林多時,特洛斐摩因患病,我將他留在米米肋托。
Erastọs nọ na Kọrint, ma ahapụrụ m Trofimọs na Melitọs nʼọnọdụ ahụ esighị ike.
21 你要趕快在冬天以前來到。歐步羅、普登、理諾、克勞狄雅和所有的弟兄都問候你。
Jisie ike bịarute nʼebe a tupu oge oyi eruo. Yubulọs na-ekele gị, ya na Pudins, na Lainọs na Klọdia na ụmụnna anyị niile.
22 主與你的心靈同在! 願恩寵與你們同在。
Ka Onyenwe anyị nọnyere mmụọ gị. Ka amara dịnyere gị.

< 提摩太後書 4 >