< 撒母耳記下 6 >

1 達味又調集了以色列所有的精兵,共三萬人。
Emesịa, Devid chịkọtara iri puku ndị agha Izrel atọ a zụziri azụzi,
2 達味和他身邊所有的人,起身到猶大巴阿拉去,要從那裏將天主的約櫃運上來。這約櫃名叫「坐於革魯賓上的萬軍的上主。」
Ya na ndị ikom ya niile gara Baala nʼime Juda, isi nʼebe ahụ bugota igbe ọgbụgba ndụ Chineke, nke akpọkwasịrị Aha ya, bụ aha Onyenwe anyị. Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-anọkwasị nʼetiti cherubim.
3 人遂將天主的約櫃,從丘陵上的阿彼納達布家裏抬出,放在一輛新車上,阿彼納達布的兩個兒子,烏匝和阿希約駕駛新車。
Ha dọkwasịrị igbe Chineke ahụ nʼelu ụgbọala ọhụrụ ehi na-adọkpụ, buputa ya site nʼụlọ Abinadab nke dị nʼelu ugwu nta. Ọ bụ Ụza na Ahio, ụmụ Abinadab, na-edu ụgbọala ọhụrụ ahụ,
4 烏匝走在天主約櫃的後面,阿希約走在前面。
nke igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼelu ya, Ahio butere ụzọ na-aga nʼihu igbe ahụ.
5 達味和以色列全家在上主面前興高彩烈地舞蹈作樂,彈琴、擊弦、敲鼓、搖鈴、擊鈸。
Devid na ndị Izrel weere ike ha niile na-aṅụ ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ji abụ, ụbọ akwara, opi, une na ogene na ihe egwu dị iche iche, dịka ịgba na ekwe na-eti egwu.
6 當他們來到納貢的禾場時,因為牛幾乎使天主的約櫃傾倒,烏匝便伸手扶住。
Mgbe ha rutere nʼebe ịzọcha ọka nke Nakọn, Ụza setịpụrụ aka ya, jide igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ, nʼihi na ehi ahụ zọhiere ụkwụ.
7 為了他一時的冒失,上主就向烏匝發怒,將他擊殺,他更死在天主的約櫃旁。
Ma iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide Ụza, nʼihi omume enweghị nsọpụrụ o mere. Ya mere, Chineke tigburu ya. Ọ nwụọ nʼebe ahụ nʼakụkụ igbe Chineke.
8 達味因為上主擊殺了烏匝,很覺悲傷,於是那地方名叫培勒茲烏匝,直到今日。
Mgbe ahụ, iwe were Devid, nʼihi ọnụma Onyenwe anyị dakwasịrị Ụza. Ruo taa, a na-akpọ ebe ahụ Perez Ụza.
9 那天,達味對上主害了怕,心想:「上主的約櫃如何能進入我那裏﹖」
Devid tụrụ egwu Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ. O kwuru sị, “Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa bịakwute m?”
10 因此,達味不願上主的約櫃遷入達味城自己那裏,卻運往加特人敖貝得厄東家中。
O kweghị ebubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼime obodo Devid, kama o bugara ya nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git.
11 上主的約櫃在加特人敖貝得厄東家中,存放了三個月,上主祝福了敖貝得厄東和他的全家。
Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị nọrọ nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git ọnwa atọ. Onyenwe anyị gọzikwara ya na ezinaụlọ ya niile.
12 有人告訴達味,上主為了天主的約櫃祝福了敖貝得厄東的家,和他所有的一切。達味就去將天主的約櫃,由貝得厄東家興高彩烈地抬上達味城來。
Mgbe a gwara eze bụ Devid si, “Onyenwe anyị agọziela ezinaụlọ Obed-Edọm na ihe niile o nwere, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke.” Nʼihi nke a, Devid ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm, nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buga nʼobodo Devid.
13 每當抬上主約櫃的人走六步,他就祭獻一頭牛和一隻肥羊。
Mgbe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ zọrọ nzọ ụkwụ isii; ọ na-eji oke ehi na nwa ehi gbara abụba chụọ aja.
14 同時達味束著細麻的「厄弗得,」在上主面前盡力跳舞。
Devid ji ike ya niile na-ete egwu nʼihu Onyenwe anyị. Ọ yi uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ nʼụbọchị ahụ,
15 這樣,達味與以色列全家大聲歡呼,吹起號筒,將上主的約櫃迎上來。
mgbe ya na ndị Izrel niile ji iti mkpu na ụda ịfụ opi ike na-ebubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.
16 當上主的約櫃進入達味城時,撒烏耳的女兒米加耳,由窗內窺看,見達味王在上主面前跳躍舞蹈,心中就輕視他。
Mgbe ha bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-abata nʼobodo Devid, Mikal, nwa Sọl lepụrụ anya site na oghereikuku ụlọ. Mgbe ọ hụrụ eze Devid ka ọ na-awụli elu na-etekwa egwu nʼihu Onyenwe anyị, o ledara ya anya nʼime obi ya.
17 他們將上主的約櫃抬來,安置在預備好的地方,停在達味為約櫃建立的帳幕中央;達味給上主奉獻了全燔祭與和平祭。
Ha bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ, guzobe ya nʼọnọdụ ya nʼime ụlọ ikwu nke Devid manyere maka ya. Devid chụrụ aja nsure ọkụ na aja udo nʼihu Onyenwe anyị.
18 達味獻完了全燔祭與和平祭後,以萬軍上主的名祝福了百姓。
Mgbe ọ chụsịrị aja nsure ọkụ na aja udo ndị a, ọ gọziri ndị Izrel nʼaha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
19 以後,分給所有百姓,全以色列民眾,不論男女,每人一塊餅,一塊肉,一塊葡萄乾餅。然後百姓各自回了本家。
O nyekwara onye ọbụla nʼetiti igwe ndị Izrel niile ahụ, ma nwoke ma nwanyị, otu ogbe achịcha, ọkpụrụkpụ anụ na achịcha mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ. Ndị a niile lara, onye ọbụla nʼụlọ nke ya.
20 達味回來祝福本家時,撒烏耳的女兒米加耳出來迎接達味說:「以色列的君王今天多麼榮耀! 他今天在臣僕的婢女前赤身露體,活像一個赤身露體的小丑。」
Mgbe Devid lọtara ka ọ gọzie ndị ụlọ ya, Mikal, ada Sọl pụtara izute ya, sị, “Lee ka eze Izrel si mee onwe ya onye dị ukwuu taa! Ọ gbara onwe ya ọtọ na mbara, nʼihu ndị ohu nwanyị nke ndị odibo ya dịka mmadụ efu.”
21 達味回答米加耳說:「在廢棄你父他全家,而選拔了我的上主面前,在派我為上主百姓以色列首領的上主面前,我甘願舞蹈,
Ma Devid zara Mikal sị ya, “Ọ bụ nʼihu Onyenwe anyị onye họpụtara m karịa nna gị maọbụ onye ọbụla ọzọ sitere nʼụlọ ya ka m tere egwu. E, Onyenwe anyị ahụ họpụtara m ịbụ onyendu Izrel, ndị nke ya. Nʼezie, aga m aga nʼihu ịkpa agwa dịka onye nzuzu nʼihi ịsọpụrụ Onyenwe anyị.
22 甘願加倍卑賤我自己! 我在你眼中被視為卑賤,但在你所說的婢女們前,我必受到尊敬。」
E, aga m aga nʼihu ịghọ onye na-enweghị uche, na onye e weturu ala nʼanya onwe m. Ma ụmụ agbọghọ ndị ahụ i kwuru okwu ha, ha ga-asọpụrụ m!”
23 從此撒烏耳的女兒米加耳,到死再沒有生育。
Mikal, ada Sọl amụtaghị nwa ọbụla ruo nʼoge ọnwụ ya.

< 撒母耳記下 6 >