< 撒母耳記下 5 >
1 以色列各支派聚集到赫貝龍,來見達味說:「看,我們都是你的骨肉。
Mgbe ahụ, ndị ebo Izrel niile bịakwutere Devid na Hebrọn, sị ya, “Lee, ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị ka anyị bụ.
2 以前,連撒烏耳當我們的君王時,也是你率領以色列出入征討;上主曾對你說過:你應牧養我的百姓以色列,作以色列的領袖。」
Nʼoge gara aga, mgbe Sọl bụ eze na-achị anyị, ọ bụ gị duuru ndị agha Izrel nʼọgụ niile, ma ọpụpụ ma mbata. Onyenwe anyị sịrị gị, ‘Ị ga-azụ ndị m, bụ Izrel, ị ga-abụkwa onye ga-achị ha.’”
3 隨後,以色列所有的長老都到赫貝龍來見君王,達味君王就在赫貝龍,當上主的面同他們立了盟約;他們便給達味傅油,立他為以色列王。
Mgbe ndị okenye Izrel niile bịakwutere Devid na Hebrọn, ha na eze Devid gbara ndụ nʼihu Onyenwe anyị na Hebrọn. Ha tere Devid mmanụ ịbụ eze Izrel.
Devid gbara iri afọ atọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịkwara iri afọ anọ.
5 在赫貝龍做猶大王,七年零六個月;在耶路撒冷做全以色列和猶大王三十三年。
Ọ chịrị ndị Juda niile na Hebrọn afọ asaa na ọnwa isii. Chịakwa ndị Izrel na Juda niile mgbe ọ nọ na Hebrọn na mgbe ọ nọ na Jerusalem iri afọ atọ na atọ,
6 以後,達味和他的人向耶路撒冷進發,攻打住在那地方的耶步斯人,有人告訴達味說:「你決攻不進去,因為瞎眼瘸腿的也會把你趕走。」這是說:「達味決攻不進去。」
Eze na ndị ikom ya zọọrọ ije garuo Jerusalem ibuso ndị Jebus bi nʼebe ahụ agha. Ndị Jebus gwara Devid sị, “Ị gaghị abata nʼebe a, ọ bụladị ndị ìsì na ndị ngwụrọ nwere ike ịchụghachi gị azụ.” Ha na-eche sị, “Devid agaghị abata nʼebe a,”
nʼagbanyeghị okwu ndị a, Devid dọtara ebe ahụ e wusiri ike nke Zayọn nʼagha, ya bụ obodo Devid.
8 那日達味宣佈說:「凡攻打耶步斯人,從水道首先到達味所惱恨的那些瘸腿瞎眼的人那裏的,他要升為軍長和元帥。」責魯雅的兒子約阿布首先上去了,因而成了元帥。但為此有句俗語說:「有瞎眼瘸腿的在此,人是進不去的! 」
Nʼụbọchị ahụ, Devid kwuru sị, “Onye ọbụla ga-emeri ndị Jebus ga-esite nʼọnụ warawara ebe mmiri si abanye nʼobodo a banyekwuru ndị ngwụrọ na ndị ìsì a bụ ndị iro Devid.” Ọ bụ nke a mere ha ji ekwu okwu sị, “Ndị ìsì na ndị ngwụrọ agaghị abata nʼụlọeze ahụ.”
9 達味住在那山堡內,稱之為達味城。達味又從米羅往裏,四周加建了城牆。
Devid biiri nʼebe ahụ e wusiri ike, kpọọ ya obodo Devid. O wuru akụkụ ebe dị gburugburu ya, site na Milo baa ruo nʼime ya.
Ma ọ gara nʼihu na-adị ukwuu karịa, nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere ya.
11 提洛王希蘭派使臣來見達味,給他送來了香柏木,派來了木匠石匠,為他建造宮室。
Hiram bụ Eze Taịa, zitere Devid osisi sida e ji ewu ụlọ, na ndị ǹka osisi, ndị na-ewu ụlọ. Ha wuuru Devid ụlọeze.
12 那時,達味知道上主已堅定他為以色列王,並為了自己的百姓以色列,提高了他的王位。
Mgbe ahụ, Devid ghọtara na Onyenwe anyị emeela ka o guzosie ike dịka eze ndị Izrel. Bulikwa alaeze ya elu nʼihi ndị ya Izrel.
13 達味從赫貝龍遷來以後,在耶路撒冷又娶了妻妾,生了一些子女。
Mgbe Devid sitere na Hebrọn kwabata na Jerusalem; ọ lụrụ ndị inyom ọzọ, nwetakwara onwe ya ọtụtụ ndị iko nwanyị. Ọ mụtakwara ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị.
14 他在耶路撒冷所生兒子的名字如下:沙慕亞、芍巴布、納堂、撒羅滿、
Ndị a bụ aha ụmụ a mụụrụ ya na Jerusalem: Shamua, Shobab, Netan, Solomọn,
Ibha, Elishua, Nefeg, Jafia,
Elishama, Eliada na Elifelet.
17 培肋舍特人聽說:達味受傅作了以色列王,遂都上來向達味尋釁;達味一聽說,便下到堡壘中。
Mgbe ndị Filistia nụrụ na eteela Devid mmanụ ị bụ eze ndị Izrel, ha pụrụ ka igwe ha niile ha ịchọ ya. Ma Devid nụrụ maka ya, gbadaa nʼime ebe ahụ e wusiri ike.
Ma ndị Filistia bịara, gbasaa onwe ha na Ndagwurugwu Refaim niile.
19 那時達味求問上主說:「我可以上去攻打培肋舍特人嗎﹖你將他們交在我手中嗎﹖」上主回答達味說:「你上去,我必將培肋舍特人交在你手中。」
Mgbe ahụ, Devid jụrụOnyenwe anyị ase sị, “Ọ bụ m gaa buso ndị Filistia agha? Ị ga-enyefe ha nʼaka m?” Onyenwe anyị zara sị ya, “Gaa, nʼihi na aghaghị m inyefe ndị Filistia nʼaka gị.”
20 達味於是來到巴耳培辣親,在那裏擊敗了他們。達味因此說:「上主使我的敵人在我面前崩潰,如水破堤。」為此,後人稱這地方為巴耳培辣親。
Ya mere, Devid gara Baal-Perazim, meriekwa ha nʼebe ahụ. O kwuru sị, “Onyenwe anyị enupula megide ndị iro m nʼihu m, dịka idee mmiri si enupu.” Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Baal-Perazim.
21 培肋舍特人把自己的神像都遺棄在那裏,達味和他的人便將這些神像都帶走了。
Ndị Filistia hapụrụ arụsị niile ha nʼebe ahụ. Devid na ndị ikom ya chịkọtara ha chịpụ.
Ma ndị Filistia lọghachiri ọzọ, gbasaa onwe ha na Ndagwurugwu Refaim.
23 達味又求問上主,上主說:「不要上去,但要繞到他們後方,從桑林那邊抄他們的後路。
Nʼihi nke a, Devid jụrụ Onyenwe anyị ase, ọ zara sị, “Esitekwala nʼihu ha gaa, kama gaa gburugburu ruo nʼazụ ha, buso ha agha na ncherita ihu osisi balsam ndị ahụ.
24 當你聽到桑樹梢上有腳步聲時,你就趕快行動,因為那時正是上主在你前面出擊培肋舍特人的軍隊。」
Ngwangwa ị nụrụ ụda ikiri ụkwụ nʼelu osisi balsam ndị ahụ, mee ngwa malite ọgụ, nʼihi na nke a pụtara na Onyenwe anyị eburula unu ụzọ pụọ, itigbu ndị agha Filistia.”
25 達味就照上主所命的行了,擊殺培肋舍特人,從基貝紅直到革則爾。
Devid mere dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. O tigburu ndị Filistia, site na Geba ruo Gaza.