< 列王紀下 15 >
1 以色列王雅洛貝罕二十七年,阿瑪責雅的兒子阿匝黎雅登極為猶大王。
Nʼafọ nke iri abụọ na asaa nke ọchịchị Jeroboam nʼIzrel ka Azaraya nwa Amazaya bidoro ịchị dịka eze na Juda.
2 他登極時十六歲,在耶路撒冷作王凡五十二年;他母親名叫耶苛里雅,是耶路撒冷人。
Ọ gbara afọ iri na isii mgbe ọ malitere ị bụ eze. Ọ chịkwara na Jerusalem iri afọ ise na abụọ. Aha nne ya bụ Jekolaya, onye Jerusalem.
3 阿匝黎雅行了上主視為正義的事,完全像他父親阿瑪責雅所行的一樣,
O soro nzọ ụkwụ nna ya bụ Amazaya, mee ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.
Kama dịka eze ndị ọzọ, o wezugaghị ebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu; ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja nsure ọkụ na aja na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ.
5 上主打擊了君王,君王即患了癩病,直到他死的那一天,獨自住在一所王宮裡。那時,君王的兒子約堂代理朝事,統治國家的百姓。
Onyenwe anyị tiri eze ihe otiti ọrịa ekpenta ruo ụbọchị ọnwụ ya. O biri nʼụlọ ewupụrụ iche. Jotam nwa nwoke eze ghọrọ onye nlekọta ụlọeze na-achịkwa ndị ala ahụ.
6 阿匝黎雅其餘的事蹟,他行的一切,都記載在猶大列王實錄上。
Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Azaraya, na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
7 阿匝黎雅與祖先同眠,與祖先同葬在達味城;他的兒子約堂繼位為王。
Azaraya soro ndị nna nna ya dina nʼọnwụ, e lie ya nso nʼebe e liri ha, nʼime obodo Devid. Jotam nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
8 猶大王阿匝黎雅三十八年,雅洛貝罕的兒子則加黎雅在撒瑪黎雅登極為以色列王,在位六個月;
Nʼafọ nke iri atọ na asatọ nke ọchịchị eze Azaraya bụ eze Juda, ka Zekaraya, nwa Jeroboam ghọrọ eze Izrel na Sameria. Ọ chịrị ọnwa isii.
9 他行了上主視為惡的事,像他的祖先所行的一樣,沒有離開乃巴特的兒子雅洛貝罕,使以色列陷於罪惡的罪。
Dịka ndị nna ya bu ya ụzọ si mee, Zekaraya mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O mekwara dịka Jeroboam nwa Nebat, onye dubara ndị Izrel na mmehie ịkpọ isiala nye chi ọzọ.
10 雅貝士的兒子沙隆結黨反叛他,在依貝肋罕殺了他,篡位為王。
Shalum nwa Jebesh, na ndị ọzọ, gbara izu ọjọọ megide ya, tigbuo ya nʼihu ndị Izrel niile. Ọ ghọkwara eze mgbe Zekaraya nwụrụ.
11 則加黎雅其餘的事蹟都記載在以色列列王實錄上。
Akụkọ metụtara ihe ndị ọzọ mere mgbe Zekaraya bụ eze, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha.
12 這正應驗了上主對耶胡所說的話:「你的子孫要坐以色列王位,直到第四代。」
Ya mere, okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Jehu mezuru, nke bụ: “Ụmụ ụmụ gị ga-anọkwasị nʼocheeze Izrel ruo nʼọgbọ nke anọ ha.”
13 猶大王烏齊雅三十九年,雅貝士的兒子沙隆登極為王,在撒瑪黎雅作王一個月。
Shalum nwa Jebesh malitere ịbụ eze nʼafọ nke iri atọ na itoolu nke ọchịchị Uzaya eze Juda. Ọ chịrị otu ọnwa na Sameria.
14 那時加狄的兒子默納恆從提爾匝來到撒瑪黎雅,在撒瑪黎雅殺了雅貝士的兒子沙隆,篡位為王。
Menahem nwa Gadi sitere nʼobodo Tịaza bịaruo Sameria gbuo Shalum nwa Jebesh ghọọ eze nʼọnọdụ ya.
15 沙隆其餘的事蹟和他如何結黨謀反,都記載在以色列列王實錄上。
Akụkọ ndị ọzọ gbasara Shalum na izu ọjọọ ya, e deghị ha nʼakwụkwọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel na-achị.
16 以後,默納恒從提爾匝出發攻打塔普亞,又攻打其四境,因為人沒有給他開城門,所以攻破以後,屠殺了城中所有的人,剖開了所有的孕婦。
Nʼoge ahụ, Menahem sitere na Tịaza buso obodo Tipsa agha, na onye ọbụla bi nʼobodo ahụ na gburugburu ya nʼihi na ha ekweghị emeghe ọnụ ụzọ ama ha. O tigburu Tifsa kwakọrọ ihe niile, bọwakwaa afọ ndị inyom niile dị ime.
17 猶大王阿匝黎雅三十九年,加狄的兒子默納恒登極為以色列王,在撒瑪黎雅作王十年,
Nʼafọ iri atọ na itoolu nke Azaraya, eze Juda, Menahem nwa Gadi ghọrọ eze ọhụrụ ndị Izrel. Ọ chịrị afọ iri dịka eze na Sameria.
18 行了上主視為惡的事,在他有生之日,始終沒有離開乃巴特的兒子雅洛貝罕,使以色列陷於罪惡的罪。
O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Nʼoge ọchịchị ya, o sighị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ nke o mere ka Izrel mehie.
19 那時,亞述王普耳前來犯境,默納恒就送給了普耳一千「塔冷通」銀子,要求他扶持自己,鞏固自己的王權。
Mgbe ahụ, Pul eze Asịrịa busoro ala ahụ agha. Menahem nyere ya otu puku talenti ọlaọcha, ime ka Pul kwagide ọchịchị ya, na ime ka aka ya siekwa ike nʼalaeze Izrel.
20 默納恒向以色列所有富豪征收銀子,每人應繳納五十「協刻耳,」為進獻給亞述王。亞述王於是回去了,沒有在境內停留。
Menahem si nʼaka ndị Izrel nweta ego a. Onye ọgaranya ọbụla tụrụ iri shekel ọlaọcha ise nke e nyere eze Asịrịa. Mgbe eze Asịrịa natachara ọlaọcha ndị a, o si nʼala ahụ pụọ, ọ nọgidekwaghị nʼala ahụ.
21 默納恒其餘的事蹟,他行的一切,都記載在以色列列王實錄上。
Akụkọ banyere Menahem na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha?
22 默納恒與祖先同眠後,他的兒子培卡希雅繼位為王。
Menahem sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, Pekahaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
23 猶大王阿匝黎雅五十年,默納恒的兒子培卡希雅登極為以色列王,在撒瑪黎雅作王兩年。
Nʼafọ nke iri ise, nke ọchịchị eze Azaraya na Juda, ka Pekahaya nwa Menahem bidoro ịchị dịka eze nʼIzrel. Afọ abụọ ka ọ chịrị nʼime Sameria.
24 他行了上主視為惡的事,沒有離開乃巴特的兒子雅洛貝罕,使以色列陷於罪惡的種種罪惡。
Ma Pekahaya mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị. O sighị na mmehie niile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ nke o jiri mee ka Izrel mehie.
25 他的軍官,勒瑪里雅的兒子培卡黑結黨反叛他,同阿爾哥布和阿黎厄,以及與他同謀的五十個基肋阿得人,在撒瑪黎雅王宮的堡壘內,將他殺死,篡位為王。
Ma Peka nwa Remalaya, otu nʼime ndịisi agha eze na iri ndị ikom ise ọzọ si Gilead gbara izu megide ya, gbuo ya nʼụlọeze dị nʼime Sameria. Ha gbukwara Agob na Arie nʼoge a ha gburu Pekahaya. Emesịa, Peka ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
26 培卡希雅其餘的事蹟,他行的一切,都記載在以色列列王實錄上。
Akụkọ banyere Pekahaya na ihe niile o mere ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha.
27 猶大王阿匝黎雅五十二年,勒瑪里雅的兒子培卡黑登極為以色列王,在撒瑪黎雅作王凡二十年。
Nʼafọ nke iri ise na abụọ nke ọchịchị Azaraya eze Juda ka Peka nwa Remalaya ghọrọ eze Izrel nʼobodo Sameria. Ọ chịrị dịka eze iri afọ abụọ.
28 他行了上主視為惡的事,沒有離開乃巴特的兒子雅洛貝罕,使以色列陷於罪惡的種種罪惡。
O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O fere chi ọzọ ofufe, o sighị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ mmehie nke o dubara ndị Izrel nʼime ya.
29 以色列王培卡黑在位時,亞述王提革拉特丕肋色爾前來,侵佔了依雍、阿貝耳貝特瑪阿加、雅諾亞、刻德士、哈祚爾、基肋阿得、加里肋亞和納斐塔里全地;並將這些地方的居民都擄往亞述。
Nʼoge Peka bụ eze Izrel, ka Tiglat-Pilesa, eze Asịrịa bịara were Ijon, Ebel-Bet-Maaka, Janoa, Kedesh, Hazọ, Gilead, Galili na ala ndị Naftalị niile. Ọ chụpụrụ ndị mmadụ niile mee ka ha gaa biri nʼAsịrịa.
30 烏齊雅的兒子約堂二十年,厄拉的兒子曷舍亞結黨反叛勒瑪里雅的兒子卡培黑,殺了他,篡位為王。
Nʼoge ahụ, Hoshea nwa Elaa gbara izu ọjọọ megide Peka nwa Remalaya gbuo ya, bụrụ eze nʼọnọdụ ya. Ọ malitere ịbụ eze nʼafọ nke iri abụọ nke ọchịchị eze Jotam nwa Uzaya.
31 培卡黑其餘的事蹟,他行的一切,都記載在以色列列王實錄上。
Akụkọ banyere Peka na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel niile mere nʼụbọchị ndụ ha?
32 以色列王勒瑪里雅的兒子培卡黑二年,烏齊雅的兒子約堂登極為猶大王。
Nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị Peka nwa Remalaya eze Izrel ka Jotam nwa Ụzaya eze Juda malitere ọchịchị ya.
33 他登極時二十五歲,在耶路撒冷作王凡十六年;他的母親名叫耶魯沙,是匝多克的女兒。
Ọ gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ ghọrọ eze. Ọ chịrị afọ iri na isii na Jerusalem. Aha nne ya bụ Jerusha, nwa Zadọk.
34 約堂行了上主視為正義的事完全像他父親烏齊雅所行的一樣,
O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka nna ya Ụzaya mere.
35 只是高丘仍沒有廢除,人民仍在高丘上焚香獻祭;他建築了上主聖殿的北門。
Kama, o wezugaghị ebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu, ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja nsure ọkụ dị iche iche na aja na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ. Jotam wugharịrị Ọnụ Ụzọ ama nke dị Elu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
36 約堂其餘的事蹟,他行的一切,都記載在猶大列王實錄上。
Ma banyere ihe ndị ọzọ niile nke oge ọchịchị Jotam na ihe o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
37 那時,上主已開始派阿蘭王勒斤和勒瑪里雅的兒子培卡黑來攻打猶大。
(Nʼụbọchị ndị ahụ, Onyenwe anyị malitere izite Rezin eze ndị Aram na Peka nwa Remalaya, imegide ndị Juda.)
38 約堂與祖先同眠,與祖先同葬在他祖先達味城內;他的兒子阿哈次繼位為王。
Jotam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha, nʼobodo Devid, bụ obodo nna ya. Ehaz nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.