< 列王紀下 12 >

1 他在耶胡第七年即位為王,在耶路撒冷作王凡四十年。他的母親名叫漆彼雅,是貝耳舍巴人。
Nʼafọ nke asaa, nke ọchịchị Jehu nʼIzrel, ka Joash malitere ịbụ eze na Juda. Iri afọ anọ ka ọ chịrị dịka eze na Jerusalem. Aha nne ya bụ Zibịa onye Bịasheba.
2 約阿士在司祭約雅達教導他期間,行了上主視為正義的事,
Joash mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị ụbọchị niile nke Jehoiada onye nchụaja ziri ya ihe.
3 只是沒有廢除高丘,人民仍在高丘上焚香獻祭。
Ma naanị na o wezugaghị ebe ịchụ aja niile dị nʼugwu. Ndị Juda nọgidere na-achụ aja dị iche iche nʼebe ahụ, na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
4 約阿士對司祭說:「凡人向上主的殿繳納作獻儀錢,不論是人丁贖金,或樂意捐獻於上主殿中的錢,
Joash sịrị ndị nchụaja, “Nakọtaanụ ego niile a na-ewebata dịka onyinye dị nsọ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ya bụ, ego a na-anakọta nʼoge ịgụ mmadụ ọnụ, na ego e webatara maka imezu nkwa ndị mmadụ kwere, na ego e webatara nʼụlọnsọ ukwu dịka onyinye afọ ofufe.
5 司祭們都可以接收,每人也可向相識的人去勸捐;但司祭們應該修理聖殿需要修理的破壞之處。」
Ka onye nchụaja ọbụla site nʼaka otu nʼime ndị na-eche ego nara ego, a ga-eji mezie ihe ọbụla a chọpụtara na o mebiri nʼụlọnsọ ukwu ahụ.”
6 但是,直到約阿士王第二十三年,司祭尚未修理聖殿的破壞之處。
Ma nʼafọ nke iri abụọ na atọ nke ọchịchị eze Joash, ọ chọpụtara na ndị nchụaja ahụ emezibeghị ihe mebiri nʼụlọnsọ.
7 於是約阿士王將約雅達大司祭和其他司祭召來,問他們說:「你們為什麼不修理聖殿破壞之處﹖現在你們不要再向相識的人收錢了;應把所有的錢交出,用來修理聖殿的破壞之處。」
Ya mere, eze Joash kpọrọ Jehoiada, onye nchụaja, kpọkwaa ndị nchụaja ndị ọzọ jụọ ha, “Gịnị mere unu emezibeghị ụlọnsọ a? Site ugbu a gaa nʼihu, unu esitekwala nʼaka ndị na-eche ego anara ego ọzọ, kama, nyefeenụ ya maka iji dozie ụlọnsọ ukwu ahụ.”
8 司祭們就同意不再向人民收錢,也不再負責修理聖殿的破壞之處。
Ndị nchụaja ahụ kwenyere sị, “Anyị agaghị esitekwa nʼaka ndị mmadụ nara ego ọbụla. Otu a kwa, anyị agaghị emezikwa ụlọnsọ ukwu a nʼonwe anyị.”
9 司祭約雅達於是拿來一個箱子,箱子上面開了一個口,安放在祭壇旁邊,即在上主聖殿入口的右邊,守門的司祭將所有獻於上主聖殿的銀錢,放入箱內。
Mgbe ahụ, Jehoiada wetara otu igbe mepuo oghere nʼelu ya, debe ya nʼakụkụ ebe ịchụ aja, nʼaka nri dịka mmadụ na-abata nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ndị nchụaja niile na-eche nche nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ na-etinye ego niile e webatara nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼime igbe ahụ.
10 幾時看見箱內的錢夠多了,君王的秘書和大司祭就上來,把錢倒出,數點上主殿內所有的銀錢。
Mgbe ọbụla ha hụrụ na igbe ego ahụ ejupụtala nʼego, onye ode akwụkwọ ụlọeze na onyeisi nchụaja na-abịa, gụọ ego ahụ e webatara nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, tinye ha nʼakpa.
11 他們將秤好了的錢,交給上主殿內間監工的管理員,由他們發給在上主殿內工作的木匠和建築工人,
Ha na-ewere ego ahụ a gụrụ ọnụ, nyefee nʼaka ndị ikom ahọpụtara maka ilekọta ndị ọrụ na-emezi ụlọ Onyenwe anyị. Ndị ahụ na-eji ya kwụọ ndị ọkwa ǹka osisi na ndị na-ewu ụlọ,
12 泥水匠和石匠,或購買木料和鑿刻好的石頭,用來修補上主殿內的破壞之處;總之,用來作為修理聖殿的費用。
na ndị na-edo nkume, na ndị na-awa nkume ụgwọ. Ọ bụ sitekwa nʼego ahụ ka a na-azụta osisi na nkume a wara awa iji dozie ụlọnsọ Onyenwe anyị, na ịkwụ ụgwọ ihe ndị ọzọ e ji emezi ihe niile ekwesiri imezi nʼụlọnsọ ukwu ahụ.
13 進獻於上主聖殿的銀錢,並沒有用來製造上主殿內的銀盆、燭剪、盤子、號筒,或任何金銀器皿,
E jikwaghị ego ahụ e webatara nʼụlọnsọ kpụta efere ọlaọcha, ihe e ji akpakepụ ọkụ, efere ịkwọsa mmiri, opi maọbụ ihe ndị ọzọ nke e ji ọlaedo maọbụ ọlaọcha kpụọ maka ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
14 只是將銀錢交給工作人員,用來修理上主的殿。
Ọ bụ ndị na-eje ozi, ndị ji ya rụzie ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ka e nyere ya.
15 也並不需要向那些經手收錢付給工人的人算賬,因為他們做事忠信可靠。
O nweghị onye a sịrị ka ọ gụzie otu e si jiri ego ahụ rụọ ọrụ, bụ ndị e nyere ego ahụ maka ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ, nʼihi na ha bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi.
16 至於獻作贖過祭和贖罪祭的錢,不歸於上主的殿,全歸於司祭。
E webataghị ego niile sitere nʼaja ikpe ọmụma nakwa aja mmehie nʼime ụlọnsọ ukwuu Onyenwe anyị. Ọ bụ ndị nchụaja nwe nke ahụ.
17 那時,阿蘭王哈匝耳上來攻打加特,也攻下了,準備進攻耶路撒冷。
Nʼoge ahụ, Hazael eze Aram, gara buso Gat agha, lụgbuo ya, dọta ya nʼagha. Emesịa, o chere ihu nʼụzọ Jerusalem imegide ya.
18 猶大王約阿士就將他祖先猶大王約沙法特、約蘭和阿哈齊雅所奉獻的聖物,同他自己奉獻的聖物,以及上主聖殿和王宮的府庫內儲藏的金子,全部取出來,送給了阿蘭王哈匝耳;哈匝耳就離開了耶路撒冷。
Ma Joash, bụ eze Juda, chịkọtara ihe niile ahụ bụ nke Jehoshafat, Jehoram na Ahazaya nna ya, ndị bụ eze Juda doro nsọ nye Chineke, chịrịkwa onyinye nke ya onwe ya dokwara nsọ, na ọlaedo niile, na akụ niile e nwere ike ịchọta nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na nke dị nʼụlọeze, zigara Hazael, bụ eze Aram. Nʼihi ihe ndị a, ọ lara, hapụ ibuso Jerusalem agha.
19 約阿士其餘的事蹟,他行的一切,都記載在猶大列王實錄上。
Akụkọ gbasara ọchịchị eze Joash, na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Juda niile mere nʼoge ha.
20 約阿士的臣僕起來結黨謀反,在約阿士下到米羅宮時,將他殺死;
Ndị ozi ya gbara izu ọjọọ megide Joash, gbukwaa ya na Bet Milo, nʼụzọ e si aga Sila.
21 殺他的是他的臣僕史默阿特的兒子約匝加爾和芍默爾的兒子約匝巴得。他死後,人將他葬在達味城,與祖先埋在一起;他的兒子阿瑪責雅繼位為王。
Ndịisi ozi ahụ gburu ya bụ Jozabad nwa Shimeat, na Jehozabad nwa Shomea. Ọ nwụrụ, e lie ya na ndị nna nna ya ha nʼobodo Devid. Amazaya nwa ya, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

< 列王紀下 12 >