< 列王紀下 1 >

1 阿哈布死後,摩阿布就背叛了以色列。
Moab nupuru isi megide Izrel mgbe Ehab nwụrụ.
2 阿哈齊雅在撒瑪黎雅從樓上的欄杆上跌下來就病了,遂打發使者,吩咐他們說:「你們去求問厄刻龍的神巴耳則步布,我這病寒能好嗎﹖」
Nʼoge a, Ahazaya sitere na mgbe ụlọ elu ya dị na Sameria daa, merụọ ahụ nke ukwuu. Nʼihi ọrịa a, o zigara ndị ozi, sị ha, “Gaa jụta ase nʼaka Baal-Zebub, bụ chi Ekrọn, ma m ga-adịrị site nʼihe mmerụ ahụ a.”
3 上主的使者對提市貝人厄里亞說:「快起身,去迎撒瑪黎雅王的使者,問他們說:你們去求問厄刻龍的神巴耳則步布,難道在以色列沒有天主嗎﹖
Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Ịlaịja onye Tishbe okwu sị ya, “Gaa zute ndị ozi eze Sameria zipụrụ, jụọ ha sị, ‘Gịnị mere unu ji aga Ekrọn ịjụ ase? Ọ bụ na Chineke anọghị nʼIzrel mere unu ji aga ịjụ Baal-Zebub ase ịmata ma eze ọ ga-adị ndụ?’
4 為此,上主這樣說:你再不能從你所上的床上下來,你必定要死。」厄里亞就去了。
Nʼihi nke a, otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ị gaghị esite nʼelu ihe ndina ahụ bilie. Ị ghaghị ịnwụ!’” Ya mere Ịlaịja pụrụ gaa zie ndị ozi eze ozi ahụ.
5 使者回來見了君王,阿哈齊雅問他們說:「你們為什麼回來了。」
Ndị ozi ahụ laghachiri azụ. Ma mgbe eze hụrụ ha, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji lọghachi?”
6 他們回答說:「有一個人迎上我們來,對我們說:你們回去見打發你們來的君王,對他說:上主這樣說:你派人去求問厄刻龍的神巴耳則步布,難道以色列沒有天主嗎﹖為此,你再不能從你所上的床上下來,你必定要死。」
Ha zara ya, “Otu nwoke zutere anyị nʼụzọ sị anyị, ‘Laghachi ga zie eze ahụ zitere unu sị ya: “Ihe ndị a, ka Onyenwe anyị kwuru, Ọ bụ nʼihi na Chineke anọghị nʼIzrel ka i ji zipụ ndị mmadụ ka ha gaa jụta ase site nʼaka Baal-Zebub, chi ndị Ekrọn? Nʼihi nke a, ị gaghị esite nʼihe ndina gị bilie. Ya doo gị anya na ị ghaghị ịnwụ!”’”
7 君王問他們說:「迎上你們,且告訴你們這些話的是怎樣的一個人﹖」
Eze jụrụ ha sị, “Onye bụ nwoke a zutere unu nʼụzọ gwa unu okwu ndị a? Olee ụdị mmadụ ọ bụ?”
8 他們回答說,「是一個身穿皮毛衣,腰束皮帶的人。」君王說:「這一定是提市貝人厄里亞。」
Ha zaghachiri ya, “Ọ bụ nwoke yi uwe e ji ajị anụ kpaa; o kere ihe okike akpụkpọ anụ nʼukwu ya.” Eze sịrị, “Ọ bụ Ịlaịja, onye amụma si Tishbe!”
9 王遂派五十夫長,帶領五十人,去見厄里亞。他上去見厄里亞,厄里亞正坐在山頂上。五十夫長便對厄里亞說:「天主的人,王命你下去。」
Mgbe ahụ, eze zigara otu onyeisi agha ya, na iri ndị agha ise ka ha gaa jide Ịlaịja. Mgbe ndị agha ahụ bịarutere hụ Ịlaịja ka ọ nọ ala nʼelu ugwu, onyeisi agha ahụ kpọrọ Ịlaịja sị ya, “Onye nke Chineke, eze sị gị, ‘rituo!’”
10 厄里亞回答五十夫長說:「如果我是天主的人,願火從天降下,吞噬你和你這五十人! 」果然有火從天降下,吞噬了他和那五十人。
Ịlaịja zara sị ha, “Ọ bụrụ na m bụ onye nke Chineke dịka i kwuru, ka ọkụ si nʼeluigwe daa rechapụ gị na iri ndị a agha ise so gị.” Otu mgbe ahụ, ọkụ sitere nʼeluigwe daa rechapụ iri ndị agha ise ahụ na onyeisi ha.
11 王又另派一個五十夫長,帶領五十人,去見厄里亞。五十夫長上去對厄里亞說:「天主的人! 王這樣吩咐:要你快下山! 」
Ọzọkwa, eze zigara otu onyeisi agha na iri ndị agha ise ọzọ ka ha gaa jide Ịlaịja. Mgbe ha bịarutere hụ Ịlaịja, onyeisi agha ahụ kpọkuru ya sị ya, “Onye nke Chineke, eze sị gị, ‘rituo, bịa ngwangwa!’”
12 厄里亞回答說:「如果我是天主的人,願火從天降下,吞噬你和你這五十人。」果然天主的火從天降下,吞噬了他和那五十人。
Ịlaịja zara sị ya, “Ọ bụrụ na m bụ onye nke Chineke dịka i kwuru, ka ọkụ si nʼeluigwe daa rechapụ gị na iri ndị agha ise gị na ha so.” Ngwangwa, ọkụ Chineke si nʼeluigwe daa rechapụ ha.
13 王又派第三個五十夫長,帶領五十人去。這第三個五十夫長上去,一來到就屈膝跪在厄里亞面前,哀求他說:「天主的人,願我的生命和我這五十人的生命,在你眼中有點價值!
Ọzọkwa, eze zigara otu onyeisi agha na iri ndị agha ise ọzọ ka ha gaa jide Ịlaịja. Mgbe ndị agha a bịara hụ Ịlaịja, onyeisi agha ahụ rigoro nʼelu ugwu gbuo ikpere nʼala nʼihu Ịlaịja rịọọ ya amara sị ya, “Onye nke Chineke, biko, meere ohu gị na iri ndị agha ise mụ na ha so ebere.
14 有火從天降下,吞噬了前兩個五十夫長,和他們每人帶領的五十人;現在,願我的生命在你眼中有點價值! 」
Lee, ọkụ esitela nʼeluigwe rechapụ ndịisi agha abụọ ahụ buru ụzọ, ha na ndị agha ha. Ugbu a, biko, arịọ m gị, chebe ndụ anyị.”
15 上主的使者對厄里亞說:「你同他下去! 不必害怕。」厄里亞就起身同他一起下去見君王,
Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Ịlaịja okwu sị ya, “Atụla egwu! Soro ya gaa!” Ya mere, Ịlaịja sooro onyeisi agha ahụ gaa nʼihu eze.
16 對君王說:「上主這樣說:由於你打發使者去求問厄刻龍的神巴耳則步布,好像在以色列沒有天主可以向他求問指示一樣,因此,你再不能從你所上的床下來,你必定要死。」
Mgbe Ịlaịja ruru nʼihu eze, ọ gwara eze okwu sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ọ bụ nʼihi na Chineke anọghị nʼIzrel ka i ji zipụ ndị ozi ka ha gaa jụta ase site nʼaka Baal-Zebub, chi ndị Ekrọn? Ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, ị gaghị esite nʼihe ndina gị bilie. Ị ga-anwụrịrị!”
17 阿哈齊雅果然如上主藉著厄里亞所說的話死了;因為他沒有兒子,他的兄弟耶曷蘭繼位為王,時在猶大王約沙法特的兒子約蘭第二年。
Ọ nwụrụ dịka okwu Onyenwe anyị nke Ịlaịja kwuru si dị. Nʼihi na Ahazaya enweghị nwa nwoke ọbụla, Jehoram nọchiri anya ya dịka eze, nʼafọ nke abụọ nke ịbụ eze Jehoram nwa Jehoshafat, bụ eze Juda.
18 阿哈齊雅其餘的事蹟,都記載在以色列列王實錄上。
Akụkọ banyere ịbụ eze nke Ahazaya, na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel?

< 列王紀下 1 >