< 歷代志下 31 >

1 [清除偶像]這一切完成以後,所有在場的以色列人就都出去,到猶大各城,將石柱搗碎,將木偶砍倒,將猶大、本雅明、厄弗辣因和默納協各地的高丘和香壇完全拆除;以後,所有的以色列子民各回了本城,各歸己業。[重整神職班次]
Mgbe ihe niile a gwụsịrị, ndị Izrel bụ ndị nọ nʼebe ahụ pụrụ gaa nʼobodo niile dị na Juda, kurisie ogidi nsọ niile, gbutukwa ogidi Ashera niile. Ha kwatụrụ ebe niile dị elu na ebe ịchụ aja niile dị na Juda, Benjamin, Ifrem na Manase. Mgbe ha lachara ha niile nʼiyi, ndị Izrel niile laghachiri nʼobodo nke aka ha nakwa nʼihe onye ọbụla nwere.
2 希則克雅又整編了司祭和肋未人的班次,使司祭和肋未人各照自己的班次,各照自己的任務,獻權燔祭與和平祭,或服務於上主的螢幕門口,稱謝讚頌上主。
Hezekaya kenyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị nʼusoro ịrụ ọrụ ha nʼụlọnsọ ukwu Chineke ụbọchị niile, maka ọrụ ịchụ aja nsure ọkụ na aja udo, na inye ekele, na ito Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ama ebe obibi ya.
3 君王又由自己的產業中劃出一份,作為早晚的全燔祭,安息日、新月和節期的全燔祭,如上主法律上所規定的;
Eze nyekwara ụtụ nke ya site nʼihe nweta ya maka iji chụọ aja nsure ọkụ, nke ụtụtụ na abalị, ya na aja nsure ọkụ nke ụbọchị izuike niile na ọnwa ọhụrụ, na nke mmemme niile a kara aka a na-eme dịka ọ dị nʼiwu Onyenwe anyị.
4 又吩咐住在耶路撒冷的百姓,交出司祭和肋未人所應得的一分,令他們堅守上主的法律。
O nyekwara ndị bi na Jerusalem iwu ka ha na-ewebatara ndị nchụaja na ndị Livayị oke nke ruuru ha, ka ha nwee ike lebanye anya nke ọma nʼiwu Onyenwe anyị.
5 這道諭旨一出,以色列子民便獻了許多初熟的五穀、新酒、蜜,以及田地的出產;同時將所有物的十分之一,也大批的送了來,
Ngwangwa e kwusara okwu a, ụmụ Izrel niile wetara onyinye ha nʼebe ọ bara ụba. Ha wetara mkpụrụ mbụ nke ọka ha, na mmanya vaịnị ọhụrụ ha, na mmanụ oliv, na mmanụ aṅụ, na ihe omume niile nke ubi. Ha wetakwara nʼụba otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile ọzọ ha nwere.
6 連住在猶大各城的以色列和猶大子民,也將牛羊的十分之一,並應獻於上主,他們天主的聖物的十分之一,都送了來,堆積成堆;
Ndị Izrel na Juda niile bi nʼobodo Juda bubatakwara otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ, na otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe nsọ niile edoro nsọ nye Onyenwe anyị bụ Chineke ha. Ha doro ha niile nʼukwu nʼukwu
7 由三月開始堆積,至七月纔完畢。
Ha bidoro iwebata ihe ndị a site nʼọnwa nke atọ nʼafọ ruo nʼọnwa nke asaa.
8 希則克雅和首領們前來,看見這些堆積之物,便稱讚了上主和他的百姓以色列。
Mgbe Hezekaya na ndịisi ya bịara hụ ukwu ihe ndị ahụ niile, ha toro Onyenwe anyị, gọziekwa ndị ya bụ Izrel.
9 希則克雅向司祭和肋未人問及這些堆積之物,
Hezekaya jụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị banyere onyinye ndị ahụ e bubatara.
10 匝多克家的司祭之長阿匝黎雅答說:「自從人民將供物獻入上主的殿內以來,我們不但可以飽食,而且還有許多剩餘,因為上主祝福了他的百姓;這一大堆全是剩餘的。」[儲藏與分配供物]
Azaraya, onyeisi nchụaja, onye sitere nʼikwu Zadọk zara sị ya; “Lee, kemgbe ndị mmadụ malitere iwebata onyinye ha nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị o nwebeghị ihe kọrọ anyị. Nʼezie, anyị nwere karịa, nʼihi na Onyenwe anyị agọziela ndị ya. Leekwa ihe dị ukwuu ka fọdụrụ.”
11 希則克雅吩咐在上主殿內預備倉房;人便預備了,
Hezekaya nyere iwu ka e edozie ụlọ ịchịkọba ihe nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ. Ha mekwara otu a.
12 細心將供物和什一之物,以及奉獻的聖物,都搬入倉內。肋未人苛納尼雅為總管,他的兄弟史米為副。
Emesịa, ha jiri ikwesi ntụkwasị obi bubata onyinye ndị ahụ, na onyinye nke otu ụzọ nʼime ụzọ iri, na onyinye e doro nsọ, tifee ha nʼaka Konanaya, onye Livayị. Shimei nwanne ya nwoke bụ onye na-esote ya.
13 耶希耳、阿匝齊雅、納哈特、阿撒耳、耶黎摩特、約匝巴得,厄里耳、依斯瑪基雅、瑪哈特和貝納雅,自苛納尼和他兄弟史米之下作督察,全是由君王希則克雅和上主殿宇的主席阿匝黎雅所委任的。
Jehiel, Azazaya, Nahat, Asahel, Jerimot, Jozabad, Eliel, Ismakaya, Mahat na Benaya, bụ ndị nlekọta ọrụ ndị nọ nʼokpuru Konanaya na Shimei nwanne ya. Ndị a niile bụ ndị eze Hezekaya na Azaraya onye nlekọta ụlọnsọ ukwu Chineke họpụtara.
14 守東門的肋未人,依默納的兒子科勒,掌管自願捐獻於天主的禮品,發放獻於上主的供物和至聖之物;
Kore nwa Imna, onye Livayị, onye bụkwa onye na-elekọta ọnụ ụzọ ama dị nʼọwụwa anyanwụ, ka e tinyere ọrụ ilekọta onyinye afọ ofufu niile e wetaara Chineke. Ọ bụ ya nwekwa ọrụ ikesa onyinye ndị ahụ niile e bubataara Onyenwe anyị ha na onyinye ndị ọzọ e doro nsọ.
15 他以下有厄登、本雅明、耶叔亞、舍瑪雅、阿瑪黎雅和舍加尼雅,在各司祭城內,按照班次,不分老幼,將物品細心分發給他們的弟兄。
Ndị na-enyere ya aka bụ Eden, Miniamin, Jeshua, Shemaya, Amaraya na Shekanaya. Ha na-eke onyinye ahụ nye ndị nchụaja niile nʼobodo ahụ, onye ukwu na onye nta, dịka usoro ịrụ ọrụ ha si dị. Ha ji ikwesi ntụkwasị obi na-enyere ya aka.
16 此外,又登記了每日進上主殿,依照班次盡職,三十歲以上的男子:
Ọzọkwa, ndị ikom niile si nʼezinaụlọ ndị nchụaja, ndị gbara site nʼafọ atọ gbagoo, ndị aha ha dị nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ, bụ ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na-eketa oke ihe oriri ha na-eri mgbe ọbụla ha bịara ịrụ ọrụ dịka usoro ọrụ ha si dị.
17 司祭依照家族登記;二十歲以上的肋未人,依照職分班次登記。
Ha na-ekenye ndị nchụaja niile e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ, kenyekwa ndị Livayị niile gbara site iri afọ abụọ gbagoo ihe oriri dịka usoro ọrụ ha si dị.
18 登記時,他們全家妻子兒女,都應包括在內,因為他們都應自潔成聖。
Ndị na-esokwa keta oke ndị a bụ ụmụntakịrị, na ndị inyom, na ụmụ ndị ikom na ndị inyom na-etolite etolite, bụ ndị niile e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ. Ndị a bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼido onwe ha nsọ.
19 至於那住在各城郊外作司祭的亞郎子孫,在各城內有指定的人,給司祭中的男子及登記的肋未人,發放應得的一份。
A họpụtara ụfọdụ ndị ikom ndị ọrụ ha bụ ike nri nye ndị nchụaja niile bụ ụmụ ụmụ Erọn. Ndị nchụaja a na-ekwu ihe banyere ha nʼebe a bụ ndị ahụ bi nʼala ubi nke gbara obodo ndị nchụaja gburugburu, maọbụ ndị bi nʼobodo ndị ọzọ. Ndị a bụkwa ndị e dere aha ha niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ ndị Livayị.
20 希則克雅在全猶大行事都是如此:行了上主他的天主視為善,視為正義的事。
Ndị a bụ ihe ndị Hezekaya mere nʼime Juda niile, ọ na-eme ihe dị mma, na nke ziri ezi, nʼikwesị ntụkwasị obi nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke ya.
21 凡他著手所行的,不論是關於上主殿內的敬禮,或關於法律和誡命,都是為了尋求他的天主;凡他誠心所行的,無不順利。
Nʼime ihe niile o mere, nke metụtara ije ozi nke ụlọ ukwu Chineke, na idebe iwu niile na ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere, Hezekaya ji obi ya niile gbasoo Chineke. O jikwa obi ya niile jee ozi niile o jere. Nke a mekwara ka ihe gaara ya nke ọma.

< 歷代志下 31 >