< 歷代志上 5 >

1 [勒烏本支派]以色列的長子勒烏本的子孫:─他雖是長子,但因他玷污了父親的床榻,他長子的權利已轉給了以色列的兒子若瑟的兩個兒子,不過後者在譜系上並沒有列為長子;
Ọkpara Izrel bụ Ruben. Ma nʼihi na ọ merụrụ ihe ndina nna ya site na idinakwuru nwunye nna ya, a napụrụ ya ọnọdụ ọkpara ya were ya nye ụmụ nwanne ya Josef mụtara. Nʼihi ya, akwụkwọ akụkọ usoro ọmụmụ ụmụ Izrel akpọghị Ruben ọkpara.
2 長子的權利雖歸若瑟,但兄弟中猶大最為強盛,因為領袖由他而生。
Ọ bụ ezie na Juda dị ike karịa ụmụnna ya, bụrụkwa eziokwu na onyendu si na Juda pụta, maọbụ Josef ka e nyere oke ruuru ọkpara.
3 以色列的長子勒烏本的兒子:哈諾客、帕路、赫茲龍和加爾米。
Ruben, ọkpara Izrel mụrụ ndị ikom ndị a: Hanok, na Palu, na Hezrọn, na Kami.
4 約厄耳的子孫:約厄耳的兒子舍瑪雅,舍瑪雅的兒子哥格,哥格的兒子史米,
Juel mụrụ Shemaya, nna Gog, Gog mụrụ Shimei.
5 史米的兒子米加,米加的兒子勒阿雅,勒阿雅的兒子巴耳,
Shimei mụrụ Maịka, Maịka amụọ Reaya. Reaya amụọ Baal.
6 巴耳的兒子貝厄辣;他為亞述王提革拉特丕肋色爾擄去;他是勒烏本人的族長。
Baal mụrụ Beera, onye Tiglat-Pilesa eze ndị Asịrịa dọtara nʼagha. Beera bụkwa onyendu ndị Ruben.
7 他的兄弟們按家族歷代的譜系,為族長的是耶厄耳、則加黎雅、
Ndị ụmụnna ha dịka agbụrụ niile ha si dị, bụ ndị e depụtara aha ha dịka usoro ọmụmụ ha si dị; Jeiel onyeisi, na Zekaraya,
8 阿匝次的兒子貝拉;阿匝次是舍瑪的兒子,舍瑪是約厄耳的兒子。勒烏本居住在阿洛厄爾,直到乃波和巴耳默紅一帶,
na Bela nwa Azaz nwa Shema, nwa Juel. Ha nwere ebe obibi ha site nʼAroea ruo nʼugwu Nebo, rukwaa Baal-Meon.
9 向東延至幼發拉的河岸曠野邊,因為他在基勒阿得地方有大批的牲畜。
Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ, nwekwa ọtụtụ igwe anụ ụlọ. Ọ bụkwa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼọnụ ọzara ruo nʼosimiri Yufretis ka ha na-azụ ha, nʼihi na anụ ụlọ ha nwere bara ụba na Gilead.
10 在撒烏耳時代,他們同哈革爾人作戰,哈革爾人失敗,勒烏本子孫佔領了基肋阿得東部所有的地域,佔有他們的帳幕。[加得支派]
Nʼoge Sọl bụ eze Izrel, ụmụ Ruben meriri ndị Haga nʼagha, bichie ala ha niile dị nʼọwụwa anyanwụ Gilead.
11 加得的子孫靠近他們,住在巴商地方直到撒耳加:
Ụmụ Gad bi nʼakụkụ ha site na Bashan ruo Saleka.
12 約厄耳為首,沙凡為副,其次為雅乃和巴商的沙法特。
Juel bụ onyendu na Bashan, Shafam na-esote ya, ya na Janai na Shafat.
13 按家族,他們的兄弟是:米加耳、默叔藍、舍巴、約賴、雅甘、齊雅和厄貝爾七人。
Ụmụnna ha, ndị bụ ndị ndu ikwu asaa a bụ, Maikel, na Meshulam, na Sheba, na Jorai, na Jakan, na Zia, na Eba.
14 他們都是阿彼海耳的子孫:阿彼海耳是胡黎的兒子,胡黎是雅洛亞的兒子,雅洛亞是基肋阿得的兒子,基肋阿得是米加耳的兒子,米加耳是耶史賽的兒子,耶史賽是雅多的兒子,雅多是步次的兒子。
Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Abihail, nwa Huri, nwa Jaroa, nwa Gilead, nwa Maikel, nwa Jehishai, nwa Jado, nwa Buz.
15 古尼的孫子,阿貝狄耳的兒子阿希,是他們一家的族長。
Ahi nwa Abdiel, nwa Guni bụ onyeisi nʼetiti ụmụnna ya.
16 他們住在基肋阿得、巴商和所屬各村鎮,以及息黎雍直到邊界所有的牧場:
Ndị Gad nwere ebe obibi na Gilead nʼime Bashan, na nʼobodo nta niile gbara ya gburugburu. Ha bikwa nʼebe ahịhịa anụ ụlọ na-ata jupụtara na Sharọn ruo nʼebe oke ala ha kwụsịrị.
17 以上所有的加得人,是在猶大王約堂與以色列王雅洛貝罕時代所統計的。
E denyere aha ndị a niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ nʼoge Jotam bụ eze Juda, na nʼoge Jeroboam bụ eze Izrel.
18 勒烏本、加得和默納協半支派的子孫,都是英勇的軍人;能持盾操刀,善射好戰,出征上陣的人,有四萬四千七百六十。
Ndị Ruben na ndị Gad, na ọkara ebo Manase nwere iri puku mmadụ anọ na anọ na narị asaa na iri isii ndị jikeere ije agha, ndị dị ike, ndị a zụrụ iji ọta na mma agha, na ụta ibu agha.
19 曾同哈革爾人、耶突爾人、納菲士人和諾達布人作過戰。
Ha busoro ndị Haga, na Jetua, na Nafish na ndị Nodab agha.
20 作戰時蒙天主助佑,哈革爾人和所有聯軍都落在他們手中,因為他們作戰時呼求了天主,依賴了天主,也蒙了垂允。
E nyeere ha aka ibuso ha agha, Chineke nyefere ndị Haga na ndị niile na-enyere ha aka nʼaka ha, nʼihi na ha kpọkuru ya nʼoge ọgụ ahụ. Ọ zara ekpere ha nʼihi na ha tụkwasịrị ya obi.
21 他們掠奪了敵人的牲畜:駱駝五萬,羊二十五萬,驢二千,人口十萬。
Ha ji ike chịkọrọ anụ ụlọ ndị Haga, dị iri puku ịnyịnya kamel ise, narị puku atụrụ abụọ na iri puku ise, puku ịnyịnya ibu abụọ. Ha dọkpụkwara narị puku ndị mmadụ nʼagha.
22 因有天主助戰,敵人傷亡慘重。他們居住在那地方,直到充軍的時期。[默納協半支派]
E gbukwara ọtụtụ ndị mmadụ nʼihi na agha ahụ bụ nke Chineke lụrụ nʼonwe ya. Ha bichiri ala ahụ tutu ruo mgbe a dọọrọ Izrel niile nʼagha.
23 默納協半支派的子孫居住的地方,由巴商直到巴耳赫爾孟、色尼爾和赫爾孟山;他們人數眾多。
Ọkara ebo Manase dị ukwuu nʼọnụọgụgụ; ha nwere ebe obibi ha site nʼala Bashan ruo Baal-Hemon, ya bụ, ruo Senia, ugwu Hemon.
24 他們各家的族長如下:厄斐爾、依史、厄里耳、阿次黎耳、耶勒米雅、曷達委雅和雅狄耳:都是英勇的軍人,出名的人物,家族的首領。
Ndịisi ikwu ha niile bụ ndị a: Efaa, Ishi, Eliel, Azriel, Jeremaya, Hodavaya na Jadiel. Ndị a niile bụ dimkpa nʼagha, ndị a ma ama na ndịisi ezinaụlọ.
25 但是,他們卻背叛了自己祖先的天主,而事奉了當地人民的神,這些人民原是天主曾在他們前所消滅的。
Ma ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke nna nna ha. Kama ha merụrụ onwe ha site nʼife chi niile nke ndị bi nʼala ahụ na mbụ, bụ ndị Chineke lara nʼiyi nʼihu ha.
26 因此,以色列的天主激起了亞述王普耳,即亞述王提革拉丕肋色爾的心,將勒烏本人、加得人和默納協半支派的人擄走,送到哈拉、哈波爾、哈辣和哥倉河一帶;他們直到今日仍在那裏。[充軍前亞郎的子孫]
Nʼihi nke a, Chineke nke Izrel kpaliri mmụọ Pul, bụ eze Asịrịa (ya bụ Tiglat-Pilesa eze ndị Asịrịa), ka o bilie megide ndị Ruben, ndị Gad na ọkara ebo Manase, dọta ha nʼagha, buru ha gaa Hala, na Hoboa, na Hara na osimiri Gozan, ebe ha nọ ruo taa.

< 歷代志上 5 >