< 歷代志上 21 >

1 [統計人口得罪上主]撒殫起來反對以色列,慫恿達味統計以色列:
Ekwensu biliri megide Izrel, mgbe ọ kpaliri Devid ka ọ gụọ Izrel ọnụ.
2 達味對約阿布及人民的首領說:「你們去統計以色列,由貝爾舍巴直到丹,然後回來告訴我,叫我知道他們的數目。」
Ya mere, Devid gwara Joab na ndịisi agha okwu sị, “Gaa gụọ ụmụ Izrel niile ọnụ, site na Bịasheba ruo Dan. Emesịa, bịa gwa m ihe ị gụtara ka m mata ole ọnụọgụgụ ha dị.”
3 約阿布回答說:「願上主使自己的百姓比現在更增加百倍! 我主大王,他們不都是我主的僕人嗎﹖我主為什麼硬要這樣作﹖為什麼要使以色列陷於罪惡﹖」
Ma Joab zaghachiri, “Ka Onyenwe anyị mee ka ndị agha ya mụbaa, otu onye narị ụzọ karịa. Ma onyenwe m eze, ọ bụ na ndị a niile abụghị ndị nọ nʼokpuru ọchịchị onyenwe m? Nʼihi gịnị ka onyenwe m ji na-achọ ime ihe a? Nʼihi gịnị ka ọ ga-eji wetara Izrel ikpe ọmụma?”
4 然而君王的命令迫使約阿布;約阿布便去,走遍了全以色列,然後回到耶路撒冷,
Ma okwu eze dị ike karịa nke Joab. Ya mere, Joab pụrụ gagharịa nʼIzrel niile, mechaa lọghachikwa na Jerusalem.
5 將統計人民的數目呈報給達味;全以色列能持刀的人有一百一十萬,猶大人能持刀的有四十七萬。
Joab nyere Devid ngụkọta ọnụọgụgụ nke ndị agha Izrel niile. NʼIzrel niile, ha dị otu nde, na narị puku ndị ikom ndị tozuru iji mma agha buo agha, tinyekwara narị puku ndị ikom anọ na iri asaa nʼala Juda ndị na-amịpụta mma agha.
6 唯有肋未人及本雅明人沒有統計,因為約阿布憎厭君王的命令。
Ma Joab agụnyeghị ndị Livayị, na ndị Benjamin nʼọnụọgụgụ ahụ, nʼihi na iwu eze amasịghị ya nʼobi nʼụzọ ọbụla.
7 這事使天主不悅,打擊了以色列。
Iwu banyere ọnụọgụgụ a adịghịkwa Chineke mma nʼanya. Ya mere, ọ tara ndị Izrel ahụhụ nʼihi ya.
8 達味對天主說:「我作這事,實在犯了重罪。現在,求你赦免你僕人的罪,因為我所行的實在昏愚。」
Mgbe ahụ, Devid sịrị Chineke, “Emehiela m nke ukwuu site nʼihe a m mere. Ma ugbu a, biko, arịọ m gị, wezuga ikpe ọmụma dịịrị ohu gị; nʼihi na emeela m ihe nzuzu dị ukwuu.”
9 上主曉諭達味的先見者加得說:「
Onyenwe anyị gwara Gad, onye ọhụ ụzọ Devid, sị,
10 你去告訴達味:上主這樣說:我給你提出三件事,任你選擇一件,我好向你實行。」
“Gaa gwa Devid, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ụzọ ihe atọ ka m na-eche gị nʼihu. Họrọ otu nʼime ha nke m ga-eme ka ọ bịakwasị gị.’”
11 加得來到達味前,對他說:「上主這樣說:任你選擇:
Ya mere Gad jekwuuru Devid sị ya, “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, Họrọ nke dị gị mma.
12 或者三年饑荒;或者三個月在你敵人前流亡,為敵人持刀追擊;或者三日在你國內遭受上主的刀,即瘟疫,讓上主的使者蹂躪以色列全境。現在你考慮一下,我應向那派遣我來的回覆什麼!」
Oke ụnwụ nke ga-adị afọ atọ, ka ọ bụ ọnwa atọ nke mkpochapụ nʼihu ndị iro unu, site na mma agha ha ga-eru unu ahụ, ka ọ bụ ụbọchị atọ nke mma agha Onyenwe anyị, bụ ajọ ọrịa na-efe efe ịda nʼala a, nke mmụọ ozi Onyenwe anyị ga-eme ka ọ bịakwasị ala Izrel niile. Ugbu a, chee echiche, kpebie ọsịsa ị chọrọ ka m weghachiri onye ahụ zitere m.”
13 達味對加得說:「我很難作,但我寧願落在上主手中,因為他富於仁慈,而不願落在人手中。」[降瘟疫之罰]
Devid sịrị Gad, “Anọ m nʼoke nsogbu. Ọ ka mma ka m daba nʼaka Onyenwe anyị karịa ịdaba nʼaka mmadụ. Nʼihi na obi ebere ya bara ụba nke ukwuu.”
14 於是上主使瘟疫降於以色列;在以色列因瘟疫死了七萬人。
Nʼihi ya, Onyenwe anyị zitere ajọ ọrịa na-efe efe nʼala Izrel, iri puku ndị ikom asaa dara nwụọ.
15 當時,天主派一位天使往耶路撒冷去,要毀滅那城;將要毀損的時候,上主一看,便後悔降災,遂吩咐毀滅的天使說:「夠了,現在收回你的手罷! 」那時,上主的天使正立在耶步斯人敖爾難的禾場上。
Chineke zipụrụ mmụọ ozi ị ga bibie Jerusalem, ma dịka mmụọ ozi ahụ na-eme nke a, Onyenwe anyị hụrụ ya, o wutere ya nʼihi mbibi ahụ. Ọ sịrị mmụọ ozi ahụ nke na-ebibi ndị mmadụ, “O zuola! Seghachi aka gị.” Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị na-eguzo nʼebe ịzọcha ọka Arauna onye Jebus.
16 達味舉目,見上主的使者立在天地中間,手持脫鞘的刀,朝向耶路撒冷。達味與眾長老都身穿麻衣,俯伏在地。
Mgbe Devid leliri anya elu hụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka o guzo nʼetiti mbara eluigwe na ụwa, hụkwa mma agha o ji, nke o chere ihu ya na Jerusalem, ya na ndị okenye Izrel yi akwa mkpe, dara nʼala kpuo ihu nʼala.
17 達味對天主說:「不是我下了令統計百姓麼﹖是我犯了罪,是我這個牧者作了惡。但這羊群作了什麼﹖上主,我的天主! 願你的手打擊我和我的父家,但不要將瘟疫降在你百姓身上! [建築祭壇平息主怒]
Devid sịrị Chineke, “Ọ bụghị m nyere iwu ka a gụọ ndị tozuru ibu agha ọnụ? Ọ bụ mụ onwe m, mụ bụ onye ọzụzụ atụrụ, mehiere mee ajọ omume. Ma ndị a bụ naanị ụmụ atụrụ, gịnị kwanụ ka ha mere? Onyenwe anyị Chineke m, biko ekwela ka ọrịa a na-efe efe nọgide nʼahụ ndị gị, ka aka gị dịgide naanị nʼahụ m, dịgidekwa nʼahụ ndị ụlọ m.”
18 上主的天使吩咐加得去告訴達味,叫他上去,在耶步斯人敖爾難的禾場上,為上主建立一座祭壇。
Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị nyere Gad iwu ka ọ gwa Devid, ka ọ gaa wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ịzọcha ọka Arauna, onye Jebus.
19 達味就照加得奉上主的名所說的話上去了。
Ya mere, Devid rubere isi gaa dịka okwu ahụ Gad kwuru nʼaha Onyenwe anyị.
20 敖爾難回頭看見君王和他的四個兒子經過;那時敖爾難正在打麥子。
Mgbe Arauna nọ nʼebe ịzọcha ọka, ọ tụgharịrị hụ mmụọ ozi ahụ, ụmụ ya ndị ikom anọ ndị so ya guzo nʼebe ahụ zoro onwe ha.
21 達味走到敖爾難那裏,敖爾難一看見達味,便走出禾場,俯首至地叩拜達味。
Mgbe Devid bịakwutere Arauna, Arauna weliri anya hụ ya, ọ hapụrụ ebe ịzọcha ọka ahụ, bịa kpọọ isiala nye Devid, kpudokwa ihu ya nʼala.
22 達味對敖爾難說:「請將這塊禾場地段讓給我,我要在這禾場上為上主建立一座祭壇,請照足價讓給我,為止息民間的災禍。」
Devid sịrị ya, “Nye m ebe a, bụ ala ebe ịzọcha ọka gị, ka m nwee ike wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja, ka akwụsị ọrịa a na-efe efe dakwasịrị ndị mmadụ. Resi m ya nʼọnụ ahịa o ruru.”
23 敖爾爾對達味說:「儘管用吧! 我主大王看著好,就去行吧! 看我將牛給你作全燔祭,打禾具作木柴,麥子作素祭:這一切我都供給你」。
Ma Arauna zara sị Devid, “Were ya ka onyenwe m eze mee ihe ọbụla dị ya nʼobi. Aga m enye ehi maka iji chụọ aja nsure ọkụ, ihe nzọcha ọka niile ka ha bụrụ nkụ na ọka wiiti maka ịchụ aja mkpụrụ ọka. Aga m enye ha niile.”
24 達味對敖爾難說:「不成! 我一定要照足價來買;我不能拿你的東西獻於上主,不能用沒有代價的東西,獻作全燔祭」。
Ma eze Devid zaghachiri Arauna, “ee, aghaghị m ịkwụzu gị ọnụahịa ya. Nʼihi na agaghị m ewere ihe bụ nke gị nye ya Onyenwe anyị, maọbụ chụọ aja nsure ọkụ nke na-agaghị efu m ihe ọbụla.”
25 於是,達味為那塊地付給敖爾難六百「協刻耳」重的金子。
Ya mere, Devid kwụrụ Arauna narị shekel ọlaedo isii iji zụrụ ebe ahụ.
26 達味在那裏為上主建立了一座祭壇,奉獻了全燔祭與和平祭,呼求了上主,上住由天上垂聽了他,使火降在全燔祭壇上,
Devid wuru ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja nʼebe ahụ, chụọkwa aja nsure ọkụ na aja udo. Ọ kpọkuru Onyenwe anyị, Onyenwe anyị zakwara ya, site nʼọkụ nke si nʼeluigwe daa nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ.
27 並命天使將刀收入鞘中。[選定建殿地點]
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere mmụọ ozi ahụ iwu ka o tinyekwa mma agha ya nʼọbọ ya.
28 那時,達味見上主在耶步斯人敖爾難的禾場上垂聽了他,就在那裏獻了祭。─
Mgbe Devid hụrụ na Onyenwe anyị azala ekpere ya nʼebe ịzọcha ọka nke Arauna onye Jebus, ọ chụkwara aja ọzọ nye Onyenwe anyị.
29 梅瑟在曠野所造的會幕和全燔祭壇,那時雖都在基貝紅高處,
Ụlọ ikwu Onyenwe anyị na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ Mosis wuru nʼọzara dị nʼebe dị elu Gibiọn, nʼoge ahụ.
30 但達味不敢前去求問天主,因為害怕上主使者的刀。
Ma Devid ejerughị ebe ahụ ịjụta Chineke ase, nʼihi na ụjọ tụrụ ya mgbe ọ hụrụ mma agha ahụ dị nʼaka mmụọ ozi Onyenwe anyị.

< 歷代志上 21 >