< 马太福音 24 >

1 耶稣出了圣殿,门徒走上前骄傲地把圣殿建筑指给他看。
Mgbe Jisọs si nʼụlọnsọ ahụ na-apụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya na-achọ igosi ya akụkụ dị iche iche nke ụlọnsọ ukwu ahụ.
2 他对门徒说:“你们看这些建筑?告诉你们实话,未来这里将没有一块石头留下,所有的石头都将崩塌。”
Ma ọ zara ha sị, “Unu hụrụ ihe ndị a niile? Nʼezie agwa m unu, oge na-abịa mgbe ọ bụladị otu nkume na-agaghị adịgidekwa nʼelu ibe ya, nke a na-agaghị akwatu nʼala.”
3 耶稣坐在橄榄山上,门徒暗中前来询问:“请告诉我们,何时会出现此事?你的降临和这个世界的终结,会有什么预兆?” (aiōn g165)
Mgbe ọ nọdụrụ ala nʼelu Ugwu Oliv, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya iche, sị, “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama nke oge i ji alọghachi na nke ọgwụgwụ ụwa a?” (aiōn g165)
4 耶稣回答他们:“你们要小心,不要被人迷惑。
Jisọs zara ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie unu ụzọ.
5 因为许多人会假冒我之名而来,说他就是基督,借此迷惑众人。
Nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m, na-ekwu sị, ‘Abụ m Kraịst ahụ.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ụzọ.
6 你们将听见战争,还有关于战争的传言。要小心,但不要惊慌,因为这避免不了,但不是最终结局。
Mgbe unu nụrụ ụzụ agha, na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu, nʼihi na ihe ndị a aghaghị ime. Ma ha anaghị egosi na ọgwụgwụ oge eruola.
7 一个民族要攻打另一个民族,一个国家要攻打另一个国家,处处都是饥荒和地震,
Mba ga-ebili megide mba ibe ya, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ọzọ; oke ụnwụ, na ala ọma jijiji ga-adịkwa nʼọtụtụ ebe dị iche iche.
8 这一切不过是诞生之痛的开始。
Ma ihe ndị a niile bụ naanị mmalite ịta ahụhụ nke ga-abịa.
9 然后人们会抓住你们,折磨你们,杀害你们,你们要因我的名而被万民痛恨。
“Mgbe ahụ ha ga-arara unu nyefee nʼaka ndị ga-ata unu ahụhụ. Ha ga-egbukwa unu. Mba niile ga-akpọ unu asị nʼihi m.
10 届时会有许多人会失去信仰,彼此出卖,互相恨恶。
Ọtụtụ ga-ada site nʼokwukwe ha nʼoge ahụ. Ha ga-emekwa ka ibe ha ma nʼọnya, kpọọkwa ibe ha asị.
11 也有许多假先知出现,迷惑众人。
Mgbe ahụ ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ mmadụ.
12 越来越多的邪恶出现,将人们的爱冷却,
Nʼihi na ajọ omume bara ụba nʼebe niile, ịhụnanya ọtụtụ ndị mmadụ nʼebe ibe ha nọ ga-ajụ oyi.
13 唯有忍耐到底者方可得救。
Ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.
14 这王国的福音要传遍天下,向万民听到,然后最终结局才会来到。
A ga-ekwusa oziọma nke alaeze ahụ nye ụwa niile ka ọ bụrụ ihe ama nye mba niile. Emesịa ọgwụgwụ oge ahụ ga-abịa.
15 当你们看见那‘污秽的偶像崇拜’站在但以理先知所说圣地(读至此处应认真思考),
“Ya mere, mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi, nke e kwuru okwu ya site nʼọnụ Daniel onye amụma, ka ọ na-eguzo nʼebe nsọ (onye na-agụ ya nwee nghọta ihe ọ pụtara).
16 那时,住在犹太的应当逃到山上,
Mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu.
17 站在房顶之人,不要下来拿家里的东西,
Ka onye nọ nʼelu ụlọ ghara ịrịdata ka ọ banye nʼime ụlọ ya, ịkwapụta ngwongwo dị nʼime ụlọ ya.
18 在田里的也不要回去取衣服。
Ka onye nọ nʼubi ghara ịlọghachi nʼụlọ ya ịchịrị uwe ya.
19 在那样的日子,对于怀孕的和哺乳孩子的母亲极为可怕!
Ma ịta ahụhụ ga-adịrị ndị nwanyị di ime, na ndị na-enye ụmụaka ara nʼụbọchị ahụ
20 你们应当祈求,不要在冬季或安息日的时候逃难,
Kpesienụ ekpere ike ka unu ghara ịgba ọsọ a nʼoge oke oyi, maọbụ nʼụbọchị izuike.
21 因为那时必有大灾难,这是从世界的开始到现在未曾有过的,以后也必不会再有。
Nʼihi na oke mkpagbu ga-adị, ụdị nke ụwa na-ahụbeghị mbụ, na nke anya na-agaghị ahụkwa ọzọ site na mmalite ụwa ruo mgbe ahụ.
22 除非那样的日子变短,否则无人可以存活,但是为了天选之人,那些日子必会变短。
“Ọ bụrụ na-emeghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ, o nweghị onye a ga-azọpụta, ma nʼihi ndị ya ọ họpụtara, ụbọchị ndị ahụ ga-adị mkpụmkpụ.
23 届时,如果有人对你们说:‘看,基督在这里!’或说:‘他在那里!’你们不要信,
Mgbe ahụ, ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘Lee ya nʼebe ahụ,’ unu ekwela.
24 因为必有假弥赛亚和假先知出现,做出看似了不起的上帝神迹和奇事。如果可以,他们连天选之民也要迷惑。
Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eme ihe oke ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ha ga-esite nʼọrụ ebube ha ga-arụ duhie, ọ bụladị ndị ahụ a họpụtara.
25 你们看!我已经提前告诉你们了。
Lee, agwala m unu ihe ndị a, mgbe ha na-emebeghị.
26 如果他们对你们说:‘看!基督在荒野里。’你们不要出去;或说:‘看!他已悄悄降临。’也不要相信。
“Ya mere, ọ bụrụ na ha asị unu, ‘Lee, ọ nọ nʼime ọzara,’ unu agakwala. Ọ bụrụkwa na ha asị unu, ‘Lee, ọ nọ nʼime ime ụlọ,’ unu ekwela.
27 似电光从东方闪出来,一直照到西方,人子降临之时也是如此。
Nʼihi na ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka amụma na-egbu nʼọwụwa anyanwụ nke a na-ahụ anya nʼọdịda anyanwụ.
28 ‘有尸身之处,必有秃鹫也聚于此’。
Matakwanụ na ebe ọbụla ozu dị, nʼebe ahụ ka udele na-ezukọta.
29 当灾难刚刚过去,太阳黯然,月亮也不发光,众星从天坠落,天上万象震动。
“Ngwangwa mgbe mkpagbu nke ụbọchị ndị ahụ niile gabigasịrị, “‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị. Ọnwa agaghị enyekwa ìhè, kpakpando ga-esi na mbara eluigwe daa, ike niile nke eluigwe ga-ama jijiji.’
30 届时,人子的征兆就显在天上,地上的万族都要哀号,看见人子展示能力,载满荣耀,驾天上之云降临。
“Nʼoge ahụ akara ngosi nke Nwa nke Mmadụ ga-apụta ihe na mbara eluigwe. Agbụrụ niile nke ụwa ga-anọkwa na-eru ụjụ. Ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼigwe ojii, nʼike nakwa oke ebube.
31 当号角发出响声,他要差派天使,把他的选民从四方、从天和地的各处招聚而来。
Ọ ga-ewerekwa olu opi ike zipụ ndị mmụọ ozi ka ha gaa kpọkọtaa ndị niile a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke eluigwe na ụwa.
32 这里有一个无花果树的比喻:树枝长出嫩芽生出叶子之时,你们便知道夏天将近。
“Ugbu a mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya malitere iwepụta ome dị nro, na-epupụtakwa akwụkwọ ndụ maranụ na ọkọchị na-abịa nso.
33 同样,当你们看见这一切,就知道人子将要降临你们中间。
Otu a kwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a niile ka ha na-eme marakwanụ na ọ nọ nso, ọ bụladị nʼọnụ ụzọ unu.
34 实话告诉你们,这一切必要发生,然后这世界才会过去。
Nʼezie agwa m unu, ihe ndị a niile aghaghị imezu tupu ọgbọ a agabiga.
35 天地都要过去,但我的言语决不会消失。
Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.
36 至于具体的日期和时间,无人知晓,连天上的使者和人子也不知情,只有天父知道。
“Ma o nweghị onye ọbụla maara ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ ga-abụ. Ọ bụladị ndị mmụọ ozi nọ nʼeluigwe amaghị ya. Ọkpara ahụ amakwaghị. Ọ bụ naanị Nna maara ya.
37 诺亚时代的样子,即是人子降临时刻的样子。
Ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka ọ dị nʼụbọchị Noa.
38 洪水之前的时代,人们吃喝嫁娶,直到诺亚进入方舟的那一天。
Nʼoge ahụ tupu iju mmiri ahụ abịa, ndị mmadụ nọ na-eri na aṅụ, na-emekwa mmemme ọlụlụ di na nwunye, ruo ụbọchị Noa banyere nʼime ụgbọ mmiri ya.
39 他们不知道会发生什么事,直到洪水来了,把他们全都冲走了。人子降临之时也将是这样。
Ha amataghị ihe ga-eme tutu oke mmiri ahụ abịa kpochapụ ha niile. Otu ahụ ka ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị.
40 届时,有两人在田里工作,一个被带走,一个被留下。
Mmadụ abụọ ga na-arụkọ ọrụ nʼubi ha, a ga-ewepụ otu hapụkwa onye nke ọzọ.
41 两个女人在磨坊推磨,一人被带走,一人被留下。
Ụmụ nwanyị abụọ ga na-akwọ nri na nkume igwe nri, a ga-ewere otu, ma hapụkwa nke ọzọ.
42 因此你们要警惕,因为不知道你们的主何时会来。
“Nʼihi nke a, na-echenụ nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.
43 但想想:家主若晓得窃贼晚上何时会来,自会提高警觉,不让窃贼闯入偷盗。
Ma ghọtanụ nke a: Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ mara oge onye ohi ga-abịa nʼụlọ ya nʼabalị, ọ ga-anọ na nche nʼoge ahụ. Ọ gaghị ekwe ka onye ohi kụwaa ụlọ ya.
44 所以你们也要准备妥当,因为人子会在想不到日子到来。
Otu a ka unu onwe unu pụrụ isi nọgide na nche oge niile, nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼoge awa unu na-atụghị anya ya.
45 谁是忠心和考量周全的仆人?那就是被主人指派管理全家、按时分派粮食的仆人。
“Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ndị ohu nọ nʼezinaụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri nʼoge ya?
46 主人来到时如果看到他照做,那仆人就有福了。
Ngọzị na-adịrị ohu ahụ, onye, mgbe onyenwe ya ga-alọghachi hụ na ọ na-eme otu a.
47 告诉你们实话,主人将指派他管理自己的一切财产。
Nʼezie asị m unu, ọ ga-eme ya onyeisi nke ihe niile o nwere.
48 如果他是个恶意仆人,心中暗想:‘我的主人不会那么快回来’,
Ma ọ bụrụ na ohu ahụ bụ onye ajọọ omume na-asị onwe ya, ‘Nna m ukwu anọọla ogologo oge,’
49 于是就会动手打其他仆人,与醉汉们大吃大喝。
ọ bụrụkwa na o bido iti ndị ohu ibe ya ihe, sorokwa ndị ọṅụ oke mmanya na-eri, na-aṅụ.
50 但在他没有想到的日期和时辰,仆人的主人回来了,
Nna ukwu ohu ahụ ga-alọta nʼụbọchị ọ na-atụghị anya, nʼoge awa ọ na-amakwaghị.
51 他被严厉处罚,一如对待其他虚伪之人那样被送到一个地方,那里必有哀哭切齿。
Ọ ga-egburisikwa ya, nye ya ọnọdụ nʼetiti ebe ndị ihu abụọ nọ. Ebe e nwere ịkwa akwa na ịta ikikere eze.

< 马太福音 24 >