< 约翰福音 7 >
1 此后,耶稣便在加利利游历。他不想住在犹太,因为犹太人想要他死。
Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gagharịrị na Galili, ma ọ kpachapụrụ anya hapụ ịga Judịa nʼihi na ndị Juu na-achọ ụzọ igbu ya.
Mmemme Ụlọ ikwu ndị Juu dị nso,
3 耶稣的弟弟们对他说:“你应当离开这里去犹太,让你的追随者能够看到你可以显化的神迹。
ya mere, ụmụnne ya ndị nwoke sịrị ya, “Si nʼebe a pụọ, gaa Judịa, ka ndị na-eso ụzọ gị nwe ike ịhụ ọrụ ị na-arụ.
4 想成名的人不会藏起来。既然你可显化神迹,就应该向世人展示自己!”
Nʼihi na o nweghị onye ọbụla chọrọ ịbụ onye ọha mmadụ ma, nke na-eme ihe na nzuzo. Ebe ọ bụkwanụ na ị na-eme ihe ndị a, gosi ụwa onwe gị.”
Nʼihi na ọ bụladị ụmụnne ya ekwenyeghị na ya.
6 耶稣就对他们说:“我的时间还没有到,但你们可以去任何地方,因为对你们而言,任何时间都可以。
Jisọs sịrị ha, “Oge nke m erubeghị, ma oge nke unu nọ nʼebe a mgbe niile.
7 世人没有理由恨你们,但却憎恨我,因为我表明他们的行为是邪恶的。
Ụwa enweghị ike ịkpọ unu asị, ma ọ kpọrọ m asị nʼihi na ana m agba ama megide ya nʼọrụ ya jọrọ njọ.
8 你们去过节吧!我就不去这个节日了,因为我的时机还没到,还不成熟。”
Unu onwe unu gaanụ na mmemme ahụ, agaghị m aga mmemme a nʼihi na oge m erubeghị.”
Mgbe o kwusiri nke a, ọ nọgidere na Galili.
10 他的弟弟们去过节以后,耶稣也去了,但没有公开,而是躲开了众人的视线。
Ma otu ọ dị, mgbe ụmụnne ya gawara mmemme ahụ ya onwe ya gakwara. Ọ gaghị ebe mmadụ niile ga-ahụ ya kama ọ gara na nzuzo.
11 在节日期间,犹太人的首领们四处寻找耶稣,不断问众人:“他在哪儿?”
Na mmemme ahụ ndị Juu nọ na-ele anya ma na-ajụgharị sị, “Olee ebe ọ nọ?”
12 人群中有很多人开始谈论耶稣,有的说:“他是好人。”有的说:“不,他就是个骗子。”
E nwere oke ntamu nʼetiti igwe mmadụ ahụ banyere ya. Ndị ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ezigbo mmadụ.” Ndị ọzọ na-asị, “Mba, ọ na-eduhie igwe mmadụ.”
13 但没有人敢公开这样说,怕犹太人首领会对付他们。
Ma o nweghị onye ọbụla kwulitere okwu maka ya nʼihu ọha nʼihi egwu ndị Juu.
Mgbe o ruru nʼetiti mmemme ahụ, Jisọs banyere nʼime ụlọnsọ ukwu ma bido ikuzi ihe.
15 犹太人首领对此颇感意外,于是询问道:“这人没有学过教育,为什么如此有学识?”
Site nʼoke mgbagwoju anya, ndị Juu jụrịtara onwe ha sị, “Olee otu nwoke a sịrị nweta amamihe dị otu a ebe ọ bụ na o nwebeghị onye kuziri ya ihe ọbụla?”
16 耶稣回答:“我的学识并非源于自己,而是来自派我到这里的那个人。
Jisọs zara ha, “Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye ahụ zitere m.
17 你若选择遵循上帝的意愿,就会知道我这学识是出于上帝,还是仅在讲述我个人的想法。
Onye ọbụla na-achọ ime uche Chineke, ọ ga-achọpụta ma ozizi m ọ bụ nke m ma o sikwanụ na Chineke.
18 如果你讲述的是自己的想法,就是想要荣耀自己。但如果你只是为了让派你前来之人获得荣耀,这才是真诚,才不会存在谎言。
Ndị ahụ na-ekwu nke onwe ha na-eme nke a iji wetara onwe ha ugwu, ma onye ahụ na-achọ ugwu nke onye zitere ya bụ onye eziokwu; o nwekwaghị ihe ọbụla bụ ụgha banyere ya.
19 摩西给你们带来了律法,是不是?但你们没有一个人遵行这律法。你们为什么想要杀我?”
Mosis o nyeghị unu iwu? Ma o nweghị onye ọbụla nʼime unu na-edebe iwu ahụ. Gịnị mere unu ji achọ igbu m?”
Igwe mmadụ ahụ zara, “Mmụọ ọjọọ bi nʼime gị, onye chọrọ igbu gị?”
21 耶稣回答:“我显化了一个神迹,你们为止感到震惊。
Jisọs zara sị ha, “Arụrụ m otu ọrụ, ma unu niile nọ na mgbagwoju anya.
22 摩西告诉你们要进行割礼——其实这并非源自摩西,而是源自他之前的祖先。所以你们在安息日也会进行割礼。
Mosis nyere unu iwu ibi ugwu (nʼagbanyeghị na o siteghị na Mosis, kama na nna nna anyị ha), nʼụbọchị izuike unu na-ebikwa mmadụ ugwu.
23 如果为了遵循摩西的律法,你们在安息日举行割礼,那么我在安息日让一个人痊愈,为什么会让你们怒火中烧呢?
Ọ bụrụ na e nwere ike bie mmadụ ugwu nʼụbọchị izuike ka a ghara imebi iwu Mosis, gịnị mere o ji na-ewute unu na m mere ka ahụ mmadụ zuo oke nʼụbọchị izuike?
Kwụsịnụ ikpe ikpe site nʼihe anya na-ahụ, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.”
25 这时,有几个来自耶路撒冷的人开始思量:“这就是他们想要杀的人吗?
Nʼoge ahụ, ụfọdụ nʼime ndị Jerusalem bidoro na-asị, “Onye a ọ bụghị nwoke ahụ ha chọrọ igbu?
26 但你看他说话如此坦诚,他们却保持沉默,你觉得长官们真的相信这就是基督吗?
Lee ka ọ nọ na-ekwu okwu nʼihu mmadụ niile ma o nwekwaghị onye na-agwa ya ihe ọbụla. Ọ pụtara na ndịisi amatala nʼeziokwu na ọ bụ Kraịst?
27 那是不可能的,我们知道他从哪里来,而基督到来之际,没有人知道他从何而来。”
Ma anyị matara ebe nwoke a siri pụta, mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, o nweghị onye ga-amata ebe o siri pụta.”
28 此刻耶稣正在殿里教导众人,他高声说:“你们以为认识我,知道我从何而来。但我来此并非出于我的意愿,那派我来此的人真实存在,你们不认识他。
Ma dị ka Jisọs na-ezi ihe nʼime ụlọnsọ ukwuu ahụ, o tiri mkpu sị, “Nʼezie, unu maara m, matakwa ebe m siri pụta. Anọghị m nʼebe a na nke onwe m, ma onye ahụ zitere m bụ eziokwu. Unu amaghị ya.
29 但我认识他,因为我从他那里而来,也是受他派遣。”
Ma amara m ya, nʼihi na esitere m na ya bịa. Ọ bụkwa ya zitere m.”
30 于是犹太长官想要逮捕他,但没有人下手,因为他的时刻尚未到来。
Mgbe ahụ ha chọrọ ijide ya, ma o nweghị onye ọbụla metụrụ ya aka nʼihi na oge ya erubeghị.
31 但民众中有许多人相信他。他们说:“如果基督出现,难道会比这个人显化更多神迹吗?”
Ma otu ọ dị, ọtụtụ nʼime igwe mmadụ ahụ kweere na ya. Ha sịrị, “Mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, ọ ga-arụ ọrụ ebube ọzọ karịrị ndị a nwoke a rụrụla?”
32 法利赛人听到民众低声议论耶稣,他们和牧师长就派差役去逮捕耶稣。
Ndị Farisii nụrụ ka igwe mmadụ ahụ na-atamu ntamu nʼolu nta banyere ya. Mgbe ahụ ndịisi nchụaja na ndị Farisii zigara ndị na-eche nche nʼụlọnsọ ukwuu ahụ ka ha gaa jide ya.
33 这时候耶稣对众人说:“我和你们在一起的时间不多了,但我要回到派我前来之人那里去。
Jisọs sịrị, “Naanị nwa oge ka mụ na unu ga-anọ, aga m alakwurukwa onye zitere m.
34 你们会寻找我,但找不到,我将去的地方,你们无法进去。”
Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m. Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru ya.”
35 犹太人彼此谈论:“这人要去哪个我们找不到的地方呢?难道他去的地方在异教徒那里吗?他想去教导异教徒?
Ndị Juu sịrịtara onwe ha, “Olee ebe nwoke a chọrọ ịga anyị na-agaghị achọta ya? Ọ ga-eje ebe ndị nke anyị a chụsasịrị achụsasị bi nʼetiti ndị Griik, ka ọ ga kuziere ndị Griik ihe?
36 他说‘你们会寻找我,但找不到。我将去的地方,你们无法进去’这话,是什么意思?”
Kedụ ụdị okwu bụ nke a ọ na-ekwu sị, ‘Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m,’ na ‘Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru’?”
37 在节日的最后一天、也是最隆重的那一天,耶稣站立高呼:“如果你渴了,到我这里来解渴!
Nʼụbọchị ikpeazụ bụkwa ụbọchị kacha ibe ya nke mmemme ahụ, Jisọs guzooro ọtọ jiri oke olu tie mkpu sị, “Ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ onye ọbụla nkụ, ya bịakwute m bịa ṅụrụ mmiri.
38 正如经文所说,信我者,身体将流淌赋予生命的溪流。”
Onye ọbụla kweere na m, dị ka akwụkwọ nsọ kwururị, isi iyi mmiri nke ndụ ga na-asọpụta site nʼime afọ ya.”
39 他所指的是:相信他的人之后会获得圣灵,但因为耶稣尚未获得荣耀,所以圣灵还没有降临。
O kwuru nke a banyere Mmụọ ahụ ndị kwere na ya ga-anata. Tutu ruo oge ahụ, e nyebeghị Mmụọ ahụ, nʼihi na e nyebeghị Jisọs otuto.
40 人群中有人听到这番话,就说:“他真的是先知!”
Mgbe ha nụrụ nke a, ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ sịrị, “Nʼeziokwu onye a bụ onye amụma ahụ.”
41 有人说:“他是基督!”还有人说:“基督怎么能来自加利利呢?
Ndị ọzọ sịrị, “Ọ bụ Kraịst ahụ.” Ma ndị nke ọzọ sịkwara, “Nʼezie Kraịst ahụ, ọ ga-esi na Galili pụta?
42 经文不是说基督是大卫的后裔,来自大卫的家乡伯利恒吗?”
Ọ bụ na akwụkwọ nsọ ekwughị na Kraịst ga-esi nʼagbụrụ Devid pụta, na Betlehem bụ obodo Devid?”
Ya mere nkewa dapụtara nʼetiti igwe mmadụ ahụ nʼihi ya.
Ụfọdụ chọrọ ijide ya ma ọ dịghị onye ọbụla metụrụ ya aka.
45 卫兵随后回到牧师长和法利赛人那里。他们问卫兵:“为什么没有把他带来?”
Mgbe ahụ, ndị nche ụlọnsọ ukwu lọghachiri nʼebe ndịisi nchụaja na ndị Farisii nọ, ndị sịrị ha, “Gịnị mere unu akpụtaghị ya?”
Ha zara, “Anyị ahụbeghị onye kwuru okwu dị ka nwoke a.”
Ndị Farisii zara ha, “Unu esorola bụrụ ndị a ghọgburu?
Ọ dị onye ọbụla nʼime ndịisi maọbụ nʼime ndị Farisii tụkwasịrị ya obi?
49 至于这群完全不懂律法之人,他们就是被咒诅的一群人!”
E e! Kama igwe mmadụ ndị a na-amaghị iwu bụ ndị a bụrụ ọnụ.”
50 他们当中有一人叫做尼哥德慕,以前曾经去见过耶稣。他对他们说:
Nikọdimọs, otu nʼime ha bụ onye bịakwutere ya na mbụ sịrị ha,
51 “难道不该先审讯一下吗?查明他到底做了什么,否则我们的律法怎能给他定罪?”
“Iwu anyị ọ na-ama mmadụ ikpe, ma ọ bụrụ na o bụghị ụzọ nụta okwu nʼọnụ ya, ịchọpụta ihe onye ahụ na-eme?”
52 他们回答:“那么你也是从加利利来的吗?去看看经文吧,你就知道先知并非来自加利利。”
Ha zaghachiri ya sị, “Gị onwe gị, i sokwa na ndị si Galili pụta? Nyochaa nke ọma, ị ga-achọpụta na onye amụma ọbụla agaghị esi na Galili pụta.”
Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime ha lara nʼụlọ ya.