< 希伯来书 3 >

1 因此,为上帝而存在、共同听从天召的兄弟姐妹,我们需要认真思考耶稣——我们称之为上帝派来之人,大祭司。
Ya mere, ụmụnna m dị nsọ, ndị so keta oke nʼọkpụkpọ eluigwe ahụ, ka echiche unu dịgide naanị na Jisọs. Onyeisi ozi na onyeisi nchụaja nke okwukwe anyị.
2 在他被选去做的事情中,他忠于上帝,就像摩西在上帝之家忠于上帝。
O kwesiri ntụkwasị obi nye onye ahụ họpụtara ya dịka Mosis si bụrụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼije ozi ya nʼụlọ Chineke.
3 因为耶稣值得拥有比摩西更大的荣耀,就像建造房屋的人,比房屋本身值得拥有更大的尊贵。
Ma Jisọs nwere ugwu na nsọpụrụ karịa Mosis, dịka onye na-ewu ụlọ si enwe ugwu na nsọpụrụ karịa ụlọ o wuru.
4 每一间房屋都有其建造者,上帝是万物的建造者。
Nʼihi na ụlọ ọbụla nwere onye wuru ya, maọbụ Chineke na-ewu ihe niile.
5 摩西作为仆人在上帝之家中效忠上帝。他提供了以后要宣布的证据。;
Mosis kwesiri ntụkwasị obi dịka odibo nʼụlọ Chineke nʼihe niile, sịkwa otu a gbaa ama banyere ihe ndị a ga-ekwu nʼọdịnihu.
6 但是基督却是负责上帝之家的儿子。如果我们对所信仰的希望充满信心,我们就是神的家。。
Ma otu ọ dị, Kraịst kwesiri ntụkwasị obi dịka ọkpara nke na-elekọta ụlọ ya. Anyị gabụkwanụ ụlọ ya ma ọ bụrụ na anyị ejidesie okwukwe anyị ike ya na olileanya nke anyị ji anya isi.
7 所以,就像圣灵所说:“如果你们今天听到上帝对你说的,
Ya mere, dị ka Mmụọ Nsọ na-asị, “Ọ bụrụ na unu anụ olu ya taa,
8 就不要铁石心肠,比如在荒野试探他,反叛他;
unu emela ka obi unu sie ike, dị ka unu mere nʼoge nnupu isi mgbe oge ọnwụnwa nʼime ọzara,
9 你们的祖先曾通过这种方式试探我,在四十年中一直都看到我给他们的证据。
ebe nna nna unu ha nọrọ nwa m ọnwụnwa. Ọ bụ ezie na ha hụrụ akaọrụ m iri afọ anọ ndị a.
10 那个世代的人让我发怒,于是我说:‘他们的思想总是出现错误,不知道我或我所做的事情。’
Nʼihi nke a, ewere m iwe megide ọgbọ ahụ. Asịrị m, ‘Obi ha na-akpafu akpafu mgbe niile. Ha amatabeghị ụzọ m niile.’
11 于是我在沮丧中起誓:‘他们绝不可进进入我的安息。’”
Ya mere, aṅụrụ m iyi nʼiwe m, sị, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’”
12 兄弟姐妹们,你们要小心,免得你们中间有人存着邪恶之心,放弃了对永生上帝的信;
Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ omume niile na ekweghị ekwe niile nke obi ghara ịdị nʼime onye ọbụla nʼetiti unu, nke ga-eme ka unu site nʼiso Chineke dị ndụ tụgharịa.
13 在你们还有“今天”的时候,要互相劝勉,免得有人受罪恶的诱惑,变得铁石心肠。
Kama, na-agbanụ onwe unu ume kwa ụbọchị niile dịka a kpọrọ ụbọchị ahụ Taa. Ka a hapụ inwekwa onye ọbụla a ga-esite nʼaghụghọ nke mmehie mee ka obi ya sie ike.
14 如果我们把最初对上帝的信念坚持到底,我们就是基督的伙伴了。
Anyị bụ ndị anyị na Kraịst ga-eso kekọrịta oke ma ọ bụrụ na anyị ga-ejidesi ya ike bụ ntụkwasị obi ahụ anyị nwere site na mmalite ruo ọgwụgwụ.
15 正如经文所说:“如果你们今天听到上帝对你说的,就不要铁石心肠,就像反抗他的那时候一样。”
Dị ka e kwuru ya, “Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya. Unu emela ka obi unu sie ike, dịka unu mere nʼoge nnupu isi.”
16 那时候,听到上帝所说的话而反抗的谁呢?不就是摩西从埃及带出来的那些人吗?
Olee ndị bụ ndị ahụ nụrụ ma nupu isi? Ọ bụ na ọ bụghị ndị niile ahụ Mosis dupụtara site nʼala Ijipt?
17 是谁让上帝在四十年内感到不快?不就是向那些在埋葬在荒野中的罪人吗?
Ọ bụkwa olee ndị ka o wesoro iwe iri afọ anọ? Ọ bụ na ọ bụghị ndị ahụ mehiere. Ndị ahụ ahụ ha dara nʼọzara?
18 当上帝发誓他们不可进入他的安息,这又是向谁说的?难道不是向那些不遵从的人吗?
Olee ndị ahụ ọ ṅụụrụ iyi na ha agaghị aba nʼizuike ya? Ọ bụ na ha abụghị ndị ahụ nupuuru ya isi?
19 所以我们会看到,他们因为不信而无法进入安息。
Ugbu a, anyị maara na ha enweghị ike ịbanye, nʼihi na ha bụ ndị na-ekweghị ekwe.

< 希伯来书 3 >