< Chivumbulutso 4 >
1 Kenaka, nditayangʼana patsogolo panga ndinaona khomo lotsekuka la kumwamba. Ndipo liwu lija ndinalimva poyamba lokhala ngati lipenga linati, “Bwera kuno, ndipo ndidzakuonetsa zimene zichitike zikatha izi.”
Mgbe ihe ndị a gasịrị, eleliri m anya m hụ ọnụ ụzọ dị nʼeluigwe ka e meghere ya. Ụda olu ahụ m nụrụ na mmalite dara ọzọ, dị ka ụda opi ike sị m, “Bịa, gbagota nʼebe a, ka m gosi gị ihe ga-emezuriri mgbe ihe ndị a gasịrị.”
2 Nthawi yomweyo ndinatengedwa ndi Mzimu Woyera, ndipo patsogolo panga ndinaona mpando waufumu wina atakhalapo.
Nʼotu oge ahụ, e mere ka m nọọ nʼime mmụọ, ma lee, ahụrụ m onwe m nʼeluigwe, hụkwa ka e debere otu ocheeze nke otu onye na-anọkwasị nʼelu ya.
3 Ndipo amene anakhalapoyo anali wa maonekedwe ngati miyala ya jasipa ndi sardiyo. Utawaleza wooneka ngati simaragido unazinga mpando waufumuwo.
Ụdịdị onye nọkwasịrị nʼocheeze ahụ na-egbu nweghenweghe dịka nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ jaspa na kanelian. Eke na egwurugwu dịka nkume oke ọnụahịa. Emeralụdụ gbara ocheeze ahụ gburugburu.
4 Kuzungulira mpando waufumuwu panalinso mipando ina yaufumu yokwana 24 ndipo panakhala akuluakulu 24 atavala zoyera ndipo anavala zipewa zaufumu zagolide pamutu.
Iri ocheeze abụọ na anọ ọzọ, gbara ocheeze ukwu ahụ gburugburu. Ndị nọkwasịrị nʼocheeze ndị a bụ iri ndị okenye abụọ na anọ, ndị yi uwe ọcha. Ha kpukwa okpueze e ji ọlaedo kpụọ nʼisi ha.
5 Kumpando waufumuwo kunkatuluka mphenzi, phokoso ndi mabingu. Patsogolo pake pa mpando waufumuwo panali nyale zisanu ndi ziwiri zoyaka. Iyi ndiyo mizimu isanu ndi iwiri ya Mulungu.
Mgbe ahụ, ụda dịka ụda egbe eluigwe, ya na amụma na-egbuke sitere nʼocheeze ukwu ahụ na-ada na-achapụtakwa. Nʼihu ocheeze ukwu ahụ, e nwere oriọna asaa na-enwu ọkụ. Oriọna ndị a bụ mmụọ asaa nke Chineke.
6 Patsogolo pa mpando waufumu pomwepo panalinso ngati nyanja yagalasi yonyezimira ngati mwala wa krustalo. Pakatinʼpakati, kuzungulira mpando waufumuwo panali zamoyo zinayi zokhala ndi maso ponseponse, kutsogolo ndi kumbuyo komwe.
Nʼihu ocheeze ahụ e nwere ihe dịka oke osimiri e ji enyo mee, nke na-enwu dịka kristal. Nʼetiti ihu ocheeze ahụ na gburugburu ya, e nwere anụ anọ dị ndụ nwere anya nʼakụkụ ahụ ha niile, ihu na azụ.
7 Chamoyo choyamba chinali ngati mkango, chachiwiri chinali ngati mwana wangʼombe, chachitatu chinali ndi nkhope ngati munthu, chachinayi chinali ngati chiwombankhanga chowuluka.
Nke mbụ nʼime anụ ndị ahụ dị ndụ nwere oyiyi dịka ọdụm. Nke abụọ dịka ehi. Nke atọ nwere ihu yiri nke mmadụ. Nke anọ dịka ugo gbasapụrụ nku ya na-efe efe.
8 Chamoyo chilichonse chinali ndi mapiko asanu ndi limodzi, ndipo chinali ndi maso ponseponse ndi mʼkati mwa mapiko momwe. Usana ndi usiku zimanena mosalekeza kuti,
Nke ọbụla nʼime ihe anọ ndị a dị ndụ nwere nku isii. Anya jupụtara nʼahụ ha niile na nʼime ha, ọ bụladị nʼokpuru nku ha. Ehihie na abalị niile, ọrụ ha bụ iti mkpu na-asị,
9 Nthawi zonse zamoyozo zimapereka ulemerero, ulemu ndi mayamiko kwa uja wokhala pa mpando waufumu, amene ali ndi moyo wamuyaya. (aiōn )
Mgbe ọbụla anụ ndị ahụ dị ndụ na-enye onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi otuto na nsọpụrụ na ekele, (aiōn )
10 Izi zikamachitika akuluakulu 24 aja amadzigwetsa pansi pamaso pa wokhala pa mpando waufumuyo, namupembedza wokhala ndi moyo wamuyayayo. Iwo amaponya pansi zipewa zawo zaufumu patsogolo pa mpando waufumu nati: (aiōn )
iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ na-adakwa nʼala nʼihu onye ahụ nọ nʼocheeze na-efe ya ofufe, bụ onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ha niile nʼotu nʼotu na-atụda okpueze ha nʼihu ya na-abụ abụ na-asị, (aiōn )
11 “Ndinu woyeneradi kulandira ulemerero ndi ulemu ndi mphamvu, Ambuye ndi Mulungu wathu, pakuti munalenga zinthu zonse, ndipo mwakufuna kwanu zinalengedwa monga zilili.”
“Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị, kwesiri ịnara otuto, na nsọpụrụ, na ike. Nʼihi na gị onwe gị kere ihe niile, ọ bụkwa site nʼọchịchọ gị ka e ji kee ha, ma meekwa ka ha dịrị ndụ.”