< Masalimo 83 >
1 Nyimbo. Salimo la Asafu. Inu Mulungu musakhale chete; musangoti phee, Mulungu musangoti duu.
Abụ, bụ Abụ Ọma Asaf. O! Chineke agbachikwala nkịtị. Biko, Chineke, ahapụkwala ikwu okwu, anọkwala jụụ.
2 Onani adani anu akuchita chiwawa, amene amadana nanu autsa mitu yawo.
Lee na ndị iro gị nọ na-ebigbọ, ndị kpọrọ gị asị na-eweli isi ha.
3 Mochenjera iwo akukambirana za chiwembu kutsutsana ndi anthu anu; Iwo akukonzekera kutsutsana ndi omwe mumawakonda.
Ha ji aghụghọ na-agba izu imegide ndị gị; ha na-atụ atụmatụ ọjọọ megide ndị ị hụrụ nʼanya.
4 Iwo akunena kuti, “Bwerani” akutero, “Tiyeni tiwononge mtundu wonsewu kuti dzina la Israeli lisakumbukikenso.”
Ha na-asị, “Bịanụ ka anyị laa mba a nʼiyi, ka a ghara ichetakwa aha Izrel ọzọ.”
5 Ndi mtima umodzi akukonzekera chiwembu; Iwo achita mgwirizano kutsutsana nanu:
Ha ji otu obi na-agbarịta izu; ha agbaala ndụ imegide gị,
6 Matenti a Edomu ndi Aismaeli, Mowabu ndi Ahagiri,
ụlọ ikwu niile nke ndị Edọm, na ndị Ishmel, na ndị Moab, na ndị Haga,
7 Agebala, Aamoni ndi Aamaleki, Afilisti, pamodzi ndi anthu a ku Turo.
na ndị Gebal, na ndị Amọn, na ndị Amalek, na ndị Filistia, ha na ndị Taịa.
8 Ngakhalenso Aasiriya aphatikizana nawo kupereka mphamvu kwa ana a Loti. (Sela)
Ọ bụladị ndị Asịrịa esorokwala ha, ịgba ndị agbụrụ Lọt ume. (Sela)
9 Muwachitire zomwe munachitira Amidiyani, monga munachitira Sisera ndi Yabini ku mtsinje wa Kisoni.
Mee ha dịka i si mee ndị Midia, na dịka i mere Sisera na Jabin, nʼakụkụ iyi Kishọn,
10 Amene anawonongedwa ku Endori ndi kukhala ngati zinyalala.
ndị lara nʼiyi nʼEndoa ma ghọọ ihe dịka nsị anụ e kpofuru ekpofu nʼala.
11 Anthu awo otchuka muwachite zomwe munachita Orebu ndi Zeebu ana a mafumu muwachite zomwe munachita Zeba ndi Zalimuna,
Mee ka ndị ọgaranya ha dịka Oreb na Zeeb, ka ụmụ ndị ikom eze ha niile dịka Zeba na Zalmuna,
12 amene anati, “Tiyeni tilande dziko la msipu la Mulungu.”
ndị sịrị, “Ka anyị nwetara onwe anyị, ebe ịta nri ụmụ anụmanụ niile nke Chineke.”
13 Muwasandutse fumbi lowuluka, Inu Mulungu wanga, ngati mankhusu owuluka ndi mphepo.
O Chineke m, mee ha ka dịka ahịhịa ifufe na-efegharị gburugburu, maọbụ dịka igbugbo ọka nʼebe ifufe dị.
14 Monga moto umatentha nkhalango, kapena malawi a moto kuyatsa phiri,
Dịka ọkụ na-erepịa oke ọhịa, maọbụ nke na-ere nʼelu ugwu,
15 kotero muwathamangitse ndi mphepo yamkuntho, ndi kuwachititsa mantha ndi namondwe.
si otu a were oke ifufe chụọ ha ọsọ, jiri oke ifufe nke na-eso mmiri ozuzo mee ka ha nọrọ nʼọnọdụ obi ọlụlọ mmiri.
16 Muphimbe nkhope zawo ndi manyazi kuti adzafunefune dzina lanu Yehova.
Were ihere kpuchie ha ihu, ka ndị mmadụ si otu a chọọ aha gị, O Onyenwe anyị.
17 Achite manyazi ndi mantha nthawi zonse; awonongeke mwa manyazi.
Ka ha nọdụ nʼọnọdụ ihere na ịda mba mgbe niile; ka ha laa nʼiyi nʼọnọdụ mweda nʼala.
18 Adziwe kuti Inu amene dzina lanu ndi Yehova, ndinu nokha Wammwambamwamba pa dziko lonse lapansi.
Mee ka ha mata na gị, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, na ọ bụ naanị gị bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile.