< Masalimo 70 >

1 Kwa mtsogoleri wa mayimbidwe. Salimo la Davide. Pempho. Fulumirani Mulungu kundipulumutsa; Yehova bwerani msanga kudzandithandiza.
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke Devid. Arịrịọ. O Chineke, gbata ọsọ bịa zọpụta m, O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka.
2 Iwo amene akufunafuna moyo wanga achititsidwe manyazi ndi kusokonezedwa; onse amene akukhumba chiwonongeko changa abwezedwe mopanda ulemu.
Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara. Ka ndị ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m laghachi azụ nʼihere.
3 Onse amene akunena kwa ine kuti, “Aha, aha,” abwerere chifukwa cha manyazi awo.
Ka ndị ahụ na-asị m, “Ehee! Ehee!” laghachi azụ nʼihi ihere ha.
4 Koma onse amene akufunafuna Inu akondwere ndi kusangalala mwa Inu; iwo amene amakonda chipulumutso chanu nthawi zonse anene kuti, “Mulungu akuzike!”
Ma ka ndị niile na-achọ gị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị, ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile, “Onyenwe anyị dị ukwuu.”
5 Koma ine ndine wosauka ndi wosowa; bwerani msanga kwa ine Inu Mulungu. Inu ndinu thandizo langa ndi momboli wanga; Inu Yehova musachedwe.
Ma mụ onwe m bụ ogbenye na onye nọ na mkpa; O Chineke, mee ngwangwa bịakwute m. Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m; O Onyenwe anyị, anọla ọdụ ịbịa.

< Masalimo 70 >